Haggai 1 (BOICB)

1 Ozi ONYENWE ANYỊ, nke rutere Hegai onye amụma, nke o ziri Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja. Ozi a rutere ya nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa nke isii. 2 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Ndị a na-asị, ‘Nʼoge ahụ erubeghị mgbe anyị ga-ewu ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ.’ ” 3 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ bịara site nʼọnụ Hegai, onye amụma na-asị, 4 “Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?” 5 Ugbu a, ihe a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Lezienụ ụzọ unu anya. 6 Unu na-agha mkpụrụ, ma na-enweta naanị ihe ntakịrị. Unu na-eri nri, ma ihe unu na-eri adịghị ezuru unu. Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu adịghị aṅụju afọ ka o si mmasị unu. Unu na-eyikwasị onwe unu uwe, ma ọ dịghị achụ unu oyi. Unu na-anata ụgwọ ọrụ, maọbụ nʼakpa puru epu ka unu na-etinye ya.” 7 Ihe a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu. 8 Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru. 9 “Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya. 10 Ya mere, nʼihi unu ka eluigwe ji jide igirigi ha, ala ejidekwala ihe omume nke ubi. 11 Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.” 12 Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị niile fọdụrụ, ṅara ntị nʼolu ONYENWE ANYỊ Chineke ha, na nʼozi Hegai onye amụma, dịka ONYENWE ANYỊ Chineke ha zitere ya. Ndị Izrel niile tụkwara egwu ONYENWE ANYỊ. 13 Mgbe ahụ Hegai, onyeozi ONYENWE ANYỊ, ziri ndị mmadụ ahụ niile ozi Onyenwe anyị, sị: “Mụ onwe m nọnyeere unu,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 14 Ya mere, ONYENWE ANYỊ kwaliri mmụọ Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na mmụọ Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja na mmụọ ndị niile ahụ fọdụrụ nʼala ahụ. Ha niile bịara bido ọrụ nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha, 15 nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa nke isii.Ọ bụ nʼafọ nke abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs,

In Other Versions

Haggai 1 in the ANGEFD

Haggai 1 in the ANTPNG2D

Haggai 1 in the AS21

Haggai 1 in the BAGH

Haggai 1 in the BBPNG

Haggai 1 in the BBT1E

Haggai 1 in the BDS

Haggai 1 in the BEV

Haggai 1 in the BHAD

Haggai 1 in the BIB

Haggai 1 in the BLPT

Haggai 1 in the BNT

Haggai 1 in the BNTABOOT

Haggai 1 in the BNTLV

Haggai 1 in the BOATCB

Haggai 1 in the BOATCB2

Haggai 1 in the BOBCV

Haggai 1 in the BOCNT

Haggai 1 in the BOECS

Haggai 1 in the BOGWICC

Haggai 1 in the BOHCB

Haggai 1 in the BOHCV

Haggai 1 in the BOHLNT

Haggai 1 in the BOHNTLTAL

Haggai 1 in the BOILNTAP

Haggai 1 in the BOITCV

Haggai 1 in the BOKCV

Haggai 1 in the BOKCV2

Haggai 1 in the BOKHWOG

Haggai 1 in the BOKSSV

Haggai 1 in the BOLCB

Haggai 1 in the BOLCB2

Haggai 1 in the BOMCV

Haggai 1 in the BONAV

Haggai 1 in the BONCB

Haggai 1 in the BONLT

Haggai 1 in the BONUT2

Haggai 1 in the BOPLNT

Haggai 1 in the BOSCB

Haggai 1 in the BOSNC

Haggai 1 in the BOTLNT

Haggai 1 in the BOVCB

Haggai 1 in the BOYCB

Haggai 1 in the BPBB

Haggai 1 in the BPH

Haggai 1 in the BSB

Haggai 1 in the CCB

Haggai 1 in the CUV

Haggai 1 in the CUVS

Haggai 1 in the DBT

Haggai 1 in the DGDNT

Haggai 1 in the DHNT

Haggai 1 in the DNT

Haggai 1 in the ELBE

Haggai 1 in the EMTV

Haggai 1 in the ESV

Haggai 1 in the FBV

Haggai 1 in the FEB

Haggai 1 in the GGMNT

Haggai 1 in the GNT

Haggai 1 in the HARY

Haggai 1 in the HNT

Haggai 1 in the IRVA

Haggai 1 in the IRVB

Haggai 1 in the IRVG

Haggai 1 in the IRVH

Haggai 1 in the IRVK

Haggai 1 in the IRVM

Haggai 1 in the IRVM2

Haggai 1 in the IRVO

Haggai 1 in the IRVP

Haggai 1 in the IRVT

Haggai 1 in the IRVT2

Haggai 1 in the IRVU

Haggai 1 in the ISVN

Haggai 1 in the JSNT

Haggai 1 in the KAPI

Haggai 1 in the KBT1ETNIK

Haggai 1 in the KBV

Haggai 1 in the KJV

Haggai 1 in the KNFD

Haggai 1 in the LBA

Haggai 1 in the LBLA

Haggai 1 in the LNT

Haggai 1 in the LSV

Haggai 1 in the MAAL

Haggai 1 in the MBV

Haggai 1 in the MBV2

Haggai 1 in the MHNT

Haggai 1 in the MKNFD

Haggai 1 in the MNG

Haggai 1 in the MNT

Haggai 1 in the MNT2

Haggai 1 in the MRS1T

Haggai 1 in the NAA

Haggai 1 in the NASB

Haggai 1 in the NBLA

Haggai 1 in the NBS

Haggai 1 in the NBVTP

Haggai 1 in the NET2

Haggai 1 in the NIV11

Haggai 1 in the NNT

Haggai 1 in the NNT2

Haggai 1 in the NNT3

Haggai 1 in the PDDPT

Haggai 1 in the PFNT

Haggai 1 in the RMNT

Haggai 1 in the SBIAS

Haggai 1 in the SBIBS

Haggai 1 in the SBIBS2

Haggai 1 in the SBICS

Haggai 1 in the SBIDS

Haggai 1 in the SBIGS

Haggai 1 in the SBIHS

Haggai 1 in the SBIIS

Haggai 1 in the SBIIS2

Haggai 1 in the SBIIS3

Haggai 1 in the SBIKS

Haggai 1 in the SBIKS2

Haggai 1 in the SBIMS

Haggai 1 in the SBIOS

Haggai 1 in the SBIPS

Haggai 1 in the SBISS

Haggai 1 in the SBITS

Haggai 1 in the SBITS2

Haggai 1 in the SBITS3

Haggai 1 in the SBITS4

Haggai 1 in the SBIUS

Haggai 1 in the SBIVS

Haggai 1 in the SBT

Haggai 1 in the SBT1E

Haggai 1 in the SCHL

Haggai 1 in the SNT

Haggai 1 in the SUSU

Haggai 1 in the SUSU2

Haggai 1 in the SYNO

Haggai 1 in the TBIAOTANT

Haggai 1 in the TBT1E

Haggai 1 in the TBT1E2

Haggai 1 in the TFTIP

Haggai 1 in the TFTU

Haggai 1 in the TGNTATF3T

Haggai 1 in the THAI

Haggai 1 in the TNFD

Haggai 1 in the TNT

Haggai 1 in the TNTIK

Haggai 1 in the TNTIL

Haggai 1 in the TNTIN

Haggai 1 in the TNTIP

Haggai 1 in the TNTIZ

Haggai 1 in the TOMA

Haggai 1 in the TTENT

Haggai 1 in the UBG

Haggai 1 in the UGV

Haggai 1 in the UGV2

Haggai 1 in the UGV3

Haggai 1 in the VBL

Haggai 1 in the VDCC

Haggai 1 in the YALU

Haggai 1 in the YAPE

Haggai 1 in the YBVTP

Haggai 1 in the ZBP