Amos 2 (BOICB)
1 Otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị,“Nʼihi njehie atọ nke Moab,e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ,mee ha ka ha ghọọ ntụ. 2 Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab,nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt.Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara,nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike. 3 Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi,gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.”Ọ bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu. 4 Otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị,“Nʼihi njehie atọ nke Juda,e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.Nʼihi na ha ajụla iwu ONYENWE ANYỊ.Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya.Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie,bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro. 5 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda,ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.” 6 Otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị,“Nʼihi njehie atọ nke Izrel,e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha,reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ. 7 Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị,na-echi ha ọnụ nʼaja,na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe.Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ,si otu a merụọ aha nsọ m. 8 Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla,nʼelu uwe ndị anatara na mbe.Nʼime ụlọnsọ chi ha,ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra. 9 “Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha,ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida,ndị sikwara ike dịka osisi ook.Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu,na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi. 10 Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu,duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ,ime ka unu nweta ala ndị Amọrait. 11 “Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait.Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara ya. 12 “Ma unu mere ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya.Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma. 13 “Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu,dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada. 14 Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ,ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume,ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha. 15 Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla,ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ.Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya. 16 Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu,ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.
In Other Versions
Amos 2 in the ANGEFD
Amos 2 in the ANTPNG2D
Amos 2 in the AS21
Amos 2 in the BAGH
Amos 2 in the BBPNG
Amos 2 in the BBT1E
Amos 2 in the BDS
Amos 2 in the BEV
Amos 2 in the BHAD
Amos 2 in the BIB
Amos 2 in the BLPT
Amos 2 in the BNT
Amos 2 in the BNTABOOT
Amos 2 in the BNTLV
Amos 2 in the BOATCB
Amos 2 in the BOATCB2
Amos 2 in the BOBCV
Amos 2 in the BOCNT
Amos 2 in the BOECS
Amos 2 in the BOGWICC
Amos 2 in the BOHCB
Amos 2 in the BOHCV
Amos 2 in the BOHLNT
Amos 2 in the BOHNTLTAL
Amos 2 in the BOILNTAP
Amos 2 in the BOITCV
Amos 2 in the BOKCV
Amos 2 in the BOKCV2
Amos 2 in the BOKHWOG
Amos 2 in the BOKSSV
Amos 2 in the BOLCB
Amos 2 in the BOLCB2
Amos 2 in the BOMCV
Amos 2 in the BONAV
Amos 2 in the BONCB
Amos 2 in the BONLT
Amos 2 in the BONUT2
Amos 2 in the BOPLNT
Amos 2 in the BOSCB
Amos 2 in the BOSNC
Amos 2 in the BOTLNT
Amos 2 in the BOVCB
Amos 2 in the BOYCB
Amos 2 in the BPBB
Amos 2 in the BPH
Amos 2 in the BSB
Amos 2 in the CCB
Amos 2 in the CUV
Amos 2 in the CUVS
Amos 2 in the DBT
Amos 2 in the DGDNT
Amos 2 in the DHNT
Amos 2 in the DNT
Amos 2 in the ELBE
Amos 2 in the EMTV
Amos 2 in the ESV
Amos 2 in the FBV
Amos 2 in the FEB
Amos 2 in the GGMNT
Amos 2 in the GNT
Amos 2 in the HARY
Amos 2 in the HNT
Amos 2 in the IRVA
Amos 2 in the IRVB
Amos 2 in the IRVG
Amos 2 in the IRVH
Amos 2 in the IRVK
Amos 2 in the IRVM
Amos 2 in the IRVM2
Amos 2 in the IRVO
Amos 2 in the IRVP
Amos 2 in the IRVT
Amos 2 in the IRVT2
Amos 2 in the IRVU
Amos 2 in the ISVN
Amos 2 in the JSNT
Amos 2 in the KAPI
Amos 2 in the KBT1ETNIK
Amos 2 in the KBV
Amos 2 in the KJV
Amos 2 in the KNFD
Amos 2 in the LBA
Amos 2 in the LBLA
Amos 2 in the LNT
Amos 2 in the LSV
Amos 2 in the MAAL
Amos 2 in the MBV
Amos 2 in the MBV2
Amos 2 in the MHNT
Amos 2 in the MKNFD
Amos 2 in the MNG
Amos 2 in the MNT
Amos 2 in the MNT2
Amos 2 in the MRS1T
Amos 2 in the NAA
Amos 2 in the NASB
Amos 2 in the NBLA
Amos 2 in the NBS
Amos 2 in the NBVTP
Amos 2 in the NET2
Amos 2 in the NIV11
Amos 2 in the NNT
Amos 2 in the NNT2
Amos 2 in the NNT3
Amos 2 in the PDDPT
Amos 2 in the PFNT
Amos 2 in the RMNT
Amos 2 in the SBIAS
Amos 2 in the SBIBS
Amos 2 in the SBIBS2
Amos 2 in the SBICS
Amos 2 in the SBIDS
Amos 2 in the SBIGS
Amos 2 in the SBIHS
Amos 2 in the SBIIS
Amos 2 in the SBIIS2
Amos 2 in the SBIIS3
Amos 2 in the SBIKS
Amos 2 in the SBIKS2
Amos 2 in the SBIMS
Amos 2 in the SBIOS
Amos 2 in the SBIPS
Amos 2 in the SBISS
Amos 2 in the SBITS
Amos 2 in the SBITS2
Amos 2 in the SBITS3
Amos 2 in the SBITS4
Amos 2 in the SBIUS
Amos 2 in the SBIVS
Amos 2 in the SBT
Amos 2 in the SBT1E
Amos 2 in the SCHL
Amos 2 in the SNT
Amos 2 in the SUSU
Amos 2 in the SUSU2
Amos 2 in the SYNO
Amos 2 in the TBIAOTANT
Amos 2 in the TBT1E
Amos 2 in the TBT1E2
Amos 2 in the TFTIP
Amos 2 in the TFTU
Amos 2 in the TGNTATF3T
Amos 2 in the THAI
Amos 2 in the TNFD
Amos 2 in the TNT
Amos 2 in the TNTIK
Amos 2 in the TNTIL
Amos 2 in the TNTIN
Amos 2 in the TNTIP
Amos 2 in the TNTIZ
Amos 2 in the TOMA
Amos 2 in the TTENT
Amos 2 in the UBG
Amos 2 in the UGV
Amos 2 in the UGV2
Amos 2 in the UGV3
Amos 2 in the VBL
Amos 2 in the VDCC
Amos 2 in the YALU
Amos 2 in the YAPE
Amos 2 in the YBVTP
Amos 2 in the ZBP