Isaiah 36 (BOICB)
1 Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib, bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, meriekwa ha. 2 Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru Hezekaya na Jerusalem. Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị Elu, nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa. 3 Eliakịm, nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, bụ ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ya. 4 Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya:“ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa, na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere? 5 Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi, mere i ji enupu isi nʼokpuru m? 6 Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi. 7 Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị ONYENWE ANYỊ bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja a?” 8 “ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha. 9 Ị ga-esi kwa aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya? 10 Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma ọ bụghị nkwado ONYENWE ANYỊ? ONYENWE ANYỊ ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ” 11 Mgbe ahụ Eliakịm, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.” 12 Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?” 13 Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa. 14 Nke a bụ ihe eze sịrị, Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu. 15 Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị ONYENWE ANYỊ obi, mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, ONYENWE ANYỊ aghaghị ịnapụta anyị. A gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’ 16 “Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya: 17 ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị jupụtara nʼime ya. 18 “Unu ekwela ka Hezekaya rafuo unu mgbe ọ na-asị, ‘ONYENWE ANYỊ ga-anapụta anyị.’ O nweela chi niile nke ndị mba ọzọ, nke napụtarala ala ha site nʼaka eze Asịrịa. 19 Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m? 20 Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na ONYENWE ANYỊ pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?” 21 Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.” 22 Mgbe Eliakịm nwa Hilkaya, onyeisi ọchịchị, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, ode akwụkwọ akụkọ eze laghachikwuuru Hezekaya, ha dọwara uwe ha mgbe ha na-aga igosi ya ịda mba nke obi ha. Ha gwakwara ya ihe niile onyeisi agha ndị Asịrịa kwuru.
In Other Versions
Isaiah 36 in the ANGEFD
Isaiah 36 in the ANTPNG2D
Isaiah 36 in the AS21
Isaiah 36 in the BAGH
Isaiah 36 in the BBPNG
Isaiah 36 in the BBT1E
Isaiah 36 in the BDS
Isaiah 36 in the BEV
Isaiah 36 in the BHAD
Isaiah 36 in the BIB
Isaiah 36 in the BLPT
Isaiah 36 in the BNT
Isaiah 36 in the BNTABOOT
Isaiah 36 in the BNTLV
Isaiah 36 in the BOATCB
Isaiah 36 in the BOATCB2
Isaiah 36 in the BOBCV
Isaiah 36 in the BOCNT
Isaiah 36 in the BOECS
Isaiah 36 in the BOGWICC
Isaiah 36 in the BOHCB
Isaiah 36 in the BOHCV
Isaiah 36 in the BOHLNT
Isaiah 36 in the BOHNTLTAL
Isaiah 36 in the BOILNTAP
Isaiah 36 in the BOITCV
Isaiah 36 in the BOKCV
Isaiah 36 in the BOKCV2
Isaiah 36 in the BOKHWOG
Isaiah 36 in the BOKSSV
Isaiah 36 in the BOLCB
Isaiah 36 in the BOLCB2
Isaiah 36 in the BOMCV
Isaiah 36 in the BONAV
Isaiah 36 in the BONCB
Isaiah 36 in the BONLT
Isaiah 36 in the BONUT2
Isaiah 36 in the BOPLNT
Isaiah 36 in the BOSCB
Isaiah 36 in the BOSNC
Isaiah 36 in the BOTLNT
Isaiah 36 in the BOVCB
Isaiah 36 in the BOYCB
Isaiah 36 in the BPBB
Isaiah 36 in the BPH
Isaiah 36 in the BSB
Isaiah 36 in the CCB
Isaiah 36 in the CUV
Isaiah 36 in the CUVS
Isaiah 36 in the DBT
Isaiah 36 in the DGDNT
Isaiah 36 in the DHNT
Isaiah 36 in the DNT
Isaiah 36 in the ELBE
Isaiah 36 in the EMTV
Isaiah 36 in the ESV
Isaiah 36 in the FBV
Isaiah 36 in the FEB
Isaiah 36 in the GGMNT
Isaiah 36 in the GNT
Isaiah 36 in the HARY
Isaiah 36 in the HNT
Isaiah 36 in the IRVA
Isaiah 36 in the IRVB
Isaiah 36 in the IRVG
Isaiah 36 in the IRVH
Isaiah 36 in the IRVK
Isaiah 36 in the IRVM
Isaiah 36 in the IRVM2
Isaiah 36 in the IRVO
Isaiah 36 in the IRVP
Isaiah 36 in the IRVT
Isaiah 36 in the IRVT2
Isaiah 36 in the IRVU
Isaiah 36 in the ISVN
Isaiah 36 in the JSNT
Isaiah 36 in the KAPI
Isaiah 36 in the KBT1ETNIK
Isaiah 36 in the KBV
Isaiah 36 in the KJV
Isaiah 36 in the KNFD
Isaiah 36 in the LBA
Isaiah 36 in the LBLA
Isaiah 36 in the LNT
Isaiah 36 in the LSV
Isaiah 36 in the MAAL
Isaiah 36 in the MBV
Isaiah 36 in the MBV2
Isaiah 36 in the MHNT
Isaiah 36 in the MKNFD
Isaiah 36 in the MNG
Isaiah 36 in the MNT
Isaiah 36 in the MNT2
Isaiah 36 in the MRS1T
Isaiah 36 in the NAA
Isaiah 36 in the NASB
Isaiah 36 in the NBLA
Isaiah 36 in the NBS
Isaiah 36 in the NBVTP
Isaiah 36 in the NET2
Isaiah 36 in the NIV11
Isaiah 36 in the NNT
Isaiah 36 in the NNT2
Isaiah 36 in the NNT3
Isaiah 36 in the PDDPT
Isaiah 36 in the PFNT
Isaiah 36 in the RMNT
Isaiah 36 in the SBIAS
Isaiah 36 in the SBIBS
Isaiah 36 in the SBIBS2
Isaiah 36 in the SBICS
Isaiah 36 in the SBIDS
Isaiah 36 in the SBIGS
Isaiah 36 in the SBIHS
Isaiah 36 in the SBIIS
Isaiah 36 in the SBIIS2
Isaiah 36 in the SBIIS3
Isaiah 36 in the SBIKS
Isaiah 36 in the SBIKS2
Isaiah 36 in the SBIMS
Isaiah 36 in the SBIOS
Isaiah 36 in the SBIPS
Isaiah 36 in the SBISS
Isaiah 36 in the SBITS
Isaiah 36 in the SBITS2
Isaiah 36 in the SBITS3
Isaiah 36 in the SBITS4
Isaiah 36 in the SBIUS
Isaiah 36 in the SBIVS
Isaiah 36 in the SBT
Isaiah 36 in the SBT1E
Isaiah 36 in the SCHL
Isaiah 36 in the SNT
Isaiah 36 in the SUSU
Isaiah 36 in the SUSU2
Isaiah 36 in the SYNO
Isaiah 36 in the TBIAOTANT
Isaiah 36 in the TBT1E
Isaiah 36 in the TBT1E2
Isaiah 36 in the TFTIP
Isaiah 36 in the TFTU
Isaiah 36 in the TGNTATF3T
Isaiah 36 in the THAI
Isaiah 36 in the TNFD
Isaiah 36 in the TNT
Isaiah 36 in the TNTIK
Isaiah 36 in the TNTIL
Isaiah 36 in the TNTIN
Isaiah 36 in the TNTIP
Isaiah 36 in the TNTIZ
Isaiah 36 in the TOMA
Isaiah 36 in the TTENT
Isaiah 36 in the UBG
Isaiah 36 in the UGV
Isaiah 36 in the UGV2
Isaiah 36 in the UGV3
Isaiah 36 in the VBL
Isaiah 36 in the VDCC
Isaiah 36 in the YALU
Isaiah 36 in the YAPE
Isaiah 36 in the YBVTP
Isaiah 36 in the ZBP