Acts 23 (BOICB)

1 Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.” 2 Nke a mere, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ ya nso tie ya aka nʼọnụ. 3 Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?” 4 Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?” 5 Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’” 6 Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.” 7 Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara. 8 Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile. 9 Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?” 10 Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha. 11 Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.” 12 Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl. 13 Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ. 14 Ha jekwuuru ndịisi nchụaja ha na ndị okenye, sị ha, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri maọbụ ịṅụ ihe ọbụla tutu ruo mgbe anyị gburu Pọl. 15 Ugbu a, unu na nzukọ zienụ onyeisi ọchịagha ka ọ kpọpụtara unu ya. Meenụ ka unu na-achọ ịjụpụtasị eziokwu nʼọnụ ya nakwa itule ikpe ya nke ọma. Anyị dị njikere igbu ya nʼụzọ tupu ọ bịaruo unu nso.” 16 Ma nwa nwanne nwanyị Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ banyere nʼogige ndị agha kọọrọ Pọl. 17 Pọl kpọrọ otu nʼime ndịisi agha ahụ gwa ya, “Biko kpọrọ nwokorobịa a gaa nʼebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.” 18 Ọ kpọọrọ ya jekwuru onyeisi agha, sị.“Pọl, onye mkpọrọ, kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwokorobịa a nʼihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.” 19 Onyeisi agha ahụ duuru ya nʼaka ya gaa nʼakụkụ ọzọ jụọ ya, “Gịnị bụ ihe ị chọrọ ịkọrọ m?” 20 Ọ sịrị, “Ndị Juu ụfọdụ ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọpụta Pọl echi na nzukọ ụlọ ikpe. Ha ga-eme dịka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya. 21 Ma aṅala ha ntị. Nʼihi na ihe karịrị iri mmadụ anọ na-ezo onwe ha na-eche inwude ya. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu ya. Ha adịla njikere, ihe a na-eche bụ mkpebi gị nye arịrịọ ha.” 22 Ọchịagha ahụ zilagara nwokorobịa ahụ site nʼinye ya iwu, “Emekwala ka onye ọbụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.” 23 Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a. 24 Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.” 25 O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a: 26 Klọdiọs Lisias,Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a.Ana m ekele gị. 27 Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya, ma mgbe m nụrụ na ọ bụ onye Rom, mụ na ndị agha m bịara napụta ya nʼaka ha. 28 Achọrọ m ịmata ihe mere ha ji ebo ya ebubo, nʼihi ya eduuru m ya gaa nʼọgbakọ ndị okenye ha. 29 Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere iwu ha. Nʼeziokwu, o nweghị ihe ọbụla kwesiri iji tụọ ya mkpọrọ maọbụ ọnwụ nʼime ebubo ahụ. 30 Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha. 31 Ya mere, nʼabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris dịka e nyere ha nʼiwu. 32 Nʼechi ya, ha hapụrụ ya na ndị na-agba nʼelu ịnyịnya ka ha duru ya gawa, ebe ha laghachiri nʼogige ndị agha. 33 Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl. 34 Gọvanọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ, jụọ ya akụkụ ala o si pụta. Mgbe ọ matara na ọ bụ onye Silisia, 35 ọ sịrị ya, “Aga m enye okwu gị ezigbo ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” O nyekwara iwu ka e debe ya nʼobi Herọd nʼaka ndị nche.

In Other Versions

Acts 23 in the ANGEFD

Acts 23 in the ANTPNG2D

Acts 23 in the AS21

Acts 23 in the BAGH

Acts 23 in the BBPNG

Acts 23 in the BBT1E

Acts 23 in the BDS

Acts 23 in the BEV

Acts 23 in the BHAD

Acts 23 in the BIB

Acts 23 in the BLPT

Acts 23 in the BNT

Acts 23 in the BNTABOOT

Acts 23 in the BNTLV

Acts 23 in the BOATCB

Acts 23 in the BOATCB2

Acts 23 in the BOBCV

Acts 23 in the BOCNT

Acts 23 in the BOECS

Acts 23 in the BOGWICC

Acts 23 in the BOHCB

Acts 23 in the BOHCV

Acts 23 in the BOHLNT

Acts 23 in the BOHNTLTAL

Acts 23 in the BOILNTAP

Acts 23 in the BOITCV

Acts 23 in the BOKCV

Acts 23 in the BOKCV2

Acts 23 in the BOKHWOG

Acts 23 in the BOKSSV

Acts 23 in the BOLCB

Acts 23 in the BOLCB2

Acts 23 in the BOMCV

Acts 23 in the BONAV

Acts 23 in the BONCB

Acts 23 in the BONLT

Acts 23 in the BONUT2

Acts 23 in the BOPLNT

Acts 23 in the BOSCB

Acts 23 in the BOSNC

Acts 23 in the BOTLNT

Acts 23 in the BOVCB

Acts 23 in the BOYCB

Acts 23 in the BPBB

Acts 23 in the BPH

Acts 23 in the BSB

Acts 23 in the CCB

Acts 23 in the CUV

Acts 23 in the CUVS

Acts 23 in the DBT

Acts 23 in the DGDNT

Acts 23 in the DHNT

Acts 23 in the DNT

Acts 23 in the ELBE

Acts 23 in the EMTV

Acts 23 in the ESV

Acts 23 in the FBV

Acts 23 in the FEB

Acts 23 in the GGMNT

Acts 23 in the GNT

Acts 23 in the HARY

Acts 23 in the HNT

Acts 23 in the IRVA

Acts 23 in the IRVB

Acts 23 in the IRVG

Acts 23 in the IRVH

Acts 23 in the IRVK

Acts 23 in the IRVM

Acts 23 in the IRVM2

Acts 23 in the IRVO

Acts 23 in the IRVP

Acts 23 in the IRVT

Acts 23 in the IRVT2

Acts 23 in the IRVU

Acts 23 in the ISVN

Acts 23 in the JSNT

Acts 23 in the KAPI

Acts 23 in the KBT1ETNIK

Acts 23 in the KBV

Acts 23 in the KJV

Acts 23 in the KNFD

Acts 23 in the LBA

Acts 23 in the LBLA

Acts 23 in the LNT

Acts 23 in the LSV

Acts 23 in the MAAL

Acts 23 in the MBV

Acts 23 in the MBV2

Acts 23 in the MHNT

Acts 23 in the MKNFD

Acts 23 in the MNG

Acts 23 in the MNT

Acts 23 in the MNT2

Acts 23 in the MRS1T

Acts 23 in the NAA

Acts 23 in the NASB

Acts 23 in the NBLA

Acts 23 in the NBS

Acts 23 in the NBVTP

Acts 23 in the NET2

Acts 23 in the NIV11

Acts 23 in the NNT

Acts 23 in the NNT2

Acts 23 in the NNT3

Acts 23 in the PDDPT

Acts 23 in the PFNT

Acts 23 in the RMNT

Acts 23 in the SBIAS

Acts 23 in the SBIBS

Acts 23 in the SBIBS2

Acts 23 in the SBICS

Acts 23 in the SBIDS

Acts 23 in the SBIGS

Acts 23 in the SBIHS

Acts 23 in the SBIIS

Acts 23 in the SBIIS2

Acts 23 in the SBIIS3

Acts 23 in the SBIKS

Acts 23 in the SBIKS2

Acts 23 in the SBIMS

Acts 23 in the SBIOS

Acts 23 in the SBIPS

Acts 23 in the SBISS

Acts 23 in the SBITS

Acts 23 in the SBITS2

Acts 23 in the SBITS3

Acts 23 in the SBITS4

Acts 23 in the SBIUS

Acts 23 in the SBIVS

Acts 23 in the SBT

Acts 23 in the SBT1E

Acts 23 in the SCHL

Acts 23 in the SNT

Acts 23 in the SUSU

Acts 23 in the SUSU2

Acts 23 in the SYNO

Acts 23 in the TBIAOTANT

Acts 23 in the TBT1E

Acts 23 in the TBT1E2

Acts 23 in the TFTIP

Acts 23 in the TFTU

Acts 23 in the TGNTATF3T

Acts 23 in the THAI

Acts 23 in the TNFD

Acts 23 in the TNT

Acts 23 in the TNTIK

Acts 23 in the TNTIL

Acts 23 in the TNTIN

Acts 23 in the TNTIP

Acts 23 in the TNTIZ

Acts 23 in the TOMA

Acts 23 in the TTENT

Acts 23 in the UBG

Acts 23 in the UGV

Acts 23 in the UGV2

Acts 23 in the UGV3

Acts 23 in the VBL

Acts 23 in the VDCC

Acts 23 in the YALU

Acts 23 in the YAPE

Acts 23 in the YBVTP

Acts 23 in the ZBP