Hosea 10 (BOICB)
1 Izrel bụ osisi vaịnị dị mma,nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu.Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba,otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya.Dịka ala ya na-abawanyekwa ụbaotu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ. 2 Obi ha dị aghụghọ,ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha.Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha,ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile. 3 Ma ugbu a, ha ga-asị,“Anyị enweghị eze,nʼihi na anyị anaghị atụ ONYENWE ANYỊ egwu,ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?” 4 Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru,were ịṅụ iyina-agbakwa ndụ,ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile,dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi. 5 Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọnʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.Ndị ya ga-eruru ya ụjụ,otu a kwa ka ndị nchụaja yarụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ,maka ebube nke a napụrụ ya. 6 Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa,dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ.A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu,Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ. 7 A ga-ala eze Sameria nʼiyidịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile, 8 a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven,ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel,ogwu na uke ga-etolitekwa,nʼebe nchụaja ha.Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!”Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!” 9 “Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie,i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị.Ọ bụ na agha agaghị eri habụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea? 10 Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ;mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha,taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha. 11 Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụnke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya,nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolunʼolu ọma ya ahụ.Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya,Juda aghaghị ịkọ ala ubiJekọb ga-akọze ala nye onwe ya. 12 Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu,unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya.Kọgharịakwanụ obi unu siri ike,nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ ONYENWE ANYỊ,tutu ruo mgbe ọ bịarawụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume. 13 Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume;unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi.Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha.Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu,na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu. 14 Nʼihi ya, ụzụ nke ibu agha aghaghị ibili nʼetiti unu,ebe unu niile e wusiri ike ga-ada.Ọ ga-ada dịka Shalman si bibie Bet Abel nʼụbọchị agha,mgbe a tụpịara ndị bụ nne na ụmụ ha. 15 Ọ bụ ihe dị otu a ga-adakwasị gị, Betel,nʼihi na ajọ omume gị dị ukwuu.Mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ,a ga-ala eze Izrel nʼiyi kpamkpam.
In Other Versions
Hosea 10 in the ANGEFD
Hosea 10 in the ANTPNG2D
Hosea 10 in the AS21
Hosea 10 in the BAGH
Hosea 10 in the BBPNG
Hosea 10 in the BBT1E
Hosea 10 in the BDS
Hosea 10 in the BEV
Hosea 10 in the BHAD
Hosea 10 in the BIB
Hosea 10 in the BLPT
Hosea 10 in the BNT
Hosea 10 in the BNTABOOT
Hosea 10 in the BNTLV
Hosea 10 in the BOATCB
Hosea 10 in the BOATCB2
Hosea 10 in the BOBCV
Hosea 10 in the BOCNT
Hosea 10 in the BOECS
Hosea 10 in the BOGWICC
Hosea 10 in the BOHCB
Hosea 10 in the BOHCV
Hosea 10 in the BOHLNT
Hosea 10 in the BOHNTLTAL
Hosea 10 in the BOILNTAP
Hosea 10 in the BOITCV
Hosea 10 in the BOKCV
Hosea 10 in the BOKCV2
Hosea 10 in the BOKHWOG
Hosea 10 in the BOKSSV
Hosea 10 in the BOLCB
Hosea 10 in the BOLCB2
Hosea 10 in the BOMCV
Hosea 10 in the BONAV
Hosea 10 in the BONCB
Hosea 10 in the BONLT
Hosea 10 in the BONUT2
Hosea 10 in the BOPLNT
Hosea 10 in the BOSCB
Hosea 10 in the BOSNC
Hosea 10 in the BOTLNT
Hosea 10 in the BOVCB
Hosea 10 in the BOYCB
Hosea 10 in the BPBB
Hosea 10 in the BPH
Hosea 10 in the BSB
Hosea 10 in the CCB
Hosea 10 in the CUV
Hosea 10 in the CUVS
Hosea 10 in the DBT
Hosea 10 in the DGDNT
Hosea 10 in the DHNT
Hosea 10 in the DNT
Hosea 10 in the ELBE
Hosea 10 in the EMTV
Hosea 10 in the ESV
Hosea 10 in the FBV
Hosea 10 in the FEB
Hosea 10 in the GGMNT
Hosea 10 in the GNT
Hosea 10 in the HARY
Hosea 10 in the HNT
Hosea 10 in the IRVA
Hosea 10 in the IRVB
Hosea 10 in the IRVG
Hosea 10 in the IRVH
Hosea 10 in the IRVK
Hosea 10 in the IRVM
Hosea 10 in the IRVM2
Hosea 10 in the IRVO
Hosea 10 in the IRVP
Hosea 10 in the IRVT
Hosea 10 in the IRVT2
Hosea 10 in the IRVU
Hosea 10 in the ISVN
Hosea 10 in the JSNT
Hosea 10 in the KAPI
Hosea 10 in the KBT1ETNIK
Hosea 10 in the KBV
Hosea 10 in the KJV
Hosea 10 in the KNFD
Hosea 10 in the LBA
Hosea 10 in the LBLA
Hosea 10 in the LNT
Hosea 10 in the LSV
Hosea 10 in the MAAL
Hosea 10 in the MBV
Hosea 10 in the MBV2
Hosea 10 in the MHNT
Hosea 10 in the MKNFD
Hosea 10 in the MNG
Hosea 10 in the MNT
Hosea 10 in the MNT2
Hosea 10 in the MRS1T
Hosea 10 in the NAA
Hosea 10 in the NASB
Hosea 10 in the NBLA
Hosea 10 in the NBS
Hosea 10 in the NBVTP
Hosea 10 in the NET2
Hosea 10 in the NIV11
Hosea 10 in the NNT
Hosea 10 in the NNT2
Hosea 10 in the NNT3
Hosea 10 in the PDDPT
Hosea 10 in the PFNT
Hosea 10 in the RMNT
Hosea 10 in the SBIAS
Hosea 10 in the SBIBS
Hosea 10 in the SBIBS2
Hosea 10 in the SBICS
Hosea 10 in the SBIDS
Hosea 10 in the SBIGS
Hosea 10 in the SBIHS
Hosea 10 in the SBIIS
Hosea 10 in the SBIIS2
Hosea 10 in the SBIIS3
Hosea 10 in the SBIKS
Hosea 10 in the SBIKS2
Hosea 10 in the SBIMS
Hosea 10 in the SBIOS
Hosea 10 in the SBIPS
Hosea 10 in the SBISS
Hosea 10 in the SBITS
Hosea 10 in the SBITS2
Hosea 10 in the SBITS3
Hosea 10 in the SBITS4
Hosea 10 in the SBIUS
Hosea 10 in the SBIVS
Hosea 10 in the SBT
Hosea 10 in the SBT1E
Hosea 10 in the SCHL
Hosea 10 in the SNT
Hosea 10 in the SUSU
Hosea 10 in the SUSU2
Hosea 10 in the SYNO
Hosea 10 in the TBIAOTANT
Hosea 10 in the TBT1E
Hosea 10 in the TBT1E2
Hosea 10 in the TFTIP
Hosea 10 in the TFTU
Hosea 10 in the TGNTATF3T
Hosea 10 in the THAI
Hosea 10 in the TNFD
Hosea 10 in the TNT
Hosea 10 in the TNTIK
Hosea 10 in the TNTIL
Hosea 10 in the TNTIN
Hosea 10 in the TNTIP
Hosea 10 in the TNTIZ
Hosea 10 in the TOMA
Hosea 10 in the TTENT
Hosea 10 in the UBG
Hosea 10 in the UGV
Hosea 10 in the UGV2
Hosea 10 in the UGV3
Hosea 10 in the VBL
Hosea 10 in the VDCC
Hosea 10 in the YALU
Hosea 10 in the YAPE
Hosea 10 in the YBVTP
Hosea 10 in the ZBP