Genesis 17 (BOICB)

1 Mgbe Ebram gbara iri afọ itoolu na itoolu, ONYENWE ANYỊ gosiri ya onwe ya sị ya, “Abụ m Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Jegharịa ije nʼihu m, bụrụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla. 2 Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị nʼetiti mụ na gị, mekwa ka ị mụbaa nke ukwuu nʼọnụọgụgụ.” 3 Ebram dara nʼala, kpudo ihu ya nʼala. Chineke gwara ya sị, 4 “Lee, nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị. Ị ga-abụ nna ọtụtụ mba. 5 Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba. 6 Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta. 7 Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị. 8 Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha.” 9 Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, “Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile. 10 Nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ọgbụgba ndụ nke unu na-aghaghị idebe. A ga-ebi nwoke ọbụla nʼetiti unu ugwu. 11 A ga-ebi unu ugwu, bipụ elu ahụ nke anụ ahụ unu. Nke a ga-abụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na unu. 12 Nʼoge ọ gbara mkpụrụ ụbọchị asatọ, unu ga-ebi nwoke ọbụla nʼagbụrụ unu ugwu: ndị a mụrụ nʼụlọ, maọbụ ndị eji ego zụta site nʼaka ndị mba ọzọ, ndị na-esighị na mkpụrụ nke afọ gị. 13 A ga-ebi ha niile ugwu. Ma a mụrụ ha nʼezinaụlọ gị ma i ji ego zụta ha site nʼaka onye mba ọzọ. Ọgbụgba ndụ m nke ga-apụta ihe nʼanụ ahụ gị bụ ọgbụgba ndụ ebighị ebi. 14 Nwoke ọbụla a na-ebighị ugwu nke anụ ahụ ka a ga-ebipụ site nʼetiti ụmụnna ya. Nʼihi na o mehiela megide ọgbụgba ndụ m.” 15 Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera. 16 Aga m agọzi ya, sitekwa na ya nye gị nwa nwoke. Aga m agọzi ya ruo na ọ ga-abụ nne nke ọtụtụ mba. Ndị eze ga-achị ọtụtụ mmadụ ga-esite na ya pụta.” 17 Ebraham dara kpuo ihu nʼala, chịakwa ọchị nʼobi ya sị, “Ọ bụ onye gbara narị afọ ka a ga-amụrụ nwa? Sera, onye gbara iri afọ itoolu ọ ga-amụ nwa?” 18 Ebraham gwara Chineke sị, “A sịkwa na ị ga-ekwe mee ka Ishmel bụrụ onye dị ndụ nʼihu gị.” 19 Ma Chineke zara sị ya, “Ee, kama Sera nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke. Ị ga-agụ ya Aịzik. Ọgbụgba ndụ m ga-adịkwara ya na agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 20 Ma banyere Ishmel, anụla m ihe i kwuru. Aga m agọzi ya mee ya ka ọ baa ụba ma dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-aghọ nna ndị eze iri na abụọ. Aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu. 21 Ma ọgbụgba ndụ m ka m ga-eme ka o guzosie ike nʼebe Aịzik nọ, onye Sera ga-amụtara gị nʼoge dịka ugbu a nʼafọ ọzọ.” 22 Mgbe ọ gwasịrị Ebraham okwu, Chineke si nʼebe ọ nọ pụọ. 23 Nʼụbọchị ahụ, Ebraham duuru Ishmel nwa ya nwoke, na ndị ikom niile a mụrụ nʼezinaụlọ ya, tinyere ndị e ji ego zụta, ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya, bie ha ugwu dịka Chineke gwara ya ka ọ mee. 24 Ebraham gbara iri afọ itoolu na itoolu mgbe e biri ya ugwu, 25 Ishmel nwa ya gbara afọ iri na atọ. 26 E biri Ebraham na nwa ya bụ Ishmel ugwu nʼotu ụbọchị ahụ. 27 Ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ Ebraham, ndị a mụrụ nʼụlọ ya na ndị e si nʼaka ndị mba ọzọ zụta ka e biri ugwu nʼoge Ebraham biri ugwu.

In Other Versions

Genesis 17 in the ANGEFD

Genesis 17 in the ANTPNG2D

Genesis 17 in the AS21

Genesis 17 in the BAGH

Genesis 17 in the BBPNG

Genesis 17 in the BBT1E

Genesis 17 in the BDS

Genesis 17 in the BEV

Genesis 17 in the BHAD

Genesis 17 in the BIB

Genesis 17 in the BLPT

Genesis 17 in the BNT

Genesis 17 in the BNTABOOT

Genesis 17 in the BNTLV

Genesis 17 in the BOATCB

Genesis 17 in the BOATCB2

Genesis 17 in the BOBCV

Genesis 17 in the BOCNT

Genesis 17 in the BOECS

Genesis 17 in the BOGWICC

Genesis 17 in the BOHCB

Genesis 17 in the BOHCV

Genesis 17 in the BOHLNT

Genesis 17 in the BOHNTLTAL

Genesis 17 in the BOILNTAP

Genesis 17 in the BOITCV

Genesis 17 in the BOKCV

Genesis 17 in the BOKCV2

Genesis 17 in the BOKHWOG

Genesis 17 in the BOKSSV

Genesis 17 in the BOLCB

Genesis 17 in the BOLCB2

Genesis 17 in the BOMCV

Genesis 17 in the BONAV

Genesis 17 in the BONCB

Genesis 17 in the BONLT

Genesis 17 in the BONUT2

Genesis 17 in the BOPLNT

Genesis 17 in the BOSCB

Genesis 17 in the BOSNC

Genesis 17 in the BOTLNT

Genesis 17 in the BOVCB

Genesis 17 in the BOYCB

Genesis 17 in the BPBB

Genesis 17 in the BPH

Genesis 17 in the BSB

Genesis 17 in the CCB

Genesis 17 in the CUV

Genesis 17 in the CUVS

Genesis 17 in the DBT

Genesis 17 in the DGDNT

Genesis 17 in the DHNT

Genesis 17 in the DNT

Genesis 17 in the ELBE

Genesis 17 in the EMTV

Genesis 17 in the ESV

Genesis 17 in the FBV

Genesis 17 in the FEB

Genesis 17 in the GGMNT

Genesis 17 in the GNT

Genesis 17 in the HARY

Genesis 17 in the HNT

Genesis 17 in the IRVA

Genesis 17 in the IRVB

Genesis 17 in the IRVG

Genesis 17 in the IRVH

Genesis 17 in the IRVK

Genesis 17 in the IRVM

Genesis 17 in the IRVM2

Genesis 17 in the IRVO

Genesis 17 in the IRVP

Genesis 17 in the IRVT

Genesis 17 in the IRVT2

Genesis 17 in the IRVU

Genesis 17 in the ISVN

Genesis 17 in the JSNT

Genesis 17 in the KAPI

Genesis 17 in the KBT1ETNIK

Genesis 17 in the KBV

Genesis 17 in the KJV

Genesis 17 in the KNFD

Genesis 17 in the LBA

Genesis 17 in the LBLA

Genesis 17 in the LNT

Genesis 17 in the LSV

Genesis 17 in the MAAL

Genesis 17 in the MBV

Genesis 17 in the MBV2

Genesis 17 in the MHNT

Genesis 17 in the MKNFD

Genesis 17 in the MNG

Genesis 17 in the MNT

Genesis 17 in the MNT2

Genesis 17 in the MRS1T

Genesis 17 in the NAA

Genesis 17 in the NASB

Genesis 17 in the NBLA

Genesis 17 in the NBS

Genesis 17 in the NBVTP

Genesis 17 in the NET2

Genesis 17 in the NIV11

Genesis 17 in the NNT

Genesis 17 in the NNT2

Genesis 17 in the NNT3

Genesis 17 in the PDDPT

Genesis 17 in the PFNT

Genesis 17 in the RMNT

Genesis 17 in the SBIAS

Genesis 17 in the SBIBS

Genesis 17 in the SBIBS2

Genesis 17 in the SBICS

Genesis 17 in the SBIDS

Genesis 17 in the SBIGS

Genesis 17 in the SBIHS

Genesis 17 in the SBIIS

Genesis 17 in the SBIIS2

Genesis 17 in the SBIIS3

Genesis 17 in the SBIKS

Genesis 17 in the SBIKS2

Genesis 17 in the SBIMS

Genesis 17 in the SBIOS

Genesis 17 in the SBIPS

Genesis 17 in the SBISS

Genesis 17 in the SBITS

Genesis 17 in the SBITS2

Genesis 17 in the SBITS3

Genesis 17 in the SBITS4

Genesis 17 in the SBIUS

Genesis 17 in the SBIVS

Genesis 17 in the SBT

Genesis 17 in the SBT1E

Genesis 17 in the SCHL

Genesis 17 in the SNT

Genesis 17 in the SUSU

Genesis 17 in the SUSU2

Genesis 17 in the SYNO

Genesis 17 in the TBIAOTANT

Genesis 17 in the TBT1E

Genesis 17 in the TBT1E2

Genesis 17 in the TFTIP

Genesis 17 in the TFTU

Genesis 17 in the TGNTATF3T

Genesis 17 in the THAI

Genesis 17 in the TNFD

Genesis 17 in the TNT

Genesis 17 in the TNTIK

Genesis 17 in the TNTIL

Genesis 17 in the TNTIN

Genesis 17 in the TNTIP

Genesis 17 in the TNTIZ

Genesis 17 in the TOMA

Genesis 17 in the TTENT

Genesis 17 in the UBG

Genesis 17 in the UGV

Genesis 17 in the UGV2

Genesis 17 in the UGV3

Genesis 17 in the VBL

Genesis 17 in the VDCC

Genesis 17 in the YALU

Genesis 17 in the YAPE

Genesis 17 in the YBVTP

Genesis 17 in the ZBP