Genesis 3 (BOICB)

1 Agwọ dị aghụghọ karịa ụmụ anụ ọhịa niile ONYENWE ANYỊ Chineke kere. Ọ bịakwutere nwanyị ahụ sị ya, “Ọ bụ ezie na Chineke sị unu erila mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a?” 2 Nwanyị ahụ zara sị ya, “Anyị nwere ike rie mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a 3 ma Chineke kwuru sị, ‘Unu erila mkpụrụ si nʼosisi dị nʼetiti ogige a, unu emetụkwala ya aka, ka unu ghara ịnwụ.’ ” 4 Agwọ gwara nwanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ. 5 Nʼihi na Chineke maara na ọ bụrụ na unu erie ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-amata ezi ihe na ajọ ihe.” 6 Nwanyị ahụ hụrụ na mkpụrụ si nʼosisi ahụ dị mma iri eri, na ọ dị mma nʼanya, na ọ bụ osisi mara mma e si enweta amamihe. Ọ ghọọrọ mkpụrụ ahụ rie, nyekwa di ya, onye nke na ya nọ, o rie. 7 Mgbe ahụ, anya ha abụọ meghere, ha chọpụtara na ha gba ọtọ. Ya mere, ha dụkọtara ahịhịa fiig, jiri ya mere onwe ha akwa. 8 Mgbe nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ ụda njegharị ONYENWE ANYỊ Chineke nʼogige ahụ nʼoge uhuruchi, ha zoro onwe ha site nʼebe ONYENWE ANYỊ Chineke nọ nʼetiti osisi ndị dị nʼogige ahụ. 9 Ma ONYENWE ANYỊ Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?” 10 Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.” 11 ONYENWE ANYỊ Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?” 12 Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.” 13 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?”Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.” 14 Ya mere, ONYENWE ANYỊ Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere,“Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niilena nʼetiti anụ ọhịa niile.Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije,aja ka ị ga na-eriogologo ụbọchị ndụ gị niile. 15 Aga m eme ka irodịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ,nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya,mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi,gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.” 16 Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya,“Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu,ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị.Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị,ọ bụ ya ga-achịkwa gị.” 17 Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’“Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị,site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụtaogologo ụbọchị ndụ gị niile. 18 Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke,ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi. 19 Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihuka ị ga-eri nri gịtutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼalaebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gịnʼihi na aja ka ị bụ,nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.” 20 Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ. 21 Emesịa, ONYENWE ANYỊ Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi. 22 ONYENWE ANYỊ Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” 23 Nʼihi nke a, ONYENWE ANYỊ Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya. 24 Mgbe ọ chụpụrụ mmadụ, o dochiri nʼọwụwa anyanwụ nke ogige Iden ndị mmụọ ozi dị ike a na-akpọ Cherubim, na mma agha na-acha ọkụ, ka ha na-eche ọnụ ụzọ e si aba nʼebe osisi ahụ na-enye ndụ dị nche.

In Other Versions

Genesis 3 in the ANGEFD

Genesis 3 in the ANTPNG2D

Genesis 3 in the AS21

Genesis 3 in the BAGH

Genesis 3 in the BBPNG

Genesis 3 in the BBT1E

Genesis 3 in the BDS

Genesis 3 in the BEV

Genesis 3 in the BHAD

Genesis 3 in the BIB

Genesis 3 in the BLPT

Genesis 3 in the BNT

Genesis 3 in the BNTABOOT

Genesis 3 in the BNTLV

Genesis 3 in the BOATCB

Genesis 3 in the BOATCB2

Genesis 3 in the BOBCV

Genesis 3 in the BOCNT

Genesis 3 in the BOECS

Genesis 3 in the BOGWICC

Genesis 3 in the BOHCB

Genesis 3 in the BOHCV

Genesis 3 in the BOHLNT

Genesis 3 in the BOHNTLTAL

Genesis 3 in the BOILNTAP

Genesis 3 in the BOITCV

Genesis 3 in the BOKCV

Genesis 3 in the BOKCV2

Genesis 3 in the BOKHWOG

Genesis 3 in the BOKSSV

Genesis 3 in the BOLCB

Genesis 3 in the BOLCB2

Genesis 3 in the BOMCV

Genesis 3 in the BONAV

Genesis 3 in the BONCB

Genesis 3 in the BONLT

Genesis 3 in the BONUT2

Genesis 3 in the BOPLNT

Genesis 3 in the BOSCB

Genesis 3 in the BOSNC

Genesis 3 in the BOTLNT

Genesis 3 in the BOVCB

Genesis 3 in the BOYCB

Genesis 3 in the BPBB

Genesis 3 in the BPH

Genesis 3 in the BSB

Genesis 3 in the CCB

Genesis 3 in the CUV

Genesis 3 in the CUVS

Genesis 3 in the DBT

Genesis 3 in the DGDNT

Genesis 3 in the DHNT

Genesis 3 in the DNT

Genesis 3 in the ELBE

Genesis 3 in the EMTV

Genesis 3 in the ESV

Genesis 3 in the FBV

Genesis 3 in the FEB

Genesis 3 in the GGMNT

Genesis 3 in the GNT

Genesis 3 in the HARY

Genesis 3 in the HNT

Genesis 3 in the IRVA

Genesis 3 in the IRVB

Genesis 3 in the IRVG

Genesis 3 in the IRVH

Genesis 3 in the IRVK

Genesis 3 in the IRVM

Genesis 3 in the IRVM2

Genesis 3 in the IRVO

Genesis 3 in the IRVP

Genesis 3 in the IRVT

Genesis 3 in the IRVT2

Genesis 3 in the IRVU

Genesis 3 in the ISVN

Genesis 3 in the JSNT

Genesis 3 in the KAPI

Genesis 3 in the KBT1ETNIK

Genesis 3 in the KBV

Genesis 3 in the KJV

Genesis 3 in the KNFD

Genesis 3 in the LBA

Genesis 3 in the LBLA

Genesis 3 in the LNT

Genesis 3 in the LSV

Genesis 3 in the MAAL

Genesis 3 in the MBV

Genesis 3 in the MBV2

Genesis 3 in the MHNT

Genesis 3 in the MKNFD

Genesis 3 in the MNG

Genesis 3 in the MNT

Genesis 3 in the MNT2

Genesis 3 in the MRS1T

Genesis 3 in the NAA

Genesis 3 in the NASB

Genesis 3 in the NBLA

Genesis 3 in the NBS

Genesis 3 in the NBVTP

Genesis 3 in the NET2

Genesis 3 in the NIV11

Genesis 3 in the NNT

Genesis 3 in the NNT2

Genesis 3 in the NNT3

Genesis 3 in the PDDPT

Genesis 3 in the PFNT

Genesis 3 in the RMNT

Genesis 3 in the SBIAS

Genesis 3 in the SBIBS

Genesis 3 in the SBIBS2

Genesis 3 in the SBICS

Genesis 3 in the SBIDS

Genesis 3 in the SBIGS

Genesis 3 in the SBIHS

Genesis 3 in the SBIIS

Genesis 3 in the SBIIS2

Genesis 3 in the SBIIS3

Genesis 3 in the SBIKS

Genesis 3 in the SBIKS2

Genesis 3 in the SBIMS

Genesis 3 in the SBIOS

Genesis 3 in the SBIPS

Genesis 3 in the SBISS

Genesis 3 in the SBITS

Genesis 3 in the SBITS2

Genesis 3 in the SBITS3

Genesis 3 in the SBITS4

Genesis 3 in the SBIUS

Genesis 3 in the SBIVS

Genesis 3 in the SBT

Genesis 3 in the SBT1E

Genesis 3 in the SCHL

Genesis 3 in the SNT

Genesis 3 in the SUSU

Genesis 3 in the SUSU2

Genesis 3 in the SYNO

Genesis 3 in the TBIAOTANT

Genesis 3 in the TBT1E

Genesis 3 in the TBT1E2

Genesis 3 in the TFTIP

Genesis 3 in the TFTU

Genesis 3 in the TGNTATF3T

Genesis 3 in the THAI

Genesis 3 in the TNFD

Genesis 3 in the TNT

Genesis 3 in the TNTIK

Genesis 3 in the TNTIL

Genesis 3 in the TNTIN

Genesis 3 in the TNTIP

Genesis 3 in the TNTIZ

Genesis 3 in the TOMA

Genesis 3 in the TTENT

Genesis 3 in the UBG

Genesis 3 in the UGV

Genesis 3 in the UGV2

Genesis 3 in the UGV3

Genesis 3 in the VBL

Genesis 3 in the VDCC

Genesis 3 in the YALU

Genesis 3 in the YAPE

Genesis 3 in the YBVTP

Genesis 3 in the ZBP