Joel 2 (BOICB)

1 Fụọ opi ịdọ aka na ntị na Zayọn.Ka a nụ ụda opi ịdọ aka na ntị site nʼelu ugwu nsọ m. Ka ndị niile bi nʼala ahụ maa jijiji,nʼihi na ụbọchị ikpe nke ONYENWE ANYỊ na-abịa,ọ na-abịaru nso. 2 Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu.Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị.Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ.Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu.Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ,a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa. 3 Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu,ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ.Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden,ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu,o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha. 4 Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya,ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha. 5 Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọalana-arịgo elu ugwu.Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ.Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha. 6 Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu.Ihu ha na-agbarụkwa. 7 Ha na-ekwogharị dịka ndị agha;ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha.Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị,na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha. 8 Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ.Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị.Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha,ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị. 9 Ha na-enukwasị obodo,na-agbagharị nʼelu mgbidi,na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ;na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile. 10 Ala na-ama jijiji nʼihu ha,eluigwe na-emekwa mkpọtụ.Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị,kpakpando adịghịkwa enye ìhè. 11 Olu ONYENWE ANYỊ daranʼihu ndị agha,ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ,ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya.Ụbọchị ikpe nke ONYENWE ANYỊ dị ukwubụrụkwa ihe dị egwu.Onye pụrụ ịnagide ya? 12 “Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya,“Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m.Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.” 13 Dọwakwaanụ obi unu,ọ bụghị uwe unu.Lọghachikwutenụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu,nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere.Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya.Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ. 14 Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya,hapụrụ anyị ngọzị ya,kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụmaka ONYENWE ANYỊ bụ, Chineke unu. 15 Fụọ opi ike nʼime Zayọn.Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ.Kpọkọta nzukọ dị nsọ. 16 Chịkọtaa onye ọbụla,doo nzukọ ahụ nsọ,ma ndị okenye,ma ụmụntakịrị,ma ụmụ na-aṅụ ara.Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya,ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya. 17 Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere ONYENWE ANYỊ ozi,nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa.Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, ONYENWE ANYỊ.Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta,nʼetiti mba dị iche iche.Ekwela ka ha sị,‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ” 18 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ kworo ekworo nʼihi ala ya,nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ. 19 ONYENWE ANYỊ zaghachiri ha sị,“Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ.Agaghị m emekwaka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ. 20 “Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya,m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu.Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ;ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ.Isisi ọjọọ ya ga-esipụta,isisi nke ure ya ga-arịgokwa.” Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche. 21 Atụkwala egwu, gị ala Juda,kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ,nʼezie, ONYENWE ANYỊ arụọla ọrụ dị ịtụnanya. 22 Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile,nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ.Osisi na-amị mkpụrụ ha,osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju. 23 Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ,ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke unu.Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị,nʼihi ịdị mma ya.Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo,nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ. 24 Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka,ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ. 25 “Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri,ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta,na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri,bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu. 26 Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ,unu ga-etokwa ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu,onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu.Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m. 27 Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel.Unu ga-amatakwa na naanị m bụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu,na ọ dịkwaghị onye ọzọ.Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ. 28 “Ma emesịa,aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma.Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. 29 Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ mọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị. 30 Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe,na nʼelu ụwa;a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ. 31 Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị,ọnwa ga-aghọkwa ọbara,tupu ụbọchị ONYENWE ANYỊ abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu. 32 Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha ONYENWE ANYỊka a ga-azọpụta.Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalemka mgbapụta ga-adị,dịka ONYENWE ANYỊ kwuru ya.Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ,bụ ndị ahụ ONYENWE ANYỊ na-akpọ.

In Other Versions

Joel 2 in the ANGEFD

Joel 2 in the ANTPNG2D

Joel 2 in the AS21

Joel 2 in the BAGH

Joel 2 in the BBPNG

Joel 2 in the BBT1E

Joel 2 in the BDS

Joel 2 in the BEV

Joel 2 in the BHAD

Joel 2 in the BIB

Joel 2 in the BLPT

Joel 2 in the BNT

Joel 2 in the BNTABOOT

Joel 2 in the BNTLV

Joel 2 in the BOATCB

Joel 2 in the BOATCB2

Joel 2 in the BOBCV

Joel 2 in the BOCNT

Joel 2 in the BOECS

Joel 2 in the BOGWICC

Joel 2 in the BOHCB

Joel 2 in the BOHCV

Joel 2 in the BOHLNT

Joel 2 in the BOHNTLTAL

Joel 2 in the BOILNTAP

Joel 2 in the BOITCV

Joel 2 in the BOKCV

Joel 2 in the BOKCV2

Joel 2 in the BOKHWOG

Joel 2 in the BOKSSV

Joel 2 in the BOLCB

Joel 2 in the BOLCB2

Joel 2 in the BOMCV

Joel 2 in the BONAV

Joel 2 in the BONCB

Joel 2 in the BONLT

Joel 2 in the BONUT2

Joel 2 in the BOPLNT

Joel 2 in the BOSCB

Joel 2 in the BOSNC

Joel 2 in the BOTLNT

Joel 2 in the BOVCB

Joel 2 in the BOYCB

Joel 2 in the BPBB

Joel 2 in the BPH

Joel 2 in the BSB

Joel 2 in the CCB

Joel 2 in the CUV

Joel 2 in the CUVS

Joel 2 in the DBT

Joel 2 in the DGDNT

Joel 2 in the DHNT

Joel 2 in the DNT

Joel 2 in the ELBE

Joel 2 in the EMTV

Joel 2 in the ESV

Joel 2 in the FBV

Joel 2 in the FEB

Joel 2 in the GGMNT

Joel 2 in the GNT

Joel 2 in the HARY

Joel 2 in the HNT

Joel 2 in the IRVA

Joel 2 in the IRVB

Joel 2 in the IRVG

Joel 2 in the IRVH

Joel 2 in the IRVK

Joel 2 in the IRVM

Joel 2 in the IRVM2

Joel 2 in the IRVO

Joel 2 in the IRVP

Joel 2 in the IRVT

Joel 2 in the IRVT2

Joel 2 in the IRVU

Joel 2 in the ISVN

Joel 2 in the JSNT

Joel 2 in the KAPI

Joel 2 in the KBT1ETNIK

Joel 2 in the KBV

Joel 2 in the KJV

Joel 2 in the KNFD

Joel 2 in the LBA

Joel 2 in the LBLA

Joel 2 in the LNT

Joel 2 in the LSV

Joel 2 in the MAAL

Joel 2 in the MBV

Joel 2 in the MBV2

Joel 2 in the MHNT

Joel 2 in the MKNFD

Joel 2 in the MNG

Joel 2 in the MNT

Joel 2 in the MNT2

Joel 2 in the MRS1T

Joel 2 in the NAA

Joel 2 in the NASB

Joel 2 in the NBLA

Joel 2 in the NBS

Joel 2 in the NBVTP

Joel 2 in the NET2

Joel 2 in the NIV11

Joel 2 in the NNT

Joel 2 in the NNT2

Joel 2 in the NNT3

Joel 2 in the PDDPT

Joel 2 in the PFNT

Joel 2 in the RMNT

Joel 2 in the SBIAS

Joel 2 in the SBIBS

Joel 2 in the SBIBS2

Joel 2 in the SBICS

Joel 2 in the SBIDS

Joel 2 in the SBIGS

Joel 2 in the SBIHS

Joel 2 in the SBIIS

Joel 2 in the SBIIS2

Joel 2 in the SBIIS3

Joel 2 in the SBIKS

Joel 2 in the SBIKS2

Joel 2 in the SBIMS

Joel 2 in the SBIOS

Joel 2 in the SBIPS

Joel 2 in the SBISS

Joel 2 in the SBITS

Joel 2 in the SBITS2

Joel 2 in the SBITS3

Joel 2 in the SBITS4

Joel 2 in the SBIUS

Joel 2 in the SBIVS

Joel 2 in the SBT

Joel 2 in the SBT1E

Joel 2 in the SCHL

Joel 2 in the SNT

Joel 2 in the SUSU

Joel 2 in the SUSU2

Joel 2 in the SYNO

Joel 2 in the TBIAOTANT

Joel 2 in the TBT1E

Joel 2 in the TBT1E2

Joel 2 in the TFTIP

Joel 2 in the TFTU

Joel 2 in the TGNTATF3T

Joel 2 in the THAI

Joel 2 in the TNFD

Joel 2 in the TNT

Joel 2 in the TNTIK

Joel 2 in the TNTIL

Joel 2 in the TNTIN

Joel 2 in the TNTIP

Joel 2 in the TNTIZ

Joel 2 in the TOMA

Joel 2 in the TTENT

Joel 2 in the UBG

Joel 2 in the UGV

Joel 2 in the UGV2

Joel 2 in the UGV3

Joel 2 in the VBL

Joel 2 in the VDCC

Joel 2 in the YALU

Joel 2 in the YAPE

Joel 2 in the YBVTP

Joel 2 in the ZBP