Leviticus 20 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ sịrị Mosis, 2 “Gwa ụmụ Izrel, ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa ọbụla bi nʼetiti unu, nke weere nwa ya nye maka ịchụrụ Molek aja, aghaghị ime ka ọ nwụọ. Ndị mmadụ ga-ewere nkume tugbuo ya. 3 Mụ onwe m ga-emegide onye ahụ, bipụ ya site nʼetiti ndị ya, nʼihi na o merụọla ebe nsọ m, mee ka aha m gharakwa ịdị nsọ, site nʼiji ụmụ ya chụọrọ Molek aja. 4 Ọ bụrụ na ndị obodo elezie anya mee omume dịka a ga-asị na ha amaghị ihe onye ahụ mere, hapụkwa igbu ya, mgbe o were otu nʼime ụmụ ya nye Molek, 5 mụ onwe m ga-emegide onye ahụ na ezinaụlọ ya bipụ ha site nʼetiti ndị ya. Otu a kwa ka m ga-eme ya na ndị niile so ya merụọ onwe ha site nʼife arụsị Molek. 6 “ ‘Aga m edo ihu m megide onye ọbụla gara jụọ ase site nʼaka mmụọ ọjọọ, maọbụ onye gara na dibịa afa gbaa afa, site nʼiso ha kwaa iko. Aga m ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya. 7 “ ‘Doonụ onwe unu nsọ, ma dịkwanụ nsọ nʼihi na abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 8 Debenụ ụkpụrụ m niile, ma gbasoonụ ha nʼihi na abụ m ONYENWE ANYỊ onye na-edo unu nsọ. 9 “ ‘Onye ọbụla kọchara nne ya maọbụ nna ya ka a ga-egbu nʼihi na ọ kọchara nne na nna ya. Ọbara onye dị otu a ga-adịkwa ya nʼisi. 10 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu. 11 “ ‘Nwoke ọbụla ya na nwunye nna ya dinakọrọ nwe mmekọ, emerụọla nna ya. A ga-egbu nwoke ahụ na nwanyị ahụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi. 12 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwa ya, wetara onwe ha ikpe ọmụma, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ọ bụ arụ ka ha mere. 13 “ ‘Ọ bụrụ nwoke na nwoke ibe ya edinakọọ nwee ụdị mmekọ edina nwoke na nwanyị, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ihe ha mere bụ ihe rụrụ arụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi. 14 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu. 15 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ. 16 “ ‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi. 17 “ ‘Nwoke ọbụla ya na nwanne ya nwanyị nwere mmekọ edina, maọbụ nwa afọ nne ya maọbụ nwa nwunye nna ya, a ga-ekpochapụ ha site nʼihu ọha mmadụ nʼihi na ọ bụ ihe ihere dị ukwuu ka ha mere. Ọ merụọla nwanne ya, nʼihi ya ikpe ọmụma dị ya nʼisi. 18 “ ‘Nwoke ọbụla nke ya na nwanyị nọ na nsọ nwanyị ya dinakọrọ nwee mmekọ ekpugheela adịghị ọcha nwanyị ahụ. Nwanyị ahụ nʼonwe ya ekpugheekwala adịghị ọcha nke ya. A ga-ebipụ ha abụọ site nʼetiti ndị ha. 19 “ ‘Ị gaghị enwe mmekọ edina nʼetiti gị na nwanne nwanyị nne gị maọbụ nwanne nwanyị nna gị, nʼihi na nke a bụ ihe nleda anya nye onye ọbara jịkọrọ gị na ya. Ikpe ọmụma ga-adịrị unu abụọ. 20 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla na nwunye nwanne nna ya edinaa, ọ bụ omume ileda anya nye nwanne nna ya. Ha ga-ebu mmehie ha. Ha ga-anwụ na-amụtaghị nwa. 21 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye nwanne ya, ọ bụ omume rụrụ arụ, nʼihi na ọ bụ ihe nleda anya nye nwanne ya. Ha ga-agba aka nwa. 22 “ ‘Debenụ iwu ndị a na ụkpụrụ ndị a, ma gbasoonụ ha ka ala ahụ m na-eduba unu nʼime ya hapụ imeghe ọnụ ya gbụpụ unu. 23 Unu agbasola omenaala ndị mba niile a m na-achụpụ site nʼala m na-enye unu, nʼihi na ha na-eme ihe ndị a niile m nyere unu nʼiwu emela. Ọ bụ nke a mere ihe banyere ha ji sọọ m oyi. 24 Ma agwala m unu sị, “Unu ga-eketa ala ha. Aga m enye ya unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu onye kewapụtara unu doo unu iche site na mba ndị ọzọ niile. 25 “ ‘Unu aghaghị ịkpa oke nʼetiti anụmanụ ndị dị ọcha iri eri, na anụmanụ ndị na-adịghị ọcha, na nʼetiti anụ ufe dị ọcha iri eri na ndị rụrụ arụ. Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ maọbụ anụ ufe, maọbụ ihe ọzọ na-akpụgharị nʼala, ndị ahụ m kewapụrụ iche dịka ihe rụrụ arụ. 26 Unu ga-adị nsọ nye m, nʼihi na mụ, bụ ONYENWE ANYỊ, dị nsọ. Ekewapụtala m unu, doo unu iche, site nʼetiti ndị mba ọzọ niile, ka unu bụrụ nke m. 27 “ ‘A ga-eji nkume tugbuo nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nke na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa nọ nʼetiti unu ka ọ nwụọ. Ọbara ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”

In Other Versions

Leviticus 20 in the ANGEFD

Leviticus 20 in the ANTPNG2D

Leviticus 20 in the AS21

Leviticus 20 in the BAGH

Leviticus 20 in the BBPNG

Leviticus 20 in the BBT1E

Leviticus 20 in the BDS

Leviticus 20 in the BEV

Leviticus 20 in the BHAD

Leviticus 20 in the BIB

Leviticus 20 in the BLPT

Leviticus 20 in the BNT

Leviticus 20 in the BNTABOOT

Leviticus 20 in the BNTLV

Leviticus 20 in the BOATCB

Leviticus 20 in the BOATCB2

Leviticus 20 in the BOBCV

Leviticus 20 in the BOCNT

Leviticus 20 in the BOECS

Leviticus 20 in the BOGWICC

Leviticus 20 in the BOHCB

Leviticus 20 in the BOHCV

Leviticus 20 in the BOHLNT

Leviticus 20 in the BOHNTLTAL

Leviticus 20 in the BOILNTAP

Leviticus 20 in the BOITCV

Leviticus 20 in the BOKCV

Leviticus 20 in the BOKCV2

Leviticus 20 in the BOKHWOG

Leviticus 20 in the BOKSSV

Leviticus 20 in the BOLCB

Leviticus 20 in the BOLCB2

Leviticus 20 in the BOMCV

Leviticus 20 in the BONAV

Leviticus 20 in the BONCB

Leviticus 20 in the BONLT

Leviticus 20 in the BONUT2

Leviticus 20 in the BOPLNT

Leviticus 20 in the BOSCB

Leviticus 20 in the BOSNC

Leviticus 20 in the BOTLNT

Leviticus 20 in the BOVCB

Leviticus 20 in the BOYCB

Leviticus 20 in the BPBB

Leviticus 20 in the BPH

Leviticus 20 in the BSB

Leviticus 20 in the CCB

Leviticus 20 in the CUV

Leviticus 20 in the CUVS

Leviticus 20 in the DBT

Leviticus 20 in the DGDNT

Leviticus 20 in the DHNT

Leviticus 20 in the DNT

Leviticus 20 in the ELBE

Leviticus 20 in the EMTV

Leviticus 20 in the ESV

Leviticus 20 in the FBV

Leviticus 20 in the FEB

Leviticus 20 in the GGMNT

Leviticus 20 in the GNT

Leviticus 20 in the HARY

Leviticus 20 in the HNT

Leviticus 20 in the IRVA

Leviticus 20 in the IRVB

Leviticus 20 in the IRVG

Leviticus 20 in the IRVH

Leviticus 20 in the IRVK

Leviticus 20 in the IRVM

Leviticus 20 in the IRVM2

Leviticus 20 in the IRVO

Leviticus 20 in the IRVP

Leviticus 20 in the IRVT

Leviticus 20 in the IRVT2

Leviticus 20 in the IRVU

Leviticus 20 in the ISVN

Leviticus 20 in the JSNT

Leviticus 20 in the KAPI

Leviticus 20 in the KBT1ETNIK

Leviticus 20 in the KBV

Leviticus 20 in the KJV

Leviticus 20 in the KNFD

Leviticus 20 in the LBA

Leviticus 20 in the LBLA

Leviticus 20 in the LNT

Leviticus 20 in the LSV

Leviticus 20 in the MAAL

Leviticus 20 in the MBV

Leviticus 20 in the MBV2

Leviticus 20 in the MHNT

Leviticus 20 in the MKNFD

Leviticus 20 in the MNG

Leviticus 20 in the MNT

Leviticus 20 in the MNT2

Leviticus 20 in the MRS1T

Leviticus 20 in the NAA

Leviticus 20 in the NASB

Leviticus 20 in the NBLA

Leviticus 20 in the NBS

Leviticus 20 in the NBVTP

Leviticus 20 in the NET2

Leviticus 20 in the NIV11

Leviticus 20 in the NNT

Leviticus 20 in the NNT2

Leviticus 20 in the NNT3

Leviticus 20 in the PDDPT

Leviticus 20 in the PFNT

Leviticus 20 in the RMNT

Leviticus 20 in the SBIAS

Leviticus 20 in the SBIBS

Leviticus 20 in the SBIBS2

Leviticus 20 in the SBICS

Leviticus 20 in the SBIDS

Leviticus 20 in the SBIGS

Leviticus 20 in the SBIHS

Leviticus 20 in the SBIIS

Leviticus 20 in the SBIIS2

Leviticus 20 in the SBIIS3

Leviticus 20 in the SBIKS

Leviticus 20 in the SBIKS2

Leviticus 20 in the SBIMS

Leviticus 20 in the SBIOS

Leviticus 20 in the SBIPS

Leviticus 20 in the SBISS

Leviticus 20 in the SBITS

Leviticus 20 in the SBITS2

Leviticus 20 in the SBITS3

Leviticus 20 in the SBITS4

Leviticus 20 in the SBIUS

Leviticus 20 in the SBIVS

Leviticus 20 in the SBT

Leviticus 20 in the SBT1E

Leviticus 20 in the SCHL

Leviticus 20 in the SNT

Leviticus 20 in the SUSU

Leviticus 20 in the SUSU2

Leviticus 20 in the SYNO

Leviticus 20 in the TBIAOTANT

Leviticus 20 in the TBT1E

Leviticus 20 in the TBT1E2

Leviticus 20 in the TFTIP

Leviticus 20 in the TFTU

Leviticus 20 in the TGNTATF3T

Leviticus 20 in the THAI

Leviticus 20 in the TNFD

Leviticus 20 in the TNT

Leviticus 20 in the TNTIK

Leviticus 20 in the TNTIL

Leviticus 20 in the TNTIN

Leviticus 20 in the TNTIP

Leviticus 20 in the TNTIZ

Leviticus 20 in the TOMA

Leviticus 20 in the TTENT

Leviticus 20 in the UBG

Leviticus 20 in the UGV

Leviticus 20 in the UGV2

Leviticus 20 in the UGV3

Leviticus 20 in the VBL

Leviticus 20 in the VDCC

Leviticus 20 in the YALU

Leviticus 20 in the YAPE

Leviticus 20 in the YBVTP

Leviticus 20 in the ZBP