Job 9 (BOICB)

1 Job zara sị: 2 “Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke? 3 Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya? 4 Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ? 5 Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a,na-akwatụ ha nʼiwe ya. 6 Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,mee ka ogidi ya maa jijiji. 7 Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye. 8 Naanị ya gbasara mbara eluigwe,ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri. 9 Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orionna Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe. 10 Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta. 11 Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya,mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya. 12 Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya?Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’ 13 Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi,ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya. 14 “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ,maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka? 15 Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu;kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere. 16 A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m,ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị. 17 Ọ ga-eji oke ifufe tirie m,meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya. 18 Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachikama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m. 19 Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu!Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya. 20 A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe;ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara. 21 “Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghịejighị m onwe m kpọrọ ihe;nʼezie ana m eleda ndụ m anya. 22 Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị,‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’ 23 Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede,ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị. 24 Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu,ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya.Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya? 25 “Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya. 26 Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri. 27 Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’ 28 Nsogbu m niile ka na-atụ m egwunʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha. 29 Ebe m bụrịị onye ikpe mara,nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu? 30 A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ mwerekwa soda saa aka m abụọ, 31 ị ga-enuba m nʼolulu apịtịnke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị. 32 “Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya,ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe. 33 A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị,onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya, 34 onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ,ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ. 35 Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu;ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.

In Other Versions

Job 9 in the ANGEFD

Job 9 in the ANTPNG2D

Job 9 in the AS21

Job 9 in the BAGH

Job 9 in the BBPNG

Job 9 in the BBT1E

Job 9 in the BDS

Job 9 in the BEV

Job 9 in the BHAD

Job 9 in the BIB

Job 9 in the BLPT

Job 9 in the BNT

Job 9 in the BNTABOOT

Job 9 in the BNTLV

Job 9 in the BOATCB

Job 9 in the BOATCB2

Job 9 in the BOBCV

Job 9 in the BOCNT

Job 9 in the BOECS

Job 9 in the BOGWICC

Job 9 in the BOHCB

Job 9 in the BOHCV

Job 9 in the BOHLNT

Job 9 in the BOHNTLTAL

Job 9 in the BOILNTAP

Job 9 in the BOITCV

Job 9 in the BOKCV

Job 9 in the BOKCV2

Job 9 in the BOKHWOG

Job 9 in the BOKSSV

Job 9 in the BOLCB

Job 9 in the BOLCB2

Job 9 in the BOMCV

Job 9 in the BONAV

Job 9 in the BONCB

Job 9 in the BONLT

Job 9 in the BONUT2

Job 9 in the BOPLNT

Job 9 in the BOSCB

Job 9 in the BOSNC

Job 9 in the BOTLNT

Job 9 in the BOVCB

Job 9 in the BOYCB

Job 9 in the BPBB

Job 9 in the BPH

Job 9 in the BSB

Job 9 in the CCB

Job 9 in the CUV

Job 9 in the CUVS

Job 9 in the DBT

Job 9 in the DGDNT

Job 9 in the DHNT

Job 9 in the DNT

Job 9 in the ELBE

Job 9 in the EMTV

Job 9 in the ESV

Job 9 in the FBV

Job 9 in the FEB

Job 9 in the GGMNT

Job 9 in the GNT

Job 9 in the HARY

Job 9 in the HNT

Job 9 in the IRVA

Job 9 in the IRVB

Job 9 in the IRVG

Job 9 in the IRVH

Job 9 in the IRVK

Job 9 in the IRVM

Job 9 in the IRVM2

Job 9 in the IRVO

Job 9 in the IRVP

Job 9 in the IRVT

Job 9 in the IRVT2

Job 9 in the IRVU

Job 9 in the ISVN

Job 9 in the JSNT

Job 9 in the KAPI

Job 9 in the KBT1ETNIK

Job 9 in the KBV

Job 9 in the KJV

Job 9 in the KNFD

Job 9 in the LBA

Job 9 in the LBLA

Job 9 in the LNT

Job 9 in the LSV

Job 9 in the MAAL

Job 9 in the MBV

Job 9 in the MBV2

Job 9 in the MHNT

Job 9 in the MKNFD

Job 9 in the MNG

Job 9 in the MNT

Job 9 in the MNT2

Job 9 in the MRS1T

Job 9 in the NAA

Job 9 in the NASB

Job 9 in the NBLA

Job 9 in the NBS

Job 9 in the NBVTP

Job 9 in the NET2

Job 9 in the NIV11

Job 9 in the NNT

Job 9 in the NNT2

Job 9 in the NNT3

Job 9 in the PDDPT

Job 9 in the PFNT

Job 9 in the RMNT

Job 9 in the SBIAS

Job 9 in the SBIBS

Job 9 in the SBIBS2

Job 9 in the SBICS

Job 9 in the SBIDS

Job 9 in the SBIGS

Job 9 in the SBIHS

Job 9 in the SBIIS

Job 9 in the SBIIS2

Job 9 in the SBIIS3

Job 9 in the SBIKS

Job 9 in the SBIKS2

Job 9 in the SBIMS

Job 9 in the SBIOS

Job 9 in the SBIPS

Job 9 in the SBISS

Job 9 in the SBITS

Job 9 in the SBITS2

Job 9 in the SBITS3

Job 9 in the SBITS4

Job 9 in the SBIUS

Job 9 in the SBIVS

Job 9 in the SBT

Job 9 in the SBT1E

Job 9 in the SCHL

Job 9 in the SNT

Job 9 in the SUSU

Job 9 in the SUSU2

Job 9 in the SYNO

Job 9 in the TBIAOTANT

Job 9 in the TBT1E

Job 9 in the TBT1E2

Job 9 in the TFTIP

Job 9 in the TFTU

Job 9 in the TGNTATF3T

Job 9 in the THAI

Job 9 in the TNFD

Job 9 in the TNT

Job 9 in the TNTIK

Job 9 in the TNTIL

Job 9 in the TNTIN

Job 9 in the TNTIP

Job 9 in the TNTIZ

Job 9 in the TOMA

Job 9 in the TTENT

Job 9 in the UBG

Job 9 in the UGV

Job 9 in the UGV2

Job 9 in the UGV3

Job 9 in the VBL

Job 9 in the VDCC

Job 9 in the YALU

Job 9 in the YAPE

Job 9 in the YBVTP

Job 9 in the ZBP