Daniel 1 (BOICB)
1 Mgbe afọ atọ gafere site na mgbe Jehoiakim bidoro bụrụ eze na-achị Juda, Nebukadneza eze na-achị Babilọn bịara buso Jerusalem agha. 2 Onyenwe anyị nyefere Jehoiakim, eze Juda nʼaka ya, na ihe ụfọdụ e jiri chọọ ụlọnsọ Chineke mma. O buuru ha niile gawa Shaịna nʼụlọ chi ya, dobe ha nʼime nʼụlọakụ chi ya. 3 Eze nyere Ashipenaz, onyeisi ndị ozi ya iwu ka ọ kpọbata ụmụ okorobịa sitere nʼezinaụlọ eze na nke ndị ọchịchị nʼala Izrel nʼije ozi eze. 4 Ụmụ okorobịa ndị a ga-abụ ndị nʼenweghị nkwarụ ọbụla nʼahụ ha, ndị mara mma ile anya na ndị nwere nghọta banyere ihe ọmụma dị iche iche. Ha kwesikwara ịbụ ndị maara ihe, ndị na-amụta ihe ọsịịsọ na ndị tozuru oke ije ozi nʼụlọeze. Ọ ga-akụziri ha asụsụ na akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche nke ndị Kaldịa. 5 Onye eze si nʼoche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha kwa ụbọchị. Ha ga-anọ nʼọzụzụ a afọ atọ, nke ọ ga-abụ e mechaa, ha ga-abụ ndị kwesiri ịnọ nʼije ozi nʼobi onye eze. 6 Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda. 7 Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego. 8 Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya. 9 Ma Chineke mere ka Daniel nweta ihuọma na obi ebere nʼaka onyeisi ndị na-ejere eze ozi. O nwekwara ọmịiko nʼebe Daniel nọ nʼihi ọnọdụ ha. 10 Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.” 11 Daniel sịrị onyeisi ahụ e tinyere ọrụ ilekọta Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya nʼaka, 12 “Biko, nye anyị naanị ahịhịa nri, na mmiri ọṅụṅụ, ka ọ bụrụ ihe oriri anyị na ihe ọṅụṅụ anyị. Jiri ya lee anyị ule ụbọchị iri. 13 Jirizie anya gị chọpụta ma o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ndị ọzọ, ndị na-eri nri ọma nke eze nyere, site nʼihe ị hụrụ, mee ụmụodibo gị otu o kwesiri.” 14 O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri. 15 Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ. 16 Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri. 17 Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile. 18 Mgbe oge eze nyere a ga-eji kpọbata ha nʼije ozi ya zuru, onyeisi ndị na-eje ozi chere ha nʼihu Nebukadneza. 19 Ha na eze kparịtakwara ụka. Ma nʼime ụmụ okorobịa ahụ niile a zụrụ, o nweghị nke amamihe ya juru eze afọ dịka amamihe Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya. Nʼihi nke a, o mere ka ha soro bụrụ ndị na-adụ ya ọdụ. 20 Mgbe ọ bụlakwa eze chọrọ ndụmọdụ banyere amamihe na nghọta, ọ na-achọpụta na ndụmọdụ ha na-enye ya na-adị mma okpukpu iri karịa ndụmọdụ nke ndị majiki ya na ndị maara ihe banyere kpakpando nọ nʼalaeze ya na-enye ya. 21 Daniel nọgidere bụrụ onye na-adụ eze ọdụ tutu ruo afọ mbụ nke Sairọs bidoro ịchị dịka eze.
In Other Versions
Daniel 1 in the ANGEFD
Daniel 1 in the ANTPNG2D
Daniel 1 in the AS21
Daniel 1 in the BAGH
Daniel 1 in the BBPNG
Daniel 1 in the BBT1E
Daniel 1 in the BDS
Daniel 1 in the BEV
Daniel 1 in the BHAD
Daniel 1 in the BIB
Daniel 1 in the BLPT
Daniel 1 in the BNT
Daniel 1 in the BNTABOOT
Daniel 1 in the BNTLV
Daniel 1 in the BOATCB
Daniel 1 in the BOATCB2
Daniel 1 in the BOBCV
Daniel 1 in the BOCNT
Daniel 1 in the BOECS
Daniel 1 in the BOGWICC
Daniel 1 in the BOHCB
Daniel 1 in the BOHCV
Daniel 1 in the BOHLNT
Daniel 1 in the BOHNTLTAL
Daniel 1 in the BOILNTAP
Daniel 1 in the BOITCV
Daniel 1 in the BOKCV
Daniel 1 in the BOKCV2
Daniel 1 in the BOKHWOG
Daniel 1 in the BOKSSV
Daniel 1 in the BOLCB
Daniel 1 in the BOLCB2
Daniel 1 in the BOMCV
Daniel 1 in the BONAV
Daniel 1 in the BONCB
Daniel 1 in the BONLT
Daniel 1 in the BONUT2
Daniel 1 in the BOPLNT
Daniel 1 in the BOSCB
Daniel 1 in the BOSNC
Daniel 1 in the BOTLNT
Daniel 1 in the BOVCB
Daniel 1 in the BOYCB
Daniel 1 in the BPBB
Daniel 1 in the BPH
Daniel 1 in the BSB
Daniel 1 in the CCB
Daniel 1 in the CUV
Daniel 1 in the CUVS
Daniel 1 in the DBT
Daniel 1 in the DGDNT
Daniel 1 in the DHNT
Daniel 1 in the DNT
Daniel 1 in the ELBE
Daniel 1 in the EMTV
Daniel 1 in the ESV
Daniel 1 in the FBV
Daniel 1 in the FEB
Daniel 1 in the GGMNT
Daniel 1 in the GNT
Daniel 1 in the HARY
Daniel 1 in the HNT
Daniel 1 in the IRVA
Daniel 1 in the IRVB
Daniel 1 in the IRVG
Daniel 1 in the IRVH
Daniel 1 in the IRVK
Daniel 1 in the IRVM
Daniel 1 in the IRVM2
Daniel 1 in the IRVO
Daniel 1 in the IRVP
Daniel 1 in the IRVT
Daniel 1 in the IRVT2
Daniel 1 in the IRVU
Daniel 1 in the ISVN
Daniel 1 in the JSNT
Daniel 1 in the KAPI
Daniel 1 in the KBT1ETNIK
Daniel 1 in the KBV
Daniel 1 in the KJV
Daniel 1 in the KNFD
Daniel 1 in the LBA
Daniel 1 in the LBLA
Daniel 1 in the LNT
Daniel 1 in the LSV
Daniel 1 in the MAAL
Daniel 1 in the MBV
Daniel 1 in the MBV2
Daniel 1 in the MHNT
Daniel 1 in the MKNFD
Daniel 1 in the MNG
Daniel 1 in the MNT
Daniel 1 in the MNT2
Daniel 1 in the MRS1T
Daniel 1 in the NAA
Daniel 1 in the NASB
Daniel 1 in the NBLA
Daniel 1 in the NBS
Daniel 1 in the NBVTP
Daniel 1 in the NET2
Daniel 1 in the NIV11
Daniel 1 in the NNT
Daniel 1 in the NNT2
Daniel 1 in the NNT3
Daniel 1 in the PDDPT
Daniel 1 in the PFNT
Daniel 1 in the RMNT
Daniel 1 in the SBIAS
Daniel 1 in the SBIBS
Daniel 1 in the SBIBS2
Daniel 1 in the SBICS
Daniel 1 in the SBIDS
Daniel 1 in the SBIGS
Daniel 1 in the SBIHS
Daniel 1 in the SBIIS
Daniel 1 in the SBIIS2
Daniel 1 in the SBIIS3
Daniel 1 in the SBIKS
Daniel 1 in the SBIKS2
Daniel 1 in the SBIMS
Daniel 1 in the SBIOS
Daniel 1 in the SBIPS
Daniel 1 in the SBISS
Daniel 1 in the SBITS
Daniel 1 in the SBITS2
Daniel 1 in the SBITS3
Daniel 1 in the SBITS4
Daniel 1 in the SBIUS
Daniel 1 in the SBIVS
Daniel 1 in the SBT
Daniel 1 in the SBT1E
Daniel 1 in the SCHL
Daniel 1 in the SNT
Daniel 1 in the SUSU
Daniel 1 in the SUSU2
Daniel 1 in the SYNO
Daniel 1 in the TBIAOTANT
Daniel 1 in the TBT1E
Daniel 1 in the TBT1E2
Daniel 1 in the TFTIP
Daniel 1 in the TFTU
Daniel 1 in the TGNTATF3T
Daniel 1 in the THAI
Daniel 1 in the TNFD
Daniel 1 in the TNT
Daniel 1 in the TNTIK
Daniel 1 in the TNTIL
Daniel 1 in the TNTIN
Daniel 1 in the TNTIP
Daniel 1 in the TNTIZ
Daniel 1 in the TOMA
Daniel 1 in the TTENT
Daniel 1 in the UBG
Daniel 1 in the UGV
Daniel 1 in the UGV2
Daniel 1 in the UGV3
Daniel 1 in the VBL
Daniel 1 in the VDCC
Daniel 1 in the YALU
Daniel 1 in the YAPE
Daniel 1 in the YBVTP
Daniel 1 in the ZBP