Genesis 4 (BOICB)

1 Emesịa, Adam na nwunye ya Iiv dinakọrọ dịka di na nwunye. Iiv tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye ha gụrụ Ken. Iiv sịrị, “Site nʼinyeaka ONYENWE ANYỊ, amụtala m nwa nwoke!” 2 Emesịa Iiv mụtara nwanne ya nwoke Ebel.Ebel ghọrọ onye na-azụ igwe atụrụ. Ma Ken ghọrọ onye ọrụ ubi. 3 Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ken wetaara ONYENWE ANYỊ ụfọdụ ihe ubi ya dịka onyinye. 4 Ma Ebel, ya onwe ya nyekwara onyinye site nʼigwe ewu na atụrụ ya e bụ ụzọ mụọ, nke mara abụba. ONYENWE ANYỊ nabatara Ebel na onyinye ya, 5 ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ. 6 Ma ONYENWE ANYỊ jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ? 7 Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya.” 8 Ken gwara nwanne ya Ebel sị, “Bịa soro m ka anyị banye ọhịa.” Mgbe ha nọ nʼebe ahụ, Ken jidere nwanne ya gbuo ya. 9 Emesịa, ONYENWE ANYỊ jụrụ Ken ajụjụ sị, “Ebee ka Ebel nwanne gị nwoke nọ?”Ọ zaghachiri, “Amaghị m. Abụ m onye nche nwanne m?” 10 Ma ONYENWE ANYỊ zara sị ya, “Gịnị ka i mere? Gee ntị, ọbara nwanne gị na-akpọku m site nʼala. 11 Site ugbu a gaa nʼihu ị bụrụla onye a bụrụ ọnụ, na onye e si nʼala chụpụ, ala ahụ meghepụrụ ọnụ ya nabata ọbara nwanne gị, site nʼaka gị. 12 Mgbe ị kụrụ ihe ọbụla nʼime ya, ala agaghị enye gị mkpụrụ ya nʼuju. Site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị nʼihe nʼụwa.” 13 Ken zara ONYENWE ANYỊ, “Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu. 14 Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.” 15 ONYENWE ANYỊ zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, ONYENWE ANYỊ kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya. 16 Ken sitere nʼihu ONYENWE ANYỊ pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden. 17 Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke. 18 Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek. 19 Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila. 20 Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu. 21 Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi. 22 Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama. 23 Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha,“Geenụ m ntị, Ada na Zila,unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ.Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ,otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ. 24 Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa,mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.” 25 Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.” 26 Set mụtara nwa nwoke gụọ ya Enọsh.Nʼoge ahụ ka ụmụ mmadụ bidoro ịkpọku aha ONYENWE ANYỊ.

In Other Versions

Genesis 4 in the ANGEFD

Genesis 4 in the ANTPNG2D

Genesis 4 in the AS21

Genesis 4 in the BAGH

Genesis 4 in the BBPNG

Genesis 4 in the BBT1E

Genesis 4 in the BDS

Genesis 4 in the BEV

Genesis 4 in the BHAD

Genesis 4 in the BIB

Genesis 4 in the BLPT

Genesis 4 in the BNT

Genesis 4 in the BNTABOOT

Genesis 4 in the BNTLV

Genesis 4 in the BOATCB

Genesis 4 in the BOATCB2

Genesis 4 in the BOBCV

Genesis 4 in the BOCNT

Genesis 4 in the BOECS

Genesis 4 in the BOGWICC

Genesis 4 in the BOHCB

Genesis 4 in the BOHCV

Genesis 4 in the BOHLNT

Genesis 4 in the BOHNTLTAL

Genesis 4 in the BOILNTAP

Genesis 4 in the BOITCV

Genesis 4 in the BOKCV

Genesis 4 in the BOKCV2

Genesis 4 in the BOKHWOG

Genesis 4 in the BOKSSV

Genesis 4 in the BOLCB

Genesis 4 in the BOLCB2

Genesis 4 in the BOMCV

Genesis 4 in the BONAV

Genesis 4 in the BONCB

Genesis 4 in the BONLT

Genesis 4 in the BONUT2

Genesis 4 in the BOPLNT

Genesis 4 in the BOSCB

Genesis 4 in the BOSNC

Genesis 4 in the BOTLNT

Genesis 4 in the BOVCB

Genesis 4 in the BOYCB

Genesis 4 in the BPBB

Genesis 4 in the BPH

Genesis 4 in the BSB

Genesis 4 in the CCB

Genesis 4 in the CUV

Genesis 4 in the CUVS

Genesis 4 in the DBT

Genesis 4 in the DGDNT

Genesis 4 in the DHNT

Genesis 4 in the DNT

Genesis 4 in the ELBE

Genesis 4 in the EMTV

Genesis 4 in the ESV

Genesis 4 in the FBV

Genesis 4 in the FEB

Genesis 4 in the GGMNT

Genesis 4 in the GNT

Genesis 4 in the HARY

Genesis 4 in the HNT

Genesis 4 in the IRVA

Genesis 4 in the IRVB

Genesis 4 in the IRVG

Genesis 4 in the IRVH

Genesis 4 in the IRVK

Genesis 4 in the IRVM

Genesis 4 in the IRVM2

Genesis 4 in the IRVO

Genesis 4 in the IRVP

Genesis 4 in the IRVT

Genesis 4 in the IRVT2

Genesis 4 in the IRVU

Genesis 4 in the ISVN

Genesis 4 in the JSNT

Genesis 4 in the KAPI

Genesis 4 in the KBT1ETNIK

Genesis 4 in the KBV

Genesis 4 in the KJV

Genesis 4 in the KNFD

Genesis 4 in the LBA

Genesis 4 in the LBLA

Genesis 4 in the LNT

Genesis 4 in the LSV

Genesis 4 in the MAAL

Genesis 4 in the MBV

Genesis 4 in the MBV2

Genesis 4 in the MHNT

Genesis 4 in the MKNFD

Genesis 4 in the MNG

Genesis 4 in the MNT

Genesis 4 in the MNT2

Genesis 4 in the MRS1T

Genesis 4 in the NAA

Genesis 4 in the NASB

Genesis 4 in the NBLA

Genesis 4 in the NBS

Genesis 4 in the NBVTP

Genesis 4 in the NET2

Genesis 4 in the NIV11

Genesis 4 in the NNT

Genesis 4 in the NNT2

Genesis 4 in the NNT3

Genesis 4 in the PDDPT

Genesis 4 in the PFNT

Genesis 4 in the RMNT

Genesis 4 in the SBIAS

Genesis 4 in the SBIBS

Genesis 4 in the SBIBS2

Genesis 4 in the SBICS

Genesis 4 in the SBIDS

Genesis 4 in the SBIGS

Genesis 4 in the SBIHS

Genesis 4 in the SBIIS

Genesis 4 in the SBIIS2

Genesis 4 in the SBIIS3

Genesis 4 in the SBIKS

Genesis 4 in the SBIKS2

Genesis 4 in the SBIMS

Genesis 4 in the SBIOS

Genesis 4 in the SBIPS

Genesis 4 in the SBISS

Genesis 4 in the SBITS

Genesis 4 in the SBITS2

Genesis 4 in the SBITS3

Genesis 4 in the SBITS4

Genesis 4 in the SBIUS

Genesis 4 in the SBIVS

Genesis 4 in the SBT

Genesis 4 in the SBT1E

Genesis 4 in the SCHL

Genesis 4 in the SNT

Genesis 4 in the SUSU

Genesis 4 in the SUSU2

Genesis 4 in the SYNO

Genesis 4 in the TBIAOTANT

Genesis 4 in the TBT1E

Genesis 4 in the TBT1E2

Genesis 4 in the TFTIP

Genesis 4 in the TFTU

Genesis 4 in the TGNTATF3T

Genesis 4 in the THAI

Genesis 4 in the TNFD

Genesis 4 in the TNT

Genesis 4 in the TNTIK

Genesis 4 in the TNTIL

Genesis 4 in the TNTIN

Genesis 4 in the TNTIP

Genesis 4 in the TNTIZ

Genesis 4 in the TOMA

Genesis 4 in the TTENT

Genesis 4 in the UBG

Genesis 4 in the UGV

Genesis 4 in the UGV2

Genesis 4 in the UGV3

Genesis 4 in the VBL

Genesis 4 in the VDCC

Genesis 4 in the YALU

Genesis 4 in the YAPE

Genesis 4 in the YBVTP

Genesis 4 in the ZBP