Jeremiah 39 (BOICB)

1 Otu a ka e si dọta Jerusalem nʼagha. Nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nʼọnwa nke iri ya, Nebukadneza eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha, Ha gbara ya gburugburu, nọchibido ya. 2 Nʼụbọchị nke itoolu, nʼọnwa nke anọ, nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị Zedekaya, ha gwupuru mgbidi obodo ahụ. 3 Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ. 4 Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba. 5 Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe. 6 Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ. 7 Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn. 8 Ndị Babilọn sunyere ụlọeze na ụlọ ndị mmadụ niile ọkụ, kwatukwa mgbidi niile nke Jerusalem. 9 Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, buuru ndị niile fọdụrụ nʼobodo, ha na ndị ahụ buuru ụzọ jekwuru ya, na ndị ọzọ fọdụrụ, bulaa ha Babilọn, dịka ndị a dọtara nʼagha. 10 Ma Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye, ndị na-enweghị ihe ọbụla nʼala Juda. Nʼoge ahụ, o nyere ha ubi vaịnị a gbara ogige na ala ubi niile. 11 Ugbu a, Nebukadneza eze Babilọn enyelarị Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze iwu banyere Jeremaya, sị, 12 “Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.” 13 Ya mere, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, na Nebushazban, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza, bụ onyeisi ọkwa ya dị elu, na ndịisi ndị ọzọ niile nke eze Babilọn, 14 ziri ndị jere kpọpụta Jeremaya site nʼogige ndị nche. Ha nyefere ya nʼaka Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ka o dulaa ya nʼụlọ ya. Ya mere, Jeremaya nọgidere nʼetiti ndị nke ya. 15 Ma nʼoge ahụ, Jeremaya nọ dị ka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu ONYENWE ANYỊ ruru ya ntị sị ya, 16 “Jekwuru Ebed-Melek onye Kush, gwa ya sị ya, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Lee, ana m aga ime ka okwu ahụ m kwuru megide obodo a mezuo. Ihe ga-abịakwasị obodo a bụ ịla nʼiyi, ọ bụghị ọganihu. Nʼoge ahụ, ihe ndị a ga-emezukwa nʼihu gị. 17 Ma aga m anapụta gị nʼụbọchị ahụ, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. A gaghị enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị na-atụ egwu ha. 18 Aga m azọpụta gị. Ị gakwaghị ada site na mma agha kama ị ga-agbapụkwa na ndụ, nʼihi na ị tụkwasịrị m obi.’ ” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.

In Other Versions

Jeremiah 39 in the ANGEFD

Jeremiah 39 in the ANTPNG2D

Jeremiah 39 in the AS21

Jeremiah 39 in the BAGH

Jeremiah 39 in the BBPNG

Jeremiah 39 in the BBT1E

Jeremiah 39 in the BDS

Jeremiah 39 in the BEV

Jeremiah 39 in the BHAD

Jeremiah 39 in the BIB

Jeremiah 39 in the BLPT

Jeremiah 39 in the BNT

Jeremiah 39 in the BNTABOOT

Jeremiah 39 in the BNTLV

Jeremiah 39 in the BOATCB

Jeremiah 39 in the BOATCB2

Jeremiah 39 in the BOBCV

Jeremiah 39 in the BOCNT

Jeremiah 39 in the BOECS

Jeremiah 39 in the BOGWICC

Jeremiah 39 in the BOHCB

Jeremiah 39 in the BOHCV

Jeremiah 39 in the BOHLNT

Jeremiah 39 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 39 in the BOILNTAP

Jeremiah 39 in the BOITCV

Jeremiah 39 in the BOKCV

Jeremiah 39 in the BOKCV2

Jeremiah 39 in the BOKHWOG

Jeremiah 39 in the BOKSSV

Jeremiah 39 in the BOLCB

Jeremiah 39 in the BOLCB2

Jeremiah 39 in the BOMCV

Jeremiah 39 in the BONAV

Jeremiah 39 in the BONCB

Jeremiah 39 in the BONLT

Jeremiah 39 in the BONUT2

Jeremiah 39 in the BOPLNT

Jeremiah 39 in the BOSCB

Jeremiah 39 in the BOSNC

Jeremiah 39 in the BOTLNT

Jeremiah 39 in the BOVCB

Jeremiah 39 in the BOYCB

Jeremiah 39 in the BPBB

Jeremiah 39 in the BPH

Jeremiah 39 in the BSB

Jeremiah 39 in the CCB

Jeremiah 39 in the CUV

Jeremiah 39 in the CUVS

Jeremiah 39 in the DBT

Jeremiah 39 in the DGDNT

Jeremiah 39 in the DHNT

Jeremiah 39 in the DNT

Jeremiah 39 in the ELBE

Jeremiah 39 in the EMTV

Jeremiah 39 in the ESV

Jeremiah 39 in the FBV

Jeremiah 39 in the FEB

Jeremiah 39 in the GGMNT

Jeremiah 39 in the GNT

Jeremiah 39 in the HARY

Jeremiah 39 in the HNT

Jeremiah 39 in the IRVA

Jeremiah 39 in the IRVB

Jeremiah 39 in the IRVG

Jeremiah 39 in the IRVH

Jeremiah 39 in the IRVK

Jeremiah 39 in the IRVM

Jeremiah 39 in the IRVM2

Jeremiah 39 in the IRVO

Jeremiah 39 in the IRVP

Jeremiah 39 in the IRVT

Jeremiah 39 in the IRVT2

Jeremiah 39 in the IRVU

Jeremiah 39 in the ISVN

Jeremiah 39 in the JSNT

Jeremiah 39 in the KAPI

Jeremiah 39 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 39 in the KBV

Jeremiah 39 in the KJV

Jeremiah 39 in the KNFD

Jeremiah 39 in the LBA

Jeremiah 39 in the LBLA

Jeremiah 39 in the LNT

Jeremiah 39 in the LSV

Jeremiah 39 in the MAAL

Jeremiah 39 in the MBV

Jeremiah 39 in the MBV2

Jeremiah 39 in the MHNT

Jeremiah 39 in the MKNFD

Jeremiah 39 in the MNG

Jeremiah 39 in the MNT

Jeremiah 39 in the MNT2

Jeremiah 39 in the MRS1T

Jeremiah 39 in the NAA

Jeremiah 39 in the NASB

Jeremiah 39 in the NBLA

Jeremiah 39 in the NBS

Jeremiah 39 in the NBVTP

Jeremiah 39 in the NET2

Jeremiah 39 in the NIV11

Jeremiah 39 in the NNT

Jeremiah 39 in the NNT2

Jeremiah 39 in the NNT3

Jeremiah 39 in the PDDPT

Jeremiah 39 in the PFNT

Jeremiah 39 in the RMNT

Jeremiah 39 in the SBIAS

Jeremiah 39 in the SBIBS

Jeremiah 39 in the SBIBS2

Jeremiah 39 in the SBICS

Jeremiah 39 in the SBIDS

Jeremiah 39 in the SBIGS

Jeremiah 39 in the SBIHS

Jeremiah 39 in the SBIIS

Jeremiah 39 in the SBIIS2

Jeremiah 39 in the SBIIS3

Jeremiah 39 in the SBIKS

Jeremiah 39 in the SBIKS2

Jeremiah 39 in the SBIMS

Jeremiah 39 in the SBIOS

Jeremiah 39 in the SBIPS

Jeremiah 39 in the SBISS

Jeremiah 39 in the SBITS

Jeremiah 39 in the SBITS2

Jeremiah 39 in the SBITS3

Jeremiah 39 in the SBITS4

Jeremiah 39 in the SBIUS

Jeremiah 39 in the SBIVS

Jeremiah 39 in the SBT

Jeremiah 39 in the SBT1E

Jeremiah 39 in the SCHL

Jeremiah 39 in the SNT

Jeremiah 39 in the SUSU

Jeremiah 39 in the SUSU2

Jeremiah 39 in the SYNO

Jeremiah 39 in the TBIAOTANT

Jeremiah 39 in the TBT1E

Jeremiah 39 in the TBT1E2

Jeremiah 39 in the TFTIP

Jeremiah 39 in the TFTU

Jeremiah 39 in the TGNTATF3T

Jeremiah 39 in the THAI

Jeremiah 39 in the TNFD

Jeremiah 39 in the TNT

Jeremiah 39 in the TNTIK

Jeremiah 39 in the TNTIL

Jeremiah 39 in the TNTIN

Jeremiah 39 in the TNTIP

Jeremiah 39 in the TNTIZ

Jeremiah 39 in the TOMA

Jeremiah 39 in the TTENT

Jeremiah 39 in the UBG

Jeremiah 39 in the UGV

Jeremiah 39 in the UGV2

Jeremiah 39 in the UGV3

Jeremiah 39 in the VBL

Jeremiah 39 in the VDCC

Jeremiah 39 in the YALU

Jeremiah 39 in the YAPE

Jeremiah 39 in the YBVTP

Jeremiah 39 in the ZBP