Genesis 25 (BOICB)

1 Ebraham lụrụ nwunye ọzọ, onye aha ya bụ Ketura. 2 Ọ mụụrụ ya Zimran, Jokshan, Medan, Midian, Ishbak na Shua. 3 Jokshan bụ nna Sheba na Dedan. Ụmụ ndị ikom Dedan bụ Ashurim, Letushim, na Leumim. 4 Ụmụ ndị ikom Midian bụ Efaa, Efe, Hanok, Abida, na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ Ketura. 5 Ebraham nyere Aịzik ihe niile o nwere. 6 Ebraham nyere ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara onyinye dị iche iche, zipụ ha nʼala dị nʼebe ọwụwa anyanwụ, mgbe ọ ka nọ ndụ, ka ha ghara ịnọ nwa ya nwoke Aịzik nso. 7 Ebraham dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ asaa na ise. 8 Ebraham kubiri ume ndụ nwụọ mgbe o mere nnọọ ezigbo agadi, agadi nwoke nke ndụ juru afọ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya. 9 Ụmụ ya, Aịzik na Ishmel, liri ya nʼọgba Makipela nʼakụkụ Mamre, nʼala ubi Efrọn nwa Zoha onye Het, 10 ala ahụ Ebraham zụrụ site nʼaka ndị Het. Ebe ahụ ka e liri Ebraham ya na Sera nwunye ya. 11 Mgbe Ebraham nwụrụ, Chineke gọziri nwa ya nwoke Aịzik onye bi nʼoge ahụ na nso nso Bịa-Lahai-Rọị. 12 Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Ishmel nwa Ebraham onye Hega, nwanyị Ijipt ahụ na-ejere Sera ozi mụụrụ ya. 13 Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ishmel nʼusoro ọmụmụ ha. Nebaiot bụ nwa mbụ ya.Ndị ọzọ bụ Keda, Adbel, Mibsam, 14 Mishma, Duma, Masa, 15 Hadad, Tema, Jetua,Nafish na Kedema. 16 Ndị a bụ ụmụ Ishmel, ndị a bụkwa aha ndịisi ikwu iri na abụọ ha, dịka ebe obibi ha si dị, na dịka ọmụma ụlọ ikwu ha si dị. 17 Ishmel biri ndụ ruo narị afọ na iri afọ na asaa. Ọ nwụrụ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya. 18 Ụmụ ụmụ ya bi nʼala dị site na Havila ruo Shua nso nso oke ala ndị Ijipt, nʼụzọ e si aga Ashọ. Ha na ụmụnna ha ndị ọzọ ebighị nʼudo. 19 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham. Ebraham bụ nna Aịzik. 20 Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram. 21 Aịzik kpere ekpere rịọọ ONYENWE ANYỊ ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. ONYENWE ANYỊ zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime. 22 Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka ONYENWE ANYỊ. 23 ONYENWE ANYỊ gwara ya sị,“Mba abụọ dị gị nʼafọ,ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa.Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ,nke okenye ga-ejere nke nta ozi.” 24 Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya. 25 Ahụ nwa nke mbụ buru ụzọ pụta na-acha uhie uhie, ahụ ya niile dịka uwe ajị. Nʼihi ya, ha kpọrọ aha ya Ịsọ. 26 Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha. 27 Ha abụọ toro, Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye na-epiogharị nʼọhịa, ebe Jekọb bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anọ nʼetiti ụlọ ikwu. 28 Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya. 29 Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu. 30 Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.) 31 Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.” 32 Ịsọ sịrị, “Gịnị bụ uru ọnọdụ ịbụ ọkpara bara mgbe m na-anwụ nʼagụụ?” 33 Jekọb sịrị ya, “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” Ya mere, ọ ṅụụrụ ya iyi, sị otu a resi Jekọb ọnọdụ ọkpara ya. 34 Mgbe ahụ, Jekọb nyere Ịsọ achịcha na ofe lentil o siri. O riri, ṅụọkwa, bilie ọtọ pụọ.Ya mere Ịsọ ledara ọnọdụ ịbụ ọkpara nna ya anya.

In Other Versions

Genesis 25 in the ANGEFD

Genesis 25 in the ANTPNG2D

Genesis 25 in the AS21

Genesis 25 in the BAGH

Genesis 25 in the BBPNG

Genesis 25 in the BBT1E

Genesis 25 in the BDS

Genesis 25 in the BEV

Genesis 25 in the BHAD

Genesis 25 in the BIB

Genesis 25 in the BLPT

Genesis 25 in the BNT

Genesis 25 in the BNTABOOT

Genesis 25 in the BNTLV

Genesis 25 in the BOATCB

Genesis 25 in the BOATCB2

Genesis 25 in the BOBCV

Genesis 25 in the BOCNT

Genesis 25 in the BOECS

Genesis 25 in the BOGWICC

Genesis 25 in the BOHCB

Genesis 25 in the BOHCV

Genesis 25 in the BOHLNT

Genesis 25 in the BOHNTLTAL

Genesis 25 in the BOILNTAP

Genesis 25 in the BOITCV

Genesis 25 in the BOKCV

Genesis 25 in the BOKCV2

Genesis 25 in the BOKHWOG

Genesis 25 in the BOKSSV

Genesis 25 in the BOLCB

Genesis 25 in the BOLCB2

Genesis 25 in the BOMCV

Genesis 25 in the BONAV

Genesis 25 in the BONCB

Genesis 25 in the BONLT

Genesis 25 in the BONUT2

Genesis 25 in the BOPLNT

Genesis 25 in the BOSCB

Genesis 25 in the BOSNC

Genesis 25 in the BOTLNT

Genesis 25 in the BOVCB

Genesis 25 in the BOYCB

Genesis 25 in the BPBB

Genesis 25 in the BPH

Genesis 25 in the BSB

Genesis 25 in the CCB

Genesis 25 in the CUV

Genesis 25 in the CUVS

Genesis 25 in the DBT

Genesis 25 in the DGDNT

Genesis 25 in the DHNT

Genesis 25 in the DNT

Genesis 25 in the ELBE

Genesis 25 in the EMTV

Genesis 25 in the ESV

Genesis 25 in the FBV

Genesis 25 in the FEB

Genesis 25 in the GGMNT

Genesis 25 in the GNT

Genesis 25 in the HARY

Genesis 25 in the HNT

Genesis 25 in the IRVA

Genesis 25 in the IRVB

Genesis 25 in the IRVG

Genesis 25 in the IRVH

Genesis 25 in the IRVK

Genesis 25 in the IRVM

Genesis 25 in the IRVM2

Genesis 25 in the IRVO

Genesis 25 in the IRVP

Genesis 25 in the IRVT

Genesis 25 in the IRVT2

Genesis 25 in the IRVU

Genesis 25 in the ISVN

Genesis 25 in the JSNT

Genesis 25 in the KAPI

Genesis 25 in the KBT1ETNIK

Genesis 25 in the KBV

Genesis 25 in the KJV

Genesis 25 in the KNFD

Genesis 25 in the LBA

Genesis 25 in the LBLA

Genesis 25 in the LNT

Genesis 25 in the LSV

Genesis 25 in the MAAL

Genesis 25 in the MBV

Genesis 25 in the MBV2

Genesis 25 in the MHNT

Genesis 25 in the MKNFD

Genesis 25 in the MNG

Genesis 25 in the MNT

Genesis 25 in the MNT2

Genesis 25 in the MRS1T

Genesis 25 in the NAA

Genesis 25 in the NASB

Genesis 25 in the NBLA

Genesis 25 in the NBS

Genesis 25 in the NBVTP

Genesis 25 in the NET2

Genesis 25 in the NIV11

Genesis 25 in the NNT

Genesis 25 in the NNT2

Genesis 25 in the NNT3

Genesis 25 in the PDDPT

Genesis 25 in the PFNT

Genesis 25 in the RMNT

Genesis 25 in the SBIAS

Genesis 25 in the SBIBS

Genesis 25 in the SBIBS2

Genesis 25 in the SBICS

Genesis 25 in the SBIDS

Genesis 25 in the SBIGS

Genesis 25 in the SBIHS

Genesis 25 in the SBIIS

Genesis 25 in the SBIIS2

Genesis 25 in the SBIIS3

Genesis 25 in the SBIKS

Genesis 25 in the SBIKS2

Genesis 25 in the SBIMS

Genesis 25 in the SBIOS

Genesis 25 in the SBIPS

Genesis 25 in the SBISS

Genesis 25 in the SBITS

Genesis 25 in the SBITS2

Genesis 25 in the SBITS3

Genesis 25 in the SBITS4

Genesis 25 in the SBIUS

Genesis 25 in the SBIVS

Genesis 25 in the SBT

Genesis 25 in the SBT1E

Genesis 25 in the SCHL

Genesis 25 in the SNT

Genesis 25 in the SUSU

Genesis 25 in the SUSU2

Genesis 25 in the SYNO

Genesis 25 in the TBIAOTANT

Genesis 25 in the TBT1E

Genesis 25 in the TBT1E2

Genesis 25 in the TFTIP

Genesis 25 in the TFTU

Genesis 25 in the TGNTATF3T

Genesis 25 in the THAI

Genesis 25 in the TNFD

Genesis 25 in the TNT

Genesis 25 in the TNTIK

Genesis 25 in the TNTIL

Genesis 25 in the TNTIN

Genesis 25 in the TNTIP

Genesis 25 in the TNTIZ

Genesis 25 in the TOMA

Genesis 25 in the TTENT

Genesis 25 in the UBG

Genesis 25 in the UGV

Genesis 25 in the UGV2

Genesis 25 in the UGV3

Genesis 25 in the VBL

Genesis 25 in the VDCC

Genesis 25 in the YALU

Genesis 25 in the YAPE

Genesis 25 in the YBVTP

Genesis 25 in the ZBP