Joshua 5 (BOICB)
1 Mgbe ndị eze ndị Amọrait niile, ndị bi nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, na ndị eze ndị Kenan niile bi nʼakụkụ oke osimiri Mediterenịa, nụrụ na ONYENWE ANYỊ emeela ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu ụmụ Izrel, ruo mgbe anyị niile gafesịrị, obi lọrọ ha mmiri. Ọ dịkwaghị ike ọbụla fọdụụrụ ha iguzo nʼihu ụmụ Izrel. 2 Ma nʼoge ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.” 3 Ya mere, Joshua ji nkume mee mma ntakịrị e ji bie ụmụ Izrel niile ugwu. Ebe a nọ bie ụmụ Izrel ugwu bụ ebe a na-akpọ Gibịat Haaralot. 4 Nke a bụ ihe mere o ji mee otu a: Ndị ikom niile si nʼIjipt pụta, ndị tozuru ije agha, nwụrụ nʼụzọ, nʼime ọzara, mgbe ha hapụchara Ijipt. 5 Mgbe ụmụ Izrel niile si Ijipt pụta, e biri ndị nwoke niile nọ nʼetiti ha ugwu. Ma nʼime iri afọ anọ ahụ ha na-awagharị nʼọzara, o nweghị ụmụ ha ndị nwoke a mụrụ nʼoge a e biri ugwu. 6 Ndị Izrel niile awagharịala nʼọzara iri afọ anọ tutu ruo mgbe ndị ikom niile toruru ije agha, bụ ndị hapụrụ Ijipt nwụchara, ebe ọ bụ na ha jụrụ irubere ONYENWE ANYỊ isi. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ṅụrụ iyi sị ha na ha agaghị ahụ ala ahụ anya, bụ ala ahụ o kwere nna nna ha na nkwa, inye anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 7 ONYENWE ANYỊ mere ka ụmụ ndị nnupu isi a mụtara nọchie anya ha. Ọ bụkwa ndị a ka Joshua biri ugwu, nʼihi na tutu ruo ugbu a, e bibeghị ha ugwu. 8 Mgbe e bizuru mba niile ahụ ugwu, ha nọdụrụ nʼebe ahụ ha mara ụlọ ikwu tutu ọnya obibi ugwu ha alaa. 9 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Joshua okwu sị, “Taa, ewezugala m site nʼebe unu nọ ihe nkọcha nke ya na Ijipt so.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Gilgal. Ọ bụkwa aha ya ruo taa. 10 Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ. 11 Nʼụbọchị sotere ụbọchị ngabiga, nʼotu ụbọchị ahụ, ha riri ụfọdụ ihe ubi nke ala Kenan. Ọ bụ achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na ọka ahụrụ nʼọkụ ka ha tara. 12 Mánà kwụsịkwara nʼechi ya mgbe ha riri nri sitere nʼala ahụ. Ụmụ Izrel ahụkwaghị mánà anya ọzọ, ma nʼafọ ahụ ha riri ihe omume ubi si nʼala Kenan. 13 Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?” 14 Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha ONYENWE ANYỊ.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” 15 Ọchịagha usuu ndị agha ONYENWE ANYỊ zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya.
In Other Versions
Joshua 5 in the ANGEFD
Joshua 5 in the ANTPNG2D
Joshua 5 in the AS21
Joshua 5 in the BAGH
Joshua 5 in the BBPNG
Joshua 5 in the BBT1E
Joshua 5 in the BDS
Joshua 5 in the BEV
Joshua 5 in the BHAD
Joshua 5 in the BIB
Joshua 5 in the BLPT
Joshua 5 in the BNT
Joshua 5 in the BNTABOOT
Joshua 5 in the BNTLV
Joshua 5 in the BOATCB
Joshua 5 in the BOATCB2
Joshua 5 in the BOBCV
Joshua 5 in the BOCNT
Joshua 5 in the BOECS
Joshua 5 in the BOGWICC
Joshua 5 in the BOHCB
Joshua 5 in the BOHCV
Joshua 5 in the BOHLNT
Joshua 5 in the BOHNTLTAL
Joshua 5 in the BOILNTAP
Joshua 5 in the BOITCV
Joshua 5 in the BOKCV
Joshua 5 in the BOKCV2
Joshua 5 in the BOKHWOG
Joshua 5 in the BOKSSV
Joshua 5 in the BOLCB
Joshua 5 in the BOLCB2
Joshua 5 in the BOMCV
Joshua 5 in the BONAV
Joshua 5 in the BONCB
Joshua 5 in the BONLT
Joshua 5 in the BONUT2
Joshua 5 in the BOPLNT
Joshua 5 in the BOSCB
Joshua 5 in the BOSNC
Joshua 5 in the BOTLNT
Joshua 5 in the BOVCB
Joshua 5 in the BOYCB
Joshua 5 in the BPBB
Joshua 5 in the BPH
Joshua 5 in the BSB
Joshua 5 in the CCB
Joshua 5 in the CUV
Joshua 5 in the CUVS
Joshua 5 in the DBT
Joshua 5 in the DGDNT
Joshua 5 in the DHNT
Joshua 5 in the DNT
Joshua 5 in the ELBE
Joshua 5 in the EMTV
Joshua 5 in the ESV
Joshua 5 in the FBV
Joshua 5 in the FEB
Joshua 5 in the GGMNT
Joshua 5 in the GNT
Joshua 5 in the HARY
Joshua 5 in the HNT
Joshua 5 in the IRVA
Joshua 5 in the IRVB
Joshua 5 in the IRVG
Joshua 5 in the IRVH
Joshua 5 in the IRVK
Joshua 5 in the IRVM
Joshua 5 in the IRVM2
Joshua 5 in the IRVO
Joshua 5 in the IRVP
Joshua 5 in the IRVT
Joshua 5 in the IRVT2
Joshua 5 in the IRVU
Joshua 5 in the ISVN
Joshua 5 in the JSNT
Joshua 5 in the KAPI
Joshua 5 in the KBT1ETNIK
Joshua 5 in the KBV
Joshua 5 in the KJV
Joshua 5 in the KNFD
Joshua 5 in the LBA
Joshua 5 in the LBLA
Joshua 5 in the LNT
Joshua 5 in the LSV
Joshua 5 in the MAAL
Joshua 5 in the MBV
Joshua 5 in the MBV2
Joshua 5 in the MHNT
Joshua 5 in the MKNFD
Joshua 5 in the MNG
Joshua 5 in the MNT
Joshua 5 in the MNT2
Joshua 5 in the MRS1T
Joshua 5 in the NAA
Joshua 5 in the NASB
Joshua 5 in the NBLA
Joshua 5 in the NBS
Joshua 5 in the NBVTP
Joshua 5 in the NET2
Joshua 5 in the NIV11
Joshua 5 in the NNT
Joshua 5 in the NNT2
Joshua 5 in the NNT3
Joshua 5 in the PDDPT
Joshua 5 in the PFNT
Joshua 5 in the RMNT
Joshua 5 in the SBIAS
Joshua 5 in the SBIBS
Joshua 5 in the SBIBS2
Joshua 5 in the SBICS
Joshua 5 in the SBIDS
Joshua 5 in the SBIGS
Joshua 5 in the SBIHS
Joshua 5 in the SBIIS
Joshua 5 in the SBIIS2
Joshua 5 in the SBIIS3
Joshua 5 in the SBIKS
Joshua 5 in the SBIKS2
Joshua 5 in the SBIMS
Joshua 5 in the SBIOS
Joshua 5 in the SBIPS
Joshua 5 in the SBISS
Joshua 5 in the SBITS
Joshua 5 in the SBITS2
Joshua 5 in the SBITS3
Joshua 5 in the SBITS4
Joshua 5 in the SBIUS
Joshua 5 in the SBIVS
Joshua 5 in the SBT
Joshua 5 in the SBT1E
Joshua 5 in the SCHL
Joshua 5 in the SNT
Joshua 5 in the SUSU
Joshua 5 in the SUSU2
Joshua 5 in the SYNO
Joshua 5 in the TBIAOTANT
Joshua 5 in the TBT1E
Joshua 5 in the TBT1E2
Joshua 5 in the TFTIP
Joshua 5 in the TFTU
Joshua 5 in the TGNTATF3T
Joshua 5 in the THAI
Joshua 5 in the TNFD
Joshua 5 in the TNT
Joshua 5 in the TNTIK
Joshua 5 in the TNTIL
Joshua 5 in the TNTIN
Joshua 5 in the TNTIP
Joshua 5 in the TNTIZ
Joshua 5 in the TOMA
Joshua 5 in the TTENT
Joshua 5 in the UBG
Joshua 5 in the UGV
Joshua 5 in the UGV2
Joshua 5 in the UGV3
Joshua 5 in the VBL
Joshua 5 in the VDCC
Joshua 5 in the YALU
Joshua 5 in the YAPE
Joshua 5 in the YBVTP
Joshua 5 in the ZBP