Ezekiel 41 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, nwoke ahụ kpọbatara m nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ọnụ ụzọ ya. Akụkụ ya ọbụla dị mita atọ na ụma abụọ, nke a bụ obosara ụlọ ikwu ahụ. 2 Obosara ọnụ ụzọ mbata ya dị mita ise na ụma atọ. Akụkụ aja abụọ nke ọnụ ụzọ ahụ dịkwa mita abụọ na ụma asaa. Ọ tụkwara ogologo ụlọ ezumezu ahụ; ya dịrị iri mita abụọ na otu nʼogologo, obosara ya dị mita iri na otu. 3 Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara. 4 Ọ tụrụ ogologo ime ebe nsọ ahụ, ya dị mita iri na ọkara, obosara ya dịkwa mita iri na ọkara, nʼogologo ụlọ ezumezu ahụ. Ma ọ sịrị m, “Ebe a bụ Ebe Kachasị Nsọ.” 5 Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi. 6 Ọnụụlọ nta ndị a dị nʼokpukpu atọ, nke ọbụla nʼelu ibe ya, okpukpu ọbụla nwere iri ọnụụlọ atọ. E nwere mgbidi gbara aja ụlọnsọ ahụ gburugburu nʼakụkụ niile, ka ha bụrụ ihe nkwado nye ọnụụlọ nta ndị a, ka ihe nkwado ndị a ghara ịbụ ihe a rụnyere nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ. 7 E wuru ọnụụlọ nta ndị a ka obosara ọnụụlọ ndị ahụ niile dị nʼelu ibe ha dị ukwuu karịa obosara ndị nke dị nʼokpuru ha. Nʼụzọ dị otu a, obosara ọnụụlọ niile dị nʼokpukpu nke abụọ dị ukwuu karịa nke dị nʼala; nke atọ dịkwa ukwuu karịa nke abụọ. E wukwara ebe e si arịgo site nʼokpukpu nke dịkarịsịrị ala rigoruo nʼọnụụlọ ndị kachasị elu, site nʼokpukpu nke dị nʼetiti. 8 Ahụrụ m na ụlọnsọ ukwu ahụ nwere ebe e wuliri elu nʼakụkụ ya niile. Ọ bụkwa ebe a dị elu ka e ji mee ntọala ọnụụlọ nta ndị ahụ niile. Ịdị ogologo nke ebe ahụ e wuliri elu bụ mita atọ na ụma abụọ. 9 Ịdị arọ nke mgbidi ọnụụlọ nta ndị a nʼakụkụ ezi bụ mita abụọ na ụma atọ. Ala tọgbọrọ nʼefu nʼetiti ọnụụlọ nta ụlọnsọ ukwu ahụ, 10 na ọnụụlọ ndị nchụaja dị mita iri na ọkara nʼobosara, gbaa gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ. 11 E nwere ọnụ ụzọ ndị a na-esi abanye nʼọnụụlọ nta ndị ahụ, site nʼala ahụ na-enweghị ihe arụrụ na ya, otu ọnụ ụzọ nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Obosara ala nke fọdụrụ dị mita abụọ na ụma atọ nʼakụkụ niile gbaa gburugburu. 12 Ma ụlọ nke na-eche ihu nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, dị iri mita atọ na asaa nʼobosara, ịdị igbidi nke aja ụlọ ahụ dị mita abụọ na ụma atọ, gbaa gburugburu, ogologo ya dịkwa iri mita anọ na asatọ. 13 Mgbe ahụ, ọ tụrụ ụlọnsọ ukwu ahụ, ya dịrị iri mita ise na atọ, ogige ụlọnsọ, na ụlọ ahụ nakwa mgbidi ya, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo. 14 Obosara nke ogige ụlọnsọ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, tinyere ebe ihu ụlọnsọ ukwu ahụ, dị iri mita ise na atọ. 15 Ọ tụrụ ịdị ogologo nke ụlọ ahụ chere ihu nʼogige dị nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, tinyere ebe njegharị ya nke dị nʼakụkụ abụọ ya. Ọ dị iri mita ise na atọ.Ụlọ ezumezu ahụ, nʼime ebe nsọ ahụ, na mpụta nke ọnụ ụlọ, bụ nke chere ihu nʼogige ahụ, 16 ya na ọnụ ụzọ ndị ahụ, na oghereikuku niile dị warawara, na ebe njegharị gbara ha atọ gburugburu, ihe niile, elu ma ala, tinyere ọnụ ụzọ bụ nke eji osisi mmachite. Ala ya, na mgbidi ya ruo na oghereikuku, ma oghereikuku niile bụkwa ihe ekpuchiri ekpuchi. 17 Nʼelu oghere dị nʼebe ọnụ ụzọ ezi, nke gara nʼime ebe nsọ, nakwa nʼahụ aja niile, na nkebi na nkebi, gbaa gburugburu nʼime na nʼezi ebe nsọ ahụ, 18 ka a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ. Cherubim na-esota osisi nkwụ. Osisi nkwụ ọbụla na-esotakwa cherubim. Cherub ọbụla nwere ihu abụọ: 19 otu akụkụ cherub nke bụ ihu mmadụ chere ihu nʼotu nkwụ. Ihu ya nke ọzọ, nke bụ ihu ọdụm, chere ihu na nkwụ nke dị akụkụ nke ọzọ. A tụrụ ha gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ. 20 Site nʼala ụlọ ruo nʼelu ọnụ ụzọ ya, a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ nʼahụ aja ụlọ ezumezu ahụ. 21 Ọnụ ụlọ ezumezu ahụ nwere mbudo ibo nke akụkụ anọ ya ha otu nʼọtụtụ. Nke dị nʼihu Ebe ahụ Kachasị Nsọ, yiri ndị ọzọ. 22 Ebe ịchụ aja ya bụ nke eji osisi wuo. Akụkụ niile nke ebe ịchụ aja a ha nʼotu. Ọ dị otu mita na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita itoolu nʼakụkụ ya ọbụla. Osisi ka e ji wuo nkuku anọ ya, akụkụ ya niile, na ntọala ya. Mgbe ahụ, nwoke ahụ gwara m, “Nke a bụ tebul na-adị nʼihu ONYENWE ANYỊ.” 23 Ma ụlọ ezumezu, ma Ebe ahụ Kachasị Nsọ, nwere ọnụ ụzọ abụọ, nʼotu nʼotu. 24 Ọnụ ụzọ ọbụla nwere ibo abụọ, ibo abụọ nke a na-akwagharị gburugburu. 25 A tụnyere onyinyo cherubim na osisi nkwụ nʼelu ibo na-edubanye nʼụlọ ezumezu ahụ, dịka ndị ahụ a tụrụ nʼahụ mgbidi niile. E jikwa osisi rụchie elu ihu mpụta nke ọnụ ụlọ ahụ. 26 Windo dị warawara dị nʼaja mpụta ọnụ ụlọ ahụ, nke e sekwasịrị oyiyi osisi nkwụ; ọnụụlọ nta niile nke ụlọnsọ ukwu ahụ nwekwara ihe a rụnyere nʼelu ụzọ ya, nke a machiri amachi.

In Other Versions

Ezekiel 41 in the ANGEFD

Ezekiel 41 in the ANTPNG2D

Ezekiel 41 in the AS21

Ezekiel 41 in the BAGH

Ezekiel 41 in the BBPNG

Ezekiel 41 in the BBT1E

Ezekiel 41 in the BDS

Ezekiel 41 in the BEV

Ezekiel 41 in the BHAD

Ezekiel 41 in the BIB

Ezekiel 41 in the BLPT

Ezekiel 41 in the BNT

Ezekiel 41 in the BNTABOOT

Ezekiel 41 in the BNTLV

Ezekiel 41 in the BOATCB

Ezekiel 41 in the BOATCB2

Ezekiel 41 in the BOBCV

Ezekiel 41 in the BOCNT

Ezekiel 41 in the BOECS

Ezekiel 41 in the BOGWICC

Ezekiel 41 in the BOHCB

Ezekiel 41 in the BOHCV

Ezekiel 41 in the BOHLNT

Ezekiel 41 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 41 in the BOILNTAP

Ezekiel 41 in the BOITCV

Ezekiel 41 in the BOKCV

Ezekiel 41 in the BOKCV2

Ezekiel 41 in the BOKHWOG

Ezekiel 41 in the BOKSSV

Ezekiel 41 in the BOLCB

Ezekiel 41 in the BOLCB2

Ezekiel 41 in the BOMCV

Ezekiel 41 in the BONAV

Ezekiel 41 in the BONCB

Ezekiel 41 in the BONLT

Ezekiel 41 in the BONUT2

Ezekiel 41 in the BOPLNT

Ezekiel 41 in the BOSCB

Ezekiel 41 in the BOSNC

Ezekiel 41 in the BOTLNT

Ezekiel 41 in the BOVCB

Ezekiel 41 in the BOYCB

Ezekiel 41 in the BPBB

Ezekiel 41 in the BPH

Ezekiel 41 in the BSB

Ezekiel 41 in the CCB

Ezekiel 41 in the CUV

Ezekiel 41 in the CUVS

Ezekiel 41 in the DBT

Ezekiel 41 in the DGDNT

Ezekiel 41 in the DHNT

Ezekiel 41 in the DNT

Ezekiel 41 in the ELBE

Ezekiel 41 in the EMTV

Ezekiel 41 in the ESV

Ezekiel 41 in the FBV

Ezekiel 41 in the FEB

Ezekiel 41 in the GGMNT

Ezekiel 41 in the GNT

Ezekiel 41 in the HARY

Ezekiel 41 in the HNT

Ezekiel 41 in the IRVA

Ezekiel 41 in the IRVB

Ezekiel 41 in the IRVG

Ezekiel 41 in the IRVH

Ezekiel 41 in the IRVK

Ezekiel 41 in the IRVM

Ezekiel 41 in the IRVM2

Ezekiel 41 in the IRVO

Ezekiel 41 in the IRVP

Ezekiel 41 in the IRVT

Ezekiel 41 in the IRVT2

Ezekiel 41 in the IRVU

Ezekiel 41 in the ISVN

Ezekiel 41 in the JSNT

Ezekiel 41 in the KAPI

Ezekiel 41 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 41 in the KBV

Ezekiel 41 in the KJV

Ezekiel 41 in the KNFD

Ezekiel 41 in the LBA

Ezekiel 41 in the LBLA

Ezekiel 41 in the LNT

Ezekiel 41 in the LSV

Ezekiel 41 in the MAAL

Ezekiel 41 in the MBV

Ezekiel 41 in the MBV2

Ezekiel 41 in the MHNT

Ezekiel 41 in the MKNFD

Ezekiel 41 in the MNG

Ezekiel 41 in the MNT

Ezekiel 41 in the MNT2

Ezekiel 41 in the MRS1T

Ezekiel 41 in the NAA

Ezekiel 41 in the NASB

Ezekiel 41 in the NBLA

Ezekiel 41 in the NBS

Ezekiel 41 in the NBVTP

Ezekiel 41 in the NET2

Ezekiel 41 in the NIV11

Ezekiel 41 in the NNT

Ezekiel 41 in the NNT2

Ezekiel 41 in the NNT3

Ezekiel 41 in the PDDPT

Ezekiel 41 in the PFNT

Ezekiel 41 in the RMNT

Ezekiel 41 in the SBIAS

Ezekiel 41 in the SBIBS

Ezekiel 41 in the SBIBS2

Ezekiel 41 in the SBICS

Ezekiel 41 in the SBIDS

Ezekiel 41 in the SBIGS

Ezekiel 41 in the SBIHS

Ezekiel 41 in the SBIIS

Ezekiel 41 in the SBIIS2

Ezekiel 41 in the SBIIS3

Ezekiel 41 in the SBIKS

Ezekiel 41 in the SBIKS2

Ezekiel 41 in the SBIMS

Ezekiel 41 in the SBIOS

Ezekiel 41 in the SBIPS

Ezekiel 41 in the SBISS

Ezekiel 41 in the SBITS

Ezekiel 41 in the SBITS2

Ezekiel 41 in the SBITS3

Ezekiel 41 in the SBITS4

Ezekiel 41 in the SBIUS

Ezekiel 41 in the SBIVS

Ezekiel 41 in the SBT

Ezekiel 41 in the SBT1E

Ezekiel 41 in the SCHL

Ezekiel 41 in the SNT

Ezekiel 41 in the SUSU

Ezekiel 41 in the SUSU2

Ezekiel 41 in the SYNO

Ezekiel 41 in the TBIAOTANT

Ezekiel 41 in the TBT1E

Ezekiel 41 in the TBT1E2

Ezekiel 41 in the TFTIP

Ezekiel 41 in the TFTU

Ezekiel 41 in the TGNTATF3T

Ezekiel 41 in the THAI

Ezekiel 41 in the TNFD

Ezekiel 41 in the TNT

Ezekiel 41 in the TNTIK

Ezekiel 41 in the TNTIL

Ezekiel 41 in the TNTIN

Ezekiel 41 in the TNTIP

Ezekiel 41 in the TNTIZ

Ezekiel 41 in the TOMA

Ezekiel 41 in the TTENT

Ezekiel 41 in the UBG

Ezekiel 41 in the UGV

Ezekiel 41 in the UGV2

Ezekiel 41 in the UGV3

Ezekiel 41 in the VBL

Ezekiel 41 in the VDCC

Ezekiel 41 in the YALU

Ezekiel 41 in the YAPE

Ezekiel 41 in the YBVTP

Ezekiel 41 in the ZBP