Jeremiah 5 (BOICB)

1 “Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem,legharịa anya, ma mara,chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile.Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye,bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu.M ga-agbagharakwa obodo a 2 Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ,’ma ha ka na-aṅụ iyi nʼokwu ụgha.” 3 ONYENWE ANYỊ, anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ?Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ.I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị.Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume,ha ajụla ịchịgharị. 4 Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenyena ndị na-enweghị uche,ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ ONYENWE ANYỊ,na iwu nke Chineke ha. 5 Aga m ejekwuru ndị ndu,gwa ha okwu sị,nʼezie ha maara ihe gbasara ụzọ ONYENWE ANYỊ,marakwa iwu niile nke Chineke ha.”Ma ha onwe ha nʼotu obi agbajiela ịyagba ahụ,tijiekwa agbụ niile. 6 Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ;nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha.Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo haịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta.Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu,na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu. 7 “Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu?Lee na ụmụ unu ahapụla m,na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi.Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha,ma ha nọgidere na-akwa iko.Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ. 8 Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya.Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya. 9 Ma ONYENWE ANYỊ na-ajụ ajụjụ sị,m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọmegide mba dị otu a?” 10 “Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya,ma unu emebila ya kpamkpam.Gbajisienụ alaka yanʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke ONYENWE ANYỊ. 11 ONYENWE ANYỊ ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Judaegosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 12 Ha ekwuola okwu ụgha megide ONYENWE ANYỊ.E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme!Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị;mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso. 13 Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku,nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha.Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.” 14 Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,“Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta,aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ.Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa. 15 Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri,“Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu.Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike,nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha,ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha. 16 Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe;ha niile bụkwa ndị dike nʼagha. 17 Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere.Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị.Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu.Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu.Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike,bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche. 18 “Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam. 19 Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ONYENWE ANYỊ Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’ 20 “Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya,kwusaa ya na Juda. 21 Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche,unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ,na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe. 22 Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, na-ajụ sị,o kwesighị ka unu tụọ m egwu?”“O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m?Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere.Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe.Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya.Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ. 23 Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe.Ha atụgharịala wezuga onwe ha. 24 Ha adịghị asị onwe ha,‘Ka anyị tụọ egwu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị,onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya,ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’ 25 Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka.Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu. 26 “E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m,ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya,dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ. 27 Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya,ụlọ ndị dị otu a jupụtara nʼaghụghọ.Nʼihi nke a, ha ghọrọ ndị ọgaranya na ndị dị ike, 28 ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ.Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ;ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi.Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna;ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha. 29 M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?”ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, na-ajụ.“M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọmegide mba dị otu a? 30 “Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ okeemeela nʼala a. 31 Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha,ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike,ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya.Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”

In Other Versions

Jeremiah 5 in the ANGEFD

Jeremiah 5 in the ANTPNG2D

Jeremiah 5 in the AS21

Jeremiah 5 in the BAGH

Jeremiah 5 in the BBPNG

Jeremiah 5 in the BBT1E

Jeremiah 5 in the BDS

Jeremiah 5 in the BEV

Jeremiah 5 in the BHAD

Jeremiah 5 in the BIB

Jeremiah 5 in the BLPT

Jeremiah 5 in the BNT

Jeremiah 5 in the BNTABOOT

Jeremiah 5 in the BNTLV

Jeremiah 5 in the BOATCB

Jeremiah 5 in the BOATCB2

Jeremiah 5 in the BOBCV

Jeremiah 5 in the BOCNT

Jeremiah 5 in the BOECS

Jeremiah 5 in the BOGWICC

Jeremiah 5 in the BOHCB

Jeremiah 5 in the BOHCV

Jeremiah 5 in the BOHLNT

Jeremiah 5 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 5 in the BOILNTAP

Jeremiah 5 in the BOITCV

Jeremiah 5 in the BOKCV

Jeremiah 5 in the BOKCV2

Jeremiah 5 in the BOKHWOG

Jeremiah 5 in the BOKSSV

Jeremiah 5 in the BOLCB

Jeremiah 5 in the BOLCB2

Jeremiah 5 in the BOMCV

Jeremiah 5 in the BONAV

Jeremiah 5 in the BONCB

Jeremiah 5 in the BONLT

Jeremiah 5 in the BONUT2

Jeremiah 5 in the BOPLNT

Jeremiah 5 in the BOSCB

Jeremiah 5 in the BOSNC

Jeremiah 5 in the BOTLNT

Jeremiah 5 in the BOVCB

Jeremiah 5 in the BOYCB

Jeremiah 5 in the BPBB

Jeremiah 5 in the BPH

Jeremiah 5 in the BSB

Jeremiah 5 in the CCB

Jeremiah 5 in the CUV

Jeremiah 5 in the CUVS

Jeremiah 5 in the DBT

Jeremiah 5 in the DGDNT

Jeremiah 5 in the DHNT

Jeremiah 5 in the DNT

Jeremiah 5 in the ELBE

Jeremiah 5 in the EMTV

Jeremiah 5 in the ESV

Jeremiah 5 in the FBV

Jeremiah 5 in the FEB

Jeremiah 5 in the GGMNT

Jeremiah 5 in the GNT

Jeremiah 5 in the HARY

Jeremiah 5 in the HNT

Jeremiah 5 in the IRVA

Jeremiah 5 in the IRVB

Jeremiah 5 in the IRVG

Jeremiah 5 in the IRVH

Jeremiah 5 in the IRVK

Jeremiah 5 in the IRVM

Jeremiah 5 in the IRVM2

Jeremiah 5 in the IRVO

Jeremiah 5 in the IRVP

Jeremiah 5 in the IRVT

Jeremiah 5 in the IRVT2

Jeremiah 5 in the IRVU

Jeremiah 5 in the ISVN

Jeremiah 5 in the JSNT

Jeremiah 5 in the KAPI

Jeremiah 5 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 5 in the KBV

Jeremiah 5 in the KJV

Jeremiah 5 in the KNFD

Jeremiah 5 in the LBA

Jeremiah 5 in the LBLA

Jeremiah 5 in the LNT

Jeremiah 5 in the LSV

Jeremiah 5 in the MAAL

Jeremiah 5 in the MBV

Jeremiah 5 in the MBV2

Jeremiah 5 in the MHNT

Jeremiah 5 in the MKNFD

Jeremiah 5 in the MNG

Jeremiah 5 in the MNT

Jeremiah 5 in the MNT2

Jeremiah 5 in the MRS1T

Jeremiah 5 in the NAA

Jeremiah 5 in the NASB

Jeremiah 5 in the NBLA

Jeremiah 5 in the NBS

Jeremiah 5 in the NBVTP

Jeremiah 5 in the NET2

Jeremiah 5 in the NIV11

Jeremiah 5 in the NNT

Jeremiah 5 in the NNT2

Jeremiah 5 in the NNT3

Jeremiah 5 in the PDDPT

Jeremiah 5 in the PFNT

Jeremiah 5 in the RMNT

Jeremiah 5 in the SBIAS

Jeremiah 5 in the SBIBS

Jeremiah 5 in the SBIBS2

Jeremiah 5 in the SBICS

Jeremiah 5 in the SBIDS

Jeremiah 5 in the SBIGS

Jeremiah 5 in the SBIHS

Jeremiah 5 in the SBIIS

Jeremiah 5 in the SBIIS2

Jeremiah 5 in the SBIIS3

Jeremiah 5 in the SBIKS

Jeremiah 5 in the SBIKS2

Jeremiah 5 in the SBIMS

Jeremiah 5 in the SBIOS

Jeremiah 5 in the SBIPS

Jeremiah 5 in the SBISS

Jeremiah 5 in the SBITS

Jeremiah 5 in the SBITS2

Jeremiah 5 in the SBITS3

Jeremiah 5 in the SBITS4

Jeremiah 5 in the SBIUS

Jeremiah 5 in the SBIVS

Jeremiah 5 in the SBT

Jeremiah 5 in the SBT1E

Jeremiah 5 in the SCHL

Jeremiah 5 in the SNT

Jeremiah 5 in the SUSU

Jeremiah 5 in the SUSU2

Jeremiah 5 in the SYNO

Jeremiah 5 in the TBIAOTANT

Jeremiah 5 in the TBT1E

Jeremiah 5 in the TBT1E2

Jeremiah 5 in the TFTIP

Jeremiah 5 in the TFTU

Jeremiah 5 in the TGNTATF3T

Jeremiah 5 in the THAI

Jeremiah 5 in the TNFD

Jeremiah 5 in the TNT

Jeremiah 5 in the TNTIK

Jeremiah 5 in the TNTIL

Jeremiah 5 in the TNTIN

Jeremiah 5 in the TNTIP

Jeremiah 5 in the TNTIZ

Jeremiah 5 in the TOMA

Jeremiah 5 in the TTENT

Jeremiah 5 in the UBG

Jeremiah 5 in the UGV

Jeremiah 5 in the UGV2

Jeremiah 5 in the UGV3

Jeremiah 5 in the VBL

Jeremiah 5 in the VDCC

Jeremiah 5 in the YALU

Jeremiah 5 in the YAPE

Jeremiah 5 in the YBVTP

Jeremiah 5 in the ZBP