Isaiah 37 (BOICB)

1 Mgbe eze Hezekaya nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 2 O zipụrụ Eliakịm, onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz. 3 Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya. 4 Ma eleghị anya ONYENWE ANYỊ Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ nke Rabashaka, bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.” 5 Mgbe ndị ọrụ eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya, 6 ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Ihe a ka ONYENWE ANYỊ kwuru: Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m. 7 Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ” 8 Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha. 9 Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Mgbe ọ nụrụ nke a, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị, 10 “Gwanụ Hezekaya, eze Juda: Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’ 11 Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị? 12 Chi niile nke mba niile, ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden ndị nọ na Tel Asa? 13 Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze ndị Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?” 14 Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, gbasaa ya nʼihu ONYENWE ANYỊ. 15 Hezekaya kpere ekpere nye ONYENWE ANYỊ, sị: 16 “O, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa. 17 Tọọ ntị gị nʼala, o ONYENWE ANYỊ ma nụrụ; meghee anya gị abụọ ONYENWE ANYỊ, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu niile ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ. 18 “Nʼeziokwu, ONYENWE ANYỊ, ndị eze Asịrịa alala ndị a niile na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu, 19 ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa. 20 Ma ugbu a, ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị ONYENWE ANYỊ bụ Chineke, na ọ dịkwaghị chi ọzọ ma ọ bụghị gị.” 21 Mgbe ahụ, Aịzaya nwa Emọz, zigaara Hezekaya ozi, sị, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, sịrị, Nʼihi ekpere gị niile nye m banyere Senakerib, eze Asịrịa, 22 nke a bụ okwu ONYENWE ANYỊ kwuru megide ya.“Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Zayọn,na-elelị gị anya, jirikwa gị na-eme ihe ọchị,Nwaada Jerusalemna-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ. 23 Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa?Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gịwelie olu okwu gị na anya gị elu megide?Ọ bụ megide onye Nsọ nke Izrel? 24 I sitere nʼaka ndị ozi gịkparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya,ị sịkwara,‘Eji m ọtụtụ ụgbọala mrigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile,nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn.Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo,na osisi junipa ya niile kachasị mma.Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu,bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile. 25 Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ,ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ.Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji meeka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.’ 26 “Ọ bụ na ị nụbeghị?Na mgbe ochie ka m kpebiri ya.Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka nọ pịa ọpịpịa ya,ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu,na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu,ghọọ mkpokọta nkume. 27 Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere,bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere.Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi,na ome na-epupụta epupụta,nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọnke anwụ na-achakpọ tupu o tolite. 28 “Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ,marakwa ọpụpụ gị na mbata gị,marakwa oke iwe gị megide m. 29 Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m,nʼihi na mkparị gị eruola m ntị,aga m etinye nko m nʼimi gị,werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị,mee ka ị laghachisite nʼụzọ ahụ nke i siri bịa. 30 “Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama nye gị, Hezekaya.“Nʼafọ a, unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya,nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe si na nke ahụ pupụta.Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi,kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha. 31 Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Judaga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu. 32 Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta,otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta.Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile,ga-emezu nke a. 33 “Ya mere, nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru banyere eze Asịrịa.“Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo amaọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a.Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya,maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya. 34 Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi;ọ gaghị abanye nʼobodo a.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 35 “Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m,na nʼihi Devid, bụ ohu m.” 36 Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile. 37 Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa, biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive. 38 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

Isaiah 37 in the ANGEFD

Isaiah 37 in the ANTPNG2D

Isaiah 37 in the AS21

Isaiah 37 in the BAGH

Isaiah 37 in the BBPNG

Isaiah 37 in the BBT1E

Isaiah 37 in the BDS

Isaiah 37 in the BEV

Isaiah 37 in the BHAD

Isaiah 37 in the BIB

Isaiah 37 in the BLPT

Isaiah 37 in the BNT

Isaiah 37 in the BNTABOOT

Isaiah 37 in the BNTLV

Isaiah 37 in the BOATCB

Isaiah 37 in the BOATCB2

Isaiah 37 in the BOBCV

Isaiah 37 in the BOCNT

Isaiah 37 in the BOECS

Isaiah 37 in the BOGWICC

Isaiah 37 in the BOHCB

Isaiah 37 in the BOHCV

Isaiah 37 in the BOHLNT

Isaiah 37 in the BOHNTLTAL

Isaiah 37 in the BOILNTAP

Isaiah 37 in the BOITCV

Isaiah 37 in the BOKCV

Isaiah 37 in the BOKCV2

Isaiah 37 in the BOKHWOG

Isaiah 37 in the BOKSSV

Isaiah 37 in the BOLCB

Isaiah 37 in the BOLCB2

Isaiah 37 in the BOMCV

Isaiah 37 in the BONAV

Isaiah 37 in the BONCB

Isaiah 37 in the BONLT

Isaiah 37 in the BONUT2

Isaiah 37 in the BOPLNT

Isaiah 37 in the BOSCB

Isaiah 37 in the BOSNC

Isaiah 37 in the BOTLNT

Isaiah 37 in the BOVCB

Isaiah 37 in the BOYCB

Isaiah 37 in the BPBB

Isaiah 37 in the BPH

Isaiah 37 in the BSB

Isaiah 37 in the CCB

Isaiah 37 in the CUV

Isaiah 37 in the CUVS

Isaiah 37 in the DBT

Isaiah 37 in the DGDNT

Isaiah 37 in the DHNT

Isaiah 37 in the DNT

Isaiah 37 in the ELBE

Isaiah 37 in the EMTV

Isaiah 37 in the ESV

Isaiah 37 in the FBV

Isaiah 37 in the FEB

Isaiah 37 in the GGMNT

Isaiah 37 in the GNT

Isaiah 37 in the HARY

Isaiah 37 in the HNT

Isaiah 37 in the IRVA

Isaiah 37 in the IRVB

Isaiah 37 in the IRVG

Isaiah 37 in the IRVH

Isaiah 37 in the IRVK

Isaiah 37 in the IRVM

Isaiah 37 in the IRVM2

Isaiah 37 in the IRVO

Isaiah 37 in the IRVP

Isaiah 37 in the IRVT

Isaiah 37 in the IRVT2

Isaiah 37 in the IRVU

Isaiah 37 in the ISVN

Isaiah 37 in the JSNT

Isaiah 37 in the KAPI

Isaiah 37 in the KBT1ETNIK

Isaiah 37 in the KBV

Isaiah 37 in the KJV

Isaiah 37 in the KNFD

Isaiah 37 in the LBA

Isaiah 37 in the LBLA

Isaiah 37 in the LNT

Isaiah 37 in the LSV

Isaiah 37 in the MAAL

Isaiah 37 in the MBV

Isaiah 37 in the MBV2

Isaiah 37 in the MHNT

Isaiah 37 in the MKNFD

Isaiah 37 in the MNG

Isaiah 37 in the MNT

Isaiah 37 in the MNT2

Isaiah 37 in the MRS1T

Isaiah 37 in the NAA

Isaiah 37 in the NASB

Isaiah 37 in the NBLA

Isaiah 37 in the NBS

Isaiah 37 in the NBVTP

Isaiah 37 in the NET2

Isaiah 37 in the NIV11

Isaiah 37 in the NNT

Isaiah 37 in the NNT2

Isaiah 37 in the NNT3

Isaiah 37 in the PDDPT

Isaiah 37 in the PFNT

Isaiah 37 in the RMNT

Isaiah 37 in the SBIAS

Isaiah 37 in the SBIBS

Isaiah 37 in the SBIBS2

Isaiah 37 in the SBICS

Isaiah 37 in the SBIDS

Isaiah 37 in the SBIGS

Isaiah 37 in the SBIHS

Isaiah 37 in the SBIIS

Isaiah 37 in the SBIIS2

Isaiah 37 in the SBIIS3

Isaiah 37 in the SBIKS

Isaiah 37 in the SBIKS2

Isaiah 37 in the SBIMS

Isaiah 37 in the SBIOS

Isaiah 37 in the SBIPS

Isaiah 37 in the SBISS

Isaiah 37 in the SBITS

Isaiah 37 in the SBITS2

Isaiah 37 in the SBITS3

Isaiah 37 in the SBITS4

Isaiah 37 in the SBIUS

Isaiah 37 in the SBIVS

Isaiah 37 in the SBT

Isaiah 37 in the SBT1E

Isaiah 37 in the SCHL

Isaiah 37 in the SNT

Isaiah 37 in the SUSU

Isaiah 37 in the SUSU2

Isaiah 37 in the SYNO

Isaiah 37 in the TBIAOTANT

Isaiah 37 in the TBT1E

Isaiah 37 in the TBT1E2

Isaiah 37 in the TFTIP

Isaiah 37 in the TFTU

Isaiah 37 in the TGNTATF3T

Isaiah 37 in the THAI

Isaiah 37 in the TNFD

Isaiah 37 in the TNT

Isaiah 37 in the TNTIK

Isaiah 37 in the TNTIL

Isaiah 37 in the TNTIN

Isaiah 37 in the TNTIP

Isaiah 37 in the TNTIZ

Isaiah 37 in the TOMA

Isaiah 37 in the TTENT

Isaiah 37 in the UBG

Isaiah 37 in the UGV

Isaiah 37 in the UGV2

Isaiah 37 in the UGV3

Isaiah 37 in the VBL

Isaiah 37 in the VDCC

Isaiah 37 in the YALU

Isaiah 37 in the YAPE

Isaiah 37 in the YBVTP

Isaiah 37 in the ZBP