Lamentations 2 (BOICB)
1 Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe yakpuchie ada Zayọn!O sitela nʼeluigwetụda ịma mma Izrel nʼala,o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya,nʼụbọchị iwe ya. 2 Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb;na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ.O sitela nʼoke iwe yadọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda.Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala,mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ. 3 O sitela nʼoke iwe yabipụ ike niile Izrel nwere.O seghachiri aka nri ya,mgbe ndị iro ha na-abịa nso.O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb;si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya. 4 O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya,dịka onye iro.Dịka onye iro kwao gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya;ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ,nʼelu ụlọ ada Zayọn. 5 Onyenwe anyị dị ka onye iro,o lomichaala Izrel.O lomichaala ụlọeze ya niile,bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike.O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwamụbaara ada Juda. 6 O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige;o bibiela ebe nzukọ ya niile. ONYENWE ANYỊ emeela ka Zayọn chezọọime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ.Site nʼoke iwe ya,ọ jụla eze na onye nchụaja. 7 Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja yagbakụta ebe nsọ ya azụ.O werela mgbidi niile nke ụlọeze yanyefee nʼaka onye iro;ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ ONYENWE ANYỊdịka nʼụbọchị mmemme a kara aka. 8 ONYENWE ANYỊ ekpebiela ibibimgbidi gbara ada Zayọn gburugburu.O setịpụrụ ihe ọtụtụ;o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya.O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ,meekwa ka ha richapụsịa. 9 Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala;ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi.A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ.Iwu adịghịkwa,otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụsite nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ. 10 Ndị okenye ada Zayọnnọ ọdụ nʼala, dere duu.Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha;ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe.Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwokeehulatala isi ha nʼala. 11 Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa,ime ime ahụ m na-anụ ọkụ.Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala,nʼihi na e bibiela ndị m,nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mbanʼokporoụzọ nke obodo. 12 Ha na-ebere nne ha akwa na-asị,“Olee ebe ọka na mmanya dị?”Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụnʼokporoụzọ obodo,mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ hanʼaka nne ha ku ha. 13 Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị?Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị,gị ada Jerusalem?Gịnị ka m ga-asị na i yiri,nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi,gị ada Zayọn na-amaghị nwoke?Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri.Onye pụrụ ịgwọ gị? 14 Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụbụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi.Ha ekpugheghị mmehie gị,igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị.Kama ihe ha hụtaara gịbụ ihe ụgha na nduhie. 15 Ndị niile si nʼebe ị nọna-agafe na-akụrụ gị aka ha;ha na-efufe isi ha,jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị.Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụa na-akpọ ebe mabigara mma oke,ọṅụ nke ụwa niile?” 16 Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ hamegide gị;ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze.Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya.Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya.Anyị adịrịla ndụ hụ ya.” 17 ONYENWE ANYỊ emeela ihe o zubere ime.O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị imesite nʼoge gara aga.Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla.O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị;o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị. 18 Obi ndị mmadụna-etiku Onyenwe anyị.Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn,ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiriehihie na abalị niile,enyekwala onwe gị izuike,enyekwala anya gị izuike. 19 Bilie, kwaa akwa nʼabalị,nʼoge mmalite nche abalị.Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyịdịka ọ bụ mmiri.Welie aka unu elu nye Onyenwe anyịnʼihi ụmụntakịrị ndị a,ndị na-ada nʼihi agụụnʼisi okporoụzọ niile. 20 “Lee anya, ONYENWE ANYỊ, ma tụgharịa uche gị.Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso?O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha,bụ ụmụ nke ha mụrụ?O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụmanʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị? 21 “Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe,nʼuzuzu nke okporoụzọ.E jirila mma agha gbuoụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m.I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị;i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha. 22 “Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri,otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile.Nʼụbọchị nke iwe ONYENWE ANYỊọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ;ndị m lekọtara, zụlitekwaka ndị iro m lara nʼiyi.”
In Other Versions
Lamentations 2 in the ANTPNG2D
Lamentations 2 in the BNTABOOT
Lamentations 2 in the BOHNTLTAL
Lamentations 2 in the BOILNTAP
Lamentations 2 in the KBT1ETNIK
Lamentations 2 in the TBIAOTANT