Habakkuk 2 (BOICB)
1 Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m,guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ.Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m,na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a. 2 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ zara m sị,“Dee ọhụ ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe.Depụta ya nke ọma,ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya. 3 Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka,ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ,Ọ gaghị abụkwa ụgha.Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya,nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo,ọ gaghị anọ tee aka. 4 “Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu;ọchịchọ ya ezikwaghị ezima onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe ya dị ndụ. 5 Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ,onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike.Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ,ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ.Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya,ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. 6 “Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya,“ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi,ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranyasite nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’ 7 Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede?Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji?Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ. 8 Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche,ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere.Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ,i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha. 9 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ,nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu,nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa. 10 I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ,sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere. 11 Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị.Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ. 12 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo,nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike. 13 Ọ bụ na ọ bụghị uche ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile,na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ,na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi? 14 Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube ONYENWE ANYỊ,dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 15 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya,nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya,ka o si otu a hụ ọtọ ya anya. 16 Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere.Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu.Nʼihi na iko dị nʼaka nri ONYENWE ANYỊ na-abịakwute gị.Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị. 17 Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị.Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi.Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ,bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha. 18 “Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya?Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha?Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara,nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere. 19 Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’O nwere ike izi mmadụ ihe?Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie,ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.” 20 Ma ONYENWE ANYỊ nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya.Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.
In Other Versions
Habakkuk 2 in the ANGEFD
Habakkuk 2 in the ANTPNG2D
Habakkuk 2 in the AS21
Habakkuk 2 in the BAGH
Habakkuk 2 in the BBPNG
Habakkuk 2 in the BBT1E
Habakkuk 2 in the BDS
Habakkuk 2 in the BEV
Habakkuk 2 in the BHAD
Habakkuk 2 in the BIB
Habakkuk 2 in the BLPT
Habakkuk 2 in the BNT
Habakkuk 2 in the BNTABOOT
Habakkuk 2 in the BNTLV
Habakkuk 2 in the BOATCB
Habakkuk 2 in the BOATCB2
Habakkuk 2 in the BOBCV
Habakkuk 2 in the BOCNT
Habakkuk 2 in the BOECS
Habakkuk 2 in the BOGWICC
Habakkuk 2 in the BOHCB
Habakkuk 2 in the BOHCV
Habakkuk 2 in the BOHLNT
Habakkuk 2 in the BOHNTLTAL
Habakkuk 2 in the BOILNTAP
Habakkuk 2 in the BOITCV
Habakkuk 2 in the BOKCV
Habakkuk 2 in the BOKCV2
Habakkuk 2 in the BOKHWOG
Habakkuk 2 in the BOKSSV
Habakkuk 2 in the BOLCB
Habakkuk 2 in the BOLCB2
Habakkuk 2 in the BOMCV
Habakkuk 2 in the BONAV
Habakkuk 2 in the BONCB
Habakkuk 2 in the BONLT
Habakkuk 2 in the BONUT2
Habakkuk 2 in the BOPLNT
Habakkuk 2 in the BOSCB
Habakkuk 2 in the BOSNC
Habakkuk 2 in the BOTLNT
Habakkuk 2 in the BOVCB
Habakkuk 2 in the BOYCB
Habakkuk 2 in the BPBB
Habakkuk 2 in the BPH
Habakkuk 2 in the BSB
Habakkuk 2 in the CCB
Habakkuk 2 in the CUV
Habakkuk 2 in the CUVS
Habakkuk 2 in the DBT
Habakkuk 2 in the DGDNT
Habakkuk 2 in the DHNT
Habakkuk 2 in the DNT
Habakkuk 2 in the ELBE
Habakkuk 2 in the EMTV
Habakkuk 2 in the ESV
Habakkuk 2 in the FBV
Habakkuk 2 in the FEB
Habakkuk 2 in the GGMNT
Habakkuk 2 in the GNT
Habakkuk 2 in the HARY
Habakkuk 2 in the HNT
Habakkuk 2 in the IRVA
Habakkuk 2 in the IRVB
Habakkuk 2 in the IRVG
Habakkuk 2 in the IRVH
Habakkuk 2 in the IRVK
Habakkuk 2 in the IRVM
Habakkuk 2 in the IRVM2
Habakkuk 2 in the IRVO
Habakkuk 2 in the IRVP
Habakkuk 2 in the IRVT
Habakkuk 2 in the IRVT2
Habakkuk 2 in the IRVU
Habakkuk 2 in the ISVN
Habakkuk 2 in the JSNT
Habakkuk 2 in the KAPI
Habakkuk 2 in the KBT1ETNIK
Habakkuk 2 in the KBV
Habakkuk 2 in the KJV
Habakkuk 2 in the KNFD
Habakkuk 2 in the LBA
Habakkuk 2 in the LBLA
Habakkuk 2 in the LNT
Habakkuk 2 in the LSV
Habakkuk 2 in the MAAL
Habakkuk 2 in the MBV
Habakkuk 2 in the MBV2
Habakkuk 2 in the MHNT
Habakkuk 2 in the MKNFD
Habakkuk 2 in the MNG
Habakkuk 2 in the MNT
Habakkuk 2 in the MNT2
Habakkuk 2 in the MRS1T
Habakkuk 2 in the NAA
Habakkuk 2 in the NASB
Habakkuk 2 in the NBLA
Habakkuk 2 in the NBS
Habakkuk 2 in the NBVTP
Habakkuk 2 in the NET2
Habakkuk 2 in the NIV11
Habakkuk 2 in the NNT
Habakkuk 2 in the NNT2
Habakkuk 2 in the NNT3
Habakkuk 2 in the PDDPT
Habakkuk 2 in the PFNT
Habakkuk 2 in the RMNT
Habakkuk 2 in the SBIAS
Habakkuk 2 in the SBIBS
Habakkuk 2 in the SBIBS2
Habakkuk 2 in the SBICS
Habakkuk 2 in the SBIDS
Habakkuk 2 in the SBIGS
Habakkuk 2 in the SBIHS
Habakkuk 2 in the SBIIS
Habakkuk 2 in the SBIIS2
Habakkuk 2 in the SBIIS3
Habakkuk 2 in the SBIKS
Habakkuk 2 in the SBIKS2
Habakkuk 2 in the SBIMS
Habakkuk 2 in the SBIOS
Habakkuk 2 in the SBIPS
Habakkuk 2 in the SBISS
Habakkuk 2 in the SBITS
Habakkuk 2 in the SBITS2
Habakkuk 2 in the SBITS3
Habakkuk 2 in the SBITS4
Habakkuk 2 in the SBIUS
Habakkuk 2 in the SBIVS
Habakkuk 2 in the SBT
Habakkuk 2 in the SBT1E
Habakkuk 2 in the SCHL
Habakkuk 2 in the SNT
Habakkuk 2 in the SUSU
Habakkuk 2 in the SUSU2
Habakkuk 2 in the SYNO
Habakkuk 2 in the TBIAOTANT
Habakkuk 2 in the TBT1E
Habakkuk 2 in the TBT1E2
Habakkuk 2 in the TFTIP
Habakkuk 2 in the TFTU
Habakkuk 2 in the TGNTATF3T
Habakkuk 2 in the THAI
Habakkuk 2 in the TNFD
Habakkuk 2 in the TNT
Habakkuk 2 in the TNTIK
Habakkuk 2 in the TNTIL
Habakkuk 2 in the TNTIN
Habakkuk 2 in the TNTIP
Habakkuk 2 in the TNTIZ
Habakkuk 2 in the TOMA
Habakkuk 2 in the TTENT
Habakkuk 2 in the UBG
Habakkuk 2 in the UGV
Habakkuk 2 in the UGV2
Habakkuk 2 in the UGV3
Habakkuk 2 in the VBL
Habakkuk 2 in the VDCC
Habakkuk 2 in the YALU
Habakkuk 2 in the YAPE
Habakkuk 2 in the YBVTP
Habakkuk 2 in the ZBP