Ezra 5 (BOICB)
1 Ugbu a, ndị amụma, bụ Hegai, na Zekaraya nwa Ido buru amụma nye ndị Juu nọ na Juda nakwa Jerusalem. Ọ bụ nʼaha Chineke nke Izrel, onye na-achị ha ka ha buru amụma ahụ. 2 Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak malitekwara iwu ụlọnsọ Chineke nʼJerusalem. Ndị amụma Chineke ahụ nọnyeere ha na-enyekwara ha aka. 3 Ma Tatenai, onye na-achị mba niile dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndị enyi ha, gara Jerusalem jụọ ndị Juu sị; “Onye nyere unu ike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?” 4 Ha jụkwara ha ajụjụ sị: “Gịnị bụ aha ndị na-arụ ụlọ a?” 5 Ma anya Chineke ha dịkwasịrị nʼahụ ndị okenye ndị Juu, ha akwụsịghị ha ọrụ ruo mgbe akwụkwọ ozi ruru Daraiọs, na mgbe ọsịsa ya bịara site nʼakwụkwọ ozi. 6 Nke a bụ akwụkwọ ozi Tatenai, onye na-achị ala dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ degara eze Daraiọs: 7 Ha zigara ya akwụkwọ ozi, nke e si otu a dee,Daraiọs bụ eze nwe akwụkwọ a,Anyị ekelee gị. 8 Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha. 9 Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem? 10 Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha. 11 Ma nke a bụ ihe ha zaghachiri anyị: “Anyị onwe anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-ewugharị ụlọnsọ nke otu eze ukwu ndị Izrel wuru nʼoge gara aga. 12 Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn. 13 “Ma otu ọ dị, nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Babilọn, eze Sairọs nyere iwu ka e wugharịa ụlọnsọ Chineke a. 14 O sikwa nʼụlọnsọ dị na Babilọn wepụta ngwongwo ọlaọcha na ọlaedo si nʼụlọnsọ Chineke nke Nebukadneza si nʼụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem bupụ bulaa nʼụlọnsọ dị na Babilọn. Mgbe ahụ eze Sairọs nyefere ha nʼaka otu nwoke a na-akpọ Sheshbaza, onye ọ họpụtara dịka gọvanọ. 15 Ọ gwara ya sị, ‘buru ngwongwo ndị a bulaa ha nʼụlọnsọ dị na Jerusalem, wugharịakwa ụlọnsọ Chineke nʼọnọdụ ya mbụ.’ 16 “Ya mere, ọ bụ Sheshbaza a bịara tọọ ntọala ụlọnsọ dị na Jerusalem. Sitekwa nʼoge ahụ ruo ugbu a, ha nọ na-arụ ya ma ha arụchabeghị ya.” 17 Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma nʼobi, ya nye iwu ka e nyochaa nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị eze Babilọn, ịchọpụta maọbụ eziokwu na eze Sairọs nyere iwu dị otu a iwugharị ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem. Ka eze gwakwa anyị ihe bụ mkpebi ya banyere okwu a.
In Other Versions
Ezra 5 in the ANGEFD
Ezra 5 in the ANTPNG2D
Ezra 5 in the AS21
Ezra 5 in the BAGH
Ezra 5 in the BBPNG
Ezra 5 in the BBT1E
Ezra 5 in the BDS
Ezra 5 in the BEV
Ezra 5 in the BHAD
Ezra 5 in the BIB
Ezra 5 in the BLPT
Ezra 5 in the BNT
Ezra 5 in the BNTABOOT
Ezra 5 in the BNTLV
Ezra 5 in the BOATCB
Ezra 5 in the BOATCB2
Ezra 5 in the BOBCV
Ezra 5 in the BOCNT
Ezra 5 in the BOECS
Ezra 5 in the BOGWICC
Ezra 5 in the BOHCB
Ezra 5 in the BOHCV
Ezra 5 in the BOHLNT
Ezra 5 in the BOHNTLTAL
Ezra 5 in the BOILNTAP
Ezra 5 in the BOITCV
Ezra 5 in the BOKCV
Ezra 5 in the BOKCV2
Ezra 5 in the BOKHWOG
Ezra 5 in the BOKSSV
Ezra 5 in the BOLCB
Ezra 5 in the BOLCB2
Ezra 5 in the BOMCV
Ezra 5 in the BONAV
Ezra 5 in the BONCB
Ezra 5 in the BONLT
Ezra 5 in the BONUT2
Ezra 5 in the BOPLNT
Ezra 5 in the BOSCB
Ezra 5 in the BOSNC
Ezra 5 in the BOTLNT
Ezra 5 in the BOVCB
Ezra 5 in the BOYCB
Ezra 5 in the BPBB
Ezra 5 in the BPH
Ezra 5 in the BSB
Ezra 5 in the CCB
Ezra 5 in the CUV
Ezra 5 in the CUVS
Ezra 5 in the DBT
Ezra 5 in the DGDNT
Ezra 5 in the DHNT
Ezra 5 in the DNT
Ezra 5 in the ELBE
Ezra 5 in the EMTV
Ezra 5 in the ESV
Ezra 5 in the FBV
Ezra 5 in the FEB
Ezra 5 in the GGMNT
Ezra 5 in the GNT
Ezra 5 in the HARY
Ezra 5 in the HNT
Ezra 5 in the IRVA
Ezra 5 in the IRVB
Ezra 5 in the IRVG
Ezra 5 in the IRVH
Ezra 5 in the IRVK
Ezra 5 in the IRVM
Ezra 5 in the IRVM2
Ezra 5 in the IRVO
Ezra 5 in the IRVP
Ezra 5 in the IRVT
Ezra 5 in the IRVT2
Ezra 5 in the IRVU
Ezra 5 in the ISVN
Ezra 5 in the JSNT
Ezra 5 in the KAPI
Ezra 5 in the KBT1ETNIK
Ezra 5 in the KBV
Ezra 5 in the KJV
Ezra 5 in the KNFD
Ezra 5 in the LBA
Ezra 5 in the LBLA
Ezra 5 in the LNT
Ezra 5 in the LSV
Ezra 5 in the MAAL
Ezra 5 in the MBV
Ezra 5 in the MBV2
Ezra 5 in the MHNT
Ezra 5 in the MKNFD
Ezra 5 in the MNG
Ezra 5 in the MNT
Ezra 5 in the MNT2
Ezra 5 in the MRS1T
Ezra 5 in the NAA
Ezra 5 in the NASB
Ezra 5 in the NBLA
Ezra 5 in the NBS
Ezra 5 in the NBVTP
Ezra 5 in the NET2
Ezra 5 in the NIV11
Ezra 5 in the NNT
Ezra 5 in the NNT2
Ezra 5 in the NNT3
Ezra 5 in the PDDPT
Ezra 5 in the PFNT
Ezra 5 in the RMNT
Ezra 5 in the SBIAS
Ezra 5 in the SBIBS
Ezra 5 in the SBIBS2
Ezra 5 in the SBICS
Ezra 5 in the SBIDS
Ezra 5 in the SBIGS
Ezra 5 in the SBIHS
Ezra 5 in the SBIIS
Ezra 5 in the SBIIS2
Ezra 5 in the SBIIS3
Ezra 5 in the SBIKS
Ezra 5 in the SBIKS2
Ezra 5 in the SBIMS
Ezra 5 in the SBIOS
Ezra 5 in the SBIPS
Ezra 5 in the SBISS
Ezra 5 in the SBITS
Ezra 5 in the SBITS2
Ezra 5 in the SBITS3
Ezra 5 in the SBITS4
Ezra 5 in the SBIUS
Ezra 5 in the SBIVS
Ezra 5 in the SBT
Ezra 5 in the SBT1E
Ezra 5 in the SCHL
Ezra 5 in the SNT
Ezra 5 in the SUSU
Ezra 5 in the SUSU2
Ezra 5 in the SYNO
Ezra 5 in the TBIAOTANT
Ezra 5 in the TBT1E
Ezra 5 in the TBT1E2
Ezra 5 in the TFTIP
Ezra 5 in the TFTU
Ezra 5 in the TGNTATF3T
Ezra 5 in the THAI
Ezra 5 in the TNFD
Ezra 5 in the TNT
Ezra 5 in the TNTIK
Ezra 5 in the TNTIL
Ezra 5 in the TNTIN
Ezra 5 in the TNTIP
Ezra 5 in the TNTIZ
Ezra 5 in the TOMA
Ezra 5 in the TTENT
Ezra 5 in the UBG
Ezra 5 in the UGV
Ezra 5 in the UGV2
Ezra 5 in the UGV3
Ezra 5 in the VBL
Ezra 5 in the VDCC
Ezra 5 in the YALU
Ezra 5 in the YAPE
Ezra 5 in the YBVTP
Ezra 5 in the ZBP