Ezekiel 5 (BOICB)
1 “Ma gị, nwa nke mmadụ, were mma agha dị nkọ dịka agụba onye ọkpụisi, kpụchaa isi gị na afụọnụ gị; werekwa ihe e ji atụ ihe ọtụtụ tụọ agịrị isi gị, ka ụzọ ọbụla hara nʼotu. 2 Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha. 3 Ma ị ga-esite nʼime ya wepụta agịrị isi dị ole na ole, kedo ha nʼọnụ ọnụ uwe gị. 4 Ọzọkwa, site na ndị a, ị ga-ewere ụfọdụ tụnye ha nʼime ọkụ ka ha ree ọkụ, site na ha ka ọkụ ga-esi banye nʼụlọ Izrel niile. 5 “Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, Nke a bụ Jerusalem, obodo m mere ka ọ dịrị nʼetiti mba dị nʼụwa, nke mba dị iche iche gbara gburugburu. 6 Ma o sitela nʼajọ omume ya, nupu isi nʼiwu na ụkpụrụ m nyere, karịa mba na obodo ndị ọzọ ahụ niile gbara ya gburugburu. Ọ jụkwara idebe iwu m, jụkwa ịgbaso ụkpụrụ m. 7 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Ị bụrụla onye nnupu isi karịa mba niile ndị gbara gị gburugburu. Ị jụkwara idebe iwu m na ịgbaso ụkpụrụ m, ọ bụghịkwa dịka iwu na atụmatụ nke mba dị iche iche nọ gị gburugburu ka ị mere. 8 “Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-emegide gị bụ Jerusalem, kpee gị ikpe nʼihu mba niile. 9 Nʼihi ihe arụ gị niile, aga m eme gị ihe m na-emebeghị mbụ, nke m agaghị emekwa ọzọ. 10 Nʼihi nke a, ndị bụ nna ga-eri ụmụ ha nʼetiti gị, ụmụ ga-erikwa ndị nna ha. Aga m ekpe gị ikpe mee ka ndị fọdụrụ ndụ gbasasịa nʼụwa niile. 11 Ya mere, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara, ebe ọ bụ na i jirila oyiyi ihe arụ na omume rụrụ arụ merụọ ụlọ m, aga m esite nʼebe ị nọ wezuga ịhụnanya m. Agaghị m emekwara gị ebere maọbụ hapụ ịta gị ahụhụ. 12 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị bi nʼime gị ga-anwụ site nʼagụụ maọbụ na ọrịa; otu ụzọ ga-anwụ site na mma agha nke ndị iro nọ nʼazụ mgbidi gị, otu ụzọ fọdụrụ ka a ga-achụsa nʼifufe, a ga-eji mma agha ndị iro chụsasịa ha. 13 “Mgbe ahụ, iwe m ga-akwụsị, ọnụma m megide ha ga-adajụkwa, na nke a ka a ga-abọrọ m ọbọ. Ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ kwuru okwu site nʼekworo mgbe m mezuru ọnụma m nʼahụ ha. 14 “Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ. 15 Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola. 16 Mgbe m gbara gị àkụ ọjọọ ahụ na-eweta ọnwụ na ịla nʼiyi, bụ àkụ nke oke ụnwụ, aga m agba gị ya, gbajaa gị. Aga m anọgide na-ezite ụnwụ tutu ruo mgbe e mere ka ihe oriri kọọ gị. 17 Aga m ezitere gị oke ụnwụ na ajọ anụ ọhịa, ha ga-agbawa gị aka nwa, ọrịa ọjọọ na ọbara ga-esi nʼetiti gị gafee; aga m eji mma agha megide gị. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola.”
In Other Versions
Ezekiel 5 in the ANGEFD
Ezekiel 5 in the ANTPNG2D
Ezekiel 5 in the AS21
Ezekiel 5 in the BAGH
Ezekiel 5 in the BBPNG
Ezekiel 5 in the BBT1E
Ezekiel 5 in the BDS
Ezekiel 5 in the BEV
Ezekiel 5 in the BHAD
Ezekiel 5 in the BIB
Ezekiel 5 in the BLPT
Ezekiel 5 in the BNT
Ezekiel 5 in the BNTABOOT
Ezekiel 5 in the BNTLV
Ezekiel 5 in the BOATCB
Ezekiel 5 in the BOATCB2
Ezekiel 5 in the BOBCV
Ezekiel 5 in the BOCNT
Ezekiel 5 in the BOECS
Ezekiel 5 in the BOGWICC
Ezekiel 5 in the BOHCB
Ezekiel 5 in the BOHCV
Ezekiel 5 in the BOHLNT
Ezekiel 5 in the BOHNTLTAL
Ezekiel 5 in the BOILNTAP
Ezekiel 5 in the BOITCV
Ezekiel 5 in the BOKCV
Ezekiel 5 in the BOKCV2
Ezekiel 5 in the BOKHWOG
Ezekiel 5 in the BOKSSV
Ezekiel 5 in the BOLCB
Ezekiel 5 in the BOLCB2
Ezekiel 5 in the BOMCV
Ezekiel 5 in the BONAV
Ezekiel 5 in the BONCB
Ezekiel 5 in the BONLT
Ezekiel 5 in the BONUT2
Ezekiel 5 in the BOPLNT
Ezekiel 5 in the BOSCB
Ezekiel 5 in the BOSNC
Ezekiel 5 in the BOTLNT
Ezekiel 5 in the BOVCB
Ezekiel 5 in the BOYCB
Ezekiel 5 in the BPBB
Ezekiel 5 in the BPH
Ezekiel 5 in the BSB
Ezekiel 5 in the CCB
Ezekiel 5 in the CUV
Ezekiel 5 in the CUVS
Ezekiel 5 in the DBT
Ezekiel 5 in the DGDNT
Ezekiel 5 in the DHNT
Ezekiel 5 in the DNT
Ezekiel 5 in the ELBE
Ezekiel 5 in the EMTV
Ezekiel 5 in the ESV
Ezekiel 5 in the FBV
Ezekiel 5 in the FEB
Ezekiel 5 in the GGMNT
Ezekiel 5 in the GNT
Ezekiel 5 in the HARY
Ezekiel 5 in the HNT
Ezekiel 5 in the IRVA
Ezekiel 5 in the IRVB
Ezekiel 5 in the IRVG
Ezekiel 5 in the IRVH
Ezekiel 5 in the IRVK
Ezekiel 5 in the IRVM
Ezekiel 5 in the IRVM2
Ezekiel 5 in the IRVO
Ezekiel 5 in the IRVP
Ezekiel 5 in the IRVT
Ezekiel 5 in the IRVT2
Ezekiel 5 in the IRVU
Ezekiel 5 in the ISVN
Ezekiel 5 in the JSNT
Ezekiel 5 in the KAPI
Ezekiel 5 in the KBT1ETNIK
Ezekiel 5 in the KBV
Ezekiel 5 in the KJV
Ezekiel 5 in the KNFD
Ezekiel 5 in the LBA
Ezekiel 5 in the LBLA
Ezekiel 5 in the LNT
Ezekiel 5 in the LSV
Ezekiel 5 in the MAAL
Ezekiel 5 in the MBV
Ezekiel 5 in the MBV2
Ezekiel 5 in the MHNT
Ezekiel 5 in the MKNFD
Ezekiel 5 in the MNG
Ezekiel 5 in the MNT
Ezekiel 5 in the MNT2
Ezekiel 5 in the MRS1T
Ezekiel 5 in the NAA
Ezekiel 5 in the NASB
Ezekiel 5 in the NBLA
Ezekiel 5 in the NBS
Ezekiel 5 in the NBVTP
Ezekiel 5 in the NET2
Ezekiel 5 in the NIV11
Ezekiel 5 in the NNT
Ezekiel 5 in the NNT2
Ezekiel 5 in the NNT3
Ezekiel 5 in the PDDPT
Ezekiel 5 in the PFNT
Ezekiel 5 in the RMNT
Ezekiel 5 in the SBIAS
Ezekiel 5 in the SBIBS
Ezekiel 5 in the SBIBS2
Ezekiel 5 in the SBICS
Ezekiel 5 in the SBIDS
Ezekiel 5 in the SBIGS
Ezekiel 5 in the SBIHS
Ezekiel 5 in the SBIIS
Ezekiel 5 in the SBIIS2
Ezekiel 5 in the SBIIS3
Ezekiel 5 in the SBIKS
Ezekiel 5 in the SBIKS2
Ezekiel 5 in the SBIMS
Ezekiel 5 in the SBIOS
Ezekiel 5 in the SBIPS
Ezekiel 5 in the SBISS
Ezekiel 5 in the SBITS
Ezekiel 5 in the SBITS2
Ezekiel 5 in the SBITS3
Ezekiel 5 in the SBITS4
Ezekiel 5 in the SBIUS
Ezekiel 5 in the SBIVS
Ezekiel 5 in the SBT
Ezekiel 5 in the SBT1E
Ezekiel 5 in the SCHL
Ezekiel 5 in the SNT
Ezekiel 5 in the SUSU
Ezekiel 5 in the SUSU2
Ezekiel 5 in the SYNO
Ezekiel 5 in the TBIAOTANT
Ezekiel 5 in the TBT1E
Ezekiel 5 in the TBT1E2
Ezekiel 5 in the TFTIP
Ezekiel 5 in the TFTU
Ezekiel 5 in the TGNTATF3T
Ezekiel 5 in the THAI
Ezekiel 5 in the TNFD
Ezekiel 5 in the TNT
Ezekiel 5 in the TNTIK
Ezekiel 5 in the TNTIL
Ezekiel 5 in the TNTIN
Ezekiel 5 in the TNTIP
Ezekiel 5 in the TNTIZ
Ezekiel 5 in the TOMA
Ezekiel 5 in the TTENT
Ezekiel 5 in the UBG
Ezekiel 5 in the UGV
Ezekiel 5 in the UGV2
Ezekiel 5 in the UGV3
Ezekiel 5 in the VBL
Ezekiel 5 in the VDCC
Ezekiel 5 in the YALU
Ezekiel 5 in the YAPE
Ezekiel 5 in the YBVTP
Ezekiel 5 in the ZBP