Jeremiah 44 (BOICB)

1 Ndị a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juu ahụ niile bi nʼala Ijipt, bụ ndị bi na Migdol, na nʼime Tapanhis, na nʼime Memfis, na nʼime Patros, 2 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha. 3 Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị. 4 Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’ 5 Ma ha egeghị ntị, ha atọkwaghị ntị ha nʼala. Ha esiteghị nʼihe ọjọọ ha na-eme chegharịa, maọbụ kwụsị ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ. 6 Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m na iwe m, nke rere dịka ọkụ megide obodo niile nke Juda, na okporoụzọ nke Jerusalem. Ya mere, ha ghọrọ mkpọmkpọ ebe na ebe tọgbọrọ nʼefu taa. 7 “Ma ugbu a, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Nʼihi gịnị ka unu ji chọọ iji aka unu wetara onwe unu ihe ọjọọ ndị a? Lee ka unu si duru ndị ikom na ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile, na ụmụ a mụrụ ọhụrụ niile na-agbala nʼala Ijipt, si otu a mee ka, ọ bụladị, otu mkpụrụ mmadụ hapụ ịfọdụkwa nʼala Juda. 8 Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa. 9 Unu echefuola ihe ọjọọ nna unu ha mere na ihe ọjọọ niile ndị eze Juda na ndị eze nwanyị Juda mere na ihe ọjọọ niile nke unu onwe unu na ndị nwunye unu mekwara nʼala Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem? 10 Ruo ụbọchị taa, o nwebeghị onye ọbụla nʼime ha wedarala onwe ya ala, maọbụ tụọ egwu m; ha adịghị ejegharị nʼiwu m, maọbụ jidesie ụkpụrụ ndị ahụ niile m debere nʼihu ha na nʼihu nna nna ha aka ike, ịgbaso ya. 11 “Nʼihi ihe ndị a niile, otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ekpebiela m ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu; ekpebiela m ibibi Juda. 12 Aga m eme ka ndị ahụ niile fọdụrụ nʼala Juda, bụ ndị ahụ kpebiri nʼobi ha ịga biri nʼala Ijipt ghara ịdịkwa. A ga-ala ha nʼiyi nʼala Ijipt; ha ga-ada site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ. Ndị niile dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha na ndị niile dịkarịsịrị nta ga-anwụ. Ha ga-aghọkwa ihe ịbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe ọmụma ikpe na ihe nkọcha. 13 Dịka m si taa Jerusalem ahụhụ, otu a ka m ga-esi jiri mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, taa ndị ahụ bi nʼIjipt ahụhụ. 14 O nweghị onye ọbụla nʼime ndị Juda ahụ fọdụrụ, ndị gara biri nʼIjipt nke ga-agbanarị ọnwụ. Ọ bụ ezie na ọ na-agụsị ha agụụ ike ịlọghachi nʼala Juda, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-alọghachi, karịakwa mmadụ ole na ole ndị ga-agbapụ agbapụ.” 15 Ndị nọ nʼebe ahụ mgbe ahụ Jeremaya kwuru okwu ndị a bụ ndị ikom ahụ niile maara na ndị nwunye ha na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, na ndị niile bi nʼIjipt nʼakụkụ Patros. Ndị a zara Jeremaya sị ya, 16 “Anyị agaghị anabata okwu ahụ i si nʼaha ONYENWE ANYỊ gwa anyị 17 Nʼihi na anyị aghaghị ime ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime. Anyị ga-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anyị ga-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ dịka anyị na nna anyị ha, ndị eze anyị na ndịisi ọchịchị anyị mere nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem. Nʼoge ahụ, anyị na-eriju afọ, ihe na-agakwara anyị nke ọma, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị anyị. 18 Ma site nʼoge anyị kwụsịrị ịchụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja, ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na ịwụsara ya aja ihe ọṅụṅụ, ihe niile akọla anyị, ọ bụkwa site na mma agha na oke ụnwụ ka anyị na-ala nʼiyi.” 19 Ndị inyom ahụ niile kwukwara sị, “Mgbe ahụ anyị na-eji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja na mgbe ahụ anyị na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ, ọ bụ na ndị di na-alụ anyị amaghị na anyị na-eme achịcha nʼoyiyi ya, na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ?” 20 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara mmadụ ahụ niile okwu, ma ndị ikom ma ndị inyom ahụ niile zara ya okwu sị ha, 21 “ONYENWE ANYỊ chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile. 22 Nʼihi ya, mgbe ONYENWE ANYỊ na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa. 23 Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide ONYENWE ANYỊ, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.” 24 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt. 25 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’“Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ. 26 Ma nụrụkwanụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu ndị Juu niile bi nʼIjipt, ‘Eji m aha m dị ukwuu na-aṅụ iyi,’ ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ‘na o nweghị onye Juda ọbụla bi nʼakụkụ ọbụla nke Ijipt, nke ga-akpọkukwa aha m ọzọ, maọbụ jiri ya ṅụọ iyi sị, “Dịka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ.” 27 Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum. 28 Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha. 29 “ ‘Nke a ga-abụrụ unu ihe ama nke ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ nʼebe a,’ otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. ‘Ka unu si otu a mara na mba m na-aba na m ga-emesi unu ike aghaghị iguzosi ike.’ 30 Ihe a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Aga m arara Fero Hofra, eze Ijipt nyefee nʼaka ndị iro ya, bụ ndị na-achọ ndụ ya, dịka m si rara Zedekaya eze Juda, nyefee nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, bụ onye iro ahụ chọrọ ndụ ya.’ ”

In Other Versions

Jeremiah 44 in the ANGEFD

Jeremiah 44 in the ANTPNG2D

Jeremiah 44 in the AS21

Jeremiah 44 in the BAGH

Jeremiah 44 in the BBPNG

Jeremiah 44 in the BBT1E

Jeremiah 44 in the BDS

Jeremiah 44 in the BEV

Jeremiah 44 in the BHAD

Jeremiah 44 in the BIB

Jeremiah 44 in the BLPT

Jeremiah 44 in the BNT

Jeremiah 44 in the BNTABOOT

Jeremiah 44 in the BNTLV

Jeremiah 44 in the BOATCB

Jeremiah 44 in the BOATCB2

Jeremiah 44 in the BOBCV

Jeremiah 44 in the BOCNT

Jeremiah 44 in the BOECS

Jeremiah 44 in the BOGWICC

Jeremiah 44 in the BOHCB

Jeremiah 44 in the BOHCV

Jeremiah 44 in the BOHLNT

Jeremiah 44 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 44 in the BOILNTAP

Jeremiah 44 in the BOITCV

Jeremiah 44 in the BOKCV

Jeremiah 44 in the BOKCV2

Jeremiah 44 in the BOKHWOG

Jeremiah 44 in the BOKSSV

Jeremiah 44 in the BOLCB

Jeremiah 44 in the BOLCB2

Jeremiah 44 in the BOMCV

Jeremiah 44 in the BONAV

Jeremiah 44 in the BONCB

Jeremiah 44 in the BONLT

Jeremiah 44 in the BONUT2

Jeremiah 44 in the BOPLNT

Jeremiah 44 in the BOSCB

Jeremiah 44 in the BOSNC

Jeremiah 44 in the BOTLNT

Jeremiah 44 in the BOVCB

Jeremiah 44 in the BOYCB

Jeremiah 44 in the BPBB

Jeremiah 44 in the BPH

Jeremiah 44 in the BSB

Jeremiah 44 in the CCB

Jeremiah 44 in the CUV

Jeremiah 44 in the CUVS

Jeremiah 44 in the DBT

Jeremiah 44 in the DGDNT

Jeremiah 44 in the DHNT

Jeremiah 44 in the DNT

Jeremiah 44 in the ELBE

Jeremiah 44 in the EMTV

Jeremiah 44 in the ESV

Jeremiah 44 in the FBV

Jeremiah 44 in the FEB

Jeremiah 44 in the GGMNT

Jeremiah 44 in the GNT

Jeremiah 44 in the HARY

Jeremiah 44 in the HNT

Jeremiah 44 in the IRVA

Jeremiah 44 in the IRVB

Jeremiah 44 in the IRVG

Jeremiah 44 in the IRVH

Jeremiah 44 in the IRVK

Jeremiah 44 in the IRVM

Jeremiah 44 in the IRVM2

Jeremiah 44 in the IRVO

Jeremiah 44 in the IRVP

Jeremiah 44 in the IRVT

Jeremiah 44 in the IRVT2

Jeremiah 44 in the IRVU

Jeremiah 44 in the ISVN

Jeremiah 44 in the JSNT

Jeremiah 44 in the KAPI

Jeremiah 44 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 44 in the KBV

Jeremiah 44 in the KJV

Jeremiah 44 in the KNFD

Jeremiah 44 in the LBA

Jeremiah 44 in the LBLA

Jeremiah 44 in the LNT

Jeremiah 44 in the LSV

Jeremiah 44 in the MAAL

Jeremiah 44 in the MBV

Jeremiah 44 in the MBV2

Jeremiah 44 in the MHNT

Jeremiah 44 in the MKNFD

Jeremiah 44 in the MNG

Jeremiah 44 in the MNT

Jeremiah 44 in the MNT2

Jeremiah 44 in the MRS1T

Jeremiah 44 in the NAA

Jeremiah 44 in the NASB

Jeremiah 44 in the NBLA

Jeremiah 44 in the NBS

Jeremiah 44 in the NBVTP

Jeremiah 44 in the NET2

Jeremiah 44 in the NIV11

Jeremiah 44 in the NNT

Jeremiah 44 in the NNT2

Jeremiah 44 in the NNT3

Jeremiah 44 in the PDDPT

Jeremiah 44 in the PFNT

Jeremiah 44 in the RMNT

Jeremiah 44 in the SBIAS

Jeremiah 44 in the SBIBS

Jeremiah 44 in the SBIBS2

Jeremiah 44 in the SBICS

Jeremiah 44 in the SBIDS

Jeremiah 44 in the SBIGS

Jeremiah 44 in the SBIHS

Jeremiah 44 in the SBIIS

Jeremiah 44 in the SBIIS2

Jeremiah 44 in the SBIIS3

Jeremiah 44 in the SBIKS

Jeremiah 44 in the SBIKS2

Jeremiah 44 in the SBIMS

Jeremiah 44 in the SBIOS

Jeremiah 44 in the SBIPS

Jeremiah 44 in the SBISS

Jeremiah 44 in the SBITS

Jeremiah 44 in the SBITS2

Jeremiah 44 in the SBITS3

Jeremiah 44 in the SBITS4

Jeremiah 44 in the SBIUS

Jeremiah 44 in the SBIVS

Jeremiah 44 in the SBT

Jeremiah 44 in the SBT1E

Jeremiah 44 in the SCHL

Jeremiah 44 in the SNT

Jeremiah 44 in the SUSU

Jeremiah 44 in the SUSU2

Jeremiah 44 in the SYNO

Jeremiah 44 in the TBIAOTANT

Jeremiah 44 in the TBT1E

Jeremiah 44 in the TBT1E2

Jeremiah 44 in the TFTIP

Jeremiah 44 in the TFTU

Jeremiah 44 in the TGNTATF3T

Jeremiah 44 in the THAI

Jeremiah 44 in the TNFD

Jeremiah 44 in the TNT

Jeremiah 44 in the TNTIK

Jeremiah 44 in the TNTIL

Jeremiah 44 in the TNTIN

Jeremiah 44 in the TNTIP

Jeremiah 44 in the TNTIZ

Jeremiah 44 in the TOMA

Jeremiah 44 in the TTENT

Jeremiah 44 in the UBG

Jeremiah 44 in the UGV

Jeremiah 44 in the UGV2

Jeremiah 44 in the UGV3

Jeremiah 44 in the VBL

Jeremiah 44 in the VDCC

Jeremiah 44 in the YALU

Jeremiah 44 in the YAPE

Jeremiah 44 in the YBVTP

Jeremiah 44 in the ZBP