Isaiah 53 (BOICB)

1 Onye kweere ozi anyị,ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka ONYENWE ANYỊ? 2 Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome,dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ.O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya.O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike. 3 Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya.Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ.Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ.E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla. 4 Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru,burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile,ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ,onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ. 5 Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị:ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ.E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ;ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike. 6 Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ;onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya.Ma ONYENWE ANYỊ ebokwasịla yaajọ omume anyị niile. 7 A kpagburu ya, mesie ya ihe ike,ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta.E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu,dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị,otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya. 8 Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya.Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ ya weliri olu kwuo okwu?Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ;maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe. 9 E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu,ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya,ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere,ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta. 10 Ma ọ bụ ọchịchọ ONYENWE ANYỊ ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ.Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie.Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge.Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya. 11 Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ,ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya,site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume,ọ ga-ebukwa mmehie ha niile. 12 Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba,ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha,nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ,a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ,rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.

In Other Versions

Isaiah 53 in the ANGEFD

Isaiah 53 in the ANTPNG2D

Isaiah 53 in the AS21

Isaiah 53 in the BAGH

Isaiah 53 in the BBPNG

Isaiah 53 in the BBT1E

Isaiah 53 in the BDS

Isaiah 53 in the BEV

Isaiah 53 in the BHAD

Isaiah 53 in the BIB

Isaiah 53 in the BLPT

Isaiah 53 in the BNT

Isaiah 53 in the BNTABOOT

Isaiah 53 in the BNTLV

Isaiah 53 in the BOATCB

Isaiah 53 in the BOATCB2

Isaiah 53 in the BOBCV

Isaiah 53 in the BOCNT

Isaiah 53 in the BOECS

Isaiah 53 in the BOGWICC

Isaiah 53 in the BOHCB

Isaiah 53 in the BOHCV

Isaiah 53 in the BOHLNT

Isaiah 53 in the BOHNTLTAL

Isaiah 53 in the BOILNTAP

Isaiah 53 in the BOITCV

Isaiah 53 in the BOKCV

Isaiah 53 in the BOKCV2

Isaiah 53 in the BOKHWOG

Isaiah 53 in the BOKSSV

Isaiah 53 in the BOLCB

Isaiah 53 in the BOLCB2

Isaiah 53 in the BOMCV

Isaiah 53 in the BONAV

Isaiah 53 in the BONCB

Isaiah 53 in the BONLT

Isaiah 53 in the BONUT2

Isaiah 53 in the BOPLNT

Isaiah 53 in the BOSCB

Isaiah 53 in the BOSNC

Isaiah 53 in the BOTLNT

Isaiah 53 in the BOVCB

Isaiah 53 in the BOYCB

Isaiah 53 in the BPBB

Isaiah 53 in the BPH

Isaiah 53 in the BSB

Isaiah 53 in the CCB

Isaiah 53 in the CUV

Isaiah 53 in the CUVS

Isaiah 53 in the DBT

Isaiah 53 in the DGDNT

Isaiah 53 in the DHNT

Isaiah 53 in the DNT

Isaiah 53 in the ELBE

Isaiah 53 in the EMTV

Isaiah 53 in the ESV

Isaiah 53 in the FBV

Isaiah 53 in the FEB

Isaiah 53 in the GGMNT

Isaiah 53 in the GNT

Isaiah 53 in the HARY

Isaiah 53 in the HNT

Isaiah 53 in the IRVA

Isaiah 53 in the IRVB

Isaiah 53 in the IRVG

Isaiah 53 in the IRVH

Isaiah 53 in the IRVK

Isaiah 53 in the IRVM

Isaiah 53 in the IRVM2

Isaiah 53 in the IRVO

Isaiah 53 in the IRVP

Isaiah 53 in the IRVT

Isaiah 53 in the IRVT2

Isaiah 53 in the IRVU

Isaiah 53 in the ISVN

Isaiah 53 in the JSNT

Isaiah 53 in the KAPI

Isaiah 53 in the KBT1ETNIK

Isaiah 53 in the KBV

Isaiah 53 in the KJV

Isaiah 53 in the KNFD

Isaiah 53 in the LBA

Isaiah 53 in the LBLA

Isaiah 53 in the LNT

Isaiah 53 in the LSV

Isaiah 53 in the MAAL

Isaiah 53 in the MBV

Isaiah 53 in the MBV2

Isaiah 53 in the MHNT

Isaiah 53 in the MKNFD

Isaiah 53 in the MNG

Isaiah 53 in the MNT

Isaiah 53 in the MNT2

Isaiah 53 in the MRS1T

Isaiah 53 in the NAA

Isaiah 53 in the NASB

Isaiah 53 in the NBLA

Isaiah 53 in the NBS

Isaiah 53 in the NBVTP

Isaiah 53 in the NET2

Isaiah 53 in the NIV11

Isaiah 53 in the NNT

Isaiah 53 in the NNT2

Isaiah 53 in the NNT3

Isaiah 53 in the PDDPT

Isaiah 53 in the PFNT

Isaiah 53 in the RMNT

Isaiah 53 in the SBIAS

Isaiah 53 in the SBIBS

Isaiah 53 in the SBIBS2

Isaiah 53 in the SBICS

Isaiah 53 in the SBIDS

Isaiah 53 in the SBIGS

Isaiah 53 in the SBIHS

Isaiah 53 in the SBIIS

Isaiah 53 in the SBIIS2

Isaiah 53 in the SBIIS3

Isaiah 53 in the SBIKS

Isaiah 53 in the SBIKS2

Isaiah 53 in the SBIMS

Isaiah 53 in the SBIOS

Isaiah 53 in the SBIPS

Isaiah 53 in the SBISS

Isaiah 53 in the SBITS

Isaiah 53 in the SBITS2

Isaiah 53 in the SBITS3

Isaiah 53 in the SBITS4

Isaiah 53 in the SBIUS

Isaiah 53 in the SBIVS

Isaiah 53 in the SBT

Isaiah 53 in the SBT1E

Isaiah 53 in the SCHL

Isaiah 53 in the SNT

Isaiah 53 in the SUSU

Isaiah 53 in the SUSU2

Isaiah 53 in the SYNO

Isaiah 53 in the TBIAOTANT

Isaiah 53 in the TBT1E

Isaiah 53 in the TBT1E2

Isaiah 53 in the TFTIP

Isaiah 53 in the TFTU

Isaiah 53 in the TGNTATF3T

Isaiah 53 in the THAI

Isaiah 53 in the TNFD

Isaiah 53 in the TNT

Isaiah 53 in the TNTIK

Isaiah 53 in the TNTIL

Isaiah 53 in the TNTIN

Isaiah 53 in the TNTIP

Isaiah 53 in the TNTIZ

Isaiah 53 in the TOMA

Isaiah 53 in the TTENT

Isaiah 53 in the UBG

Isaiah 53 in the UGV

Isaiah 53 in the UGV2

Isaiah 53 in the UGV3

Isaiah 53 in the VBL

Isaiah 53 in the VDCC

Isaiah 53 in the YALU

Isaiah 53 in the YAPE

Isaiah 53 in the YBVTP

Isaiah 53 in the ZBP