Isaiah 47 (BOICB)

1 “Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu,gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn,nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze,gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn.Agaghị akpọkwa gịonye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke. 2 Were nkume igwe nri gwee ọka,wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị.Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị,mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche. 3 A ga-ekpughe ọtọ gị,tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere.Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ,agaghị m elekwa anya nʼazụ.” 4 Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile,Onye nsọ Izrel. 5 “Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị,gị eze obodo nke ndị Kaldịa;Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gịnwanyị nwe alaeze dị iche iche. 6 Ewesoro m ndị m iwe,mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ.Eweere m ha tinye gị nʼaka,ma i gosighị ha obi ebere.Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti haka ị bokwasịrị ibu arọ. 7 I kwuru sị,‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a,ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime. 8 “Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ.Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo,na-asị onwe gị,‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa.O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ,maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’ 9 Ma lee anya!Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gịna mberede.Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa.Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile,agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju. 10 Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gịị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị,mgbe ị na-asị onwe gị,‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’ 11 Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị,ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya.Oke mbibi ga-adakwasị gịnke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị;Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya yaga-abịakwasị gị na mberede. 12 “Dokọtazie ọgwụ okike gị niile,na ihe mgbaasị gị niile.Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị.Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu.Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji. 13 Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka.Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso.Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ.Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị. 14 Lee, ha bụ ihe efu dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.Ọkụ ga-erechapụkwa ha.Ha apụghịkwa ịzọpụta onwe hasite nʼọkụ ahụ na-enwusi ike.Nʼihi na ọkụ ahụ adịghị ka ọkụ a na-akwanye,nke a na-anya nʼoge oyi. 15 Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị,bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ hasite na mgbe ị bụ nwantakịrị.Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha;ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.

In Other Versions

Isaiah 47 in the ANGEFD

Isaiah 47 in the ANTPNG2D

Isaiah 47 in the AS21

Isaiah 47 in the BAGH

Isaiah 47 in the BBPNG

Isaiah 47 in the BBT1E

Isaiah 47 in the BDS

Isaiah 47 in the BEV

Isaiah 47 in the BHAD

Isaiah 47 in the BIB

Isaiah 47 in the BLPT

Isaiah 47 in the BNT

Isaiah 47 in the BNTABOOT

Isaiah 47 in the BNTLV

Isaiah 47 in the BOATCB

Isaiah 47 in the BOATCB2

Isaiah 47 in the BOBCV

Isaiah 47 in the BOCNT

Isaiah 47 in the BOECS

Isaiah 47 in the BOGWICC

Isaiah 47 in the BOHCB

Isaiah 47 in the BOHCV

Isaiah 47 in the BOHLNT

Isaiah 47 in the BOHNTLTAL

Isaiah 47 in the BOILNTAP

Isaiah 47 in the BOITCV

Isaiah 47 in the BOKCV

Isaiah 47 in the BOKCV2

Isaiah 47 in the BOKHWOG

Isaiah 47 in the BOKSSV

Isaiah 47 in the BOLCB

Isaiah 47 in the BOLCB2

Isaiah 47 in the BOMCV

Isaiah 47 in the BONAV

Isaiah 47 in the BONCB

Isaiah 47 in the BONLT

Isaiah 47 in the BONUT2

Isaiah 47 in the BOPLNT

Isaiah 47 in the BOSCB

Isaiah 47 in the BOSNC

Isaiah 47 in the BOTLNT

Isaiah 47 in the BOVCB

Isaiah 47 in the BOYCB

Isaiah 47 in the BPBB

Isaiah 47 in the BPH

Isaiah 47 in the BSB

Isaiah 47 in the CCB

Isaiah 47 in the CUV

Isaiah 47 in the CUVS

Isaiah 47 in the DBT

Isaiah 47 in the DGDNT

Isaiah 47 in the DHNT

Isaiah 47 in the DNT

Isaiah 47 in the ELBE

Isaiah 47 in the EMTV

Isaiah 47 in the ESV

Isaiah 47 in the FBV

Isaiah 47 in the FEB

Isaiah 47 in the GGMNT

Isaiah 47 in the GNT

Isaiah 47 in the HARY

Isaiah 47 in the HNT

Isaiah 47 in the IRVA

Isaiah 47 in the IRVB

Isaiah 47 in the IRVG

Isaiah 47 in the IRVH

Isaiah 47 in the IRVK

Isaiah 47 in the IRVM

Isaiah 47 in the IRVM2

Isaiah 47 in the IRVO

Isaiah 47 in the IRVP

Isaiah 47 in the IRVT

Isaiah 47 in the IRVT2

Isaiah 47 in the IRVU

Isaiah 47 in the ISVN

Isaiah 47 in the JSNT

Isaiah 47 in the KAPI

Isaiah 47 in the KBT1ETNIK

Isaiah 47 in the KBV

Isaiah 47 in the KJV

Isaiah 47 in the KNFD

Isaiah 47 in the LBA

Isaiah 47 in the LBLA

Isaiah 47 in the LNT

Isaiah 47 in the LSV

Isaiah 47 in the MAAL

Isaiah 47 in the MBV

Isaiah 47 in the MBV2

Isaiah 47 in the MHNT

Isaiah 47 in the MKNFD

Isaiah 47 in the MNG

Isaiah 47 in the MNT

Isaiah 47 in the MNT2

Isaiah 47 in the MRS1T

Isaiah 47 in the NAA

Isaiah 47 in the NASB

Isaiah 47 in the NBLA

Isaiah 47 in the NBS

Isaiah 47 in the NBVTP

Isaiah 47 in the NET2

Isaiah 47 in the NIV11

Isaiah 47 in the NNT

Isaiah 47 in the NNT2

Isaiah 47 in the NNT3

Isaiah 47 in the PDDPT

Isaiah 47 in the PFNT

Isaiah 47 in the RMNT

Isaiah 47 in the SBIAS

Isaiah 47 in the SBIBS

Isaiah 47 in the SBIBS2

Isaiah 47 in the SBICS

Isaiah 47 in the SBIDS

Isaiah 47 in the SBIGS

Isaiah 47 in the SBIHS

Isaiah 47 in the SBIIS

Isaiah 47 in the SBIIS2

Isaiah 47 in the SBIIS3

Isaiah 47 in the SBIKS

Isaiah 47 in the SBIKS2

Isaiah 47 in the SBIMS

Isaiah 47 in the SBIOS

Isaiah 47 in the SBIPS

Isaiah 47 in the SBISS

Isaiah 47 in the SBITS

Isaiah 47 in the SBITS2

Isaiah 47 in the SBITS3

Isaiah 47 in the SBITS4

Isaiah 47 in the SBIUS

Isaiah 47 in the SBIVS

Isaiah 47 in the SBT

Isaiah 47 in the SBT1E

Isaiah 47 in the SCHL

Isaiah 47 in the SNT

Isaiah 47 in the SUSU

Isaiah 47 in the SUSU2

Isaiah 47 in the SYNO

Isaiah 47 in the TBIAOTANT

Isaiah 47 in the TBT1E

Isaiah 47 in the TBT1E2

Isaiah 47 in the TFTIP

Isaiah 47 in the TFTU

Isaiah 47 in the TGNTATF3T

Isaiah 47 in the THAI

Isaiah 47 in the TNFD

Isaiah 47 in the TNT

Isaiah 47 in the TNTIK

Isaiah 47 in the TNTIL

Isaiah 47 in the TNTIN

Isaiah 47 in the TNTIP

Isaiah 47 in the TNTIZ

Isaiah 47 in the TOMA

Isaiah 47 in the TTENT

Isaiah 47 in the UBG

Isaiah 47 in the UGV

Isaiah 47 in the UGV2

Isaiah 47 in the UGV3

Isaiah 47 in the VBL

Isaiah 47 in the VDCC

Isaiah 47 in the YALU

Isaiah 47 in the YAPE

Isaiah 47 in the YBVTP

Isaiah 47 in the ZBP