Jeremiah 40 (BOICB)
1 Mgbe oge nta gasịrị site nʼoge Nebuzaradan ọchịagha ndị nche nọ na Rema mere ka Jeremaya nwere onwe ya, okwu ONYENWE ANYỊ ruru ya ntị. Nebuzaradan hụrụ Jeremaya mgbe e kekọtara ya na ndị e si na Jerusalem na Juda dọta nʼagha agbụ, bụ ndị ahụ a na-ebula Babilọn. 2 Mgbe ọchịagha ndị nche eze a hụrụ Jeremaya, ọ sịrị ya, “Ọ bụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị nyere iwu na ihe ọjọọ ndị a ga-abịakwasị ala a. 3 Ugbu a kwa ONYENWE ANYỊ emeela ka ihe o kwuru mezuo. O wetarala ala a mbibi ahụ. Ma ihe ndị a niile mezuru nʼihi na ndị gị mehiere megide ONYENWE ANYỊ, jụ irubere ya isi. 4 Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.” 5 Ma tupu Jeremaya atụgharịa ịhapụ ya pụọ, Nebuzaradan gwakwara ya ọzọ sị, “Laghachikwuru Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ na-elekọta obodo Juda niile. Gaa soro ya biri nʼetiti ndị gị, maọbụ i nwere ike gaa ebe ọbụla ọzọ dị gị mma.”Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ nyere ya ihe oriri hiri nne. O nyekwara ya onyinye, hapụ ya ka ọ laa. 6 Ya mere, Jeremaya jekwuuru Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa, soro ya na ndị fọdụrụ nʼala ahụ biri. 7 Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ, 8 ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha. 9 Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn: birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma. 10 Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.” 11 Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile, 12 ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ. 13 Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa 14 sị ya, “Ọ bụ na i maghị na Baalis eze ndị Amọn ezitela Ishmel nwa Netanaya ka ọ bịa gbuo gị?” Ma Gedaliya nwa Ahikam ekwetaghị na ọ bụ eziokwu ka ha na-ekwu. 15 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya pụrụ na nzuzo jekwuru Gedaliya na Mizpa sị ya, “Biko, kwere ka m gaa gbuo Ishmel nwa Netanaya. O nweghị onye ga-amata otu o si nwụọ. Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji gbuo gị, ime ka ndị Juu niile na-alọghachikwute gị gbasasịakwa ọzọ, na imekwa ka ndị Juda fọdụrụ laa nʼiyi?” 16 Ma Gedaliya nwa Ahikam zara Johanan nwa Kariya sị ya, “Biko, emela ihe dị otu ahụ! Nʼihi na ihe ị na-ekwu banyere Ishmel abụghị eziokwu.”
In Other Versions
Jeremiah 40 in the ANGEFD
Jeremiah 40 in the ANTPNG2D
Jeremiah 40 in the AS21
Jeremiah 40 in the BAGH
Jeremiah 40 in the BBPNG
Jeremiah 40 in the BBT1E
Jeremiah 40 in the BDS
Jeremiah 40 in the BEV
Jeremiah 40 in the BHAD
Jeremiah 40 in the BIB
Jeremiah 40 in the BLPT
Jeremiah 40 in the BNT
Jeremiah 40 in the BNTABOOT
Jeremiah 40 in the BNTLV
Jeremiah 40 in the BOATCB
Jeremiah 40 in the BOATCB2
Jeremiah 40 in the BOBCV
Jeremiah 40 in the BOCNT
Jeremiah 40 in the BOECS
Jeremiah 40 in the BOGWICC
Jeremiah 40 in the BOHCB
Jeremiah 40 in the BOHCV
Jeremiah 40 in the BOHLNT
Jeremiah 40 in the BOHNTLTAL
Jeremiah 40 in the BOILNTAP
Jeremiah 40 in the BOITCV
Jeremiah 40 in the BOKCV
Jeremiah 40 in the BOKCV2
Jeremiah 40 in the BOKHWOG
Jeremiah 40 in the BOKSSV
Jeremiah 40 in the BOLCB
Jeremiah 40 in the BOLCB2
Jeremiah 40 in the BOMCV
Jeremiah 40 in the BONAV
Jeremiah 40 in the BONCB
Jeremiah 40 in the BONLT
Jeremiah 40 in the BONUT2
Jeremiah 40 in the BOPLNT
Jeremiah 40 in the BOSCB
Jeremiah 40 in the BOSNC
Jeremiah 40 in the BOTLNT
Jeremiah 40 in the BOVCB
Jeremiah 40 in the BOYCB
Jeremiah 40 in the BPBB
Jeremiah 40 in the BPH
Jeremiah 40 in the BSB
Jeremiah 40 in the CCB
Jeremiah 40 in the CUV
Jeremiah 40 in the CUVS
Jeremiah 40 in the DBT
Jeremiah 40 in the DGDNT
Jeremiah 40 in the DHNT
Jeremiah 40 in the DNT
Jeremiah 40 in the ELBE
Jeremiah 40 in the EMTV
Jeremiah 40 in the ESV
Jeremiah 40 in the FBV
Jeremiah 40 in the FEB
Jeremiah 40 in the GGMNT
Jeremiah 40 in the GNT
Jeremiah 40 in the HARY
Jeremiah 40 in the HNT
Jeremiah 40 in the IRVA
Jeremiah 40 in the IRVB
Jeremiah 40 in the IRVG
Jeremiah 40 in the IRVH
Jeremiah 40 in the IRVK
Jeremiah 40 in the IRVM
Jeremiah 40 in the IRVM2
Jeremiah 40 in the IRVO
Jeremiah 40 in the IRVP
Jeremiah 40 in the IRVT
Jeremiah 40 in the IRVT2
Jeremiah 40 in the IRVU
Jeremiah 40 in the ISVN
Jeremiah 40 in the JSNT
Jeremiah 40 in the KAPI
Jeremiah 40 in the KBT1ETNIK
Jeremiah 40 in the KBV
Jeremiah 40 in the KJV
Jeremiah 40 in the KNFD
Jeremiah 40 in the LBA
Jeremiah 40 in the LBLA
Jeremiah 40 in the LNT
Jeremiah 40 in the LSV
Jeremiah 40 in the MAAL
Jeremiah 40 in the MBV
Jeremiah 40 in the MBV2
Jeremiah 40 in the MHNT
Jeremiah 40 in the MKNFD
Jeremiah 40 in the MNG
Jeremiah 40 in the MNT
Jeremiah 40 in the MNT2
Jeremiah 40 in the MRS1T
Jeremiah 40 in the NAA
Jeremiah 40 in the NASB
Jeremiah 40 in the NBLA
Jeremiah 40 in the NBS
Jeremiah 40 in the NBVTP
Jeremiah 40 in the NET2
Jeremiah 40 in the NIV11
Jeremiah 40 in the NNT
Jeremiah 40 in the NNT2
Jeremiah 40 in the NNT3
Jeremiah 40 in the PDDPT
Jeremiah 40 in the PFNT
Jeremiah 40 in the RMNT
Jeremiah 40 in the SBIAS
Jeremiah 40 in the SBIBS
Jeremiah 40 in the SBIBS2
Jeremiah 40 in the SBICS
Jeremiah 40 in the SBIDS
Jeremiah 40 in the SBIGS
Jeremiah 40 in the SBIHS
Jeremiah 40 in the SBIIS
Jeremiah 40 in the SBIIS2
Jeremiah 40 in the SBIIS3
Jeremiah 40 in the SBIKS
Jeremiah 40 in the SBIKS2
Jeremiah 40 in the SBIMS
Jeremiah 40 in the SBIOS
Jeremiah 40 in the SBIPS
Jeremiah 40 in the SBISS
Jeremiah 40 in the SBITS
Jeremiah 40 in the SBITS2
Jeremiah 40 in the SBITS3
Jeremiah 40 in the SBITS4
Jeremiah 40 in the SBIUS
Jeremiah 40 in the SBIVS
Jeremiah 40 in the SBT
Jeremiah 40 in the SBT1E
Jeremiah 40 in the SCHL
Jeremiah 40 in the SNT
Jeremiah 40 in the SUSU
Jeremiah 40 in the SUSU2
Jeremiah 40 in the SYNO
Jeremiah 40 in the TBIAOTANT
Jeremiah 40 in the TBT1E
Jeremiah 40 in the TBT1E2
Jeremiah 40 in the TFTIP
Jeremiah 40 in the TFTU
Jeremiah 40 in the TGNTATF3T
Jeremiah 40 in the THAI
Jeremiah 40 in the TNFD
Jeremiah 40 in the TNT
Jeremiah 40 in the TNTIK
Jeremiah 40 in the TNTIL
Jeremiah 40 in the TNTIN
Jeremiah 40 in the TNTIP
Jeremiah 40 in the TNTIZ
Jeremiah 40 in the TOMA
Jeremiah 40 in the TTENT
Jeremiah 40 in the UBG
Jeremiah 40 in the UGV
Jeremiah 40 in the UGV2
Jeremiah 40 in the UGV3
Jeremiah 40 in the VBL
Jeremiah 40 in the VDCC
Jeremiah 40 in the YALU
Jeremiah 40 in the YAPE
Jeremiah 40 in the YBVTP
Jeremiah 40 in the ZBP