Matthew 2 (BOICB)
1 Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem, 2 na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.” 3 Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. 4 Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ. 5 Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị, 6 “ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda,ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda,nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta,onye ga-achị ndị nke m Izrel.’” 7 Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè. 8 O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.” 9 Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ. 10 Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ. 11 Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá. 12 Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha. 13 Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Onyenwe anyị mere ka Josef hụ ya na nrọ, ọ sịrị ya, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipt. Alọghachikwala tutu ruo mgbe m ga-agwa gị, nʼihi na Herọd na-achọ nwantakịrị a ka o gbuo ya.” 14 Nʼoge abalị, Josef biliri kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipt. 15 Ebe ahụ ka ha nọgidere tutu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.” 16 Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị. 17 E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị, 18 “A nụrụ otu olu na Rema,ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị,Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya;ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya,nʼihi na ha adịghịkwa.” 19 Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt 20 sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi nʼala Izrel nʼihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.” 21 Ya mere, o biliri, kpọọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya, laghachi nʼala Izrel. 22 Mgbe ọ nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd na Judịa bụ nwa ya a na-akpọ Akelus, egwu tụrụ Josef ịlaghachi ebe ahụ. Ma nʼihi na adọwo ya aka na ntị na nrọ, ọ wezugara onwe ya gaa nʼakụkụ Galili. 23 Ọ gara biri nʼobodo a na-akpọ Nazaret. E sitekwara otu a mezuo okwu ọnụ ndị amụma sị na, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”
In Other Versions
Matthew 2 in the ANGEFD
Matthew 2 in the ANTPNG2D
Matthew 2 in the AS21
Matthew 2 in the BAGH
Matthew 2 in the BBPNG
Matthew 2 in the BBT1E
Matthew 2 in the BDS
Matthew 2 in the BEV
Matthew 2 in the BHAD
Matthew 2 in the BIB
Matthew 2 in the BLPT
Matthew 2 in the BNT
Matthew 2 in the BNTABOOT
Matthew 2 in the BNTLV
Matthew 2 in the BOATCB
Matthew 2 in the BOATCB2
Matthew 2 in the BOBCV
Matthew 2 in the BOCNT
Matthew 2 in the BOECS
Matthew 2 in the BOGWICC
Matthew 2 in the BOHCB
Matthew 2 in the BOHCV
Matthew 2 in the BOHLNT
Matthew 2 in the BOHNTLTAL
Matthew 2 in the BOILNTAP
Matthew 2 in the BOITCV
Matthew 2 in the BOKCV
Matthew 2 in the BOKCV2
Matthew 2 in the BOKHWOG
Matthew 2 in the BOKSSV
Matthew 2 in the BOLCB
Matthew 2 in the BOLCB2
Matthew 2 in the BOMCV
Matthew 2 in the BONAV
Matthew 2 in the BONCB
Matthew 2 in the BONLT
Matthew 2 in the BONUT2
Matthew 2 in the BOPLNT
Matthew 2 in the BOSCB
Matthew 2 in the BOSNC
Matthew 2 in the BOTLNT
Matthew 2 in the BOVCB
Matthew 2 in the BOYCB
Matthew 2 in the BPBB
Matthew 2 in the BPH
Matthew 2 in the BSB
Matthew 2 in the CCB
Matthew 2 in the CUV
Matthew 2 in the CUVS
Matthew 2 in the DBT
Matthew 2 in the DGDNT
Matthew 2 in the DHNT
Matthew 2 in the DNT
Matthew 2 in the ELBE
Matthew 2 in the EMTV
Matthew 2 in the ESV
Matthew 2 in the FBV
Matthew 2 in the FEB
Matthew 2 in the GGMNT
Matthew 2 in the GNT
Matthew 2 in the HARY
Matthew 2 in the HNT
Matthew 2 in the IRVA
Matthew 2 in the IRVB
Matthew 2 in the IRVG
Matthew 2 in the IRVH
Matthew 2 in the IRVK
Matthew 2 in the IRVM
Matthew 2 in the IRVM2
Matthew 2 in the IRVO
Matthew 2 in the IRVP
Matthew 2 in the IRVT
Matthew 2 in the IRVT2
Matthew 2 in the IRVU
Matthew 2 in the ISVN
Matthew 2 in the JSNT
Matthew 2 in the KAPI
Matthew 2 in the KBT1ETNIK
Matthew 2 in the KBV
Matthew 2 in the KJV
Matthew 2 in the KNFD
Matthew 2 in the LBA
Matthew 2 in the LBLA
Matthew 2 in the LNT
Matthew 2 in the LSV
Matthew 2 in the MAAL
Matthew 2 in the MBV
Matthew 2 in the MBV2
Matthew 2 in the MHNT
Matthew 2 in the MKNFD
Matthew 2 in the MNG
Matthew 2 in the MNT
Matthew 2 in the MNT2
Matthew 2 in the MRS1T
Matthew 2 in the NAA
Matthew 2 in the NASB
Matthew 2 in the NBLA
Matthew 2 in the NBS
Matthew 2 in the NBVTP
Matthew 2 in the NET2
Matthew 2 in the NIV11
Matthew 2 in the NNT
Matthew 2 in the NNT2
Matthew 2 in the NNT3
Matthew 2 in the PDDPT
Matthew 2 in the PFNT
Matthew 2 in the RMNT
Matthew 2 in the SBIAS
Matthew 2 in the SBIBS
Matthew 2 in the SBIBS2
Matthew 2 in the SBICS
Matthew 2 in the SBIDS
Matthew 2 in the SBIGS
Matthew 2 in the SBIHS
Matthew 2 in the SBIIS
Matthew 2 in the SBIIS2
Matthew 2 in the SBIIS3
Matthew 2 in the SBIKS
Matthew 2 in the SBIKS2
Matthew 2 in the SBIMS
Matthew 2 in the SBIOS
Matthew 2 in the SBIPS
Matthew 2 in the SBISS
Matthew 2 in the SBITS
Matthew 2 in the SBITS2
Matthew 2 in the SBITS3
Matthew 2 in the SBITS4
Matthew 2 in the SBIUS
Matthew 2 in the SBIVS
Matthew 2 in the SBT
Matthew 2 in the SBT1E
Matthew 2 in the SCHL
Matthew 2 in the SNT
Matthew 2 in the SUSU
Matthew 2 in the SUSU2
Matthew 2 in the SYNO
Matthew 2 in the TBIAOTANT
Matthew 2 in the TBT1E
Matthew 2 in the TBT1E2
Matthew 2 in the TFTIP
Matthew 2 in the TFTU
Matthew 2 in the TGNTATF3T
Matthew 2 in the THAI
Matthew 2 in the TNFD
Matthew 2 in the TNT
Matthew 2 in the TNTIK
Matthew 2 in the TNTIL
Matthew 2 in the TNTIN
Matthew 2 in the TNTIP
Matthew 2 in the TNTIZ
Matthew 2 in the TOMA
Matthew 2 in the TTENT
Matthew 2 in the UBG
Matthew 2 in the UGV
Matthew 2 in the UGV2
Matthew 2 in the UGV3
Matthew 2 in the VBL
Matthew 2 in the VDCC
Matthew 2 in the YALU
Matthew 2 in the YAPE
Matthew 2 in the YBVTP
Matthew 2 in the ZBP