Ezekiel 47 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, nwoke ahụ mere ka m lọghachikwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ahụrụ m iyi nke na-asọ na-aga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ (nʼihi na ihu ụlọnsọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ). Mmiri ahụ si nʼokpuru ụlọnsọ ukwu ahụ nʼakụkụ aka nri nke ebe ịchụ aja, nʼakụkụ ndịda ya na-asọpụta, 2 O mere ka m si nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu pụta, ma gaa nʼọnụ ụzọ nke ọwụwa anyanwụ, ebe m hụrụ mmiri ahụ ka o si na ndịda na-asọpụta. 3 Mgbe anyị na-aga, o ji ihe ọtụtụ dị ya nʼaka tụpụta ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ. O duuru m na-agafe mmiri ahụ. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela na nkwonkwo ụkwụ. 4 O jikwa ihe ọtụtụ ya tụpụtakwa ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, durukwa m na-aga. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela m nʼikpere. Mgbe ọ tụpụtara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, o duuru m gafee mmiri ruru m nʼukwu. 5 Ọ tụpụtakwara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, mmiri ahụ ghọrọ osimiri nke m na-apụghị ịgafe, nʼihi na mmiri ahụ toro eto bụrụ mmiri ogwugwu, osimiri nke mmadụ na-apụghị iji ije ụkwụ gafee. 6 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?”O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri. 7 Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. 8 Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba, tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ 9 Ọtụtụ ihe e kere eke dị ndụ ga-ebi nʼebe ọbụla mmiri a na-asọ aga. Azụ dị ukwuu ga-ejupụta nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri a na-asọbanye nʼebe ahụ, na-eme ka mmiri osimiri ghọọ mmiri dị mma ịṅụ aṅụ. Ya mere, ihe niile dị nʼebe ọbụla mmiri a sọjere ga-adị ndụ. 10 Ndị ọkụ azụ ga-eguzo nʼọnụ mmiri, site nʼEn-Gedi ruo nʼEn-Eglaim a gaghị enweta ebe a na-agbasa ụgbụ e ji egbu azụ. Azụ dị iche iche ga-adịkwa, dịka azụ osimiri Mediterenịa. 11 Ma ebe apịtị ya niile, nʼebe niile mmiri na-adọ, agaghị adị ọhụrụ, ọ bụ nnu ga-aga ka a ga-ahapụrụ ebe ndị ahụ. 12 Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.” 13 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, “Nke a ga-abụ oke ala nke unu ga-eke nʼetiti ebo iri na abụọ nke Izrel dịka ihe nketa ha, Josef ga-enweta oke ala abụọ. 14 Ebo ọbụla ga-eketa dịka ibe ya ketara, nʼihi na-eweliri m aka ṅụọ iyi na m ga-enye ndị nna nna unu ala ahụ, na ala a ga-aghọkwa ihe nketa unu. 15 “Nke a ga-abụkwa oke ala nke ala unu ahụ. “Nʼakụkụ ugwu, ọ ga-esite nʼosimiri Mediterenịa nʼakụkụ ụzọ Hetlon, gafee Lebo gawa Zedad, 16 site ya ruo Berota na Sibraim (nke dị nʼoke ala dị nʼagbata Damaskọs na Hamat), rukwaa na Haza Hatikon, nke dị nʼoke ala Hauran. 17 Oke ala ahụ ga-esite nʼoke osimiri gbasoro oke ala nke ugwu Damaskọs ruo Haza Enan. Oke ala ndị Hamat ga-adịkwa nʼakụkụ ugwu. Nke a ga-abụ oke ala nke akụkụ ugwu unu. 18 Oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-esite nʼagbata Hauran na Damaskọs soro akụkụ osimiri Jọdan, nʼagbata ndị Gilead na ala ndị Izrel ruo nʼosimiri dị nʼọwụwa anyanwụ, ruokwa Tama. Nke a ga-abụkwa oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. 19 Oke ala na ndịda, ọ ga-esite na Tama ruo ọbụladị mmiri Meriba Kadesh, soro ụzọ ọdọ mmiri iyi Ijipt ruo osimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala ahụ na ndịda. 20 Nʼọdịda anyanwụ, osimiri Mediterenịa ga-abụ oke ala, ruo na ncherita ihu ụzọ e si abata Hamat. Nke a bụ oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 21 “Ala niile dị nʼime oke ala ndị a, ka unu ga-eke nʼetiti onwe unu dịka ebo Izrel si dị. 22 Keenụ ha ka ha bụrụ ihe nketa nye onwe unu, ma nyekwa ndị ọbịa bi nʼetiti unu, bụ ndị ọbịa niile mụtara ụmụ. Unu ga-agụ ha dịka ndị amụrụ nʼala Izrel. Ha ga-esokwa unu keta oke nʼihe nketa a na-ekenye ndị ebo niile nke Izrel. 23 A ga-ekenye ndị ọbịa ihe nketa nʼebo ọbụla ha bi nʼetiti ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.

In Other Versions

Ezekiel 47 in the ANGEFD

Ezekiel 47 in the ANTPNG2D

Ezekiel 47 in the AS21

Ezekiel 47 in the BAGH

Ezekiel 47 in the BBPNG

Ezekiel 47 in the BBT1E

Ezekiel 47 in the BDS

Ezekiel 47 in the BEV

Ezekiel 47 in the BHAD

Ezekiel 47 in the BIB

Ezekiel 47 in the BLPT

Ezekiel 47 in the BNT

Ezekiel 47 in the BNTABOOT

Ezekiel 47 in the BNTLV

Ezekiel 47 in the BOATCB

Ezekiel 47 in the BOATCB2

Ezekiel 47 in the BOBCV

Ezekiel 47 in the BOCNT

Ezekiel 47 in the BOECS

Ezekiel 47 in the BOGWICC

Ezekiel 47 in the BOHCB

Ezekiel 47 in the BOHCV

Ezekiel 47 in the BOHLNT

Ezekiel 47 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 47 in the BOILNTAP

Ezekiel 47 in the BOITCV

Ezekiel 47 in the BOKCV

Ezekiel 47 in the BOKCV2

Ezekiel 47 in the BOKHWOG

Ezekiel 47 in the BOKSSV

Ezekiel 47 in the BOLCB

Ezekiel 47 in the BOLCB2

Ezekiel 47 in the BOMCV

Ezekiel 47 in the BONAV

Ezekiel 47 in the BONCB

Ezekiel 47 in the BONLT

Ezekiel 47 in the BONUT2

Ezekiel 47 in the BOPLNT

Ezekiel 47 in the BOSCB

Ezekiel 47 in the BOSNC

Ezekiel 47 in the BOTLNT

Ezekiel 47 in the BOVCB

Ezekiel 47 in the BOYCB

Ezekiel 47 in the BPBB

Ezekiel 47 in the BPH

Ezekiel 47 in the BSB

Ezekiel 47 in the CCB

Ezekiel 47 in the CUV

Ezekiel 47 in the CUVS

Ezekiel 47 in the DBT

Ezekiel 47 in the DGDNT

Ezekiel 47 in the DHNT

Ezekiel 47 in the DNT

Ezekiel 47 in the ELBE

Ezekiel 47 in the EMTV

Ezekiel 47 in the ESV

Ezekiel 47 in the FBV

Ezekiel 47 in the FEB

Ezekiel 47 in the GGMNT

Ezekiel 47 in the GNT

Ezekiel 47 in the HARY

Ezekiel 47 in the HNT

Ezekiel 47 in the IRVA

Ezekiel 47 in the IRVB

Ezekiel 47 in the IRVG

Ezekiel 47 in the IRVH

Ezekiel 47 in the IRVK

Ezekiel 47 in the IRVM

Ezekiel 47 in the IRVM2

Ezekiel 47 in the IRVO

Ezekiel 47 in the IRVP

Ezekiel 47 in the IRVT

Ezekiel 47 in the IRVT2

Ezekiel 47 in the IRVU

Ezekiel 47 in the ISVN

Ezekiel 47 in the JSNT

Ezekiel 47 in the KAPI

Ezekiel 47 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 47 in the KBV

Ezekiel 47 in the KJV

Ezekiel 47 in the KNFD

Ezekiel 47 in the LBA

Ezekiel 47 in the LBLA

Ezekiel 47 in the LNT

Ezekiel 47 in the LSV

Ezekiel 47 in the MAAL

Ezekiel 47 in the MBV

Ezekiel 47 in the MBV2

Ezekiel 47 in the MHNT

Ezekiel 47 in the MKNFD

Ezekiel 47 in the MNG

Ezekiel 47 in the MNT

Ezekiel 47 in the MNT2

Ezekiel 47 in the MRS1T

Ezekiel 47 in the NAA

Ezekiel 47 in the NASB

Ezekiel 47 in the NBLA

Ezekiel 47 in the NBS

Ezekiel 47 in the NBVTP

Ezekiel 47 in the NET2

Ezekiel 47 in the NIV11

Ezekiel 47 in the NNT

Ezekiel 47 in the NNT2

Ezekiel 47 in the NNT3

Ezekiel 47 in the PDDPT

Ezekiel 47 in the PFNT

Ezekiel 47 in the RMNT

Ezekiel 47 in the SBIAS

Ezekiel 47 in the SBIBS

Ezekiel 47 in the SBIBS2

Ezekiel 47 in the SBICS

Ezekiel 47 in the SBIDS

Ezekiel 47 in the SBIGS

Ezekiel 47 in the SBIHS

Ezekiel 47 in the SBIIS

Ezekiel 47 in the SBIIS2

Ezekiel 47 in the SBIIS3

Ezekiel 47 in the SBIKS

Ezekiel 47 in the SBIKS2

Ezekiel 47 in the SBIMS

Ezekiel 47 in the SBIOS

Ezekiel 47 in the SBIPS

Ezekiel 47 in the SBISS

Ezekiel 47 in the SBITS

Ezekiel 47 in the SBITS2

Ezekiel 47 in the SBITS3

Ezekiel 47 in the SBITS4

Ezekiel 47 in the SBIUS

Ezekiel 47 in the SBIVS

Ezekiel 47 in the SBT

Ezekiel 47 in the SBT1E

Ezekiel 47 in the SCHL

Ezekiel 47 in the SNT

Ezekiel 47 in the SUSU

Ezekiel 47 in the SUSU2

Ezekiel 47 in the SYNO

Ezekiel 47 in the TBIAOTANT

Ezekiel 47 in the TBT1E

Ezekiel 47 in the TBT1E2

Ezekiel 47 in the TFTIP

Ezekiel 47 in the TFTU

Ezekiel 47 in the TGNTATF3T

Ezekiel 47 in the THAI

Ezekiel 47 in the TNFD

Ezekiel 47 in the TNT

Ezekiel 47 in the TNTIK

Ezekiel 47 in the TNTIL

Ezekiel 47 in the TNTIN

Ezekiel 47 in the TNTIP

Ezekiel 47 in the TNTIZ

Ezekiel 47 in the TOMA

Ezekiel 47 in the TTENT

Ezekiel 47 in the UBG

Ezekiel 47 in the UGV

Ezekiel 47 in the UGV2

Ezekiel 47 in the UGV3

Ezekiel 47 in the VBL

Ezekiel 47 in the VDCC

Ezekiel 47 in the YALU

Ezekiel 47 in the YAPE

Ezekiel 47 in the YBVTP

Ezekiel 47 in the ZBP