Jeremiah 16 (BOICB)
1 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Ị gaghị alụtara onwe gị nwunye, ị gaghị amụtakwa ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼebe a.” 3 Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a. 4 “Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.” 5 Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ, maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 6 “Ma ndị ukwu na ndị nta nʼime ha ga-anwụ nʼala a. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ruo ụjụ nʼihi ha. O nweghị onye ga-akpụcha isi ya, maọbụ gbuo onwe ya mma nʼihi ha. 7 O nweghị onye ga-eweta ihe oriri nye ndị zukọrọ maka ịkasị ndị na-eru ụjụ obi. Nri agaghị adị ọ bụladị nye ndị na-eru ụjụ, nʼihi ọnwụ nna ha maọbụ ọnwụ nne ha. Ọ dịkwaghị onye ga-enye ha ihe ọṅụṅụ nʼihi ịkasị ha obi. 8 “Abanyekwala nʼụlọ ebe e nwere oriri soro ndị nọ nʼebe ahụ nọdụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ 9 Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụkwa Chineke Izrel kwuru, ‘Nʼihu gị, na nʼoge ndị a niile ị dị ndụ, ka m ga-eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na nke ndị inyom na-alụ di na nwunye kwụsị.’ 10 “Mgbe ị gwara ndị a ihe ndị a, ha ga-ajụ gị ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ONYENWE ANYỊ ji kpebie izitere anyị ụdị oke ịla nʼiyi dị otu a? Gịnị bụ ihe ọjọọ anyị mere? Gịnị bụ mmehie anyị mere megide ONYENWE ANYỊ Chineke anyị?’ 11 Mgbe ahụ, ị ga-asa ha sị ha, ‘Ihe ndị a na-adakwasị unu nʼihi na nna nna unu ha gbakụtara m azụ,’ otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, ‘gbasoro, fee ma kpọọkwa isiala nye chi ndị ọzọ. Ha jụrụ iso m, jụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu. 12 Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi. 13 Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’ 14 “Otu ọ dị, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka ONYENWE ANYỊ na adị ndụ, bụ onye ahụ sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.’ 15 Ma a ga-asị, ‘Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha. 16 “Ma ugbu a, aga m ezipu ọtụtụ ndị ọkụ azụ ka ha gaa jide ha.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. “Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m ezipụkwa ọtụtụ ndị na-achụ nta, ndị ga-esite nʼelu ugwu ukwu niile na nʼelu ugwu nta niile, na nʼọnụ mgbawara dị na nkume niile, chụọ nta ha. 17 Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile. 18 Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.” 19 ONYENWE ANYỊ, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike,ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị.Ha ga-abịakwute gị sị gị,“Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie.Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.” 20 Mmadụ ọ pụrụ imere onwe ya chi?E, ma chi ndị ahụ abụghị chi. 21 “Ya mere, aga m eme ka ha mata.Nʼoge a ka m ga-eme ka ha mata ike m,na ịdị ike m.Mgbe ahụ, ha ga-amatana aha m bụ ONYENWE ANYỊ.
In Other Versions
Jeremiah 16 in the ANGEFD
Jeremiah 16 in the ANTPNG2D
Jeremiah 16 in the AS21
Jeremiah 16 in the BAGH
Jeremiah 16 in the BBPNG
Jeremiah 16 in the BBT1E
Jeremiah 16 in the BDS
Jeremiah 16 in the BEV
Jeremiah 16 in the BHAD
Jeremiah 16 in the BIB
Jeremiah 16 in the BLPT
Jeremiah 16 in the BNT
Jeremiah 16 in the BNTABOOT
Jeremiah 16 in the BNTLV
Jeremiah 16 in the BOATCB
Jeremiah 16 in the BOATCB2
Jeremiah 16 in the BOBCV
Jeremiah 16 in the BOCNT
Jeremiah 16 in the BOECS
Jeremiah 16 in the BOGWICC
Jeremiah 16 in the BOHCB
Jeremiah 16 in the BOHCV
Jeremiah 16 in the BOHLNT
Jeremiah 16 in the BOHNTLTAL
Jeremiah 16 in the BOILNTAP
Jeremiah 16 in the BOITCV
Jeremiah 16 in the BOKCV
Jeremiah 16 in the BOKCV2
Jeremiah 16 in the BOKHWOG
Jeremiah 16 in the BOKSSV
Jeremiah 16 in the BOLCB
Jeremiah 16 in the BOLCB2
Jeremiah 16 in the BOMCV
Jeremiah 16 in the BONAV
Jeremiah 16 in the BONCB
Jeremiah 16 in the BONLT
Jeremiah 16 in the BONUT2
Jeremiah 16 in the BOPLNT
Jeremiah 16 in the BOSCB
Jeremiah 16 in the BOSNC
Jeremiah 16 in the BOTLNT
Jeremiah 16 in the BOVCB
Jeremiah 16 in the BOYCB
Jeremiah 16 in the BPBB
Jeremiah 16 in the BPH
Jeremiah 16 in the BSB
Jeremiah 16 in the CCB
Jeremiah 16 in the CUV
Jeremiah 16 in the CUVS
Jeremiah 16 in the DBT
Jeremiah 16 in the DGDNT
Jeremiah 16 in the DHNT
Jeremiah 16 in the DNT
Jeremiah 16 in the ELBE
Jeremiah 16 in the EMTV
Jeremiah 16 in the ESV
Jeremiah 16 in the FBV
Jeremiah 16 in the FEB
Jeremiah 16 in the GGMNT
Jeremiah 16 in the GNT
Jeremiah 16 in the HARY
Jeremiah 16 in the HNT
Jeremiah 16 in the IRVA
Jeremiah 16 in the IRVB
Jeremiah 16 in the IRVG
Jeremiah 16 in the IRVH
Jeremiah 16 in the IRVK
Jeremiah 16 in the IRVM
Jeremiah 16 in the IRVM2
Jeremiah 16 in the IRVO
Jeremiah 16 in the IRVP
Jeremiah 16 in the IRVT
Jeremiah 16 in the IRVT2
Jeremiah 16 in the IRVU
Jeremiah 16 in the ISVN
Jeremiah 16 in the JSNT
Jeremiah 16 in the KAPI
Jeremiah 16 in the KBT1ETNIK
Jeremiah 16 in the KBV
Jeremiah 16 in the KJV
Jeremiah 16 in the KNFD
Jeremiah 16 in the LBA
Jeremiah 16 in the LBLA
Jeremiah 16 in the LNT
Jeremiah 16 in the LSV
Jeremiah 16 in the MAAL
Jeremiah 16 in the MBV
Jeremiah 16 in the MBV2
Jeremiah 16 in the MHNT
Jeremiah 16 in the MKNFD
Jeremiah 16 in the MNG
Jeremiah 16 in the MNT
Jeremiah 16 in the MNT2
Jeremiah 16 in the MRS1T
Jeremiah 16 in the NAA
Jeremiah 16 in the NASB
Jeremiah 16 in the NBLA
Jeremiah 16 in the NBS
Jeremiah 16 in the NBVTP
Jeremiah 16 in the NET2
Jeremiah 16 in the NIV11
Jeremiah 16 in the NNT
Jeremiah 16 in the NNT2
Jeremiah 16 in the NNT3
Jeremiah 16 in the PDDPT
Jeremiah 16 in the PFNT
Jeremiah 16 in the RMNT
Jeremiah 16 in the SBIAS
Jeremiah 16 in the SBIBS
Jeremiah 16 in the SBIBS2
Jeremiah 16 in the SBICS
Jeremiah 16 in the SBIDS
Jeremiah 16 in the SBIGS
Jeremiah 16 in the SBIHS
Jeremiah 16 in the SBIIS
Jeremiah 16 in the SBIIS2
Jeremiah 16 in the SBIIS3
Jeremiah 16 in the SBIKS
Jeremiah 16 in the SBIKS2
Jeremiah 16 in the SBIMS
Jeremiah 16 in the SBIOS
Jeremiah 16 in the SBIPS
Jeremiah 16 in the SBISS
Jeremiah 16 in the SBITS
Jeremiah 16 in the SBITS2
Jeremiah 16 in the SBITS3
Jeremiah 16 in the SBITS4
Jeremiah 16 in the SBIUS
Jeremiah 16 in the SBIVS
Jeremiah 16 in the SBT
Jeremiah 16 in the SBT1E
Jeremiah 16 in the SCHL
Jeremiah 16 in the SNT
Jeremiah 16 in the SUSU
Jeremiah 16 in the SUSU2
Jeremiah 16 in the SYNO
Jeremiah 16 in the TBIAOTANT
Jeremiah 16 in the TBT1E
Jeremiah 16 in the TBT1E2
Jeremiah 16 in the TFTIP
Jeremiah 16 in the TFTU
Jeremiah 16 in the TGNTATF3T
Jeremiah 16 in the THAI
Jeremiah 16 in the TNFD
Jeremiah 16 in the TNT
Jeremiah 16 in the TNTIK
Jeremiah 16 in the TNTIL
Jeremiah 16 in the TNTIN
Jeremiah 16 in the TNTIP
Jeremiah 16 in the TNTIZ
Jeremiah 16 in the TOMA
Jeremiah 16 in the TTENT
Jeremiah 16 in the UBG
Jeremiah 16 in the UGV
Jeremiah 16 in the UGV2
Jeremiah 16 in the UGV3
Jeremiah 16 in the VBL
Jeremiah 16 in the VDCC
Jeremiah 16 in the YALU
Jeremiah 16 in the YAPE
Jeremiah 16 in the YBVTP
Jeremiah 16 in the ZBP