Ezra 3 (BOICB)
1 Mgbe o ruru ọnwa asaa nʼafọ, ndị Izrel nọkwa nʼobodo ha niile, ndị mmadụ zukọtara nʼotu na Jerusalem. 2 Mgbe ahụ, Jeshua, nwa Jozadak na ndị nchụaja ndị ọzọ, na Zerubabel nwa Shealtiel na ndị na-enyere ya aka malitere iwugharị ebe ịchụ aja Chineke Izrel maka ịchụ aja nsure ọkụ nʼelu ya dịka Mosis onye nke Chineke si nye nʼiwu. 3 Nʼagbanyeghị oke egwu maka ndị niile gbara ha gburugburu, ha gara nʼihu wughachikwa ebe ịchụ aja ahụ na ntọala ya chụọkwa aja nʼelu ya nye ONYENWE ANYỊ, bụ aja nsure ọkụ nke ụtụtụ na nke uhuruchi. 4 Ha mekwara mmemme ụlọ Ikwu dịka e dere ya nʼiwu Mosis, chụọkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nʼụbọchị niile nke mmemme ahụ. 5 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha chụrụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ mgbe niile, na nke aja maka ọnwa ọhụrụ, na aja ndị ọzọ maka mmemme ndị ọzọ dị nsọ a kara aka nke ONYENWE ANYỊ. Ha chụkwara aja onyinye nke ha ji nye ONYENWE ANYỊ onyinye afọ ofufu. 6 Ndị nchụaja bidoro ịchụ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ nʼabalị mbụ nke ọnwa nke asaa. Ọ bụ ezie na a tọbeghị ntọala ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 7 Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya. 8 Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ ONYENWE ANYỊ. 9 Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. 10 Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto ONYENWE ANYỊ dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị. 11 Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo ONYENWE ANYỊ abụ sị:“Ọ dị mma,ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.”Mmadụ niile jiri oke olu too ONYENWE ANYỊ nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ. 12 Ma ụfọdụ ndị merela agadi nʼetiti ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị ndu nke ikwu dị iche iche, bụ ndị chetara ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru, kwara akwa hie nne, mgbe ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ. 13 Ya mere, e sitere nʼebe dị nnọọ anya nụ ụzụ ọṅụ na ụda akwa ndị mmadụ ahụ. Ma o nweghị onye nwere ike ịkọwata nke bụ mkpu akwa maọbụ mkpu ọṅụ, nʼihi na ụzụ ahụ dị ukwuu.
In Other Versions
Ezra 3 in the ANGEFD
Ezra 3 in the ANTPNG2D
Ezra 3 in the AS21
Ezra 3 in the BAGH
Ezra 3 in the BBPNG
Ezra 3 in the BBT1E
Ezra 3 in the BDS
Ezra 3 in the BEV
Ezra 3 in the BHAD
Ezra 3 in the BIB
Ezra 3 in the BLPT
Ezra 3 in the BNT
Ezra 3 in the BNTABOOT
Ezra 3 in the BNTLV
Ezra 3 in the BOATCB
Ezra 3 in the BOATCB2
Ezra 3 in the BOBCV
Ezra 3 in the BOCNT
Ezra 3 in the BOECS
Ezra 3 in the BOGWICC
Ezra 3 in the BOHCB
Ezra 3 in the BOHCV
Ezra 3 in the BOHLNT
Ezra 3 in the BOHNTLTAL
Ezra 3 in the BOILNTAP
Ezra 3 in the BOITCV
Ezra 3 in the BOKCV
Ezra 3 in the BOKCV2
Ezra 3 in the BOKHWOG
Ezra 3 in the BOKSSV
Ezra 3 in the BOLCB
Ezra 3 in the BOLCB2
Ezra 3 in the BOMCV
Ezra 3 in the BONAV
Ezra 3 in the BONCB
Ezra 3 in the BONLT
Ezra 3 in the BONUT2
Ezra 3 in the BOPLNT
Ezra 3 in the BOSCB
Ezra 3 in the BOSNC
Ezra 3 in the BOTLNT
Ezra 3 in the BOVCB
Ezra 3 in the BOYCB
Ezra 3 in the BPBB
Ezra 3 in the BPH
Ezra 3 in the BSB
Ezra 3 in the CCB
Ezra 3 in the CUV
Ezra 3 in the CUVS
Ezra 3 in the DBT
Ezra 3 in the DGDNT
Ezra 3 in the DHNT
Ezra 3 in the DNT
Ezra 3 in the ELBE
Ezra 3 in the EMTV
Ezra 3 in the ESV
Ezra 3 in the FBV
Ezra 3 in the FEB
Ezra 3 in the GGMNT
Ezra 3 in the GNT
Ezra 3 in the HARY
Ezra 3 in the HNT
Ezra 3 in the IRVA
Ezra 3 in the IRVB
Ezra 3 in the IRVG
Ezra 3 in the IRVH
Ezra 3 in the IRVK
Ezra 3 in the IRVM
Ezra 3 in the IRVM2
Ezra 3 in the IRVO
Ezra 3 in the IRVP
Ezra 3 in the IRVT
Ezra 3 in the IRVT2
Ezra 3 in the IRVU
Ezra 3 in the ISVN
Ezra 3 in the JSNT
Ezra 3 in the KAPI
Ezra 3 in the KBT1ETNIK
Ezra 3 in the KBV
Ezra 3 in the KJV
Ezra 3 in the KNFD
Ezra 3 in the LBA
Ezra 3 in the LBLA
Ezra 3 in the LNT
Ezra 3 in the LSV
Ezra 3 in the MAAL
Ezra 3 in the MBV
Ezra 3 in the MBV2
Ezra 3 in the MHNT
Ezra 3 in the MKNFD
Ezra 3 in the MNG
Ezra 3 in the MNT
Ezra 3 in the MNT2
Ezra 3 in the MRS1T
Ezra 3 in the NAA
Ezra 3 in the NASB
Ezra 3 in the NBLA
Ezra 3 in the NBS
Ezra 3 in the NBVTP
Ezra 3 in the NET2
Ezra 3 in the NIV11
Ezra 3 in the NNT
Ezra 3 in the NNT2
Ezra 3 in the NNT3
Ezra 3 in the PDDPT
Ezra 3 in the PFNT
Ezra 3 in the RMNT
Ezra 3 in the SBIAS
Ezra 3 in the SBIBS
Ezra 3 in the SBIBS2
Ezra 3 in the SBICS
Ezra 3 in the SBIDS
Ezra 3 in the SBIGS
Ezra 3 in the SBIHS
Ezra 3 in the SBIIS
Ezra 3 in the SBIIS2
Ezra 3 in the SBIIS3
Ezra 3 in the SBIKS
Ezra 3 in the SBIKS2
Ezra 3 in the SBIMS
Ezra 3 in the SBIOS
Ezra 3 in the SBIPS
Ezra 3 in the SBISS
Ezra 3 in the SBITS
Ezra 3 in the SBITS2
Ezra 3 in the SBITS3
Ezra 3 in the SBITS4
Ezra 3 in the SBIUS
Ezra 3 in the SBIVS
Ezra 3 in the SBT
Ezra 3 in the SBT1E
Ezra 3 in the SCHL
Ezra 3 in the SNT
Ezra 3 in the SUSU
Ezra 3 in the SUSU2
Ezra 3 in the SYNO
Ezra 3 in the TBIAOTANT
Ezra 3 in the TBT1E
Ezra 3 in the TBT1E2
Ezra 3 in the TFTIP
Ezra 3 in the TFTU
Ezra 3 in the TGNTATF3T
Ezra 3 in the THAI
Ezra 3 in the TNFD
Ezra 3 in the TNT
Ezra 3 in the TNTIK
Ezra 3 in the TNTIL
Ezra 3 in the TNTIN
Ezra 3 in the TNTIP
Ezra 3 in the TNTIZ
Ezra 3 in the TOMA
Ezra 3 in the TTENT
Ezra 3 in the UBG
Ezra 3 in the UGV
Ezra 3 in the UGV2
Ezra 3 in the UGV3
Ezra 3 in the VBL
Ezra 3 in the VDCC
Ezra 3 in the YALU
Ezra 3 in the YAPE
Ezra 3 in the YBVTP
Ezra 3 in the ZBP