Matthew 7 (BOICB)

1 “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. 2 Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu. 3 “Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? 4 Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ. 5 Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya. 6 “Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị. 7 “Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 8 Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. 9 “Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute? 10 Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ? 11 Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya! 12 Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri. 13 “Sitenụ nʼọnụ ụzọ dị warawara banye. Nʼihi na ọnụ ụzọ ahụ dị obosara. Mbara ka ụzọ ahụ dịkwa na-eduba nʼịla nʼiyi. Ọtụtụ na-esoro ya. 14 Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide. 15 “Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ. 16 A ga-esite na mkpụrụ ha mata ndị ha bụ. Ndị mmadụ ọ na-esite nʼosisi ogwu dị nʼọhịa ghọta mkpụrụ osisi grepu, ka ha na-esite nʼosisi uke gbara nʼọhịa ghọta mkpụrụ fiig? 17 Nʼụzọ dị otu a, osisi ọbụla dị mma na-amịpụta mkpụrụ ọma, ma osisi dị njọ na-amịpụta mkpụrụ dị njọ. 18 Osisi na-amị mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịghịkwa amị mkpụrụ ọma. 19 Ma osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka a ga-egbutu tụnye ya nʼọkụ. 20 Ụzọ e si amata osisi ọma bụ site na mkpụrụ ya. 21 “Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee. 22 Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ bụ na anyị ejighị aha gị buo amụma, jiri aha gị chụpụ mmụọ ọjọọ, ma jirikwa aha gị ruo ọtụtụ ọrụ ebube?’ 23 Mgbe ahụ aga m agwa ha hoohaa sị ha, ‘Amaghị m unu, sitenụ nʼihu m pụọ, unu ndị ajọ omume!’ 24 “Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume. 25 Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume. 26 Ma ndị niile nụrụ okwu ndị a, ma lefuru ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nʼelu aja. 27 Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala. Ọdịda ya dị ukwuu.” 28 Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru igwe mmadụ ahụ niile anya. 29 Nʼihi na o ziri ihe dịka onye nwere ikike. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi iwu ha.

In Other Versions

Matthew 7 in the ANGEFD

Matthew 7 in the ANTPNG2D

Matthew 7 in the AS21

Matthew 7 in the BAGH

Matthew 7 in the BBPNG

Matthew 7 in the BBT1E

Matthew 7 in the BDS

Matthew 7 in the BEV

Matthew 7 in the BHAD

Matthew 7 in the BIB

Matthew 7 in the BLPT

Matthew 7 in the BNT

Matthew 7 in the BNTABOOT

Matthew 7 in the BNTLV

Matthew 7 in the BOATCB

Matthew 7 in the BOATCB2

Matthew 7 in the BOBCV

Matthew 7 in the BOCNT

Matthew 7 in the BOECS

Matthew 7 in the BOGWICC

Matthew 7 in the BOHCB

Matthew 7 in the BOHCV

Matthew 7 in the BOHLNT

Matthew 7 in the BOHNTLTAL

Matthew 7 in the BOILNTAP

Matthew 7 in the BOITCV

Matthew 7 in the BOKCV

Matthew 7 in the BOKCV2

Matthew 7 in the BOKHWOG

Matthew 7 in the BOKSSV

Matthew 7 in the BOLCB

Matthew 7 in the BOLCB2

Matthew 7 in the BOMCV

Matthew 7 in the BONAV

Matthew 7 in the BONCB

Matthew 7 in the BONLT

Matthew 7 in the BONUT2

Matthew 7 in the BOPLNT

Matthew 7 in the BOSCB

Matthew 7 in the BOSNC

Matthew 7 in the BOTLNT

Matthew 7 in the BOVCB

Matthew 7 in the BOYCB

Matthew 7 in the BPBB

Matthew 7 in the BPH

Matthew 7 in the BSB

Matthew 7 in the CCB

Matthew 7 in the CUV

Matthew 7 in the CUVS

Matthew 7 in the DBT

Matthew 7 in the DGDNT

Matthew 7 in the DHNT

Matthew 7 in the DNT

Matthew 7 in the ELBE

Matthew 7 in the EMTV

Matthew 7 in the ESV

Matthew 7 in the FBV

Matthew 7 in the FEB

Matthew 7 in the GGMNT

Matthew 7 in the GNT

Matthew 7 in the HARY

Matthew 7 in the HNT

Matthew 7 in the IRVA

Matthew 7 in the IRVB

Matthew 7 in the IRVG

Matthew 7 in the IRVH

Matthew 7 in the IRVK

Matthew 7 in the IRVM

Matthew 7 in the IRVM2

Matthew 7 in the IRVO

Matthew 7 in the IRVP

Matthew 7 in the IRVT

Matthew 7 in the IRVT2

Matthew 7 in the IRVU

Matthew 7 in the ISVN

Matthew 7 in the JSNT

Matthew 7 in the KAPI

Matthew 7 in the KBT1ETNIK

Matthew 7 in the KBV

Matthew 7 in the KJV

Matthew 7 in the KNFD

Matthew 7 in the LBA

Matthew 7 in the LBLA

Matthew 7 in the LNT

Matthew 7 in the LSV

Matthew 7 in the MAAL

Matthew 7 in the MBV

Matthew 7 in the MBV2

Matthew 7 in the MHNT

Matthew 7 in the MKNFD

Matthew 7 in the MNG

Matthew 7 in the MNT

Matthew 7 in the MNT2

Matthew 7 in the MRS1T

Matthew 7 in the NAA

Matthew 7 in the NASB

Matthew 7 in the NBLA

Matthew 7 in the NBS

Matthew 7 in the NBVTP

Matthew 7 in the NET2

Matthew 7 in the NIV11

Matthew 7 in the NNT

Matthew 7 in the NNT2

Matthew 7 in the NNT3

Matthew 7 in the PDDPT

Matthew 7 in the PFNT

Matthew 7 in the RMNT

Matthew 7 in the SBIAS

Matthew 7 in the SBIBS

Matthew 7 in the SBIBS2

Matthew 7 in the SBICS

Matthew 7 in the SBIDS

Matthew 7 in the SBIGS

Matthew 7 in the SBIHS

Matthew 7 in the SBIIS

Matthew 7 in the SBIIS2

Matthew 7 in the SBIIS3

Matthew 7 in the SBIKS

Matthew 7 in the SBIKS2

Matthew 7 in the SBIMS

Matthew 7 in the SBIOS

Matthew 7 in the SBIPS

Matthew 7 in the SBISS

Matthew 7 in the SBITS

Matthew 7 in the SBITS2

Matthew 7 in the SBITS3

Matthew 7 in the SBITS4

Matthew 7 in the SBIUS

Matthew 7 in the SBIVS

Matthew 7 in the SBT

Matthew 7 in the SBT1E

Matthew 7 in the SCHL

Matthew 7 in the SNT

Matthew 7 in the SUSU

Matthew 7 in the SUSU2

Matthew 7 in the SYNO

Matthew 7 in the TBIAOTANT

Matthew 7 in the TBT1E

Matthew 7 in the TBT1E2

Matthew 7 in the TFTIP

Matthew 7 in the TFTU

Matthew 7 in the TGNTATF3T

Matthew 7 in the THAI

Matthew 7 in the TNFD

Matthew 7 in the TNT

Matthew 7 in the TNTIK

Matthew 7 in the TNTIL

Matthew 7 in the TNTIN

Matthew 7 in the TNTIP

Matthew 7 in the TNTIZ

Matthew 7 in the TOMA

Matthew 7 in the TTENT

Matthew 7 in the UBG

Matthew 7 in the UGV

Matthew 7 in the UGV2

Matthew 7 in the UGV3

Matthew 7 in the VBL

Matthew 7 in the VDCC

Matthew 7 in the YALU

Matthew 7 in the YAPE

Matthew 7 in the YBVTP

Matthew 7 in the ZBP