Colossians 3 (BOICB)

1 Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke. 2 Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa. 3 Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst. 4 Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya. 5 Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị). 6 Ọ bụkwa nʼihi ihe ndị a ka ọnụma Chineke na-abịakwasị ndị ahụ na-enupu isi. 7 Ihe ndị a bụ ihe unu na-eme nʼoge gara aga mgbe unu na-adị ndụ nʼime ha. 8 Ma ugbu a bụ oge iwezuga ihe ndị a niile na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu niile, ya na okwu ihere niile na-esi unu nʼọnụ na-apụta. 9 Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nʼihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a. 10 Ugbu a, unu eyikwasịla ndụ ọhụrụ ahụ, nke e ji amamihe na-eme ka ọ dị ọhụrụ nʼoyiyi nke onye kere ya. 11 Nkewa ọbụla adịghị nʼime ndụ a. Ọ dịghị mkpa maọbụ onye Juu maọbụ onye mba ọzọ, maọbụ onye e biri ugwu, maọbụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa maọbụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bu onye ime ọhịa, maọbụ onye Sitia, maọbụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ na Kraịst bụ ihe niile, nọrọkwa nʼime ihe niile. 12 Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi. 13 Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu. 14 Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu. 15 Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele. 16 Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu. 17 Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya. 18 Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka ọ kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị. 19 Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume. 20 Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị. 21 Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi. 22 Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi. 23 Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ. 24 Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi. 25 Onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nʼihi ihe ọjọọ niile o mere. Nʼihi na ile mmadụ anya nʼihu adịghị ya.

In Other Versions

Colossians 3 in the ANGEFD

Colossians 3 in the ANTPNG2D

Colossians 3 in the AS21

Colossians 3 in the BAGH

Colossians 3 in the BBPNG

Colossians 3 in the BBT1E

Colossians 3 in the BDS

Colossians 3 in the BEV

Colossians 3 in the BHAD

Colossians 3 in the BIB

Colossians 3 in the BLPT

Colossians 3 in the BNT

Colossians 3 in the BNTABOOT

Colossians 3 in the BNTLV

Colossians 3 in the BOATCB

Colossians 3 in the BOATCB2

Colossians 3 in the BOBCV

Colossians 3 in the BOCNT

Colossians 3 in the BOECS

Colossians 3 in the BOGWICC

Colossians 3 in the BOHCB

Colossians 3 in the BOHCV

Colossians 3 in the BOHLNT

Colossians 3 in the BOHNTLTAL

Colossians 3 in the BOILNTAP

Colossians 3 in the BOITCV

Colossians 3 in the BOKCV

Colossians 3 in the BOKCV2

Colossians 3 in the BOKHWOG

Colossians 3 in the BOKSSV

Colossians 3 in the BOLCB

Colossians 3 in the BOLCB2

Colossians 3 in the BOMCV

Colossians 3 in the BONAV

Colossians 3 in the BONCB

Colossians 3 in the BONLT

Colossians 3 in the BONUT2

Colossians 3 in the BOPLNT

Colossians 3 in the BOSCB

Colossians 3 in the BOSNC

Colossians 3 in the BOTLNT

Colossians 3 in the BOVCB

Colossians 3 in the BOYCB

Colossians 3 in the BPBB

Colossians 3 in the BPH

Colossians 3 in the BSB

Colossians 3 in the CCB

Colossians 3 in the CUV

Colossians 3 in the CUVS

Colossians 3 in the DBT

Colossians 3 in the DGDNT

Colossians 3 in the DHNT

Colossians 3 in the DNT

Colossians 3 in the ELBE

Colossians 3 in the EMTV

Colossians 3 in the ESV

Colossians 3 in the FBV

Colossians 3 in the FEB

Colossians 3 in the GGMNT

Colossians 3 in the GNT

Colossians 3 in the HARY

Colossians 3 in the HNT

Colossians 3 in the IRVA

Colossians 3 in the IRVB

Colossians 3 in the IRVG

Colossians 3 in the IRVH

Colossians 3 in the IRVK

Colossians 3 in the IRVM

Colossians 3 in the IRVM2

Colossians 3 in the IRVO

Colossians 3 in the IRVP

Colossians 3 in the IRVT

Colossians 3 in the IRVT2

Colossians 3 in the IRVU

Colossians 3 in the ISVN

Colossians 3 in the JSNT

Colossians 3 in the KAPI

Colossians 3 in the KBT1ETNIK

Colossians 3 in the KBV

Colossians 3 in the KJV

Colossians 3 in the KNFD

Colossians 3 in the LBA

Colossians 3 in the LBLA

Colossians 3 in the LNT

Colossians 3 in the LSV

Colossians 3 in the MAAL

Colossians 3 in the MBV

Colossians 3 in the MBV2

Colossians 3 in the MHNT

Colossians 3 in the MKNFD

Colossians 3 in the MNG

Colossians 3 in the MNT

Colossians 3 in the MNT2

Colossians 3 in the MRS1T

Colossians 3 in the NAA

Colossians 3 in the NASB

Colossians 3 in the NBLA

Colossians 3 in the NBS

Colossians 3 in the NBVTP

Colossians 3 in the NET2

Colossians 3 in the NIV11

Colossians 3 in the NNT

Colossians 3 in the NNT2

Colossians 3 in the NNT3

Colossians 3 in the PDDPT

Colossians 3 in the PFNT

Colossians 3 in the RMNT

Colossians 3 in the SBIAS

Colossians 3 in the SBIBS

Colossians 3 in the SBIBS2

Colossians 3 in the SBICS

Colossians 3 in the SBIDS

Colossians 3 in the SBIGS

Colossians 3 in the SBIHS

Colossians 3 in the SBIIS

Colossians 3 in the SBIIS2

Colossians 3 in the SBIIS3

Colossians 3 in the SBIKS

Colossians 3 in the SBIKS2

Colossians 3 in the SBIMS

Colossians 3 in the SBIOS

Colossians 3 in the SBIPS

Colossians 3 in the SBISS

Colossians 3 in the SBITS

Colossians 3 in the SBITS2

Colossians 3 in the SBITS3

Colossians 3 in the SBITS4

Colossians 3 in the SBIUS

Colossians 3 in the SBIVS

Colossians 3 in the SBT

Colossians 3 in the SBT1E

Colossians 3 in the SCHL

Colossians 3 in the SNT

Colossians 3 in the SUSU

Colossians 3 in the SUSU2

Colossians 3 in the SYNO

Colossians 3 in the TBIAOTANT

Colossians 3 in the TBT1E

Colossians 3 in the TBT1E2

Colossians 3 in the TFTIP

Colossians 3 in the TFTU

Colossians 3 in the TGNTATF3T

Colossians 3 in the THAI

Colossians 3 in the TNFD

Colossians 3 in the TNT

Colossians 3 in the TNTIK

Colossians 3 in the TNTIL

Colossians 3 in the TNTIN

Colossians 3 in the TNTIP

Colossians 3 in the TNTIZ

Colossians 3 in the TOMA

Colossians 3 in the TTENT

Colossians 3 in the UBG

Colossians 3 in the UGV

Colossians 3 in the UGV2

Colossians 3 in the UGV3

Colossians 3 in the VBL

Colossians 3 in the VDCC

Colossians 3 in the YALU

Colossians 3 in the YAPE

Colossians 3 in the YBVTP

Colossians 3 in the ZBP