Exodus 33 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Duru ndị a i si nʼala Ijipt kpọpụta baa nʼala ahụ m kwere Ebraham, na Aịzik na Jekọb na nkwa, nʼihi na agwara m ha sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ unu ala a, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.’ 2 Aga m ezipu Mmụọ ozi m ka ọ gaa nʼihu unu chụpụrụ unu ndị Kenan, na ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus. 3 Gbago nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ma agaghị m eso unu nʼije unu, nʼihi na unu bụ ndị isiike. Ọ bụrụ na m esoro unu, unu ga-anwa m ọnwụnwa, nke ga-eme ka m laa unu nʼiyi nʼụzọ.” 4 Mgbe ndị mmadụ ahụ nụrụ okwu olu ike ndị a, ha malitere iru ụjụ, ọ dịghịkwa onye ọbụla yinyere ihe ịchọ mma ya nʼahụ ha. 5 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ agwala Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel, ‘Unu bụ ndị isiike. A sị na m nọ nʼetiti unu, otu ntabi anya ezuorola m ịla unu nʼiyi. Ugbu a, yipụnụ ihe ịchọ mma niile unu yi nʼahụ, aga m ekpebi ihe m ga-eme unu.’ ” 6 Ya mere, ndị Izrel yipụrụ ihe ịchọ mma ha niile. Nʼugwu Horeb ka ha nọ mgbe ihe ndị a mere. 7 Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta ONYENWE ANYỊ ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. 8 Mgbe ọbụla Mosis na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị Izrel niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu Mosis abanye nʼụlọ ikwu ahụ. 9 Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe ONYENWE ANYỊ na Mosis na-akparị ụka. 10 Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala. 11 Nʼime ụlọ nzute ahụ, ONYENWE ANYỊ na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ. 12 Mgbe Mosis na ONYENWE ANYỊ nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ. 13 Biko, ọ bụrụ na o si otu a dị, zi m ụzọ gị, nke ga-eme ka m mata gị, gaakwa nʼihu inweta ihuọma site nʼebe ị nọ. Chetakwa na mba a dị ukwu bụ ndị gị.” 14 Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.” 15 Mgbe ahụ Mosis sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị gaghị eso anyị nʼije a, ekwela ka anyị si nʼebe a zọpụ ụkwụ. 16 Ọ bụrụ na i soghị anyị, olee otu a ga-esi mata na mụ onwe m, na ndị gị achọtala ihuọma gị? Olee otu ọ ga-esi pụta ìhè na mụ na ndị gị bụ mba dị iche site na mba ndị ọzọ dị nʼụwa?” 17 Ma ONYENWE ANYỊ zara Mosis sị, “E, aga m eme ihe ị rịọrọ m, nʼihi na ị chọtala ihuọma m. Nʼezie, amara m onye ị bụ, marakwa aha gị.” 18 Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.” 19 Ma ONYENWE ANYỊ zara sị, “Aga m eme ka ị hụ ịdị mma m, aga m akọwakwara gị ihe aha m bụ ONYENWE ANYỊ pụtara. Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko. 20 Ma ị pụghị ịhụ ihu m nʼihi na mmadụ ọbụla enweghị ike ịhụ ihu m ma dịrịkwa ndụ.” 21 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị, “Lee, e nwere ebe dị nso nʼakụkụ m, nʼelu nkume, ebe i nwere ike iguzo. 22 Mgbe ebube m ga-agafe, aga m ezo gị nʼokpuru nkume, werekwa aka m kpuchie gị, tutu ruo mgbe m gafechara. 23 Emesịa, aga m eweli aka m, ka i nwee ike ịhụ azụ m anya, ma ị pụghị ịhụ ihu m.”

In Other Versions

Exodus 33 in the ANGEFD

Exodus 33 in the ANTPNG2D

Exodus 33 in the AS21

Exodus 33 in the BAGH

Exodus 33 in the BBPNG

Exodus 33 in the BBT1E

Exodus 33 in the BDS

Exodus 33 in the BEV

Exodus 33 in the BHAD

Exodus 33 in the BIB

Exodus 33 in the BLPT

Exodus 33 in the BNT

Exodus 33 in the BNTABOOT

Exodus 33 in the BNTLV

Exodus 33 in the BOATCB

Exodus 33 in the BOATCB2

Exodus 33 in the BOBCV

Exodus 33 in the BOCNT

Exodus 33 in the BOECS

Exodus 33 in the BOGWICC

Exodus 33 in the BOHCB

Exodus 33 in the BOHCV

Exodus 33 in the BOHLNT

Exodus 33 in the BOHNTLTAL

Exodus 33 in the BOILNTAP

Exodus 33 in the BOITCV

Exodus 33 in the BOKCV

Exodus 33 in the BOKCV2

Exodus 33 in the BOKHWOG

Exodus 33 in the BOKSSV

Exodus 33 in the BOLCB

Exodus 33 in the BOLCB2

Exodus 33 in the BOMCV

Exodus 33 in the BONAV

Exodus 33 in the BONCB

Exodus 33 in the BONLT

Exodus 33 in the BONUT2

Exodus 33 in the BOPLNT

Exodus 33 in the BOSCB

Exodus 33 in the BOSNC

Exodus 33 in the BOTLNT

Exodus 33 in the BOVCB

Exodus 33 in the BOYCB

Exodus 33 in the BPBB

Exodus 33 in the BPH

Exodus 33 in the BSB

Exodus 33 in the CCB

Exodus 33 in the CUV

Exodus 33 in the CUVS

Exodus 33 in the DBT

Exodus 33 in the DGDNT

Exodus 33 in the DHNT

Exodus 33 in the DNT

Exodus 33 in the ELBE

Exodus 33 in the EMTV

Exodus 33 in the ESV

Exodus 33 in the FBV

Exodus 33 in the FEB

Exodus 33 in the GGMNT

Exodus 33 in the GNT

Exodus 33 in the HARY

Exodus 33 in the HNT

Exodus 33 in the IRVA

Exodus 33 in the IRVB

Exodus 33 in the IRVG

Exodus 33 in the IRVH

Exodus 33 in the IRVK

Exodus 33 in the IRVM

Exodus 33 in the IRVM2

Exodus 33 in the IRVO

Exodus 33 in the IRVP

Exodus 33 in the IRVT

Exodus 33 in the IRVT2

Exodus 33 in the IRVU

Exodus 33 in the ISVN

Exodus 33 in the JSNT

Exodus 33 in the KAPI

Exodus 33 in the KBT1ETNIK

Exodus 33 in the KBV

Exodus 33 in the KJV

Exodus 33 in the KNFD

Exodus 33 in the LBA

Exodus 33 in the LBLA

Exodus 33 in the LNT

Exodus 33 in the LSV

Exodus 33 in the MAAL

Exodus 33 in the MBV

Exodus 33 in the MBV2

Exodus 33 in the MHNT

Exodus 33 in the MKNFD

Exodus 33 in the MNG

Exodus 33 in the MNT

Exodus 33 in the MNT2

Exodus 33 in the MRS1T

Exodus 33 in the NAA

Exodus 33 in the NASB

Exodus 33 in the NBLA

Exodus 33 in the NBS

Exodus 33 in the NBVTP

Exodus 33 in the NET2

Exodus 33 in the NIV11

Exodus 33 in the NNT

Exodus 33 in the NNT2

Exodus 33 in the NNT3

Exodus 33 in the PDDPT

Exodus 33 in the PFNT

Exodus 33 in the RMNT

Exodus 33 in the SBIAS

Exodus 33 in the SBIBS

Exodus 33 in the SBIBS2

Exodus 33 in the SBICS

Exodus 33 in the SBIDS

Exodus 33 in the SBIGS

Exodus 33 in the SBIHS

Exodus 33 in the SBIIS

Exodus 33 in the SBIIS2

Exodus 33 in the SBIIS3

Exodus 33 in the SBIKS

Exodus 33 in the SBIKS2

Exodus 33 in the SBIMS

Exodus 33 in the SBIOS

Exodus 33 in the SBIPS

Exodus 33 in the SBISS

Exodus 33 in the SBITS

Exodus 33 in the SBITS2

Exodus 33 in the SBITS3

Exodus 33 in the SBITS4

Exodus 33 in the SBIUS

Exodus 33 in the SBIVS

Exodus 33 in the SBT

Exodus 33 in the SBT1E

Exodus 33 in the SCHL

Exodus 33 in the SNT

Exodus 33 in the SUSU

Exodus 33 in the SUSU2

Exodus 33 in the SYNO

Exodus 33 in the TBIAOTANT

Exodus 33 in the TBT1E

Exodus 33 in the TBT1E2

Exodus 33 in the TFTIP

Exodus 33 in the TFTU

Exodus 33 in the TGNTATF3T

Exodus 33 in the THAI

Exodus 33 in the TNFD

Exodus 33 in the TNT

Exodus 33 in the TNTIK

Exodus 33 in the TNTIL

Exodus 33 in the TNTIN

Exodus 33 in the TNTIP

Exodus 33 in the TNTIZ

Exodus 33 in the TOMA

Exodus 33 in the TTENT

Exodus 33 in the UBG

Exodus 33 in the UGV

Exodus 33 in the UGV2

Exodus 33 in the UGV3

Exodus 33 in the VBL

Exodus 33 in the VDCC

Exodus 33 in the YALU

Exodus 33 in the YAPE

Exodus 33 in the YBVTP

Exodus 33 in the ZBP