Jeremiah 35 (BOICB)

1 Ndị a bụ okwu ONYENWE ANYỊ nke ruru Jeremaya ntị nʼoge ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda sị ya, 2 “Jee nʼụlọ ụmụ Rekab kpọọ ha oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, nʼotu nʼime ọnụụlọ ya, nọdụ nʼebe ahụ nye ha mmanya ka ha ṅụọ.” 3 Ya mere, ejekwuuru m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, ndị ezinaụlọ Rekab niile. 4 Akpọbatara m ha nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, nʼime ọnụụlọ ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Chineke. Ọnụụlọ a dị nso nʼọnụụlọ ndịisi ụlọnsọ, nke dị nʼelu ọnụụlọ Maaseia nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ. 5 Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.” 6 Ma ha zara sị, “Anyị adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab nyere anyị iwu sị anyị, ‘Unu aṅụkwala mmanya, unu na ụmụ ụmụ unu. 7 Ọzọkwa, unu ewurula onwe unu ụlọ, unu akụla mkpụrụ ubi, maọbụ kụọ ubi vaịnị. Unu adọtarala onwe unu ihe ndị a niile, kama na-ebinụ nʼụlọ ikwuu. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka unu ga-esi bie ogologo ndụ nʼala ahụ unu bụ ndị ọbịa nʼime ya.’ 8 Anyị erubela isi nʼihe niile nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab gwara anyị. Anyị na ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom adịghị aṅụ mmanya, 9 maọbụ wuo ụlọ, maọbụ nwee ubi vaịnị, ala ubi maọbụ mkpụrụ ọkụkụ. 10 Ọ bụkwa nʼụlọ ikwuu ka anyị na-ebi dị ka nna nna anyị Jehonadab nyere anyị nʼiwu. 11 Ma mgbe Nebukadneza eze Babilọn busoro ala anyị agha, anyị kpebiri sị, ‘Bịanụ ka anyị gbaba Jerusalem si otu a gbanarị ndị agha Babilọn, na ndị agha ndị Aram.’ Ọ bụ nke a mere anyị ji biri na Jerusalem.” 12 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru Jeremaya ntị sị ya 13 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Gaa gwa ndị Juda na ndị bi na Jerusalem, ‘Ọ bụ na unu agaghị esite nʼịdọ aka na ntị mụta irubere okwu m isi?’ ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 14 ‘Jehonadab nwa Rekab nyere ụmụ ụmụ ya iwu sị ha aṅụla mmanya, ha na-edebe iwu ahụ. Ruo taa, ha adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na ha na-edebe iwu nna nna ha nyere ha. Ma mụ onwe m agwala unu okwu mgbe na mgbe, ma unu jụrụ irubere m isi. 15 Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị. 16 Ụmụ ụmụ Jehonadab, nwa Rekab, emeela ihe nna nna ha nyere ha nʼiwu, ma ndị a jụrụ irubere m isi.’ 17 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’ ” 18 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị ezinaụlọ Rekab, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Unu erubeela isi mee ihe niile nna nna unu bụ Jehonadab nyere unu nʼiwu.’ 19 Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru sị, ‘O nweghị mgbe ọbụla nwoke ga-ejere m ozi ga-akọ nʼezinaụlọ Jehonadab nwa Rekab.’ ”

In Other Versions

Jeremiah 35 in the ANGEFD

Jeremiah 35 in the ANTPNG2D

Jeremiah 35 in the AS21

Jeremiah 35 in the BAGH

Jeremiah 35 in the BBPNG

Jeremiah 35 in the BBT1E

Jeremiah 35 in the BDS

Jeremiah 35 in the BEV

Jeremiah 35 in the BHAD

Jeremiah 35 in the BIB

Jeremiah 35 in the BLPT

Jeremiah 35 in the BNT

Jeremiah 35 in the BNTABOOT

Jeremiah 35 in the BNTLV

Jeremiah 35 in the BOATCB

Jeremiah 35 in the BOATCB2

Jeremiah 35 in the BOBCV

Jeremiah 35 in the BOCNT

Jeremiah 35 in the BOECS

Jeremiah 35 in the BOGWICC

Jeremiah 35 in the BOHCB

Jeremiah 35 in the BOHCV

Jeremiah 35 in the BOHLNT

Jeremiah 35 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 35 in the BOILNTAP

Jeremiah 35 in the BOITCV

Jeremiah 35 in the BOKCV

Jeremiah 35 in the BOKCV2

Jeremiah 35 in the BOKHWOG

Jeremiah 35 in the BOKSSV

Jeremiah 35 in the BOLCB

Jeremiah 35 in the BOLCB2

Jeremiah 35 in the BOMCV

Jeremiah 35 in the BONAV

Jeremiah 35 in the BONCB

Jeremiah 35 in the BONLT

Jeremiah 35 in the BONUT2

Jeremiah 35 in the BOPLNT

Jeremiah 35 in the BOSCB

Jeremiah 35 in the BOSNC

Jeremiah 35 in the BOTLNT

Jeremiah 35 in the BOVCB

Jeremiah 35 in the BOYCB

Jeremiah 35 in the BPBB

Jeremiah 35 in the BPH

Jeremiah 35 in the BSB

Jeremiah 35 in the CCB

Jeremiah 35 in the CUV

Jeremiah 35 in the CUVS

Jeremiah 35 in the DBT

Jeremiah 35 in the DGDNT

Jeremiah 35 in the DHNT

Jeremiah 35 in the DNT

Jeremiah 35 in the ELBE

Jeremiah 35 in the EMTV

Jeremiah 35 in the ESV

Jeremiah 35 in the FBV

Jeremiah 35 in the FEB

Jeremiah 35 in the GGMNT

Jeremiah 35 in the GNT

Jeremiah 35 in the HARY

Jeremiah 35 in the HNT

Jeremiah 35 in the IRVA

Jeremiah 35 in the IRVB

Jeremiah 35 in the IRVG

Jeremiah 35 in the IRVH

Jeremiah 35 in the IRVK

Jeremiah 35 in the IRVM

Jeremiah 35 in the IRVM2

Jeremiah 35 in the IRVO

Jeremiah 35 in the IRVP

Jeremiah 35 in the IRVT

Jeremiah 35 in the IRVT2

Jeremiah 35 in the IRVU

Jeremiah 35 in the ISVN

Jeremiah 35 in the JSNT

Jeremiah 35 in the KAPI

Jeremiah 35 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 35 in the KBV

Jeremiah 35 in the KJV

Jeremiah 35 in the KNFD

Jeremiah 35 in the LBA

Jeremiah 35 in the LBLA

Jeremiah 35 in the LNT

Jeremiah 35 in the LSV

Jeremiah 35 in the MAAL

Jeremiah 35 in the MBV

Jeremiah 35 in the MBV2

Jeremiah 35 in the MHNT

Jeremiah 35 in the MKNFD

Jeremiah 35 in the MNG

Jeremiah 35 in the MNT

Jeremiah 35 in the MNT2

Jeremiah 35 in the MRS1T

Jeremiah 35 in the NAA

Jeremiah 35 in the NASB

Jeremiah 35 in the NBLA

Jeremiah 35 in the NBS

Jeremiah 35 in the NBVTP

Jeremiah 35 in the NET2

Jeremiah 35 in the NIV11

Jeremiah 35 in the NNT

Jeremiah 35 in the NNT2

Jeremiah 35 in the NNT3

Jeremiah 35 in the PDDPT

Jeremiah 35 in the PFNT

Jeremiah 35 in the RMNT

Jeremiah 35 in the SBIAS

Jeremiah 35 in the SBIBS

Jeremiah 35 in the SBIBS2

Jeremiah 35 in the SBICS

Jeremiah 35 in the SBIDS

Jeremiah 35 in the SBIGS

Jeremiah 35 in the SBIHS

Jeremiah 35 in the SBIIS

Jeremiah 35 in the SBIIS2

Jeremiah 35 in the SBIIS3

Jeremiah 35 in the SBIKS

Jeremiah 35 in the SBIKS2

Jeremiah 35 in the SBIMS

Jeremiah 35 in the SBIOS

Jeremiah 35 in the SBIPS

Jeremiah 35 in the SBISS

Jeremiah 35 in the SBITS

Jeremiah 35 in the SBITS2

Jeremiah 35 in the SBITS3

Jeremiah 35 in the SBITS4

Jeremiah 35 in the SBIUS

Jeremiah 35 in the SBIVS

Jeremiah 35 in the SBT

Jeremiah 35 in the SBT1E

Jeremiah 35 in the SCHL

Jeremiah 35 in the SNT

Jeremiah 35 in the SUSU

Jeremiah 35 in the SUSU2

Jeremiah 35 in the SYNO

Jeremiah 35 in the TBIAOTANT

Jeremiah 35 in the TBT1E

Jeremiah 35 in the TBT1E2

Jeremiah 35 in the TFTIP

Jeremiah 35 in the TFTU

Jeremiah 35 in the TGNTATF3T

Jeremiah 35 in the THAI

Jeremiah 35 in the TNFD

Jeremiah 35 in the TNT

Jeremiah 35 in the TNTIK

Jeremiah 35 in the TNTIL

Jeremiah 35 in the TNTIN

Jeremiah 35 in the TNTIP

Jeremiah 35 in the TNTIZ

Jeremiah 35 in the TOMA

Jeremiah 35 in the TTENT

Jeremiah 35 in the UBG

Jeremiah 35 in the UGV

Jeremiah 35 in the UGV2

Jeremiah 35 in the UGV3

Jeremiah 35 in the VBL

Jeremiah 35 in the VDCC

Jeremiah 35 in the YALU

Jeremiah 35 in the YAPE

Jeremiah 35 in the YBVTP

Jeremiah 35 in the ZBP