Amos 5 (BOICB)

1 Nụrụnụ okwu ndị a, nke a ka m na-ekwu megide unu, ọ bụ mkpu akwa maka gị ezinaụlọ nke Izrel: 2 “Izrel, nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, a daala,ọ gaghị ebilite ọzọ,onye a gbahapụrụ nʼala nke aka ya,ọ dịkwaghị onye ga-ekulite ya.” 3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-asị Izrel,“Obodo unu nke na-ezipụ puku ndị ike,ka naanị narị ga-afọdụ,obodo unu na-ezipụ narị ndị ikeka naanị iri ga-afọdụrụ.” 4 Ihe ndị a bụ okwu ONYENWE ANYỊ na-agwa ụlọ Izrel,“Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ. 5 Unu achọla Betel,unu abanyekwala na Gilgal,maọbụ ga ije ruo Bịasheba.Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ,ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu.” 6 Chọọnụ ONYENWE ANYỊ, ka unu dịrị ndụ,ka ọ gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ,ọ ga-erepịa ha.Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ. 7 Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu,na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala. 8 Onye mere kpakpando pleiades na orion,onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ,na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị,onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,wụsa ha nʼelu ala akọrọ, ONYENWE ANYỊ bụ aha ya. 9 Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya,na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike. 10 Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị,na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya. 11 Unu na-azọpịa ndị ogbenye,na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha.Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa,ma unu agaghị ebi nʼime ha.Unu akụọla ubi vaịnị mara mma,ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha. 12 Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba,matakwa ọtụtụ mmehie unu niile. Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị.Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama. 13 Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ,nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ. 14 Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ;ka unu dịrị ndụ.Mgbe ahụ ka ONYENWE ANYỊ Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu,dịka unu si kwuo. 15 Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya.Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu.O nwere ike bụrụ na ONYENWE ANYỊ Chineke Onye pụrụ ime ihe niilega-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef. 16 Nʼihi ya, nke a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị,“Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile;ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa.A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa,kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa. 17 A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile,nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,”ka ONYENWE ANYỊ kwuru. 18 Ahụhụ dịrị unu,ndị ahụ na-achọsi ụbọchị ONYENWE ANYỊ ike.Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke ONYENWE ANYỊ ahụ?Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè. 19 Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụma zute anụ ọhịa bịa,maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuikema tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ,agwọ ataa ya. 20 Ụbọchị ONYENWE ANYỊ ọ gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè,nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya? 21 “Akpọrọ m mmemme oriri na ọṅụṅụ unu asị, ajụla m ya.Nnọkọ nke oke nzukọ unu adịghị atọkwa m ụtọ. 22 A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu,agaghị m anabata ha.Aja udo nke anụ unu gbara abụbaabụrụghị m ihe ọbụla. 23 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga ụzụ ịbụ abụ unu.Agaghị m ege ntị nʼabụ ụbọ akwara unu. 24 Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri,ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata. 25 “Iri afọ anọ ndị ahụ unu nọ nʼọzara,unu chụụrụ m aja, unu o wetara m onyinye, unu ụlọ Izrel? 26 Unu ga-ebuli eze unu Sakut elu,na arụsị Kayiwan, chi kpakpando unu,bụ onyinyo unu, na chi niile a kpụrụ akpụ,nke unu kpụrụ nye onwe unu. 27 Ya mere, aghaghị m ime ka e buru unu gaa nʼala ndị ọzọ, nʼofe Damaskọs,”ka ONYENWE ANYỊ, Onye ahụ aha ya bụ Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

In Other Versions

Amos 5 in the ANGEFD

Amos 5 in the ANTPNG2D

Amos 5 in the AS21

Amos 5 in the BAGH

Amos 5 in the BBPNG

Amos 5 in the BBT1E

Amos 5 in the BDS

Amos 5 in the BEV

Amos 5 in the BHAD

Amos 5 in the BIB

Amos 5 in the BLPT

Amos 5 in the BNT

Amos 5 in the BNTABOOT

Amos 5 in the BNTLV

Amos 5 in the BOATCB

Amos 5 in the BOATCB2

Amos 5 in the BOBCV

Amos 5 in the BOCNT

Amos 5 in the BOECS

Amos 5 in the BOGWICC

Amos 5 in the BOHCB

Amos 5 in the BOHCV

Amos 5 in the BOHLNT

Amos 5 in the BOHNTLTAL

Amos 5 in the BOILNTAP

Amos 5 in the BOITCV

Amos 5 in the BOKCV

Amos 5 in the BOKCV2

Amos 5 in the BOKHWOG

Amos 5 in the BOKSSV

Amos 5 in the BOLCB

Amos 5 in the BOLCB2

Amos 5 in the BOMCV

Amos 5 in the BONAV

Amos 5 in the BONCB

Amos 5 in the BONLT

Amos 5 in the BONUT2

Amos 5 in the BOPLNT

Amos 5 in the BOSCB

Amos 5 in the BOSNC

Amos 5 in the BOTLNT

Amos 5 in the BOVCB

Amos 5 in the BOYCB

Amos 5 in the BPBB

Amos 5 in the BPH

Amos 5 in the BSB

Amos 5 in the CCB

Amos 5 in the CUV

Amos 5 in the CUVS

Amos 5 in the DBT

Amos 5 in the DGDNT

Amos 5 in the DHNT

Amos 5 in the DNT

Amos 5 in the ELBE

Amos 5 in the EMTV

Amos 5 in the ESV

Amos 5 in the FBV

Amos 5 in the FEB

Amos 5 in the GGMNT

Amos 5 in the GNT

Amos 5 in the HARY

Amos 5 in the HNT

Amos 5 in the IRVA

Amos 5 in the IRVB

Amos 5 in the IRVG

Amos 5 in the IRVH

Amos 5 in the IRVK

Amos 5 in the IRVM

Amos 5 in the IRVM2

Amos 5 in the IRVO

Amos 5 in the IRVP

Amos 5 in the IRVT

Amos 5 in the IRVT2

Amos 5 in the IRVU

Amos 5 in the ISVN

Amos 5 in the JSNT

Amos 5 in the KAPI

Amos 5 in the KBT1ETNIK

Amos 5 in the KBV

Amos 5 in the KJV

Amos 5 in the KNFD

Amos 5 in the LBA

Amos 5 in the LBLA

Amos 5 in the LNT

Amos 5 in the LSV

Amos 5 in the MAAL

Amos 5 in the MBV

Amos 5 in the MBV2

Amos 5 in the MHNT

Amos 5 in the MKNFD

Amos 5 in the MNG

Amos 5 in the MNT

Amos 5 in the MNT2

Amos 5 in the MRS1T

Amos 5 in the NAA

Amos 5 in the NASB

Amos 5 in the NBLA

Amos 5 in the NBS

Amos 5 in the NBVTP

Amos 5 in the NET2

Amos 5 in the NIV11

Amos 5 in the NNT

Amos 5 in the NNT2

Amos 5 in the NNT3

Amos 5 in the PDDPT

Amos 5 in the PFNT

Amos 5 in the RMNT

Amos 5 in the SBIAS

Amos 5 in the SBIBS

Amos 5 in the SBIBS2

Amos 5 in the SBICS

Amos 5 in the SBIDS

Amos 5 in the SBIGS

Amos 5 in the SBIHS

Amos 5 in the SBIIS

Amos 5 in the SBIIS2

Amos 5 in the SBIIS3

Amos 5 in the SBIKS

Amos 5 in the SBIKS2

Amos 5 in the SBIMS

Amos 5 in the SBIOS

Amos 5 in the SBIPS

Amos 5 in the SBISS

Amos 5 in the SBITS

Amos 5 in the SBITS2

Amos 5 in the SBITS3

Amos 5 in the SBITS4

Amos 5 in the SBIUS

Amos 5 in the SBIVS

Amos 5 in the SBT

Amos 5 in the SBT1E

Amos 5 in the SCHL

Amos 5 in the SNT

Amos 5 in the SUSU

Amos 5 in the SUSU2

Amos 5 in the SYNO

Amos 5 in the TBIAOTANT

Amos 5 in the TBT1E

Amos 5 in the TBT1E2

Amos 5 in the TFTIP

Amos 5 in the TFTU

Amos 5 in the TGNTATF3T

Amos 5 in the THAI

Amos 5 in the TNFD

Amos 5 in the TNT

Amos 5 in the TNTIK

Amos 5 in the TNTIL

Amos 5 in the TNTIN

Amos 5 in the TNTIP

Amos 5 in the TNTIZ

Amos 5 in the TOMA

Amos 5 in the TTENT

Amos 5 in the UBG

Amos 5 in the UGV

Amos 5 in the UGV2

Amos 5 in the UGV3

Amos 5 in the VBL

Amos 5 in the VDCC

Amos 5 in the YALU

Amos 5 in the YAPE

Amos 5 in the YBVTP

Amos 5 in the ZBP