Jeremiah 33 (BOICB)

1 Mgbe Jeremaya ka nọ dịka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu ONYENWE ANYỊ ruru ya ntị nke ugboro abụọ, sị ya, 2 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, onye ahụ kere ụwa kwuru, ONYENWE ANYỊ, onye kpụrụ ya mee ya ka o guzosie ike, Onye aha ya bụ ONYENWE ANYỊ: 3 ‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’ 4 Nʼihi na nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke Izrel, kwuru banyere ụlọ ndị ahụ niile dị nʼobodo, na ụlọeze niile nke ndị eze Juda, bụ nke akwadara maka iji megide nnọchibido niile na mma agha 5 nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile. 6 “ ‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla. 7 Aga m emekwa ka ndị Izrel na ndị Juda a dọtara nʼagha lọta. Aga m ewugharịkwa ha dịka ụlọ, mee ka ha dịrị ka ha dị na mbụ. 8 Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m. 9 Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’ 10 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwa 11 olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ ONYENWE ANYỊ, ndị ahụ ga-asị,“ ‘ “Nyenụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ekelenʼihi na ONYENWE ANYỊ dị mma.Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.”Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru. 12 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike. 13 Nʼime obodo niile nke dị nʼala ugwu ugwu, na nʼobodo niile nke dị na mgbada ugwu niile nke Negev, nʼoke ala Benjamin, nʼime obodo nta niile nke gbara Jerusalem gburugburu, na nʼime obodo niile nke Juda. Igwe ewu na atụrụ ga-agabigakwa ọzọ nʼokpuru aka abụọ nke onye na-agụ ha ọnụ.’ Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu. 14 “ ‘Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, ‘mgbe m ga-emezu ezi nkwa ahụ m kwere ụlọ Izrel na ụlọ Juda. 15 “ ‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ,aga m eme ka Alaka ezi omume pupụta site nʼezinaụlọ Devid.Ọ ga-eme ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 16 Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda,Jerusalem ga-ebikwa nʼudo.Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, ONYENWE ANYỊ Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’ 17 Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel. 18 Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ” 19 Emesịa, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị sị ya, 20 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha, 21 mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya. 22 Aga m eme ka ụmụ ụmụ Devid ohu m, na ndị Livayị, bụ ndị na-eje ozi ha nʼihu m, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe; ha ga-adịkwa ukwuu dịka uzuzu dị nʼọnụ mmiri osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’ ” 23 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị sị ya, 24 “Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘ONYENWE ANYỊ ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba. 25 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Ọ bụrụ na m emeghị ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti mụ na ehihie na abalị, meekwa ka iwu na-achị eluigwe na ụwa guzosie ike, 26 mgbe ahụ, agaara m ajụ ụmụ ụmụ Jekọb, na ụmụ ụmụ Devid ohu m. Agaraghị m ahọpụta otu nʼime ụmụ ya ka ọ chịa ụmụ ụmụ Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ma aga m eme ka ndị ha a dọtara nʼagha lọta; aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ha.’ ”

In Other Versions

Jeremiah 33 in the ANGEFD

Jeremiah 33 in the ANTPNG2D

Jeremiah 33 in the AS21

Jeremiah 33 in the BAGH

Jeremiah 33 in the BBPNG

Jeremiah 33 in the BBT1E

Jeremiah 33 in the BDS

Jeremiah 33 in the BEV

Jeremiah 33 in the BHAD

Jeremiah 33 in the BIB

Jeremiah 33 in the BLPT

Jeremiah 33 in the BNT

Jeremiah 33 in the BNTABOOT

Jeremiah 33 in the BNTLV

Jeremiah 33 in the BOATCB

Jeremiah 33 in the BOATCB2

Jeremiah 33 in the BOBCV

Jeremiah 33 in the BOCNT

Jeremiah 33 in the BOECS

Jeremiah 33 in the BOGWICC

Jeremiah 33 in the BOHCB

Jeremiah 33 in the BOHCV

Jeremiah 33 in the BOHLNT

Jeremiah 33 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 33 in the BOILNTAP

Jeremiah 33 in the BOITCV

Jeremiah 33 in the BOKCV

Jeremiah 33 in the BOKCV2

Jeremiah 33 in the BOKHWOG

Jeremiah 33 in the BOKSSV

Jeremiah 33 in the BOLCB

Jeremiah 33 in the BOLCB2

Jeremiah 33 in the BOMCV

Jeremiah 33 in the BONAV

Jeremiah 33 in the BONCB

Jeremiah 33 in the BONLT

Jeremiah 33 in the BONUT2

Jeremiah 33 in the BOPLNT

Jeremiah 33 in the BOSCB

Jeremiah 33 in the BOSNC

Jeremiah 33 in the BOTLNT

Jeremiah 33 in the BOVCB

Jeremiah 33 in the BOYCB

Jeremiah 33 in the BPBB

Jeremiah 33 in the BPH

Jeremiah 33 in the BSB

Jeremiah 33 in the CCB

Jeremiah 33 in the CUV

Jeremiah 33 in the CUVS

Jeremiah 33 in the DBT

Jeremiah 33 in the DGDNT

Jeremiah 33 in the DHNT

Jeremiah 33 in the DNT

Jeremiah 33 in the ELBE

Jeremiah 33 in the EMTV

Jeremiah 33 in the ESV

Jeremiah 33 in the FBV

Jeremiah 33 in the FEB

Jeremiah 33 in the GGMNT

Jeremiah 33 in the GNT

Jeremiah 33 in the HARY

Jeremiah 33 in the HNT

Jeremiah 33 in the IRVA

Jeremiah 33 in the IRVB

Jeremiah 33 in the IRVG

Jeremiah 33 in the IRVH

Jeremiah 33 in the IRVK

Jeremiah 33 in the IRVM

Jeremiah 33 in the IRVM2

Jeremiah 33 in the IRVO

Jeremiah 33 in the IRVP

Jeremiah 33 in the IRVT

Jeremiah 33 in the IRVT2

Jeremiah 33 in the IRVU

Jeremiah 33 in the ISVN

Jeremiah 33 in the JSNT

Jeremiah 33 in the KAPI

Jeremiah 33 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 33 in the KBV

Jeremiah 33 in the KJV

Jeremiah 33 in the KNFD

Jeremiah 33 in the LBA

Jeremiah 33 in the LBLA

Jeremiah 33 in the LNT

Jeremiah 33 in the LSV

Jeremiah 33 in the MAAL

Jeremiah 33 in the MBV

Jeremiah 33 in the MBV2

Jeremiah 33 in the MHNT

Jeremiah 33 in the MKNFD

Jeremiah 33 in the MNG

Jeremiah 33 in the MNT

Jeremiah 33 in the MNT2

Jeremiah 33 in the MRS1T

Jeremiah 33 in the NAA

Jeremiah 33 in the NASB

Jeremiah 33 in the NBLA

Jeremiah 33 in the NBS

Jeremiah 33 in the NBVTP

Jeremiah 33 in the NET2

Jeremiah 33 in the NIV11

Jeremiah 33 in the NNT

Jeremiah 33 in the NNT2

Jeremiah 33 in the NNT3

Jeremiah 33 in the PDDPT

Jeremiah 33 in the PFNT

Jeremiah 33 in the RMNT

Jeremiah 33 in the SBIAS

Jeremiah 33 in the SBIBS

Jeremiah 33 in the SBIBS2

Jeremiah 33 in the SBICS

Jeremiah 33 in the SBIDS

Jeremiah 33 in the SBIGS

Jeremiah 33 in the SBIHS

Jeremiah 33 in the SBIIS

Jeremiah 33 in the SBIIS2

Jeremiah 33 in the SBIIS3

Jeremiah 33 in the SBIKS

Jeremiah 33 in the SBIKS2

Jeremiah 33 in the SBIMS

Jeremiah 33 in the SBIOS

Jeremiah 33 in the SBIPS

Jeremiah 33 in the SBISS

Jeremiah 33 in the SBITS

Jeremiah 33 in the SBITS2

Jeremiah 33 in the SBITS3

Jeremiah 33 in the SBITS4

Jeremiah 33 in the SBIUS

Jeremiah 33 in the SBIVS

Jeremiah 33 in the SBT

Jeremiah 33 in the SBT1E

Jeremiah 33 in the SCHL

Jeremiah 33 in the SNT

Jeremiah 33 in the SUSU

Jeremiah 33 in the SUSU2

Jeremiah 33 in the SYNO

Jeremiah 33 in the TBIAOTANT

Jeremiah 33 in the TBT1E

Jeremiah 33 in the TBT1E2

Jeremiah 33 in the TFTIP

Jeremiah 33 in the TFTU

Jeremiah 33 in the TGNTATF3T

Jeremiah 33 in the THAI

Jeremiah 33 in the TNFD

Jeremiah 33 in the TNT

Jeremiah 33 in the TNTIK

Jeremiah 33 in the TNTIL

Jeremiah 33 in the TNTIN

Jeremiah 33 in the TNTIP

Jeremiah 33 in the TNTIZ

Jeremiah 33 in the TOMA

Jeremiah 33 in the TTENT

Jeremiah 33 in the UBG

Jeremiah 33 in the UGV

Jeremiah 33 in the UGV2

Jeremiah 33 in the UGV3

Jeremiah 33 in the VBL

Jeremiah 33 in the VDCC

Jeremiah 33 in the YALU

Jeremiah 33 in the YAPE

Jeremiah 33 in the YBVTP

Jeremiah 33 in the ZBP