Luke 12 (BOICB)

1 Nʼoge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara, nke mere ka ha na-azọ ibe ha ụkwụ. O buuru ụzọ bido ịgwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya unu banyere ihe na-eko achịcha ndị Farisii, nke bụ ihu abụọ ha. 2 Nʼihi na ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe. 3 Ihe ọbụla unu kwuru nʼọchịchịrị, a ga-anụ ya nʼihe, ihe ọbụla unu gbara nʼizu nʼime ụlọ ka a ga-ekwusa nʼelu ụlọ. 4 “Ana m agwa unu, ndị enyi m, unu atụla egwu maka ndị na-egbu anụ ahụ ma e mesịa, ha apụghị ime ihe ọzọ. 5 Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu. 6 Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru. 7 Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza. 8 “Ma asị m unu, na onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, onye ahụ ka Nwa nke Mmadụ ga-ekwupụta nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke. 9 Onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, a ga-agọnarịkwa ya nʼihu ndị mmụọ ozi nke Chineke. 10 Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya. 11 “Mgbe ha ga-akpọbata unu nʼihu ụlọ nzukọ, ndị ọchịchị na ndịisi, unu echegbula onwe unu otu unu ga-esi zaghachi, maọbụ ihe unu ga-aza, maọbụ ihe unu ga-ekwu. 12 Nʼihi na Mmụọ Nsọ ga-ezi unu nʼoge awa ahụ, ihe unu kwesiri ikwu.” 13 Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.” 14 Ọ sịrị ya, “Nwoke, onye mere m onye ikpe maọbụ onye ndozi okwu nʼetiti unu?” 15 Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.” 16 Ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu ọgaranya nwere ala mịrị nnọọ mkpụrụ dị ukwuu. 17 O chere nʼime onwe ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme nʼihi na enweghị m ebe m ga-echekwa mkpụrụ m?’ 18 “Ya mere ọ sịrị, ‘Ihe m ga-eme bụ nke a, aga m akwatu ọba m, wuo nke ka ya ukwuu, bụ ebe m ga-echekwa mkpụrụ m na ihe ndị ọzọ. 19 Ya mere aga m agwa mkpụrụobi m, “I nwere ọtụtụ ezi ihe ga-ezuru gị ọtụtụ afọ, nʼihi ya zuru ike, rie, ṅụọ ma nweekwa obi ụtọ.” ’ 20 “Ma Chineke gwara ya sị, ‘Onye nzuzu, nʼabalị a ka a ga-achọ mkpụrụobi gị nʼaka gị. Ihe niile ị kpakọtara nke onye ka ha ga-abụ?’ 21 “Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.” 22 Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ya mere, asị m unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi. 23 Nʼihi na ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ dịkwa mkpa karịa uwe. 24 Tuleenụ ugolọma. Ha adịghị akụ maọbụ ghọrọ mkpụrụ ọbụla. Ha enweghị ụlọakụ maọbụ ọba, ma Chineke na-azụ ha nri. Unu ọ dịghị oke ọnụahịa karịa anụ ufe ndị a. 25 Onye nʼime unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya? 26 Ebe unu na-apụghị ime ihe nta dị otu a, gịnị mere unu ji echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ? 27 “Tuleenụ otu okoko ọhịa lili si eto. Ha adịghị arụ ọrụ ọbụla maọbụ tụọ ogho. Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a. 28 Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ pụghị i si otu a chọọ unu mma karịa? Unu ndị okwukwe nta. 29 Ya mere, unu adọgbula onwe unu maka ihe unu ga-eri maọbụ ihe unu ga-aṅụ. Unu echegbukwala onwe unu. 30 Nʼihi na ọ bụ ihe ndị a ka ndị mba nke ụwa na-achụso, ma Nna unu makwara na ha dị unu mkpa. 31 Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile. 32 “Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ. 33 Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya. 34 Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.” 35 “Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu. 36 Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka. 37 Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi. 38 Ngọzị ga-adịrị ndị ohu ahụ onye nwe ha ga-ahụ ka ha nọ na njikere, ọ bụladị ma ọ lọghachiri nʼetiti abalị, maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụ. 39 Maranụ nke a: ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge awa onye ohi ga-eji abịa nʼụlọ ya, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ tiwaa ụlọ ya. 40 Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.” 41 Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị tụrụ ilu a nʼihi anyị, ka ọ bụ maka onye ọbụla?” 42 Ma Onyenwe anyị sịrị, “Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ụmụodibo ya niile, ka ọ na-enye ha nri mgbe o kwesiri? 43 Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi. 44 Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere. 45 Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke. 46 Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe. 47 “Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike. 48 Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ. 49 “A bịara m iwebata ọkụ nʼelu ụwa, ọ gaara adịrị m nọ mma ma ọ bụrụ na ọ malitelarị inwu! 50 Enwere m baptizim nke m na-aghaghị ime, ma aga m anọgide nʼoke ihe mgbu tutu e mezuo ya 51 Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa. 52 Site ugbu a gawa, mmadụ ise si nʼotu ezinaụlọ ga-ekewa megide onwe ha, atọ megide abụọ, abụọ megide atọ. 53 Ha ga-ekewa; nna megide nwa ya nwoke, nwa nwoke ga-emegidekwa nna ya, nne megide nwa ya nwanyị, nwa nwanyị megidekwa nne ya, nne di megide nwunye nwa ya, nwunye nwa megide nne di ya.” 54 Ọ gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe unu hụrụ urukpu ojii ka ọ na-ebili nʼọdịda anyanwụ, unu na-eme ngwangwa sị, ‘Mmiri ga-ezo,’ ọ na-ezokwa. 55 Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị, ọ na-emekwa otu ahụ. 56 Ndị ihu abụọ! Unu matara ịkọwa ihu ala na mbara eluigwe. Gịnị mere unu apụghị ịkọwa oge dị ugbu a? 57 “Gịnị mere unu adịghị ekpebiri onwe unu ihe ziri ezi? 58 Ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nʼihu ọkaikpe, gbalịsie ike ka gị na ya kpezie nʼụzọ, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-akpọpụ gị nʼihu onye ọkaikpe, ma eleghị anya ọkaikpe ahụ ga-arara gị nye nʼaka ọkaikpe ukwu, ọkaikpe ukwu ga-ararakwa gị nye nʼaka onye na-eje ozi nʼụlọikpe, bụ onye ga-etinye gị nʼụlọ mkpọrọ. 59 Asị m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri ọ bụladị otu kobo nke ikpeazụ.”

In Other Versions

Luke 12 in the ANGEFD

Luke 12 in the ANTPNG2D

Luke 12 in the AS21

Luke 12 in the BAGH

Luke 12 in the BBPNG

Luke 12 in the BBT1E

Luke 12 in the BDS

Luke 12 in the BEV

Luke 12 in the BHAD

Luke 12 in the BIB

Luke 12 in the BLPT

Luke 12 in the BNT

Luke 12 in the BNTABOOT

Luke 12 in the BNTLV

Luke 12 in the BOATCB

Luke 12 in the BOATCB2

Luke 12 in the BOBCV

Luke 12 in the BOCNT

Luke 12 in the BOECS

Luke 12 in the BOGWICC

Luke 12 in the BOHCB

Luke 12 in the BOHCV

Luke 12 in the BOHLNT

Luke 12 in the BOHNTLTAL

Luke 12 in the BOILNTAP

Luke 12 in the BOITCV

Luke 12 in the BOKCV

Luke 12 in the BOKCV2

Luke 12 in the BOKHWOG

Luke 12 in the BOKSSV

Luke 12 in the BOLCB

Luke 12 in the BOLCB2

Luke 12 in the BOMCV

Luke 12 in the BONAV

Luke 12 in the BONCB

Luke 12 in the BONLT

Luke 12 in the BONUT2

Luke 12 in the BOPLNT

Luke 12 in the BOSCB

Luke 12 in the BOSNC

Luke 12 in the BOTLNT

Luke 12 in the BOVCB

Luke 12 in the BOYCB

Luke 12 in the BPBB

Luke 12 in the BPH

Luke 12 in the BSB

Luke 12 in the CCB

Luke 12 in the CUV

Luke 12 in the CUVS

Luke 12 in the DBT

Luke 12 in the DGDNT

Luke 12 in the DHNT

Luke 12 in the DNT

Luke 12 in the ELBE

Luke 12 in the EMTV

Luke 12 in the ESV

Luke 12 in the FBV

Luke 12 in the FEB

Luke 12 in the GGMNT

Luke 12 in the GNT

Luke 12 in the HARY

Luke 12 in the HNT

Luke 12 in the IRVA

Luke 12 in the IRVB

Luke 12 in the IRVG

Luke 12 in the IRVH

Luke 12 in the IRVK

Luke 12 in the IRVM

Luke 12 in the IRVM2

Luke 12 in the IRVO

Luke 12 in the IRVP

Luke 12 in the IRVT

Luke 12 in the IRVT2

Luke 12 in the IRVU

Luke 12 in the ISVN

Luke 12 in the JSNT

Luke 12 in the KAPI

Luke 12 in the KBT1ETNIK

Luke 12 in the KBV

Luke 12 in the KJV

Luke 12 in the KNFD

Luke 12 in the LBA

Luke 12 in the LBLA

Luke 12 in the LNT

Luke 12 in the LSV

Luke 12 in the MAAL

Luke 12 in the MBV

Luke 12 in the MBV2

Luke 12 in the MHNT

Luke 12 in the MKNFD

Luke 12 in the MNG

Luke 12 in the MNT

Luke 12 in the MNT2

Luke 12 in the MRS1T

Luke 12 in the NAA

Luke 12 in the NASB

Luke 12 in the NBLA

Luke 12 in the NBS

Luke 12 in the NBVTP

Luke 12 in the NET2

Luke 12 in the NIV11

Luke 12 in the NNT

Luke 12 in the NNT2

Luke 12 in the NNT3

Luke 12 in the PDDPT

Luke 12 in the PFNT

Luke 12 in the RMNT

Luke 12 in the SBIAS

Luke 12 in the SBIBS

Luke 12 in the SBIBS2

Luke 12 in the SBICS

Luke 12 in the SBIDS

Luke 12 in the SBIGS

Luke 12 in the SBIHS

Luke 12 in the SBIIS

Luke 12 in the SBIIS2

Luke 12 in the SBIIS3

Luke 12 in the SBIKS

Luke 12 in the SBIKS2

Luke 12 in the SBIMS

Luke 12 in the SBIOS

Luke 12 in the SBIPS

Luke 12 in the SBISS

Luke 12 in the SBITS

Luke 12 in the SBITS2

Luke 12 in the SBITS3

Luke 12 in the SBITS4

Luke 12 in the SBIUS

Luke 12 in the SBIVS

Luke 12 in the SBT

Luke 12 in the SBT1E

Luke 12 in the SCHL

Luke 12 in the SNT

Luke 12 in the SUSU

Luke 12 in the SUSU2

Luke 12 in the SYNO

Luke 12 in the TBIAOTANT

Luke 12 in the TBT1E

Luke 12 in the TBT1E2

Luke 12 in the TFTIP

Luke 12 in the TFTU

Luke 12 in the TGNTATF3T

Luke 12 in the THAI

Luke 12 in the TNFD

Luke 12 in the TNT

Luke 12 in the TNTIK

Luke 12 in the TNTIL

Luke 12 in the TNTIN

Luke 12 in the TNTIP

Luke 12 in the TNTIZ

Luke 12 in the TOMA

Luke 12 in the TTENT

Luke 12 in the UBG

Luke 12 in the UGV

Luke 12 in the UGV2

Luke 12 in the UGV3

Luke 12 in the VBL

Luke 12 in the VDCC

Luke 12 in the YALU

Luke 12 in the YAPE

Luke 12 in the YBVTP

Luke 12 in the ZBP