Exodus 22 (BOICB)

1 “Ọ bụrụ na mmadụ ezuru ehi maọbụ atụrụ gbuo ya, maọbụ ree ya, ọ ga-akwụghachi ehi ise nʼọnọdụ ehi ahụ. Nʼọnọdụ otu atụrụ o zuuru, ọ ga-akwụghachi atụrụ anọ. 2 “Ọ bụrụ na e jide onye ohi mgbe ọ na-egbuka ụlọ onye ọzọ, ọ bụrụkwa na e tigbuo ya, mee ka ọ nwụọ, iwu ejideghị onye ahụ gburu ya. 3 Kama ọ bụrụ na e tigburu onye ahụ mgbe chi bọcharala, ọmụma ikpe ga-adịrị onye ahụ tigburu ya.“Ọ bụrụ na e jide onye ohi, a ga-eme ka ọ kwụghachi ihe o zuru nʼohi. Ọ bụrụ na o nweghị ike kwụghachi, a ga-ere ya dịka ohu, jiri ego e retara kwụọ ụgwọ o ji. 4 Ọ bụrụ na a chọta ihe o zuru nʼaka ya, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, ọ ga-akwụghachi ọnụahịa ya okpukpu abụọ. 5 “Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya hapụ anụ ụlọ ya ka ọ gaa taa nri nʼubi maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ nʼubi onye ọzọ, onyenwe anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe niile anụ ụlọ ya mebiri, ma ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ aghaghị ịbụ ihe ọrụ ubi dị mma nke o si nʼubi ya maọbụ nʼubi vaịnị ya wepụta. 6 “Ọ bụrụ na ọkụ na-agba banye nʼogwu, repịa ogbo ọka dị nʼubi mmadụ maọbụ ọka guzoro eguzo, ma ọ bụkwanụ ọhịa niile, onye ahụ tinyere ọkụ ahụ ga-akwụghachi ụgwọ ihe ahụ niile nke ọkụ repịara. 7 “Ọ bụrụ na mmadụ enye enyi ya maọbụ onye agbataobi ya ego, maọbụ ihe ọbụla ka o debere ya, ma onye ohi agaa zuru ya site nʼụlọ ya, a si na e jide onye ohi dị otu a, ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe o zuru okpukpu abụọ. 8 Ọ bụrụ na a chọpụtaghị onye ohi ahụ, onye nwe ụlọ ahụ aghaghị ịbịa nʼihu Chineke, ka a chọpụta maọbụ ya nʼonwe ya setịpụrụ aka were ihe ahụ, bụ akụ nke onye ọzọ kpatara. 9 Ọ bụrụ na onye ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, maọbụ atụrụ ya, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla furu efu, nke mmadụ na-asị, ‘Nke a bụ ya.’ Mmadụ abụọ ndị a ga-aga nʼihu ndị ikpe. Onye ọbụla ndị ikpe a mara ikpe ga-akwụghachi ibe ya ụgwọ okpukpu abụọ. 10 “Ọ bụrụ na anụ ụlọ mmadụ nyere onye agbataobi ya nʼaka idebe anwụọ, maọbụ merụọ ahụ, maọbụ gbafuo, ma anụ ụlọ ahụ ọ bụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ anụ ụlọ ọzọ, ọ bụrụ na ọ dịghị onye hụrụ mgbe ihe ndị a dakwasịrị anụ ụlọ ahụ, 11 mgbe ahụ, onye agbataobi ahụ e nyere anụ ndị a nʼaka idebe ga-aṅụ iyi nʼihu ONYENWE ANYỊ. Iyi ahụ ọ ṅụrụ ga-egosi onyenwe anụ ụlọ ahụ na o zughị ya nʼohi. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụghachi ụgwọ ọbụla. 12 Ma ọ bụrụ na o zuru anụ ụlọ ahụ nʼohi site na nke agbataobi ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ụgwọ niile nye onyenwe ya. 13 Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ. 14 “Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya. 15 Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ. 16 “Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya. 17 Ọ bụrụ na nna nwaagbọghọ ahụ ekwenyeghị ka nwoke ahụ lụọ ya, nwoke ahụ aghaghị ịkwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. 18 “E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ. 19 “Onye ọbụla ya na anụ ọbụla dinakọrọ, e kwesiri ime ka ọ nwụọ. 20 “Onye ọbụla chụrụ aja nye chi ọzọ ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYỊ, a ga-eme ka ọ nwụọ. 21 “Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt. 22 “Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna. 23 Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka. 24 Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna. 25 “Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa. 26 Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara. 27 Nʼihi na uwe ahụ nwere ike bụrụ naanị ihe o nwere, maọbụ uwe ọ ga-eji rahụ ụra. Ọ bụrụ na i zighachighị ya, o tikuo m site nʼịkwa akwa, aga m anụrụ mkpu akwa ya, nʼihi na abụ m onye obi ebere. 28 “Ekwulula aha Chineke, abụkwala onye na-achị ndị gị ọnụ. 29 “Atụfukwala oge ọbụla nʼịkwụghachi onyinye unu kwesiri inye. Maọbụ nke mkpụrụ ala ubi gị, na nke mmanya vaịnị gị, na ụgwọ i kwesiri ịkwụ.“Ị ghaghị inye m nwa gị nwoke e buru ụzọ mụọ. 30 Otu a ka ị ga-emekwa banyere mkpụrụ mbụ nke ehi gị na atụrụ gị. Ị ga-ewebata ya nye m nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ha, mgbe ị hapụsịrị ha nne ha ụbọchị asaa. 31 “Unu ga na-abụrụ m ndị dị nsọ. Nʼihi nke a, wezuganụ onwe unu nʼebe anụ a dọgburu adọgbu dị. Unu erikwala anụ dị otu a, kama tụpụrụnụ ya nkịta.

In Other Versions

Exodus 22 in the ANGEFD

Exodus 22 in the ANTPNG2D

Exodus 22 in the AS21

Exodus 22 in the BAGH

Exodus 22 in the BBPNG

Exodus 22 in the BBT1E

Exodus 22 in the BDS

Exodus 22 in the BEV

Exodus 22 in the BHAD

Exodus 22 in the BIB

Exodus 22 in the BLPT

Exodus 22 in the BNT

Exodus 22 in the BNTABOOT

Exodus 22 in the BNTLV

Exodus 22 in the BOATCB

Exodus 22 in the BOATCB2

Exodus 22 in the BOBCV

Exodus 22 in the BOCNT

Exodus 22 in the BOECS

Exodus 22 in the BOGWICC

Exodus 22 in the BOHCB

Exodus 22 in the BOHCV

Exodus 22 in the BOHLNT

Exodus 22 in the BOHNTLTAL

Exodus 22 in the BOILNTAP

Exodus 22 in the BOITCV

Exodus 22 in the BOKCV

Exodus 22 in the BOKCV2

Exodus 22 in the BOKHWOG

Exodus 22 in the BOKSSV

Exodus 22 in the BOLCB

Exodus 22 in the BOLCB2

Exodus 22 in the BOMCV

Exodus 22 in the BONAV

Exodus 22 in the BONCB

Exodus 22 in the BONLT

Exodus 22 in the BONUT2

Exodus 22 in the BOPLNT

Exodus 22 in the BOSCB

Exodus 22 in the BOSNC

Exodus 22 in the BOTLNT

Exodus 22 in the BOVCB

Exodus 22 in the BOYCB

Exodus 22 in the BPBB

Exodus 22 in the BPH

Exodus 22 in the BSB

Exodus 22 in the CCB

Exodus 22 in the CUV

Exodus 22 in the CUVS

Exodus 22 in the DBT

Exodus 22 in the DGDNT

Exodus 22 in the DHNT

Exodus 22 in the DNT

Exodus 22 in the ELBE

Exodus 22 in the EMTV

Exodus 22 in the ESV

Exodus 22 in the FBV

Exodus 22 in the FEB

Exodus 22 in the GGMNT

Exodus 22 in the GNT

Exodus 22 in the HARY

Exodus 22 in the HNT

Exodus 22 in the IRVA

Exodus 22 in the IRVB

Exodus 22 in the IRVG

Exodus 22 in the IRVH

Exodus 22 in the IRVK

Exodus 22 in the IRVM

Exodus 22 in the IRVM2

Exodus 22 in the IRVO

Exodus 22 in the IRVP

Exodus 22 in the IRVT

Exodus 22 in the IRVT2

Exodus 22 in the IRVU

Exodus 22 in the ISVN

Exodus 22 in the JSNT

Exodus 22 in the KAPI

Exodus 22 in the KBT1ETNIK

Exodus 22 in the KBV

Exodus 22 in the KJV

Exodus 22 in the KNFD

Exodus 22 in the LBA

Exodus 22 in the LBLA

Exodus 22 in the LNT

Exodus 22 in the LSV

Exodus 22 in the MAAL

Exodus 22 in the MBV

Exodus 22 in the MBV2

Exodus 22 in the MHNT

Exodus 22 in the MKNFD

Exodus 22 in the MNG

Exodus 22 in the MNT

Exodus 22 in the MNT2

Exodus 22 in the MRS1T

Exodus 22 in the NAA

Exodus 22 in the NASB

Exodus 22 in the NBLA

Exodus 22 in the NBS

Exodus 22 in the NBVTP

Exodus 22 in the NET2

Exodus 22 in the NIV11

Exodus 22 in the NNT

Exodus 22 in the NNT2

Exodus 22 in the NNT3

Exodus 22 in the PDDPT

Exodus 22 in the PFNT

Exodus 22 in the RMNT

Exodus 22 in the SBIAS

Exodus 22 in the SBIBS

Exodus 22 in the SBIBS2

Exodus 22 in the SBICS

Exodus 22 in the SBIDS

Exodus 22 in the SBIGS

Exodus 22 in the SBIHS

Exodus 22 in the SBIIS

Exodus 22 in the SBIIS2

Exodus 22 in the SBIIS3

Exodus 22 in the SBIKS

Exodus 22 in the SBIKS2

Exodus 22 in the SBIMS

Exodus 22 in the SBIOS

Exodus 22 in the SBIPS

Exodus 22 in the SBISS

Exodus 22 in the SBITS

Exodus 22 in the SBITS2

Exodus 22 in the SBITS3

Exodus 22 in the SBITS4

Exodus 22 in the SBIUS

Exodus 22 in the SBIVS

Exodus 22 in the SBT

Exodus 22 in the SBT1E

Exodus 22 in the SCHL

Exodus 22 in the SNT

Exodus 22 in the SUSU

Exodus 22 in the SUSU2

Exodus 22 in the SYNO

Exodus 22 in the TBIAOTANT

Exodus 22 in the TBT1E

Exodus 22 in the TBT1E2

Exodus 22 in the TFTIP

Exodus 22 in the TFTU

Exodus 22 in the TGNTATF3T

Exodus 22 in the THAI

Exodus 22 in the TNFD

Exodus 22 in the TNT

Exodus 22 in the TNTIK

Exodus 22 in the TNTIL

Exodus 22 in the TNTIN

Exodus 22 in the TNTIP

Exodus 22 in the TNTIZ

Exodus 22 in the TOMA

Exodus 22 in the TTENT

Exodus 22 in the UBG

Exodus 22 in the UGV

Exodus 22 in the UGV2

Exodus 22 in the UGV3

Exodus 22 in the VBL

Exodus 22 in the VDCC

Exodus 22 in the YALU

Exodus 22 in the YAPE

Exodus 22 in the YBVTP

Exodus 22 in the ZBP