Luke 3 (BOICB)

1 Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin, 2 mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara. 3 Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 4 Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị,“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị,‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị,meenụ ka okporoụzọ ya guzozie. 5 A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla,ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala.Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma,meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị. 6 Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ” 7 Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? 8 Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. 9 Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.” 10 Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?” 11 Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.” 12 Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?” 13 Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.” 14 Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?”Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.” 15 Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ. 16 Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim. 17 Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.” 18 O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma. 19 Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere, 20 tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ. 21 Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere. 22 Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.” 23 Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef, onye bụ nwa Heli; 24 Heli abụrụ nwa Matat,nwa Livayị, nwa Meliki,nwa Janayi, nwa Josef; 25 nwa Matatiyas, nwa Emọs,nwa Nehum, nwa Esili,nwa Nagayị; 26 nwa Maat,nwa Matatiyas, nwa Semein,nwa Josek, nwa Joda; 27 nwa Joanan, nwa Resa,nwa Zerubabel, nwa Shealtiel,nwa Neri; 28 nwa Meliki,nwa Adi, nwa Kosam,nwa Elmadam, nwa Er, 29 nwa Joshua, nwa Elieza,nwa Jorim, nwa Matat,nwa Livayị; 30 nwa Simiọn,nwa Juda, nwa Josef,nwa Jonam, nwa Eliakịm; 31 nwa Melea, nwa Mena,nwa Matata, nwa Netan,nwa Devid; 32 nwa Jesi,nwa Obed, nwa Boaz,nwa Salmọn, nwa Nashọn; 33 nwa Aminadab, nwa Ram,nwa Hezrọn, nwa Perez,nwa Juda; 34 nwa Jekọb,nwa Aịzik, nwa Ebraham,nwa Tera, nwa Nahọ; 35 nwa Serug, nwa Reu,nwa Peleg, nwa Eba,nwa Shela; 36 nwa Kenan,nwa Aafaksad, nwa Shem,nwa Noa, nwa Lamek; 37 nwa Metusela, nwa Enọk,nwa Jared, nwa Mahalalel,nwa Kenan; 38 nwa Enọsh,nwa Set, nwa Adam,nwa Chineke.

In Other Versions

Luke 3 in the ANGEFD

Luke 3 in the ANTPNG2D

Luke 3 in the AS21

Luke 3 in the BAGH

Luke 3 in the BBPNG

Luke 3 in the BBT1E

Luke 3 in the BDS

Luke 3 in the BEV

Luke 3 in the BHAD

Luke 3 in the BIB

Luke 3 in the BLPT

Luke 3 in the BNT

Luke 3 in the BNTABOOT

Luke 3 in the BNTLV

Luke 3 in the BOATCB

Luke 3 in the BOATCB2

Luke 3 in the BOBCV

Luke 3 in the BOCNT

Luke 3 in the BOECS

Luke 3 in the BOGWICC

Luke 3 in the BOHCB

Luke 3 in the BOHCV

Luke 3 in the BOHLNT

Luke 3 in the BOHNTLTAL

Luke 3 in the BOILNTAP

Luke 3 in the BOITCV

Luke 3 in the BOKCV

Luke 3 in the BOKCV2

Luke 3 in the BOKHWOG

Luke 3 in the BOKSSV

Luke 3 in the BOLCB

Luke 3 in the BOLCB2

Luke 3 in the BOMCV

Luke 3 in the BONAV

Luke 3 in the BONCB

Luke 3 in the BONLT

Luke 3 in the BONUT2

Luke 3 in the BOPLNT

Luke 3 in the BOSCB

Luke 3 in the BOSNC

Luke 3 in the BOTLNT

Luke 3 in the BOVCB

Luke 3 in the BOYCB

Luke 3 in the BPBB

Luke 3 in the BPH

Luke 3 in the BSB

Luke 3 in the CCB

Luke 3 in the CUV

Luke 3 in the CUVS

Luke 3 in the DBT

Luke 3 in the DGDNT

Luke 3 in the DHNT

Luke 3 in the DNT

Luke 3 in the ELBE

Luke 3 in the EMTV

Luke 3 in the ESV

Luke 3 in the FBV

Luke 3 in the FEB

Luke 3 in the GGMNT

Luke 3 in the GNT

Luke 3 in the HARY

Luke 3 in the HNT

Luke 3 in the IRVA

Luke 3 in the IRVB

Luke 3 in the IRVG

Luke 3 in the IRVH

Luke 3 in the IRVK

Luke 3 in the IRVM

Luke 3 in the IRVM2

Luke 3 in the IRVO

Luke 3 in the IRVP

Luke 3 in the IRVT

Luke 3 in the IRVT2

Luke 3 in the IRVU

Luke 3 in the ISVN

Luke 3 in the JSNT

Luke 3 in the KAPI

Luke 3 in the KBT1ETNIK

Luke 3 in the KBV

Luke 3 in the KJV

Luke 3 in the KNFD

Luke 3 in the LBA

Luke 3 in the LBLA

Luke 3 in the LNT

Luke 3 in the LSV

Luke 3 in the MAAL

Luke 3 in the MBV

Luke 3 in the MBV2

Luke 3 in the MHNT

Luke 3 in the MKNFD

Luke 3 in the MNG

Luke 3 in the MNT

Luke 3 in the MNT2

Luke 3 in the MRS1T

Luke 3 in the NAA

Luke 3 in the NASB

Luke 3 in the NBLA

Luke 3 in the NBS

Luke 3 in the NBVTP

Luke 3 in the NET2

Luke 3 in the NIV11

Luke 3 in the NNT

Luke 3 in the NNT2

Luke 3 in the NNT3

Luke 3 in the PDDPT

Luke 3 in the PFNT

Luke 3 in the RMNT

Luke 3 in the SBIAS

Luke 3 in the SBIBS

Luke 3 in the SBIBS2

Luke 3 in the SBICS

Luke 3 in the SBIDS

Luke 3 in the SBIGS

Luke 3 in the SBIHS

Luke 3 in the SBIIS

Luke 3 in the SBIIS2

Luke 3 in the SBIIS3

Luke 3 in the SBIKS

Luke 3 in the SBIKS2

Luke 3 in the SBIMS

Luke 3 in the SBIOS

Luke 3 in the SBIPS

Luke 3 in the SBISS

Luke 3 in the SBITS

Luke 3 in the SBITS2

Luke 3 in the SBITS3

Luke 3 in the SBITS4

Luke 3 in the SBIUS

Luke 3 in the SBIVS

Luke 3 in the SBT

Luke 3 in the SBT1E

Luke 3 in the SCHL

Luke 3 in the SNT

Luke 3 in the SUSU

Luke 3 in the SUSU2

Luke 3 in the SYNO

Luke 3 in the TBIAOTANT

Luke 3 in the TBT1E

Luke 3 in the TBT1E2

Luke 3 in the TFTIP

Luke 3 in the TFTU

Luke 3 in the TGNTATF3T

Luke 3 in the THAI

Luke 3 in the TNFD

Luke 3 in the TNT

Luke 3 in the TNTIK

Luke 3 in the TNTIL

Luke 3 in the TNTIN

Luke 3 in the TNTIP

Luke 3 in the TNTIZ

Luke 3 in the TOMA

Luke 3 in the TTENT

Luke 3 in the UBG

Luke 3 in the UGV

Luke 3 in the UGV2

Luke 3 in the UGV3

Luke 3 in the VBL

Luke 3 in the VDCC

Luke 3 in the YALU

Luke 3 in the YAPE

Luke 3 in the YBVTP

Luke 3 in the ZBP