Luke 10 (BOICB)

1 Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị họpụtara iri mmadụ asaa na abụọ ndị ọzọ, zipụ ha mmadụ abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa nʼobodo niile nakwa ebe niile ọ na-achọ ịga. 2 Ọ sịrị ha, “Owuwe ihe ubi dị ukwuu ma ndị ọrụ dị naanị ole na ole. Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya. 3 Gaanụ! Ma lee, ana m ezipu unu dị ka ụmụ atụrụ nʼetiti agụ. 4 Unu ewerekwala ego maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ. Unu ekelekwala onye ọbụla nʼụzọ. 5 “Mgbe unu banyere nʼụlọ ọbụla, burunu ụzọ sị, ‘Udo dịrị nʼụlọ a.’ 6 Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nʼụlọ ahụ, udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nʼụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitekwara unu. 7 Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ. 8 “Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu. 9 Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’ 10 Ma mgbe unu banyere nʼobodo ọbụla ha jụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nʼokporoụzọ ya kwuo sị, 11 ‘Ọ bụladị aja si nʼobodo a nke nyapagidere nʼụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ntị nye gị. Otu ọ dị, matakwanụ nke a, na alaeze Chineke dị nso.’ 12 Ana m agwa unu na nʼụbọchị ahụ, ga-akara Sọdọm mma karịa obodo ahụ. 13 “Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaida. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ebube a rụrụ nʼime unu ka a rụrụ na Taịa na Saịdọn ha gaara echegharị ogologo oge, nọdụ nʼakwa mkpe na ntụ. 14 Ọ ga-akara Taịa na Saịdọn mma nʼụbọchị ikpe karịa unu. 15 Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ! 16 “Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.” 17 Iri mmadụ asaa na abụọ ahụ jiri ọṅụ lọta sị, “Onyenwe anyị, nʼaha gị, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi.” 18 Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma. 19 Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20 Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21 Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya. 22 “Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara ahụ bụ, karịa Nna ahụ. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara na ndị ahụ Ọkpara chọrọ igosi onye Nna ya bụ.” 23 Mgbe ahụ ọ tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzị na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ ugbu a. 24 Ana m asị unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.” 25 Otu ụbọchị, otu onye ozizi iwu biliri ịnwale ya. Ọ jụrụ ya, “Onye ozizi, gịnị ka m kwesiri ime ka m keta ndụ ebighị ebi?” 26 Ọ sịrị ya, “Gịnị ka e dere nʼiwu? Gịnị ka ị gụtara nʼime ya?” 27 Ọ zara sị, “ ‘Ị ga-eji obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya’; ma ‘hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’” 28 Ọ sịrị ya, “Ị zara nke ọma. Gaa mee nke a ị ga-adị ndụ.” 29 Ma iji gosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ sịrị Jisọs, “Onye kwanụ bụ onye agbataobi m?” 30 Jisọs sịrị ya, “Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, ọ dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa. 31 Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee. 32 Otu a kwa, otu onye Livayị bịarutekwara nʼebe ahụ, hụ ya, ma o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafeekwa. 33 Ma otu onye Sameria na-aga njem, mgbe ọ bịarutere nso nʼebe ahụ; hụ ya, o nwere ọmịiko nʼahụ ya. 34 Ọ gara nso nʼebe ọ nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. Ọ tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma. 35 Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’ 36 “Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?” 37 Ọ sịrị, “Ọ bụ onye ahụ meere ya ebere.”Jisọs sịrị ya, “Laa, gaa mee otu ahụ.” 38 Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39 O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40 Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41 Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42 maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.”

In Other Versions

Luke 10 in the ANGEFD

Luke 10 in the ANTPNG2D

Luke 10 in the AS21

Luke 10 in the BAGH

Luke 10 in the BBPNG

Luke 10 in the BBT1E

Luke 10 in the BDS

Luke 10 in the BEV

Luke 10 in the BHAD

Luke 10 in the BIB

Luke 10 in the BLPT

Luke 10 in the BNT

Luke 10 in the BNTABOOT

Luke 10 in the BNTLV

Luke 10 in the BOATCB

Luke 10 in the BOATCB2

Luke 10 in the BOBCV

Luke 10 in the BOCNT

Luke 10 in the BOECS

Luke 10 in the BOGWICC

Luke 10 in the BOHCB

Luke 10 in the BOHCV

Luke 10 in the BOHLNT

Luke 10 in the BOHNTLTAL

Luke 10 in the BOILNTAP

Luke 10 in the BOITCV

Luke 10 in the BOKCV

Luke 10 in the BOKCV2

Luke 10 in the BOKHWOG

Luke 10 in the BOKSSV

Luke 10 in the BOLCB

Luke 10 in the BOLCB2

Luke 10 in the BOMCV

Luke 10 in the BONAV

Luke 10 in the BONCB

Luke 10 in the BONLT

Luke 10 in the BONUT2

Luke 10 in the BOPLNT

Luke 10 in the BOSCB

Luke 10 in the BOSNC

Luke 10 in the BOTLNT

Luke 10 in the BOVCB

Luke 10 in the BOYCB

Luke 10 in the BPBB

Luke 10 in the BPH

Luke 10 in the BSB

Luke 10 in the CCB

Luke 10 in the CUV

Luke 10 in the CUVS

Luke 10 in the DBT

Luke 10 in the DGDNT

Luke 10 in the DHNT

Luke 10 in the DNT

Luke 10 in the ELBE

Luke 10 in the EMTV

Luke 10 in the ESV

Luke 10 in the FBV

Luke 10 in the FEB

Luke 10 in the GGMNT

Luke 10 in the GNT

Luke 10 in the HARY

Luke 10 in the HNT

Luke 10 in the IRVA

Luke 10 in the IRVB

Luke 10 in the IRVG

Luke 10 in the IRVH

Luke 10 in the IRVK

Luke 10 in the IRVM

Luke 10 in the IRVM2

Luke 10 in the IRVO

Luke 10 in the IRVP

Luke 10 in the IRVT

Luke 10 in the IRVT2

Luke 10 in the IRVU

Luke 10 in the ISVN

Luke 10 in the JSNT

Luke 10 in the KAPI

Luke 10 in the KBT1ETNIK

Luke 10 in the KBV

Luke 10 in the KJV

Luke 10 in the KNFD

Luke 10 in the LBA

Luke 10 in the LBLA

Luke 10 in the LNT

Luke 10 in the LSV

Luke 10 in the MAAL

Luke 10 in the MBV

Luke 10 in the MBV2

Luke 10 in the MHNT

Luke 10 in the MKNFD

Luke 10 in the MNG

Luke 10 in the MNT

Luke 10 in the MNT2

Luke 10 in the MRS1T

Luke 10 in the NAA

Luke 10 in the NASB

Luke 10 in the NBLA

Luke 10 in the NBS

Luke 10 in the NBVTP

Luke 10 in the NET2

Luke 10 in the NIV11

Luke 10 in the NNT

Luke 10 in the NNT2

Luke 10 in the NNT3

Luke 10 in the PDDPT

Luke 10 in the PFNT

Luke 10 in the RMNT

Luke 10 in the SBIAS

Luke 10 in the SBIBS

Luke 10 in the SBIBS2

Luke 10 in the SBICS

Luke 10 in the SBIDS

Luke 10 in the SBIGS

Luke 10 in the SBIHS

Luke 10 in the SBIIS

Luke 10 in the SBIIS2

Luke 10 in the SBIIS3

Luke 10 in the SBIKS

Luke 10 in the SBIKS2

Luke 10 in the SBIMS

Luke 10 in the SBIOS

Luke 10 in the SBIPS

Luke 10 in the SBISS

Luke 10 in the SBITS

Luke 10 in the SBITS2

Luke 10 in the SBITS3

Luke 10 in the SBITS4

Luke 10 in the SBIUS

Luke 10 in the SBIVS

Luke 10 in the SBT

Luke 10 in the SBT1E

Luke 10 in the SCHL

Luke 10 in the SNT

Luke 10 in the SUSU

Luke 10 in the SUSU2

Luke 10 in the SYNO

Luke 10 in the TBIAOTANT

Luke 10 in the TBT1E

Luke 10 in the TBT1E2

Luke 10 in the TFTIP

Luke 10 in the TFTU

Luke 10 in the TGNTATF3T

Luke 10 in the THAI

Luke 10 in the TNFD

Luke 10 in the TNT

Luke 10 in the TNTIK

Luke 10 in the TNTIL

Luke 10 in the TNTIN

Luke 10 in the TNTIP

Luke 10 in the TNTIZ

Luke 10 in the TOMA

Luke 10 in the TTENT

Luke 10 in the UBG

Luke 10 in the UGV

Luke 10 in the UGV2

Luke 10 in the UGV3

Luke 10 in the VBL

Luke 10 in the VDCC

Luke 10 in the YALU

Luke 10 in the YAPE

Luke 10 in the YBVTP

Luke 10 in the ZBP