Ezra 10 (BOICB)

1 Mgbe Ezra na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie ndị a, na-akwa akwa, na-atụ onwe ya nʼala nʼihu ụlọ Chineke, igwe ndị Izrel dị ukwuu, bụ ndị nwoke, na nwanyị, na ụmụntakịrị gbara ya gburugburu soro ya na-akwa akwa dị ilu. 2 Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehiel, onye agbụrụ Elam, sịrị Ezra, “Anyị emehiela megide Chineke anyị, nʼihi nʼịlụ ndị inyom mba ọzọ ndị gbara anyị gburugburu. Ma otu ọ dị, olileanya ka dịrị ndị Izrel. 3 Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị. 4 Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.” 5 Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya. 6 Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta. 7 E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem. 8 Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ. 9 Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ. 10 Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel. 11 Ugbu a, sọpụrụnụ ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nna nna unu ha, meekwanụ ihe bụ nzube ya. Kewapụnụ onwe unu site nʼebe ndị mba ọzọ nọ, nakwa ebe nwunye ndị unu si mba ọzọ lụta.” 12 Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.” 13 Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya. 14 Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.” 15 Ma ndị na-ekweghị ka e mee ya otu a bụ naanị Jonatan nwa Asahel na Jazeia nwa Tikva, na Meshulam na Shabetai onye Livayị. 16 Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a. 17 Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ. 18 A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ.Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ,Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya. 19 Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma. 20 Ndị si nʼikwu Imea bụHanani, na Zebadaya. 21 Ikwu Harim:Maaseia, Ịlaịja, Shemaya, Jehiel na Uzaya. 22 Ndị si nʼikwu Pashua:Elioenai, Maaseia, Ishmel, Netanel, Jozabad, na Eleasa. 23 Nʼime ndị Livayị:Jozabad, Shimei, Kelaya (onye a na-akpọkwa Kelita), Petahaya, Juda na Elieza. 24 Nʼime ndị na-abụ abụ,Eliashib.Nʼime ndị nche ọnụ ụzọ:Shalum, Telem, na Uri. 25 Nʼetiti ndị Izrel ndị ọzọ:Site nʼikwu Parosh:Ramaya, Izaya, Malkija, Mijamin, Elieza, Malkija na Benaya. 26 Site nʼikwu Elam:Matanaya, Zekaraya, Jehiel, Abdi, Jeremot na Ịlaịja. 27 Site nʼikwu Zatu:Elioenai, Eliashib, Matanaya, Jeremot, Zabad na Aziza. 28 Site nʼikwu Bebai:Jehohanan, Hananaya, Zabai, na Atlai. 29 Site nʼikwu Bani,Meshulam, Maluk, Adaya, Jashub, Sheal na Jeremot. 30 Site nʼikwu Pahat-Moab,Adna, Kelal, Benaya, Maaseia, Matanaya, Bezalel, Binui, na Manase. 31 Site nʼikwu Harim:Elieza, Ishija, Malkija, Shemaya, Shimeon, 32 Benjamin, Maluk na Shemaraya. 33 Site nʼikwu Hashum,Matenai, Matata, Zabad, Elifelet, Jeremai, Manase na Shimei. 34 Site nʼikwu Bani,Maadai, Amram, Uel, 35 Benaya, Bedeia, Keluhi 36 Venaya, Meremot, Eliashib 37 Matanaya, Matenai na Jaasu. 38 Site nʼikwu Bani:Binui na Shimei, 39 Shelemaya, Netan, Adaya, 40 Maknadebai, Shashai, Sharai, 41 Azarel, Shelemaya, Shemaraya, 42 Shalum, Amaraya na Josef. 43 Site nʼikwu Nebo:Jeiel, Matitaia, Zabad, Zebina, Jadai, Juel na Benaya. 44 Ndị a niile lụrụ ndị inyom site na mba ọzọ. Ha zilagara ha na ụmụ ha.

In Other Versions

Ezra 10 in the ANGEFD

Ezra 10 in the ANTPNG2D

Ezra 10 in the AS21

Ezra 10 in the BAGH

Ezra 10 in the BBPNG

Ezra 10 in the BBT1E

Ezra 10 in the BDS

Ezra 10 in the BEV

Ezra 10 in the BHAD

Ezra 10 in the BIB

Ezra 10 in the BLPT

Ezra 10 in the BNT

Ezra 10 in the BNTABOOT

Ezra 10 in the BNTLV

Ezra 10 in the BOATCB

Ezra 10 in the BOATCB2

Ezra 10 in the BOBCV

Ezra 10 in the BOCNT

Ezra 10 in the BOECS

Ezra 10 in the BOGWICC

Ezra 10 in the BOHCB

Ezra 10 in the BOHCV

Ezra 10 in the BOHLNT

Ezra 10 in the BOHNTLTAL

Ezra 10 in the BOILNTAP

Ezra 10 in the BOITCV

Ezra 10 in the BOKCV

Ezra 10 in the BOKCV2

Ezra 10 in the BOKHWOG

Ezra 10 in the BOKSSV

Ezra 10 in the BOLCB

Ezra 10 in the BOLCB2

Ezra 10 in the BOMCV

Ezra 10 in the BONAV

Ezra 10 in the BONCB

Ezra 10 in the BONLT

Ezra 10 in the BONUT2

Ezra 10 in the BOPLNT

Ezra 10 in the BOSCB

Ezra 10 in the BOSNC

Ezra 10 in the BOTLNT

Ezra 10 in the BOVCB

Ezra 10 in the BOYCB

Ezra 10 in the BPBB

Ezra 10 in the BPH

Ezra 10 in the BSB

Ezra 10 in the CCB

Ezra 10 in the CUV

Ezra 10 in the CUVS

Ezra 10 in the DBT

Ezra 10 in the DGDNT

Ezra 10 in the DHNT

Ezra 10 in the DNT

Ezra 10 in the ELBE

Ezra 10 in the EMTV

Ezra 10 in the ESV

Ezra 10 in the FBV

Ezra 10 in the FEB

Ezra 10 in the GGMNT

Ezra 10 in the GNT

Ezra 10 in the HARY

Ezra 10 in the HNT

Ezra 10 in the IRVA

Ezra 10 in the IRVB

Ezra 10 in the IRVG

Ezra 10 in the IRVH

Ezra 10 in the IRVK

Ezra 10 in the IRVM

Ezra 10 in the IRVM2

Ezra 10 in the IRVO

Ezra 10 in the IRVP

Ezra 10 in the IRVT

Ezra 10 in the IRVT2

Ezra 10 in the IRVU

Ezra 10 in the ISVN

Ezra 10 in the JSNT

Ezra 10 in the KAPI

Ezra 10 in the KBT1ETNIK

Ezra 10 in the KBV

Ezra 10 in the KJV

Ezra 10 in the KNFD

Ezra 10 in the LBA

Ezra 10 in the LBLA

Ezra 10 in the LNT

Ezra 10 in the LSV

Ezra 10 in the MAAL

Ezra 10 in the MBV

Ezra 10 in the MBV2

Ezra 10 in the MHNT

Ezra 10 in the MKNFD

Ezra 10 in the MNG

Ezra 10 in the MNT

Ezra 10 in the MNT2

Ezra 10 in the MRS1T

Ezra 10 in the NAA

Ezra 10 in the NASB

Ezra 10 in the NBLA

Ezra 10 in the NBS

Ezra 10 in the NBVTP

Ezra 10 in the NET2

Ezra 10 in the NIV11

Ezra 10 in the NNT

Ezra 10 in the NNT2

Ezra 10 in the NNT3

Ezra 10 in the PDDPT

Ezra 10 in the PFNT

Ezra 10 in the RMNT

Ezra 10 in the SBIAS

Ezra 10 in the SBIBS

Ezra 10 in the SBIBS2

Ezra 10 in the SBICS

Ezra 10 in the SBIDS

Ezra 10 in the SBIGS

Ezra 10 in the SBIHS

Ezra 10 in the SBIIS

Ezra 10 in the SBIIS2

Ezra 10 in the SBIIS3

Ezra 10 in the SBIKS

Ezra 10 in the SBIKS2

Ezra 10 in the SBIMS

Ezra 10 in the SBIOS

Ezra 10 in the SBIPS

Ezra 10 in the SBISS

Ezra 10 in the SBITS

Ezra 10 in the SBITS2

Ezra 10 in the SBITS3

Ezra 10 in the SBITS4

Ezra 10 in the SBIUS

Ezra 10 in the SBIVS

Ezra 10 in the SBT

Ezra 10 in the SBT1E

Ezra 10 in the SCHL

Ezra 10 in the SNT

Ezra 10 in the SUSU

Ezra 10 in the SUSU2

Ezra 10 in the SYNO

Ezra 10 in the TBIAOTANT

Ezra 10 in the TBT1E

Ezra 10 in the TBT1E2

Ezra 10 in the TFTIP

Ezra 10 in the TFTU

Ezra 10 in the TGNTATF3T

Ezra 10 in the THAI

Ezra 10 in the TNFD

Ezra 10 in the TNT

Ezra 10 in the TNTIK

Ezra 10 in the TNTIL

Ezra 10 in the TNTIN

Ezra 10 in the TNTIP

Ezra 10 in the TNTIZ

Ezra 10 in the TOMA

Ezra 10 in the TTENT

Ezra 10 in the UBG

Ezra 10 in the UGV

Ezra 10 in the UGV2

Ezra 10 in the UGV3

Ezra 10 in the VBL

Ezra 10 in the VDCC

Ezra 10 in the YALU

Ezra 10 in the YAPE

Ezra 10 in the YBVTP

Ezra 10 in the ZBP