Ezekiel 42 (BOICB)

1 Nwoke ahụ duuru m gaa nʼakụkụ ugwu, banye nʼime ogige ahụ dị nʼezi, kpọbata m nʼime ọnụụlọ ndị ahụ dị na ncherita ihu nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. 2 Ụlọ ahụ nke ọnụ ụzọ ya chere ihu nʼebe ugwu dị iri mita ise na atọ nʼogologo, ebe obosara ya dị iri mita abụọ na asaa. 3 Ma nʼakụkụ nke dị iri mita na otu, site nʼime ogige nakwa nʼakụkụ nke dị na ncherita ihu pevumentị nke ogige dị nʼezi, ebe njegharị chere ebe njegharị ọzọ ihu, nʼokpukpu atọ ahụ. 4 Nʼihu ọnụụlọ ndị a, e nwere ka ụzọ njegharị nke dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo. Ọnụ ụzọ ha niile chere ihu nʼugwu. 5 Okpukpu ụlọ nke dị nʼelu asaghị mbara dịka nke dị nʼala, nʼihi na ebe njegharị ndị ahụ weere ọtụtụ oghere karịa ka ọ dị nʼọnụụlọ ndị dị okpukpu nke dị nʼala na nke etiti ụlọ ahụ. 6 Ebe a na-ejighị ogidi wuo ụlọ a, dịka e si wuo ndị dị nʼogige, nke a mere ka ụlọ ndị dị nʼelu na-akpa nkpa karịa ndị nke dị nʼala, na ndị dị nʼetiti. 7 E nwere mgbidi aja nke dị nʼezi nʼakụkụ ọnụụlọ niile, nʼụzọ ogige nke dị nʼezi. Ọ mapụtara nʼihu ọnụụlọ ndị ahụ, ogologo ihe dị iri mita abụọ na asaa. 8 Nʼọtụtụ ogologo ọnụụlọ ndị a, ndị dị nso nʼogige mpụta, ruru mita iri abụọ na itoolu, ebe ogologo ndị nke dịkarịsịrị nso ebe nsọ ahụ, ruru mita iri ise na asatọ. 9 Nʼokpuru ọnụụlọ ndị a, e nwere ụzọ mbata nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka mmadụ na-abata ha site nʼogige dị na mpụta. 10 Nʼakụkụ ndịda, nʼogologo aja ụlọ dị nʼogige mpụta, nke dị nʼakụkụ ogige ụlọnsọ ukwu, nke chere aja ụlọ mpụta ihu, ọtụtụ ọnụụlọ dị ya. 11 Ụzọ njegharị dị nʼetiti akụkụ abụọ ụlọ ahụ, ha dịkwa ka ọnụụlọ ndị ahụ nke dị nʼụzọ ugwu. Ogologo ha na obosara ha bụ otu; ha niile yiri onwe ha. Ọnụ ụzọ ya dịkwa ka ọnụ ụzọ dị nʼugwu. 12 Otu a ka ọnụ ụzọ e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị a dị na ndịda si dị. E nwere ọnụ ụzọ na mpụta, nke dị na mgbidi ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ. Ebe a ka e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị ahụ. 13 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ime ọnụụlọ niile dị nʼugwu, na ime ọnụụlọ ndị dị na ndịda, bụ ndị a chere ogige ụlọnsọ ahụ ihu, bụ ime ụlọ dị nsọ, nke ndị nchụaja. Ebe ndị nchụaja ndị na-abịa nso ONYENWE ANYỊ ịchụ aja ga-anọ rie nri niile nke kachasị nsọ, nʼebe ahụ ka ha ga-edebekwa aja ịnata ihuọma, aja mmehie na aja ikpe ọmụma, nʼihi na ụlọ ndị a dị nsọ. 14 Mgbe ndị nchụaja bara nʼime ebe nsọ ahụ nke e kewapụrụ iche, ha aghaghị esikwa nʼebe ahụ pụta nʼogige mpụta ezi, tupu ruo mgbe ha yisara uwe ha yii jee ozi, nʼihi na uwe ndị a dị nsọ. Ha ga-eyiri uwe ọzọ, tupu ha abanye nʼakụkụ ụlọ ndị ahụ dịịrị ndị ọzọ.” 15 Mgbe ọ tụchara ihe ndị dị nʼime ebe ụlọnsọ ahụ, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼọwụwa anyanwụ pụta, tụkwaa nʼakụkụ niile gburugburu. 16 O ji ihe ọtụtụ dị ogologo tụọ akụkụ ọwụwa anyanwụ, ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise. 17 O ji mkpirisi osisi ahụ e ji atụ ihe tụọ akụkụ nke ugwu ma chọpụta na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise. 18 Ọ tụkwara akụkụ nke ndịda, chọpụtakwa na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise. 19 Mgbe ahụ, ọ tụgharịrị jirikwa ihe ọtụtụ ahụ tụọkwa akụkụ nke ọdịda anyanwụ. Ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise. 20 Ya mere, ọ tụrụ akụkụ anọ niile nke ebe ahụ. Mgbidi gbara ya gburugburu. Ọtụtụ ha dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, nʼogologo, obosara ya dịkwa ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, iji kewapụta ebe dị nsọ site nʼebe ndị ọzọ.

In Other Versions

Ezekiel 42 in the ANGEFD

Ezekiel 42 in the ANTPNG2D

Ezekiel 42 in the AS21

Ezekiel 42 in the BAGH

Ezekiel 42 in the BBPNG

Ezekiel 42 in the BBT1E

Ezekiel 42 in the BDS

Ezekiel 42 in the BEV

Ezekiel 42 in the BHAD

Ezekiel 42 in the BIB

Ezekiel 42 in the BLPT

Ezekiel 42 in the BNT

Ezekiel 42 in the BNTABOOT

Ezekiel 42 in the BNTLV

Ezekiel 42 in the BOATCB

Ezekiel 42 in the BOATCB2

Ezekiel 42 in the BOBCV

Ezekiel 42 in the BOCNT

Ezekiel 42 in the BOECS

Ezekiel 42 in the BOGWICC

Ezekiel 42 in the BOHCB

Ezekiel 42 in the BOHCV

Ezekiel 42 in the BOHLNT

Ezekiel 42 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 42 in the BOILNTAP

Ezekiel 42 in the BOITCV

Ezekiel 42 in the BOKCV

Ezekiel 42 in the BOKCV2

Ezekiel 42 in the BOKHWOG

Ezekiel 42 in the BOKSSV

Ezekiel 42 in the BOLCB

Ezekiel 42 in the BOLCB2

Ezekiel 42 in the BOMCV

Ezekiel 42 in the BONAV

Ezekiel 42 in the BONCB

Ezekiel 42 in the BONLT

Ezekiel 42 in the BONUT2

Ezekiel 42 in the BOPLNT

Ezekiel 42 in the BOSCB

Ezekiel 42 in the BOSNC

Ezekiel 42 in the BOTLNT

Ezekiel 42 in the BOVCB

Ezekiel 42 in the BOYCB

Ezekiel 42 in the BPBB

Ezekiel 42 in the BPH

Ezekiel 42 in the BSB

Ezekiel 42 in the CCB

Ezekiel 42 in the CUV

Ezekiel 42 in the CUVS

Ezekiel 42 in the DBT

Ezekiel 42 in the DGDNT

Ezekiel 42 in the DHNT

Ezekiel 42 in the DNT

Ezekiel 42 in the ELBE

Ezekiel 42 in the EMTV

Ezekiel 42 in the ESV

Ezekiel 42 in the FBV

Ezekiel 42 in the FEB

Ezekiel 42 in the GGMNT

Ezekiel 42 in the GNT

Ezekiel 42 in the HARY

Ezekiel 42 in the HNT

Ezekiel 42 in the IRVA

Ezekiel 42 in the IRVB

Ezekiel 42 in the IRVG

Ezekiel 42 in the IRVH

Ezekiel 42 in the IRVK

Ezekiel 42 in the IRVM

Ezekiel 42 in the IRVM2

Ezekiel 42 in the IRVO

Ezekiel 42 in the IRVP

Ezekiel 42 in the IRVT

Ezekiel 42 in the IRVT2

Ezekiel 42 in the IRVU

Ezekiel 42 in the ISVN

Ezekiel 42 in the JSNT

Ezekiel 42 in the KAPI

Ezekiel 42 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 42 in the KBV

Ezekiel 42 in the KJV

Ezekiel 42 in the KNFD

Ezekiel 42 in the LBA

Ezekiel 42 in the LBLA

Ezekiel 42 in the LNT

Ezekiel 42 in the LSV

Ezekiel 42 in the MAAL

Ezekiel 42 in the MBV

Ezekiel 42 in the MBV2

Ezekiel 42 in the MHNT

Ezekiel 42 in the MKNFD

Ezekiel 42 in the MNG

Ezekiel 42 in the MNT

Ezekiel 42 in the MNT2

Ezekiel 42 in the MRS1T

Ezekiel 42 in the NAA

Ezekiel 42 in the NASB

Ezekiel 42 in the NBLA

Ezekiel 42 in the NBS

Ezekiel 42 in the NBVTP

Ezekiel 42 in the NET2

Ezekiel 42 in the NIV11

Ezekiel 42 in the NNT

Ezekiel 42 in the NNT2

Ezekiel 42 in the NNT3

Ezekiel 42 in the PDDPT

Ezekiel 42 in the PFNT

Ezekiel 42 in the RMNT

Ezekiel 42 in the SBIAS

Ezekiel 42 in the SBIBS

Ezekiel 42 in the SBIBS2

Ezekiel 42 in the SBICS

Ezekiel 42 in the SBIDS

Ezekiel 42 in the SBIGS

Ezekiel 42 in the SBIHS

Ezekiel 42 in the SBIIS

Ezekiel 42 in the SBIIS2

Ezekiel 42 in the SBIIS3

Ezekiel 42 in the SBIKS

Ezekiel 42 in the SBIKS2

Ezekiel 42 in the SBIMS

Ezekiel 42 in the SBIOS

Ezekiel 42 in the SBIPS

Ezekiel 42 in the SBISS

Ezekiel 42 in the SBITS

Ezekiel 42 in the SBITS2

Ezekiel 42 in the SBITS3

Ezekiel 42 in the SBITS4

Ezekiel 42 in the SBIUS

Ezekiel 42 in the SBIVS

Ezekiel 42 in the SBT

Ezekiel 42 in the SBT1E

Ezekiel 42 in the SCHL

Ezekiel 42 in the SNT

Ezekiel 42 in the SUSU

Ezekiel 42 in the SUSU2

Ezekiel 42 in the SYNO

Ezekiel 42 in the TBIAOTANT

Ezekiel 42 in the TBT1E

Ezekiel 42 in the TBT1E2

Ezekiel 42 in the TFTIP

Ezekiel 42 in the TFTU

Ezekiel 42 in the TGNTATF3T

Ezekiel 42 in the THAI

Ezekiel 42 in the TNFD

Ezekiel 42 in the TNT

Ezekiel 42 in the TNTIK

Ezekiel 42 in the TNTIL

Ezekiel 42 in the TNTIN

Ezekiel 42 in the TNTIP

Ezekiel 42 in the TNTIZ

Ezekiel 42 in the TOMA

Ezekiel 42 in the TTENT

Ezekiel 42 in the UBG

Ezekiel 42 in the UGV

Ezekiel 42 in the UGV2

Ezekiel 42 in the UGV3

Ezekiel 42 in the VBL

Ezekiel 42 in the VDCC

Ezekiel 42 in the YALU

Ezekiel 42 in the YAPE

Ezekiel 42 in the YBVTP

Ezekiel 42 in the ZBP