Deuteronomy 24 (BOICB)
1 Ọ bụrụ na nwoke akpọrọ nwanyị, lụọ ya, ma emesịa ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị ya nʼihi na ọ dị ihe ọ chọpụtara nʼahụ ya nke na-adịghị mma, ọ ga-ede akwụkwọ alụkwaghị m nye nwanyị ahụ nʼaka, zilaa ya. 2 Ọ bụrụ na emesịa, nwoke ọzọ alụọ ya, 3 ma nwoke ahụ ekpebiekwa ịgbara ya akwụkwọ achọkwaghị m, maọbụ na nwoke a mesịrị nwụọ, 4 nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya ONYENWE ANYỊ ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke na-enye gị dịka ihe nketa. 5 Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ. 6 Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya. 7 Ọ bụrụ na onye ọbụla ezuru nwanna ya onye Izrel nʼohi, mesoo ya mmeso dịka ohu, maọbụ ree ya, onye ohi ahụ ga-anwụ. Nke a bụ ikpochapụ ihe ọjọọ nʼetiti gị. 8 Gbalịsie ike ịhụ na ị na-eso iwu niile onye nchụaja, bụ onye Livayị nyere gị banyere ndị nwere ọrịa ekpenta, nʼihi na agwala m ya usoro ha ga-agbaso. 9 Chetakwa ihe ONYENWE ANYỊ Chineke gị mere Miriam, mgbe i si nʼIjipt na-apụta. 10 Ọ bụrụ na i binye mmadụ ihe ọbụla, abanyekwala nʼụlọ ya ịnata ihe a na-enye gị dị ka ihe ebe. 11 Guzo nʼezi! Ka onye ahụ ị na-ebinye ihe wetara gị ihe ibe ahụ nʼezi. 12 Ọ bụrụ na ọ bụ onye ogbenye na-enweghị ihe, e jidela ihe ibe ya naba ụra abalị. 13 Weghachiri ya akwa ahụ nʼanyasị, ka onye agbataobi gị jiri ya hie ụra abalị. Mgbe ahụ ha ga-ekele gị, ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-agụkwara gị ya nʼezi omume. 14 Emegbula nwa ogbenye mkpa na-akpa i goro ọrụ, ma onye ahụ ọ bụ nwa Izrel ma ọ bụkwanụ onye ọbịa bi nʼobodo gị. 15 Kwụọ ya ụgwọ ya ụbọchị niile tupu anwụ adaa, nʼihi na ebe ọ bụ nwa ogbenye, obi ya dabeere nʼụgwọ ahụ ị ga-akwụ ya. Ọ bụrụ na i meghị otu a, ọ ga-akwa akwa kpọkuo ONYENWE ANYỊ megide gị. A ga-agụkwara gị ya dịka mmehie. 16 Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya. 17 Ikpe ziri ezi ga-adịrị, ọ bụladị onye ọbịa na nwa mgbei, anarakwala nwanyị di ya nwụrụ anwụ uwe ya dịka ihe ibe. 18 Cheta mgbe niile na i bụrụrị ohu nʼala Ijipt, ma ONYENWE ANYỊ Chineke gị gbapụtara gị, nʼihi nke a ka m ji enye gị iwu ndị a. 19 Ọ bụrụ na i lefuo ukwu ọka ụfọdụ anya mgbe ị na-ewe ihe ubi nʼubi gị, alaghachila azụ nʼubi gị ịchịrị ha. Hapụrụ ya ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei, ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-agọzi gị, ọ ga-emekwa ka ị baa ụba. 20 Mgbe ị na-akụtusi mkpụrụ osisi oliv gị, ejeghachila azụ nʼalaka ọbụla inyochazi ya, ịchọpụta ma ị ghọtachaala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ha. Hapụrụ ndị ọbịa na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ mkpụrụ ọbụla fọdụrụ. 21 Otu a ka ị ga-emekwa nʼihe banyere mkpụrụ ubi vaịnị gị. Atụtụkọchala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ya. Hapụrụ ndị ọbịa, na ndị mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ ihe niile fọdụrụ. 22 Chetakwa na o nwere mgbe ị bụ ndị ohu nʼala Ijipt. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a.
In Other Versions
Deuteronomy 24 in the ANGEFD
Deuteronomy 24 in the ANTPNG2D
Deuteronomy 24 in the AS21
Deuteronomy 24 in the BAGH
Deuteronomy 24 in the BBPNG
Deuteronomy 24 in the BBT1E
Deuteronomy 24 in the BDS
Deuteronomy 24 in the BEV
Deuteronomy 24 in the BHAD
Deuteronomy 24 in the BIB
Deuteronomy 24 in the BLPT
Deuteronomy 24 in the BNT
Deuteronomy 24 in the BNTABOOT
Deuteronomy 24 in the BNTLV
Deuteronomy 24 in the BOATCB
Deuteronomy 24 in the BOATCB2
Deuteronomy 24 in the BOBCV
Deuteronomy 24 in the BOCNT
Deuteronomy 24 in the BOECS
Deuteronomy 24 in the BOGWICC
Deuteronomy 24 in the BOHCB
Deuteronomy 24 in the BOHCV
Deuteronomy 24 in the BOHLNT
Deuteronomy 24 in the BOHNTLTAL
Deuteronomy 24 in the BOILNTAP
Deuteronomy 24 in the BOITCV
Deuteronomy 24 in the BOKCV
Deuteronomy 24 in the BOKCV2
Deuteronomy 24 in the BOKHWOG
Deuteronomy 24 in the BOKSSV
Deuteronomy 24 in the BOLCB
Deuteronomy 24 in the BOLCB2
Deuteronomy 24 in the BOMCV
Deuteronomy 24 in the BONAV
Deuteronomy 24 in the BONCB
Deuteronomy 24 in the BONLT
Deuteronomy 24 in the BONUT2
Deuteronomy 24 in the BOPLNT
Deuteronomy 24 in the BOSCB
Deuteronomy 24 in the BOSNC
Deuteronomy 24 in the BOTLNT
Deuteronomy 24 in the BOVCB
Deuteronomy 24 in the BOYCB
Deuteronomy 24 in the BPBB
Deuteronomy 24 in the BPH
Deuteronomy 24 in the BSB
Deuteronomy 24 in the CCB
Deuteronomy 24 in the CUV
Deuteronomy 24 in the CUVS
Deuteronomy 24 in the DBT
Deuteronomy 24 in the DGDNT
Deuteronomy 24 in the DHNT
Deuteronomy 24 in the DNT
Deuteronomy 24 in the ELBE
Deuteronomy 24 in the EMTV
Deuteronomy 24 in the ESV
Deuteronomy 24 in the FBV
Deuteronomy 24 in the FEB
Deuteronomy 24 in the GGMNT
Deuteronomy 24 in the GNT
Deuteronomy 24 in the HARY
Deuteronomy 24 in the HNT
Deuteronomy 24 in the IRVA
Deuteronomy 24 in the IRVB
Deuteronomy 24 in the IRVG
Deuteronomy 24 in the IRVH
Deuteronomy 24 in the IRVK
Deuteronomy 24 in the IRVM
Deuteronomy 24 in the IRVM2
Deuteronomy 24 in the IRVO
Deuteronomy 24 in the IRVP
Deuteronomy 24 in the IRVT
Deuteronomy 24 in the IRVT2
Deuteronomy 24 in the IRVU
Deuteronomy 24 in the ISVN
Deuteronomy 24 in the JSNT
Deuteronomy 24 in the KAPI
Deuteronomy 24 in the KBT1ETNIK
Deuteronomy 24 in the KBV
Deuteronomy 24 in the KJV
Deuteronomy 24 in the KNFD
Deuteronomy 24 in the LBA
Deuteronomy 24 in the LBLA
Deuteronomy 24 in the LNT
Deuteronomy 24 in the LSV
Deuteronomy 24 in the MAAL
Deuteronomy 24 in the MBV
Deuteronomy 24 in the MBV2
Deuteronomy 24 in the MHNT
Deuteronomy 24 in the MKNFD
Deuteronomy 24 in the MNG
Deuteronomy 24 in the MNT
Deuteronomy 24 in the MNT2
Deuteronomy 24 in the MRS1T
Deuteronomy 24 in the NAA
Deuteronomy 24 in the NASB
Deuteronomy 24 in the NBLA
Deuteronomy 24 in the NBS
Deuteronomy 24 in the NBVTP
Deuteronomy 24 in the NET2
Deuteronomy 24 in the NIV11
Deuteronomy 24 in the NNT
Deuteronomy 24 in the NNT2
Deuteronomy 24 in the NNT3
Deuteronomy 24 in the PDDPT
Deuteronomy 24 in the PFNT
Deuteronomy 24 in the RMNT
Deuteronomy 24 in the SBIAS
Deuteronomy 24 in the SBIBS
Deuteronomy 24 in the SBIBS2
Deuteronomy 24 in the SBICS
Deuteronomy 24 in the SBIDS
Deuteronomy 24 in the SBIGS
Deuteronomy 24 in the SBIHS
Deuteronomy 24 in the SBIIS
Deuteronomy 24 in the SBIIS2
Deuteronomy 24 in the SBIIS3
Deuteronomy 24 in the SBIKS
Deuteronomy 24 in the SBIKS2
Deuteronomy 24 in the SBIMS
Deuteronomy 24 in the SBIOS
Deuteronomy 24 in the SBIPS
Deuteronomy 24 in the SBISS
Deuteronomy 24 in the SBITS
Deuteronomy 24 in the SBITS2
Deuteronomy 24 in the SBITS3
Deuteronomy 24 in the SBITS4
Deuteronomy 24 in the SBIUS
Deuteronomy 24 in the SBIVS
Deuteronomy 24 in the SBT
Deuteronomy 24 in the SBT1E
Deuteronomy 24 in the SCHL
Deuteronomy 24 in the SNT
Deuteronomy 24 in the SUSU
Deuteronomy 24 in the SUSU2
Deuteronomy 24 in the SYNO
Deuteronomy 24 in the TBIAOTANT
Deuteronomy 24 in the TBT1E
Deuteronomy 24 in the TBT1E2
Deuteronomy 24 in the TFTIP
Deuteronomy 24 in the TFTU
Deuteronomy 24 in the TGNTATF3T
Deuteronomy 24 in the THAI
Deuteronomy 24 in the TNFD
Deuteronomy 24 in the TNT
Deuteronomy 24 in the TNTIK
Deuteronomy 24 in the TNTIL
Deuteronomy 24 in the TNTIN
Deuteronomy 24 in the TNTIP
Deuteronomy 24 in the TNTIZ
Deuteronomy 24 in the TOMA
Deuteronomy 24 in the TTENT
Deuteronomy 24 in the UBG
Deuteronomy 24 in the UGV
Deuteronomy 24 in the UGV2
Deuteronomy 24 in the UGV3
Deuteronomy 24 in the VBL
Deuteronomy 24 in the VDCC
Deuteronomy 24 in the YALU
Deuteronomy 24 in the YAPE
Deuteronomy 24 in the YBVTP
Deuteronomy 24 in the ZBP