Hosea 4 (BOICB)
1 Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ unu ndị Izrel,nʼihi na ONYENWE ANYỊ nwere ebubomegide unu ndị bi nʼala a.“Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya,ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile. 2 Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ,izu ohi na ịkwa iko.Ọgbaaghara dị nʼebe niile,ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka. 3 Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ,ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe,ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ. 4 “Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu,ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo.Nʼihi na ndị gị dịkandị na-eseso onye nchụaja okwu. 5 Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị,ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ.Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi 6 ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma,aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m;ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụmụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ. 7 Ka ha na-abawanye nʼọnụọgụgụ,otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m,ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere. 8 Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m.Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu. 9 Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa.Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile. 10 “Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha.Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba,nʼihi na ha ajụla ONYENWE ANYỊ,were onwe ha nyefee 11 nʼaka ịgba akwụna,na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ,nke na-ewepụ mmụọ nghọta. 12 Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme,na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase.Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo;ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha. 13 Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile,na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile,na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint,ebe ndo ya dị ezi mma.Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna,ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko. 14 “Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ,mgbe ha na-agba akwụna,maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụmgbe ha na-akwa iko,nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna,ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja,ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi. 15 “Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel,ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal,unu agakwala ruo Bet-Aven,unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ.’ 16 Ndị Izrel dị isiikedịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. ONYENWE ANYỊ ọ ga-esi aṅaa zụọ hadịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara? 17 Ifrem na arụsị agbaala ndụhapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya. 18 Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ,ha na-aga nʼihu na-agba akwụna;ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha. 19 Ifufe ga-ebupụ ha,aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.
In Other Versions
Hosea 4 in the ANGEFD
Hosea 4 in the ANTPNG2D
Hosea 4 in the AS21
Hosea 4 in the BAGH
Hosea 4 in the BBPNG
Hosea 4 in the BBT1E
Hosea 4 in the BDS
Hosea 4 in the BEV
Hosea 4 in the BHAD
Hosea 4 in the BIB
Hosea 4 in the BLPT
Hosea 4 in the BNT
Hosea 4 in the BNTABOOT
Hosea 4 in the BNTLV
Hosea 4 in the BOATCB
Hosea 4 in the BOATCB2
Hosea 4 in the BOBCV
Hosea 4 in the BOCNT
Hosea 4 in the BOECS
Hosea 4 in the BOGWICC
Hosea 4 in the BOHCB
Hosea 4 in the BOHCV
Hosea 4 in the BOHLNT
Hosea 4 in the BOHNTLTAL
Hosea 4 in the BOILNTAP
Hosea 4 in the BOITCV
Hosea 4 in the BOKCV
Hosea 4 in the BOKCV2
Hosea 4 in the BOKHWOG
Hosea 4 in the BOKSSV
Hosea 4 in the BOLCB
Hosea 4 in the BOLCB2
Hosea 4 in the BOMCV
Hosea 4 in the BONAV
Hosea 4 in the BONCB
Hosea 4 in the BONLT
Hosea 4 in the BONUT2
Hosea 4 in the BOPLNT
Hosea 4 in the BOSCB
Hosea 4 in the BOSNC
Hosea 4 in the BOTLNT
Hosea 4 in the BOVCB
Hosea 4 in the BOYCB
Hosea 4 in the BPBB
Hosea 4 in the BPH
Hosea 4 in the BSB
Hosea 4 in the CCB
Hosea 4 in the CUV
Hosea 4 in the CUVS
Hosea 4 in the DBT
Hosea 4 in the DGDNT
Hosea 4 in the DHNT
Hosea 4 in the DNT
Hosea 4 in the ELBE
Hosea 4 in the EMTV
Hosea 4 in the ESV
Hosea 4 in the FBV
Hosea 4 in the FEB
Hosea 4 in the GGMNT
Hosea 4 in the GNT
Hosea 4 in the HARY
Hosea 4 in the HNT
Hosea 4 in the IRVA
Hosea 4 in the IRVB
Hosea 4 in the IRVG
Hosea 4 in the IRVH
Hosea 4 in the IRVK
Hosea 4 in the IRVM
Hosea 4 in the IRVM2
Hosea 4 in the IRVO
Hosea 4 in the IRVP
Hosea 4 in the IRVT
Hosea 4 in the IRVT2
Hosea 4 in the IRVU
Hosea 4 in the ISVN
Hosea 4 in the JSNT
Hosea 4 in the KAPI
Hosea 4 in the KBT1ETNIK
Hosea 4 in the KBV
Hosea 4 in the KJV
Hosea 4 in the KNFD
Hosea 4 in the LBA
Hosea 4 in the LBLA
Hosea 4 in the LNT
Hosea 4 in the LSV
Hosea 4 in the MAAL
Hosea 4 in the MBV
Hosea 4 in the MBV2
Hosea 4 in the MHNT
Hosea 4 in the MKNFD
Hosea 4 in the MNG
Hosea 4 in the MNT
Hosea 4 in the MNT2
Hosea 4 in the MRS1T
Hosea 4 in the NAA
Hosea 4 in the NASB
Hosea 4 in the NBLA
Hosea 4 in the NBS
Hosea 4 in the NBVTP
Hosea 4 in the NET2
Hosea 4 in the NIV11
Hosea 4 in the NNT
Hosea 4 in the NNT2
Hosea 4 in the NNT3
Hosea 4 in the PDDPT
Hosea 4 in the PFNT
Hosea 4 in the RMNT
Hosea 4 in the SBIAS
Hosea 4 in the SBIBS
Hosea 4 in the SBIBS2
Hosea 4 in the SBICS
Hosea 4 in the SBIDS
Hosea 4 in the SBIGS
Hosea 4 in the SBIHS
Hosea 4 in the SBIIS
Hosea 4 in the SBIIS2
Hosea 4 in the SBIIS3
Hosea 4 in the SBIKS
Hosea 4 in the SBIKS2
Hosea 4 in the SBIMS
Hosea 4 in the SBIOS
Hosea 4 in the SBIPS
Hosea 4 in the SBISS
Hosea 4 in the SBITS
Hosea 4 in the SBITS2
Hosea 4 in the SBITS3
Hosea 4 in the SBITS4
Hosea 4 in the SBIUS
Hosea 4 in the SBIVS
Hosea 4 in the SBT
Hosea 4 in the SBT1E
Hosea 4 in the SCHL
Hosea 4 in the SNT
Hosea 4 in the SUSU
Hosea 4 in the SUSU2
Hosea 4 in the SYNO
Hosea 4 in the TBIAOTANT
Hosea 4 in the TBT1E
Hosea 4 in the TBT1E2
Hosea 4 in the TFTIP
Hosea 4 in the TFTU
Hosea 4 in the TGNTATF3T
Hosea 4 in the THAI
Hosea 4 in the TNFD
Hosea 4 in the TNT
Hosea 4 in the TNTIK
Hosea 4 in the TNTIL
Hosea 4 in the TNTIN
Hosea 4 in the TNTIP
Hosea 4 in the TNTIZ
Hosea 4 in the TOMA
Hosea 4 in the TTENT
Hosea 4 in the UBG
Hosea 4 in the UGV
Hosea 4 in the UGV2
Hosea 4 in the UGV3
Hosea 4 in the VBL
Hosea 4 in the VDCC
Hosea 4 in the YALU
Hosea 4 in the YAPE
Hosea 4 in the YBVTP
Hosea 4 in the ZBP