Malachi 3 (BOICB)

1 “Lee, aga m ezipu onyeozi m, onye ga-edozi ụzọ nʼihu m. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ahụ unu na-ele anya ya ga-abịa na mberede nʼụlọnsọ ukwu ya. Onyeozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-agụsị unu agụụ ike, ga-abịa,” ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 2 “Ma onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya ma guzokwa mgbe ọ pụtara ihe? Nʼihi na ọ ga-adị ka ọkụ na-anụcha anụcha, dịkwa ka ncha e ji asụ akwa. 3 Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara ONYENWE ANYỊ onyinye nʼezi omume. 4 Mgbe ahụ, onyinye Juda na Jerusalem ga-abụ onyinye ONYENWE ANYỊ ga-anabata, dịka o si anabata ha nʼụbọchị ndị ahụ gara aga, na mgbe ochie gara aga. 5 “Mgbe ahụ, aga m abịa unu nso ikpe unu ikpe. Aga m abịakwa ngwangwa ịgbagide ha ama bụ ndị mgbaasị, na ndị na-akwa iko, na ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ndị na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị na-emegbu ndị na-enweghị nna, na ndị na-anapụ ndị ọbịa ikpe ziri ezi, ndị ahụ niile na-adịghị atụ egwu m.” Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 6 “Nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ adịghị agbanwe agbanwe. Ya mere, unu bụ ụmụ Jekọb ji dịgide. 7 Site nʼoge nna nna unu ha, unu esitela nʼidebe iwu na ụkpụrụ m wezuga onwe unu. Unu adịghịkwa edebe ha. Ya mere, lọghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alọghachikwute unu.” Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.“Ma unu na-asị, ‘Anyị ga-esi aṅaa lọghachi?’ 8 “Mmadụ ọ na-ezu ihe bụ nke Chineke nʼohi? Ma unu apụnarịla m ihe bụ nke m.“Ma unu na-ajụ: ‘Anyị si aṅaa na-ezu gị ohi?’“Ọ bụ site nʼotu ụzọ nʼime ụzọ iri unu, onyinye na aja niile. 9 Nʼihi ya, ọbụbụ ọnụ dịịrị unu, ka mba niile unu ha, nʼihi na ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ezu ohi. 10 Webatanụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile unu nʼime ụlọakụ m, ka nri jupụta nʼime ụlọ m. Jirinụ nke a nwalee m,” ka unu hụ ma mụ onwe m agaghị emeghe ọnụ ụzọ eluigwe, site na ya wụdatara unu ngọzị dị ukwuu, nke ga-ejubiga oke na ọnọdụ agaghị adị ichebe ha. Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 11 “Aga m egbochi ihe nripịa ndị ahụ niile ka ha ghara iripịa mkpụrụ ubi unu. Osisi vaịnị unu agakwaghị atụpụsị mkpụrụ ya nʼala tutu ruo mgbe ha chara.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 12 “Mgbe ahụ, mba niile dị iche iche ga-akpọ unu ndị a gọziri agọzi, nʼihi na ala unu ga-abụ nke na-enye ndị nwe ya obi ụtọ.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 13 ONYENWE ANYỊ na-ekwu, sị, “Unu ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m.”“Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị ka anyị kwuru megide gị?’ 14 “Unu ekwuola sị, ‘Ọ bụ ihe nzuzu ife Chineke ofufe, na ịtụ ya egwu. Gịnị bụ uru anyị na-erite site nʼidebe iwu ya, na ijegharị dịka ndị na-eru ụjụ nʼihu ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile? 15 Ma site ugbu a gaa nʼihu, ndị nganga ka anyị ga-akpọ ndị ihe na-agara nke ọma. Nʼezie, ndị na-eme ihe ọjọọ ka ihe na-agara nke ọma. Ndị ahụ jikwa ihe ọjọọ ha na-anwa Chineke na-agbanarị ntaramahụhụ ya.’ ” 16 Mgbe ahụ, ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ gwarịtara ibe ha okwu, ONYENWE ANYỊ ṅara ntị, nụkwa ihe ha na-ekwu. Nʼihu ya, e nwere akwụkwọ ncheta dị ya, ebe e dere aha ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ, ma na-echekwa echiche banyere aha ya. 17 “Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe,” ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “ha ga-abụ ihe oke ọnụahịa nke aka m. Aga m echebe ha, dịka nna na-enwe ọmịiko ma chebekwa nwa ya nwoke na-efe ya. 18 Unu ga-ahụ ihe dị iche nʼetiti ndị ezi omume na ndị ajọ omume, hụkwa ihe dị iche nʼetiti ndị na-efe Chineke na ndị na-adịghị efe ya.

In Other Versions

Malachi 3 in the ANGEFD

Malachi 3 in the ANTPNG2D

Malachi 3 in the AS21

Malachi 3 in the BAGH

Malachi 3 in the BBPNG

Malachi 3 in the BBT1E

Malachi 3 in the BDS

Malachi 3 in the BEV

Malachi 3 in the BHAD

Malachi 3 in the BIB

Malachi 3 in the BLPT

Malachi 3 in the BNT

Malachi 3 in the BNTABOOT

Malachi 3 in the BNTLV

Malachi 3 in the BOATCB

Malachi 3 in the BOATCB2

Malachi 3 in the BOBCV

Malachi 3 in the BOCNT

Malachi 3 in the BOECS

Malachi 3 in the BOGWICC

Malachi 3 in the BOHCB

Malachi 3 in the BOHCV

Malachi 3 in the BOHLNT

Malachi 3 in the BOHNTLTAL

Malachi 3 in the BOILNTAP

Malachi 3 in the BOITCV

Malachi 3 in the BOKCV

Malachi 3 in the BOKCV2

Malachi 3 in the BOKHWOG

Malachi 3 in the BOKSSV

Malachi 3 in the BOLCB

Malachi 3 in the BOLCB2

Malachi 3 in the BOMCV

Malachi 3 in the BONAV

Malachi 3 in the BONCB

Malachi 3 in the BONLT

Malachi 3 in the BONUT2

Malachi 3 in the BOPLNT

Malachi 3 in the BOSCB

Malachi 3 in the BOSNC

Malachi 3 in the BOTLNT

Malachi 3 in the BOVCB

Malachi 3 in the BOYCB

Malachi 3 in the BPBB

Malachi 3 in the BPH

Malachi 3 in the BSB

Malachi 3 in the CCB

Malachi 3 in the CUV

Malachi 3 in the CUVS

Malachi 3 in the DBT

Malachi 3 in the DGDNT

Malachi 3 in the DHNT

Malachi 3 in the DNT

Malachi 3 in the ELBE

Malachi 3 in the EMTV

Malachi 3 in the ESV

Malachi 3 in the FBV

Malachi 3 in the FEB

Malachi 3 in the GGMNT

Malachi 3 in the GNT

Malachi 3 in the HARY

Malachi 3 in the HNT

Malachi 3 in the IRVA

Malachi 3 in the IRVB

Malachi 3 in the IRVG

Malachi 3 in the IRVH

Malachi 3 in the IRVK

Malachi 3 in the IRVM

Malachi 3 in the IRVM2

Malachi 3 in the IRVO

Malachi 3 in the IRVP

Malachi 3 in the IRVT

Malachi 3 in the IRVT2

Malachi 3 in the IRVU

Malachi 3 in the ISVN

Malachi 3 in the JSNT

Malachi 3 in the KAPI

Malachi 3 in the KBT1ETNIK

Malachi 3 in the KBV

Malachi 3 in the KJV

Malachi 3 in the KNFD

Malachi 3 in the LBA

Malachi 3 in the LBLA

Malachi 3 in the LNT

Malachi 3 in the LSV

Malachi 3 in the MAAL

Malachi 3 in the MBV

Malachi 3 in the MBV2

Malachi 3 in the MHNT

Malachi 3 in the MKNFD

Malachi 3 in the MNG

Malachi 3 in the MNT

Malachi 3 in the MNT2

Malachi 3 in the MRS1T

Malachi 3 in the NAA

Malachi 3 in the NASB

Malachi 3 in the NBLA

Malachi 3 in the NBS

Malachi 3 in the NBVTP

Malachi 3 in the NET2

Malachi 3 in the NIV11

Malachi 3 in the NNT

Malachi 3 in the NNT2

Malachi 3 in the NNT3

Malachi 3 in the PDDPT

Malachi 3 in the PFNT

Malachi 3 in the RMNT

Malachi 3 in the SBIAS

Malachi 3 in the SBIBS

Malachi 3 in the SBIBS2

Malachi 3 in the SBICS

Malachi 3 in the SBIDS

Malachi 3 in the SBIGS

Malachi 3 in the SBIHS

Malachi 3 in the SBIIS

Malachi 3 in the SBIIS2

Malachi 3 in the SBIIS3

Malachi 3 in the SBIKS

Malachi 3 in the SBIKS2

Malachi 3 in the SBIMS

Malachi 3 in the SBIOS

Malachi 3 in the SBIPS

Malachi 3 in the SBISS

Malachi 3 in the SBITS

Malachi 3 in the SBITS2

Malachi 3 in the SBITS3

Malachi 3 in the SBITS4

Malachi 3 in the SBIUS

Malachi 3 in the SBIVS

Malachi 3 in the SBT

Malachi 3 in the SBT1E

Malachi 3 in the SCHL

Malachi 3 in the SNT

Malachi 3 in the SUSU

Malachi 3 in the SUSU2

Malachi 3 in the SYNO

Malachi 3 in the TBIAOTANT

Malachi 3 in the TBT1E

Malachi 3 in the TBT1E2

Malachi 3 in the TFTIP

Malachi 3 in the TFTU

Malachi 3 in the TGNTATF3T

Malachi 3 in the THAI

Malachi 3 in the TNFD

Malachi 3 in the TNT

Malachi 3 in the TNTIK

Malachi 3 in the TNTIL

Malachi 3 in the TNTIN

Malachi 3 in the TNTIP

Malachi 3 in the TNTIZ

Malachi 3 in the TOMA

Malachi 3 in the TTENT

Malachi 3 in the UBG

Malachi 3 in the UGV

Malachi 3 in the UGV2

Malachi 3 in the UGV3

Malachi 3 in the VBL

Malachi 3 in the VDCC

Malachi 3 in the YALU

Malachi 3 in the YAPE

Malachi 3 in the YBVTP

Malachi 3 in the ZBP