Matthew 15 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu si Jerusalem bịakwute Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị, 2 “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nʼomenaala ndị okenye? Ha anaghị akwọ aka ha tupu ha erie nri.” 3 Ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu? 4 Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.’ 5 Ma unu na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla ga-asị nna maọbụ nne ya, ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ ‘onyinye dịrị Chineke.’ 6 Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu. 7 Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Mgbe o kwuru sị, 8 “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. 9 Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’ ” 10 Mgbe ahụ, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ, sị ha, “Geenụ ntị, ghọtakwanụ. 11 Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nʼọnụ na-emerụ ya, kama ọ bụ ihe sị nʼọnụ onye ahụ pụta na-emerụ ya.” 12 Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwa na obi adịghị ndị Farisii mma nʼihi okwu ahụ i kwuru?” 13 Ma ọ zara sị ha, “Osisi ọbụla Nna m nke eluigwe na-ejighị aka ya kụọ ka a ga-ehopu. 14 Ya mere, unu echegbula onwe unu, nʼihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì ibe ya ha abụọ adaba nʼime olulu.” 15 Pita sịrị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu a pụtara.” 16 Ọ jụrụ ha sị, “Unu ọ ka dị ka ndị na-enweghị nghọta? 17 Ọ bụ na unu aghọtaghị na ihe ọbụla nke na-aba nʼọnụ na-aga nʼime afọ, sịkwa nʼebe ahụ a nyụpụ ya nʼụlọ nsị? 18 Ma ihe si mmadụ nʼọnụ pụta na-esi ya nʼobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ. 19 Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu. 20 Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupu o rie nri, maọbụ na ọ kwọghị.” 21 Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn. 22 Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye Kenan bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile.” 23 Ma ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si eti mkpu na-esogharị anyị!” 24 Ọ zara sị, “Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.” 25 Ma ọ bịara daa nʼụkwụ ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nyere m aka!” 26 Ọ zara sị, “O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.” 27 Ọ zara sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebul rie iberibe nri nke na-esi nʼelu tebul ha daa nʼala.” 28 Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meelara gị ihe ị na-arịọ.” Nʼotu oge ahụ a gwọrọ ada ya. 29 Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nʼelu ugwu nọdụ ala. 30 Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile. 31 Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel. 32 Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.” 33 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?” 34 Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?”Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.” 35 Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. 36 O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ. 37 Onye ọbụla nʼime ha riri, rijuo afọ. Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara iberibe ndị fọdụrụ nke juru nkata asaa. 38 Ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke anọ, nʼagụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị. 39 Mgbe o zilagara igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gafee osimiri, bịaruo nʼobodo Magadan.

In Other Versions

Matthew 15 in the ANGEFD

Matthew 15 in the ANTPNG2D

Matthew 15 in the AS21

Matthew 15 in the BAGH

Matthew 15 in the BBPNG

Matthew 15 in the BBT1E

Matthew 15 in the BDS

Matthew 15 in the BEV

Matthew 15 in the BHAD

Matthew 15 in the BIB

Matthew 15 in the BLPT

Matthew 15 in the BNT

Matthew 15 in the BNTABOOT

Matthew 15 in the BNTLV

Matthew 15 in the BOATCB

Matthew 15 in the BOATCB2

Matthew 15 in the BOBCV

Matthew 15 in the BOCNT

Matthew 15 in the BOECS

Matthew 15 in the BOGWICC

Matthew 15 in the BOHCB

Matthew 15 in the BOHCV

Matthew 15 in the BOHLNT

Matthew 15 in the BOHNTLTAL

Matthew 15 in the BOILNTAP

Matthew 15 in the BOITCV

Matthew 15 in the BOKCV

Matthew 15 in the BOKCV2

Matthew 15 in the BOKHWOG

Matthew 15 in the BOKSSV

Matthew 15 in the BOLCB

Matthew 15 in the BOLCB2

Matthew 15 in the BOMCV

Matthew 15 in the BONAV

Matthew 15 in the BONCB

Matthew 15 in the BONLT

Matthew 15 in the BONUT2

Matthew 15 in the BOPLNT

Matthew 15 in the BOSCB

Matthew 15 in the BOSNC

Matthew 15 in the BOTLNT

Matthew 15 in the BOVCB

Matthew 15 in the BOYCB

Matthew 15 in the BPBB

Matthew 15 in the BPH

Matthew 15 in the BSB

Matthew 15 in the CCB

Matthew 15 in the CUV

Matthew 15 in the CUVS

Matthew 15 in the DBT

Matthew 15 in the DGDNT

Matthew 15 in the DHNT

Matthew 15 in the DNT

Matthew 15 in the ELBE

Matthew 15 in the EMTV

Matthew 15 in the ESV

Matthew 15 in the FBV

Matthew 15 in the FEB

Matthew 15 in the GGMNT

Matthew 15 in the GNT

Matthew 15 in the HARY

Matthew 15 in the HNT

Matthew 15 in the IRVA

Matthew 15 in the IRVB

Matthew 15 in the IRVG

Matthew 15 in the IRVH

Matthew 15 in the IRVK

Matthew 15 in the IRVM

Matthew 15 in the IRVM2

Matthew 15 in the IRVO

Matthew 15 in the IRVP

Matthew 15 in the IRVT

Matthew 15 in the IRVT2

Matthew 15 in the IRVU

Matthew 15 in the ISVN

Matthew 15 in the JSNT

Matthew 15 in the KAPI

Matthew 15 in the KBT1ETNIK

Matthew 15 in the KBV

Matthew 15 in the KJV

Matthew 15 in the KNFD

Matthew 15 in the LBA

Matthew 15 in the LBLA

Matthew 15 in the LNT

Matthew 15 in the LSV

Matthew 15 in the MAAL

Matthew 15 in the MBV

Matthew 15 in the MBV2

Matthew 15 in the MHNT

Matthew 15 in the MKNFD

Matthew 15 in the MNG

Matthew 15 in the MNT

Matthew 15 in the MNT2

Matthew 15 in the MRS1T

Matthew 15 in the NAA

Matthew 15 in the NASB

Matthew 15 in the NBLA

Matthew 15 in the NBS

Matthew 15 in the NBVTP

Matthew 15 in the NET2

Matthew 15 in the NIV11

Matthew 15 in the NNT

Matthew 15 in the NNT2

Matthew 15 in the NNT3

Matthew 15 in the PDDPT

Matthew 15 in the PFNT

Matthew 15 in the RMNT

Matthew 15 in the SBIAS

Matthew 15 in the SBIBS

Matthew 15 in the SBIBS2

Matthew 15 in the SBICS

Matthew 15 in the SBIDS

Matthew 15 in the SBIGS

Matthew 15 in the SBIHS

Matthew 15 in the SBIIS

Matthew 15 in the SBIIS2

Matthew 15 in the SBIIS3

Matthew 15 in the SBIKS

Matthew 15 in the SBIKS2

Matthew 15 in the SBIMS

Matthew 15 in the SBIOS

Matthew 15 in the SBIPS

Matthew 15 in the SBISS

Matthew 15 in the SBITS

Matthew 15 in the SBITS2

Matthew 15 in the SBITS3

Matthew 15 in the SBITS4

Matthew 15 in the SBIUS

Matthew 15 in the SBIVS

Matthew 15 in the SBT

Matthew 15 in the SBT1E

Matthew 15 in the SCHL

Matthew 15 in the SNT

Matthew 15 in the SUSU

Matthew 15 in the SUSU2

Matthew 15 in the SYNO

Matthew 15 in the TBIAOTANT

Matthew 15 in the TBT1E

Matthew 15 in the TBT1E2

Matthew 15 in the TFTIP

Matthew 15 in the TFTU

Matthew 15 in the TGNTATF3T

Matthew 15 in the THAI

Matthew 15 in the TNFD

Matthew 15 in the TNT

Matthew 15 in the TNTIK

Matthew 15 in the TNTIL

Matthew 15 in the TNTIN

Matthew 15 in the TNTIP

Matthew 15 in the TNTIZ

Matthew 15 in the TOMA

Matthew 15 in the TTENT

Matthew 15 in the UBG

Matthew 15 in the UGV

Matthew 15 in the UGV2

Matthew 15 in the UGV3

Matthew 15 in the VBL

Matthew 15 in the VDCC

Matthew 15 in the YALU

Matthew 15 in the YAPE

Matthew 15 in the YBVTP

Matthew 15 in the ZBP