Luke 11 (BOICB)

1 Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.” 2 Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa. 3 Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị. 4 Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ” 5 Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ, 6 nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’ 7 Ma ọ ga-esi nʼime ụlọ zaghachi sị, ‘Enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ugbu a inye gị ihe ọbụla.’ 8 Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa. 9 “Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 10 Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. 11 “Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ? 12 Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị? 13 Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya.” 14 Otu mgbe, ọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ nke dara ogbi, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ pụrụ, onye ogbi ahụ kwuru okwu. Nke a juru igwe mmadụ ahụ anya. 15 Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Ọ bụ site nʼike Belzebub eze ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 16 Ndị ọzọ, iji nwalee ya, sị ya gosi ha ihe ịrịbama nke si nʼeluigwe. 17 Ma ebe ọ bụ na ọ maara ihe ha na-eche, ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla kewaranụ megide ibe ya, ga-atọgbọrọ nʼefu, ezinaụlọ ọbụla nke kewakwara megide ibe ya ga-adakpọ. 18 Ọ bụrụ na ekwensu ekewa megide onwe ya, alaeze ya ọ ga-esi aṅaa guzosie ike? Unu na-asị na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub. 19 Ugbu a, ọ bụrụ na m sitere nʼike Belzebub na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ site nʼike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe unu. 20 Ma ọ bụrụ na m ji ike mkpịsịaka Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, mgbe ahụ alaeze Chineke abịarutela nʼebe unu nọ. 21 “Mgbe nwoke siri ike ji ngwa agha chekwa obi ya, ihe o nwere ga-adịgidere ya nʼudo. 22 Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka ya ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ ga-anara ya ngwa agha niile bụ ihe ntụkwasị obi ya, kesakwaa ihe ọ kwatara nʼụlọ dike ahụ. 23 “Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa. 24 “Mgbe ọbụla mmụọ na-adịghị ọcha sị nʼime mmadụ pụọ, ọ na-ejegharị nʼala kpọrọ nkụ na-achọgharị ebe izuike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m hapụrụ.’ 25 Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala ya dozie ya nke ọma. 26 Mgbe ahụ, ọ ga-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha niile na-abata biri nʼime onye ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.” 27 Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28 Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.” 29 Dị ka igwe mmadụ ahụ na-amụba, o bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe ịrịbama ma ọ dịghị ihe ịrịbama a ga-ezi ya karịa ihe ịrịbama Jona. 30 Nʼihi na dị ka Jona si bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi bụrụkwa ihe ama nye ọgbọ a. 31 Nʼụbọchị ahụ, eze nwanyị ndị ndịda ga-ebili soro ndị ọgbọ a guzo nʼikpe, maa ha ikpe, nʼihi na o sitere na nsọtụ nke ụwa bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn, ma lee, onye karịrị Solomọn nọ nʼebe a. 32 Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe, nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona, ma lee, onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.” 33 “Ọ dịghị onye na-amụnye oriọna dọnye ya nʼebe zoro ezo maọbụ nʼokpuru efere, kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ. 34 Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nʼọchịchịrị. 35 Ya mere, lezie anya ka ị mara ka ìhè dị nʼime gị, ọ bụghị ọchịchịrị. 36 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị niile ejupụta nʼìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ọbụla agbaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè dị ka mgbe ìhè oriọna na-achakwasị gị nʼahụ.” 37 Mgbe ọ na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa soro ya rie nri. Ọ banyere nọrọ nʼoche nri. 38 O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe ọ bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupu ya ebido. 39 Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Unu ndị Farisii na-asacha azụ iko mmiri na efere, mee ka ọ dị ọcha, ma ime unu jupụtara nʼanya ukwu na nʼihe ọjọọ dị iche iche. 40 Ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya? 41 Kama werenụ ihe ndị ahụ dị nʼime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara unu ọcha. 42 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, nʼihi na unu na-enye otu ụzọ nʼụzọ iri nʼihi mint, na mkpa akwụkwọ na-esi isi ụtọ na mkpa akwụkwọ niile dị iche iche nke ubi, ma leghara ikpe ziri ezi na ịhụnanya nke Chineke anya. Ihe niile ndị a ka unu kwesiri ime nʼelegharaghị ihe ndị ọzọ anya. 43 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii! Nʼihi na unu na-ahụ ịnọ nʼisi oche niile nʼụlọ ekpere na ekele pụrụ iche a na-ekele unu nʼọma ahịa nʼanya. 44 “Ahụhụ ga-adịrị unu, nʼihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ihe, nke ndị mmadụ na-agafe nʼelu ha nʼihi na ha amaghị na ọ bụ ili.” 45 Nʼotu oge, otu onye ozizi iwu sịrị ya, “Onye ozizi, mgbe ị na-ekwu ihe ndị a, anyị sokwa na ndị ị na-akọcha.” 46 Ma ọ sịrị, “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu. Nʼihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli, ma unu onwe unu adịghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka unu, ịmetụ ibu ahụ aka. 47 “Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu. 48 Ya mere, unu bụ ndị akaebe ma kwenyekwa nʼihe ndị nna nna unu ha mere, nʼihi ha gburu ha, ma unu e wuo ili ha. 49 Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke nʼamamihe ya ji kwuo sị, Aga m ezigara ha ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ ka ha ga-egbu ma ndị ọzọkwa ka ha ga-akpagbu. 50 Nʼihi nke a, ọgbọ a ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma niile a wufuru, site na mmalite nke ụwa, 51 site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya, onye e gburu nʼetiti ebe ịchụ aja na ebe nsọ. E, agwa m unu, a ga-ajụ ihe banyere ha nʼaka ọgbọ a. 52 “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu, nʼihi na unu wepụrụ ọtụghe igodo nke amamihe. Unu onwe unu abanyeghị, ma unu gbochikwara ndị na-abata ịbata.” 53 Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya, na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu, 54 na-esiri ya ọnya, ka ha mara ma ọ ga-ekwuhie ọnụ, ka ha hụ ihe ha ga-eji jide ya.

In Other Versions

Luke 11 in the ANGEFD

Luke 11 in the ANTPNG2D

Luke 11 in the AS21

Luke 11 in the BAGH

Luke 11 in the BBPNG

Luke 11 in the BBT1E

Luke 11 in the BDS

Luke 11 in the BEV

Luke 11 in the BHAD

Luke 11 in the BIB

Luke 11 in the BLPT

Luke 11 in the BNT

Luke 11 in the BNTABOOT

Luke 11 in the BNTLV

Luke 11 in the BOATCB

Luke 11 in the BOATCB2

Luke 11 in the BOBCV

Luke 11 in the BOCNT

Luke 11 in the BOECS

Luke 11 in the BOGWICC

Luke 11 in the BOHCB

Luke 11 in the BOHCV

Luke 11 in the BOHLNT

Luke 11 in the BOHNTLTAL

Luke 11 in the BOILNTAP

Luke 11 in the BOITCV

Luke 11 in the BOKCV

Luke 11 in the BOKCV2

Luke 11 in the BOKHWOG

Luke 11 in the BOKSSV

Luke 11 in the BOLCB

Luke 11 in the BOLCB2

Luke 11 in the BOMCV

Luke 11 in the BONAV

Luke 11 in the BONCB

Luke 11 in the BONLT

Luke 11 in the BONUT2

Luke 11 in the BOPLNT

Luke 11 in the BOSCB

Luke 11 in the BOSNC

Luke 11 in the BOTLNT

Luke 11 in the BOVCB

Luke 11 in the BOYCB

Luke 11 in the BPBB

Luke 11 in the BPH

Luke 11 in the BSB

Luke 11 in the CCB

Luke 11 in the CUV

Luke 11 in the CUVS

Luke 11 in the DBT

Luke 11 in the DGDNT

Luke 11 in the DHNT

Luke 11 in the DNT

Luke 11 in the ELBE

Luke 11 in the EMTV

Luke 11 in the ESV

Luke 11 in the FBV

Luke 11 in the FEB

Luke 11 in the GGMNT

Luke 11 in the GNT

Luke 11 in the HARY

Luke 11 in the HNT

Luke 11 in the IRVA

Luke 11 in the IRVB

Luke 11 in the IRVG

Luke 11 in the IRVH

Luke 11 in the IRVK

Luke 11 in the IRVM

Luke 11 in the IRVM2

Luke 11 in the IRVO

Luke 11 in the IRVP

Luke 11 in the IRVT

Luke 11 in the IRVT2

Luke 11 in the IRVU

Luke 11 in the ISVN

Luke 11 in the JSNT

Luke 11 in the KAPI

Luke 11 in the KBT1ETNIK

Luke 11 in the KBV

Luke 11 in the KJV

Luke 11 in the KNFD

Luke 11 in the LBA

Luke 11 in the LBLA

Luke 11 in the LNT

Luke 11 in the LSV

Luke 11 in the MAAL

Luke 11 in the MBV

Luke 11 in the MBV2

Luke 11 in the MHNT

Luke 11 in the MKNFD

Luke 11 in the MNG

Luke 11 in the MNT

Luke 11 in the MNT2

Luke 11 in the MRS1T

Luke 11 in the NAA

Luke 11 in the NASB

Luke 11 in the NBLA

Luke 11 in the NBS

Luke 11 in the NBVTP

Luke 11 in the NET2

Luke 11 in the NIV11

Luke 11 in the NNT

Luke 11 in the NNT2

Luke 11 in the NNT3

Luke 11 in the PDDPT

Luke 11 in the PFNT

Luke 11 in the RMNT

Luke 11 in the SBIAS

Luke 11 in the SBIBS

Luke 11 in the SBIBS2

Luke 11 in the SBICS

Luke 11 in the SBIDS

Luke 11 in the SBIGS

Luke 11 in the SBIHS

Luke 11 in the SBIIS

Luke 11 in the SBIIS2

Luke 11 in the SBIIS3

Luke 11 in the SBIKS

Luke 11 in the SBIKS2

Luke 11 in the SBIMS

Luke 11 in the SBIOS

Luke 11 in the SBIPS

Luke 11 in the SBISS

Luke 11 in the SBITS

Luke 11 in the SBITS2

Luke 11 in the SBITS3

Luke 11 in the SBITS4

Luke 11 in the SBIUS

Luke 11 in the SBIVS

Luke 11 in the SBT

Luke 11 in the SBT1E

Luke 11 in the SCHL

Luke 11 in the SNT

Luke 11 in the SUSU

Luke 11 in the SUSU2

Luke 11 in the SYNO

Luke 11 in the TBIAOTANT

Luke 11 in the TBT1E

Luke 11 in the TBT1E2

Luke 11 in the TFTIP

Luke 11 in the TFTU

Luke 11 in the TGNTATF3T

Luke 11 in the THAI

Luke 11 in the TNFD

Luke 11 in the TNT

Luke 11 in the TNTIK

Luke 11 in the TNTIL

Luke 11 in the TNTIN

Luke 11 in the TNTIP

Luke 11 in the TNTIZ

Luke 11 in the TOMA

Luke 11 in the TTENT

Luke 11 in the UBG

Luke 11 in the UGV

Luke 11 in the UGV2

Luke 11 in the UGV3

Luke 11 in the VBL

Luke 11 in the VDCC

Luke 11 in the YALU

Luke 11 in the YAPE

Luke 11 in the YBVTP

Luke 11 in the ZBP