John 3 (BOICB)

1 O nwere otu nwoke onyeisi ndị Juu nke so nʼotu ndị Farisii aha ya bụ Nikọdimọs. 2 Ọ bịakwutere ya nʼabalị sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere na Chineke, nʼihi na o nweghị onye ọbụla pụrụ ịrụ ọrụ ebube dị otu a ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.” 3 Jisọs zara sị ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.” 4 Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?” 5 Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke. 6 Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ. 7 Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’ 8 Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.” 9 Nikọdimọs zara sị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mee?” 10 Jisọs zara sị ya, “Ị bụ onye ozizi ndị Izrel, ma ị ghọtaghị ihe ndị a? 11 Nʼezie, nʼezie agwa m unu. Anyị na-ekwu banyere ihe anyị maara, na-akọwapụtakwa ihe anyị hụrụ, ma unu onwe unu adịghị anabata akaebe anyị. 12 Ekwuola m banyere ihe dị nʼụwa ma unu ekweghị ya, oleekwanụ otu unu ga-esi kwere, ma ọ bụrụ na mụ agwa unu banyere ihe ndị dị nʼeluigwe? 13 O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata. 14 Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu. 15 Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.” 16 Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. 17 Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa. 18 Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. 19 Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ. 20 Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè. 21 Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke. 22 Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime obodo Judịa, ebe ọ nọtụrụ nwa oge, meekwa baptizim. 23 Nʼotu aka ahụ, Jọn nọkwa nʼọnụ mmiri Enọn dị nso na Salim na-eme baptizim nʼihi na mmiri buru ibu nʼebe ahụ, ndị mmadụ gakwara nʼihu na-abịakwute ya, ọ na-emekwa ha baptizim. 24 E tinyebeghị Jọn nʼụlọ mkpọrọ mgbe ahụ. 25 Nʼoge a, ịrụrịta ụka malitere nʼetiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere mmemme ịdị ọcha. 26 Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, onye ahụ ị gbara ama banyere ya nọ nʼofe Jọdan na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwukwara ya.” 27 Jọn zaghachiri sị, “Ihe mmadụ nwere ike ịnata bụ naanị ihe ahụ e nyere ya site nʼeluigwe. 28 Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, na abụghị m Kraịst ahụ, kama e zitere m ka m buru ụzọ bịa. 29 Nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nke di ya. Enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-eche ma na-egekwa ntị ịnụ olu ya, ọṅụ na-ejupụtakwa ya obi mgbe ọ nụrụ olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, ọṅụ m e zuola oke ugbu a. 30 Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala. 31 “Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile. 32 Ọ na-agba ama banyere ihe ọ hụrụ nakwa nke ọ nụrụ, ma o nweghị onye na-anabata ama ya. 33 Onye ọbụla nabatara akaebe ya ji nke a mere akara, na Chineke bụ eziokwu. 34 Nʼihi na onye Chineke zitere na-ekwu okwu Chineke. Nʼihi na ọ na-enye Mmụọ ya nʼuju. 35 Nna hụrụ Ọkpara ya nʼanya, o tinyekwala ihe niile nʼaka ya. 36 Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.”

In Other Versions

John 3 in the ANGEFD

John 3 in the ANTPNG2D

John 3 in the AS21

John 3 in the BAGH

John 3 in the BBPNG

John 3 in the BBT1E

John 3 in the BDS

John 3 in the BEV

John 3 in the BHAD

John 3 in the BIB

John 3 in the BLPT

John 3 in the BNT

John 3 in the BNTABOOT

John 3 in the BNTLV

John 3 in the BOATCB

John 3 in the BOATCB2

John 3 in the BOBCV

John 3 in the BOCNT

John 3 in the BOECS

John 3 in the BOGWICC

John 3 in the BOHCB

John 3 in the BOHCV

John 3 in the BOHLNT

John 3 in the BOHNTLTAL

John 3 in the BOILNTAP

John 3 in the BOITCV

John 3 in the BOKCV

John 3 in the BOKCV2

John 3 in the BOKHWOG

John 3 in the BOKSSV

John 3 in the BOLCB

John 3 in the BOLCB2

John 3 in the BOMCV

John 3 in the BONAV

John 3 in the BONCB

John 3 in the BONLT

John 3 in the BONUT2

John 3 in the BOPLNT

John 3 in the BOSCB

John 3 in the BOSNC

John 3 in the BOTLNT

John 3 in the BOVCB

John 3 in the BOYCB

John 3 in the BPBB

John 3 in the BPH

John 3 in the BSB

John 3 in the CCB

John 3 in the CUV

John 3 in the CUVS

John 3 in the DBT

John 3 in the DGDNT

John 3 in the DHNT

John 3 in the DNT

John 3 in the ELBE

John 3 in the EMTV

John 3 in the ESV

John 3 in the FBV

John 3 in the FEB

John 3 in the GGMNT

John 3 in the GNT

John 3 in the HARY

John 3 in the HNT

John 3 in the IRVA

John 3 in the IRVB

John 3 in the IRVG

John 3 in the IRVH

John 3 in the IRVK

John 3 in the IRVM

John 3 in the IRVM2

John 3 in the IRVO

John 3 in the IRVP

John 3 in the IRVT

John 3 in the IRVT2

John 3 in the IRVU

John 3 in the ISVN

John 3 in the JSNT

John 3 in the KAPI

John 3 in the KBT1ETNIK

John 3 in the KBV

John 3 in the KJV

John 3 in the KNFD

John 3 in the LBA

John 3 in the LBLA

John 3 in the LNT

John 3 in the LSV

John 3 in the MAAL

John 3 in the MBV

John 3 in the MBV2

John 3 in the MHNT

John 3 in the MKNFD

John 3 in the MNG

John 3 in the MNT

John 3 in the MNT2

John 3 in the MRS1T

John 3 in the NAA

John 3 in the NASB

John 3 in the NBLA

John 3 in the NBS

John 3 in the NBVTP

John 3 in the NET2

John 3 in the NIV11

John 3 in the NNT

John 3 in the NNT2

John 3 in the NNT3

John 3 in the PDDPT

John 3 in the PFNT

John 3 in the RMNT

John 3 in the SBIAS

John 3 in the SBIBS

John 3 in the SBIBS2

John 3 in the SBICS

John 3 in the SBIDS

John 3 in the SBIGS

John 3 in the SBIHS

John 3 in the SBIIS

John 3 in the SBIIS2

John 3 in the SBIIS3

John 3 in the SBIKS

John 3 in the SBIKS2

John 3 in the SBIMS

John 3 in the SBIOS

John 3 in the SBIPS

John 3 in the SBISS

John 3 in the SBITS

John 3 in the SBITS2

John 3 in the SBITS3

John 3 in the SBITS4

John 3 in the SBIUS

John 3 in the SBIVS

John 3 in the SBT

John 3 in the SBT1E

John 3 in the SCHL

John 3 in the SNT

John 3 in the SUSU

John 3 in the SUSU2

John 3 in the SYNO

John 3 in the TBIAOTANT

John 3 in the TBT1E

John 3 in the TBT1E2

John 3 in the TFTIP

John 3 in the TFTU

John 3 in the TGNTATF3T

John 3 in the THAI

John 3 in the TNFD

John 3 in the TNT

John 3 in the TNTIK

John 3 in the TNTIL

John 3 in the TNTIN

John 3 in the TNTIP

John 3 in the TNTIZ

John 3 in the TOMA

John 3 in the TTENT

John 3 in the UBG

John 3 in the UGV

John 3 in the UGV2

John 3 in the UGV3

John 3 in the VBL

John 3 in the VDCC

John 3 in the YALU

John 3 in the YAPE

John 3 in the YBVTP

John 3 in the ZBP