Deuteronomy 3 (BOICB)

1 Ihe ọzọ bụ na anyị chigharịrị, gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, ya na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụta izute anyị nʼagha na Edrei. 2 Ma ONYENWE ANYỊ gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.” 3 Ya mere, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke anyị nyefere Ọg, eze Bashan na ndị agha ya niile nʼaka anyị. Anyị gbuchapụkwara ha niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ. 4 Nʼoge ahụ, anyị lụgburu obodo ya. Ọ dịghị obodo ọbụla nʼime iri obodo isii ahụ niile nke anyị na-anaraghị ha, ya bụ akụkụ Agob niile bụ alaeze Ọg nʼime Bashan. 5 Obodo ndị a bụ obodo e wusiri ike, nwechara mgbidi dị elu nke ukwuu, nwekwaa ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. Anyị lụgbukwara ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ, ndị na-enweghị mgbidi. 6 Anyị bibiri ihe niile dị nʼobodo Bashan, dịka anyị mere nʼobodo Saịhọn, eze Heshbọn. Anyị gburu mmadụ niile bi nʼime ha, nwoke, nwanyị, na ụmụntakịrị. 7 Ma anụ ụlọ ha niile, na ihe nkwata si nʼobodo ha niile, bụ ihe anyị lụtara nʼagha nye onwe anyị. 8 Mgbe ahụ, anyị napụrụ ala ahụ site nʼaka eze abụọ ndị Amọrait, ya bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha dị site na ndagwurugwu Anọn ruo nʼugwu Hemon. 9 (Aha ndị Saịdọn na-akpọ ugwu Hemon bụ Siriọn, ma ndị Amọrait na-akpọ ya Senia.) 10 Anyị meriri obodo ndị ahụ niile dị nʼala dị larịị, meriekwa Gilead niile na Bashan, tutu ruo obodo Saleka na Edrei, obodo ndị dị nʼalaeze Ọg, eze Bashan. 11 (Ọg, eze ndị Bashan bụ naanị onye fọdụrụ ndụ nʼagbụrụ ndị Refaim. E ji igwe kwaa ihe ndina ya, nke ogologo ya dị mita anọ, nke obosara ya bụkwa mita abụọ. Ihe ndina a dị ruo taa nʼobodo Raba, otu nʼime obodo ndị Amọn.) 12 Mgbe anyị nwetara ala ndị a, eweere m ya nye ndị Ruben, na Gad, ya bụ, oke ala dị nʼebe obodo ugwu Aroea, nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn. Tinyekwara ọkara obodo ugwu Gilead, na obodo niile dị nʼime ya. 13 Ala fọdụrụ na Gilead nakwa Bashan niile na alaeze Ọg ka m nyere otu ọkara ebo Manase. Nke a bụ ala Agob niile dị na Bashan, bụ ndị amaara dịka ala ndị Refaim. 14 Jaịa, onye si nʼebo Manase, were ala niile dị nʼAgob, ọ bụladị ruo nʼoke ala ndị Geshua na ndị Maaka. Ọ kpọrọ ya nʼaha ya, nke mere na ruo taa ihe a na-akpọ Bashan bụ Havọt Jaịa, nke pụtara, obodo Jaịa. 15 Makia ka m nyere Gilead. 16 Ma Ebo Ruben na Gad ka m nyere ala niile dị site na Gilead ruo nʼetiti ndagwurugwu Anọn, na site na ndagwurugwu a ruo nʼiyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Etiti ndagwurugwu Anọn bụkwa oke ala ebo Ruben na Gad. 17 Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ osimiri Jọdan nke dị nʼAraba. Oke ala a sitere na Kineret gbatịa ruo nʼOsimiri Araba (ya bụ Osimiri Nnu), nke dị na mgbada ugwu Pisga. 18 Enyekwara m unu iwu nʼoge ahụ sị, “ONYENWE ANYỊ Chineke unu enyela unu ala a ka unu nwere ya. Ma ndị unu niile, ndị bụ dimkpa, ndị jikeere maka agha, ga-agafe nọrọ ndị Izrel ndị ọzọ nʼihu. 19 Otu ọ dị, ebe ọ bụ na unu nwere ọtụtụ anụ ụlọ, ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu ga-ebi nʼobodo ndị m nyere unu, lekọtaa anụ ụlọ unu anya, 20 tutu ruo mgbe ONYENWE ANYỊ ga-enye ụmụnna unu mmeri dịka o nyere unu. Mgbe ha nwetara ala ONYENWE ANYỊ Chineke anyị na-enye ha nʼofe Jọdan, onye ọbụla nʼime unu nwere ike lọghachi bịa biri nʼala unu.” 21 Nʼoge ahụ, agwara m Joshua okwu sị, “I jirila anya gị hụ ihe ONYENWE ANYỊ Chineke gị mere eze abụọ ndị a. Otu a ka ọ ga-emekwa alaeze niile dị nʼofe Jọdan ebe unu na-aga. 22 Atụla ha egwu, nʼihi ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-alụrụ gị ọgụ.” 23 Nʼoge ahụ, arịrịọ m ONYENWE ANYỊ arịrịọ sị ya, 24 “Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ị malitela igosi mụ bụ ohu gị ịdị ukwuu gị na ike gị. O nweghị chi ọzọ dị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa pụrụ ịrụ ọrụ ebube niile ị rụrụ. 25 Kwere ka m gafee hụ ala ọma ahụ dị nʼofe ọzọ nke Jọdan, ala ugwu ugwu ahụ mara mma, na Lebanọn.” 26 Ma nʼihi unu, ONYENWE ANYỊ wesoro m iwe jụ ige m ntị! ONYENWE ANYỊ gwara m okwu sị m, “O zuola! Agwakwala m ihe ọbụla banyere okwu a. 27 Gaa, rigoruo nʼelu ugwu Pisga, site nʼebe ahụ lepụ anya nʼakụkụ ugwu na ndịda ma nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ọ bụ anya gị ka ị ga-eji hụ ala ahụ, nʼihi na ị gaghị agafe osimiri Jọdan. 28 Nye Joshua ike ka ọ nọchie ọnọdụ gị. Gbaakwa ya ume, nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị a gafee Jọdan iketa ala ahụ niile ị ga-ahụ.” 29 Ya mere, anyị nọdụrụ na ndagwurugwu ahụ dị nso na Bet-Peoa.

In Other Versions

Deuteronomy 3 in the ANGEFD

Deuteronomy 3 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 3 in the AS21

Deuteronomy 3 in the BAGH

Deuteronomy 3 in the BBPNG

Deuteronomy 3 in the BBT1E

Deuteronomy 3 in the BDS

Deuteronomy 3 in the BEV

Deuteronomy 3 in the BHAD

Deuteronomy 3 in the BIB

Deuteronomy 3 in the BLPT

Deuteronomy 3 in the BNT

Deuteronomy 3 in the BNTABOOT

Deuteronomy 3 in the BNTLV

Deuteronomy 3 in the BOATCB

Deuteronomy 3 in the BOATCB2

Deuteronomy 3 in the BOBCV

Deuteronomy 3 in the BOCNT

Deuteronomy 3 in the BOECS

Deuteronomy 3 in the BOGWICC

Deuteronomy 3 in the BOHCB

Deuteronomy 3 in the BOHCV

Deuteronomy 3 in the BOHLNT

Deuteronomy 3 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 3 in the BOILNTAP

Deuteronomy 3 in the BOITCV

Deuteronomy 3 in the BOKCV

Deuteronomy 3 in the BOKCV2

Deuteronomy 3 in the BOKHWOG

Deuteronomy 3 in the BOKSSV

Deuteronomy 3 in the BOLCB

Deuteronomy 3 in the BOLCB2

Deuteronomy 3 in the BOMCV

Deuteronomy 3 in the BONAV

Deuteronomy 3 in the BONCB

Deuteronomy 3 in the BONLT

Deuteronomy 3 in the BONUT2

Deuteronomy 3 in the BOPLNT

Deuteronomy 3 in the BOSCB

Deuteronomy 3 in the BOSNC

Deuteronomy 3 in the BOTLNT

Deuteronomy 3 in the BOVCB

Deuteronomy 3 in the BOYCB

Deuteronomy 3 in the BPBB

Deuteronomy 3 in the BPH

Deuteronomy 3 in the BSB

Deuteronomy 3 in the CCB

Deuteronomy 3 in the CUV

Deuteronomy 3 in the CUVS

Deuteronomy 3 in the DBT

Deuteronomy 3 in the DGDNT

Deuteronomy 3 in the DHNT

Deuteronomy 3 in the DNT

Deuteronomy 3 in the ELBE

Deuteronomy 3 in the EMTV

Deuteronomy 3 in the ESV

Deuteronomy 3 in the FBV

Deuteronomy 3 in the FEB

Deuteronomy 3 in the GGMNT

Deuteronomy 3 in the GNT

Deuteronomy 3 in the HARY

Deuteronomy 3 in the HNT

Deuteronomy 3 in the IRVA

Deuteronomy 3 in the IRVB

Deuteronomy 3 in the IRVG

Deuteronomy 3 in the IRVH

Deuteronomy 3 in the IRVK

Deuteronomy 3 in the IRVM

Deuteronomy 3 in the IRVM2

Deuteronomy 3 in the IRVO

Deuteronomy 3 in the IRVP

Deuteronomy 3 in the IRVT

Deuteronomy 3 in the IRVT2

Deuteronomy 3 in the IRVU

Deuteronomy 3 in the ISVN

Deuteronomy 3 in the JSNT

Deuteronomy 3 in the KAPI

Deuteronomy 3 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 3 in the KBV

Deuteronomy 3 in the KJV

Deuteronomy 3 in the KNFD

Deuteronomy 3 in the LBA

Deuteronomy 3 in the LBLA

Deuteronomy 3 in the LNT

Deuteronomy 3 in the LSV

Deuteronomy 3 in the MAAL

Deuteronomy 3 in the MBV

Deuteronomy 3 in the MBV2

Deuteronomy 3 in the MHNT

Deuteronomy 3 in the MKNFD

Deuteronomy 3 in the MNG

Deuteronomy 3 in the MNT

Deuteronomy 3 in the MNT2

Deuteronomy 3 in the MRS1T

Deuteronomy 3 in the NAA

Deuteronomy 3 in the NASB

Deuteronomy 3 in the NBLA

Deuteronomy 3 in the NBS

Deuteronomy 3 in the NBVTP

Deuteronomy 3 in the NET2

Deuteronomy 3 in the NIV11

Deuteronomy 3 in the NNT

Deuteronomy 3 in the NNT2

Deuteronomy 3 in the NNT3

Deuteronomy 3 in the PDDPT

Deuteronomy 3 in the PFNT

Deuteronomy 3 in the RMNT

Deuteronomy 3 in the SBIAS

Deuteronomy 3 in the SBIBS

Deuteronomy 3 in the SBIBS2

Deuteronomy 3 in the SBICS

Deuteronomy 3 in the SBIDS

Deuteronomy 3 in the SBIGS

Deuteronomy 3 in the SBIHS

Deuteronomy 3 in the SBIIS

Deuteronomy 3 in the SBIIS2

Deuteronomy 3 in the SBIIS3

Deuteronomy 3 in the SBIKS

Deuteronomy 3 in the SBIKS2

Deuteronomy 3 in the SBIMS

Deuteronomy 3 in the SBIOS

Deuteronomy 3 in the SBIPS

Deuteronomy 3 in the SBISS

Deuteronomy 3 in the SBITS

Deuteronomy 3 in the SBITS2

Deuteronomy 3 in the SBITS3

Deuteronomy 3 in the SBITS4

Deuteronomy 3 in the SBIUS

Deuteronomy 3 in the SBIVS

Deuteronomy 3 in the SBT

Deuteronomy 3 in the SBT1E

Deuteronomy 3 in the SCHL

Deuteronomy 3 in the SNT

Deuteronomy 3 in the SUSU

Deuteronomy 3 in the SUSU2

Deuteronomy 3 in the SYNO

Deuteronomy 3 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 3 in the TBT1E

Deuteronomy 3 in the TBT1E2

Deuteronomy 3 in the TFTIP

Deuteronomy 3 in the TFTU

Deuteronomy 3 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 3 in the THAI

Deuteronomy 3 in the TNFD

Deuteronomy 3 in the TNT

Deuteronomy 3 in the TNTIK

Deuteronomy 3 in the TNTIL

Deuteronomy 3 in the TNTIN

Deuteronomy 3 in the TNTIP

Deuteronomy 3 in the TNTIZ

Deuteronomy 3 in the TOMA

Deuteronomy 3 in the TTENT

Deuteronomy 3 in the UBG

Deuteronomy 3 in the UGV

Deuteronomy 3 in the UGV2

Deuteronomy 3 in the UGV3

Deuteronomy 3 in the VBL

Deuteronomy 3 in the VDCC

Deuteronomy 3 in the YALU

Deuteronomy 3 in the YAPE

Deuteronomy 3 in the YBVTP

Deuteronomy 3 in the ZBP