Mark 13 (BOICB)

1 Mgbe o sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-apụ, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya siri ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ a si maa mma. Lee ụdị nkume buru ibu e ji wuo ha.” 2 Jisọs zara ha, “Ị hụrụ ụlọ ukwu ndị a? Oge na-abịa mgbe ọ na-adịghị nkume ga-atụkwasị nʼelu ibe ya, nʼihi na a ga-ala ha niile nʼiyi.” 3 Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, na ncherita ihu ụlọnsọ ukwu, Pita na Jemis, na Jọn na Andru bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, 4 “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama izi na o ruola mgbe ha niile ga-emezu?” 5 Jisọs malitere ịgwa ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu. 6 Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. 7 Mgbe unu nụrụ maka agha na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu. Ihe ndị a aghaghị ime ma oge ọgwụgwụ ihe niile erubeghị. 8 Mba ga-ebili megide mba ibe ya. Alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ibe ya. Ala ọma jijiji na ụnwụ ga-adị nʼebe dị iche iche. Ihe ndị a bụ mmalite nke oke ihe mgbu. 9 “Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha. 10 Aghaghị ibu ụzọ kwusaa oziọma a nye mba niile. 11 Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu. 12 “Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya. Nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha. 13 Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m, ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. 14 “Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị (onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu 15 Onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ ya ghara ịrịdata maọbụ baa nʼime ụlọ ya iwepụta ihe ọbụla. 16 Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya. 17 Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ. 18 Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi. 19 Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. 20 “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ. 21 Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 22 Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. 23 Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị. 24 “Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya; 25 kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada, ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’ 26 “Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube. 27 Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe. 28 “Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso. 29 Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ. 30 Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 31 Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide. 32 “Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya. 33 Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya! 34 Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche. 35 “Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ. 36 Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra. 37 Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ”

In Other Versions

Mark 13 in the ANGEFD

Mark 13 in the ANTPNG2D

Mark 13 in the AS21

Mark 13 in the BAGH

Mark 13 in the BBPNG

Mark 13 in the BBT1E

Mark 13 in the BDS

Mark 13 in the BEV

Mark 13 in the BHAD

Mark 13 in the BIB

Mark 13 in the BLPT

Mark 13 in the BNT

Mark 13 in the BNTABOOT

Mark 13 in the BNTLV

Mark 13 in the BOATCB

Mark 13 in the BOATCB2

Mark 13 in the BOBCV

Mark 13 in the BOCNT

Mark 13 in the BOECS

Mark 13 in the BOGWICC

Mark 13 in the BOHCB

Mark 13 in the BOHCV

Mark 13 in the BOHLNT

Mark 13 in the BOHNTLTAL

Mark 13 in the BOILNTAP

Mark 13 in the BOITCV

Mark 13 in the BOKCV

Mark 13 in the BOKCV2

Mark 13 in the BOKHWOG

Mark 13 in the BOKSSV

Mark 13 in the BOLCB

Mark 13 in the BOLCB2

Mark 13 in the BOMCV

Mark 13 in the BONAV

Mark 13 in the BONCB

Mark 13 in the BONLT

Mark 13 in the BONUT2

Mark 13 in the BOPLNT

Mark 13 in the BOSCB

Mark 13 in the BOSNC

Mark 13 in the BOTLNT

Mark 13 in the BOVCB

Mark 13 in the BOYCB

Mark 13 in the BPBB

Mark 13 in the BPH

Mark 13 in the BSB

Mark 13 in the CCB

Mark 13 in the CUV

Mark 13 in the CUVS

Mark 13 in the DBT

Mark 13 in the DGDNT

Mark 13 in the DHNT

Mark 13 in the DNT

Mark 13 in the ELBE

Mark 13 in the EMTV

Mark 13 in the ESV

Mark 13 in the FBV

Mark 13 in the FEB

Mark 13 in the GGMNT

Mark 13 in the GNT

Mark 13 in the HARY

Mark 13 in the HNT

Mark 13 in the IRVA

Mark 13 in the IRVB

Mark 13 in the IRVG

Mark 13 in the IRVH

Mark 13 in the IRVK

Mark 13 in the IRVM

Mark 13 in the IRVM2

Mark 13 in the IRVO

Mark 13 in the IRVP

Mark 13 in the IRVT

Mark 13 in the IRVT2

Mark 13 in the IRVU

Mark 13 in the ISVN

Mark 13 in the JSNT

Mark 13 in the KAPI

Mark 13 in the KBT1ETNIK

Mark 13 in the KBV

Mark 13 in the KJV

Mark 13 in the KNFD

Mark 13 in the LBA

Mark 13 in the LBLA

Mark 13 in the LNT

Mark 13 in the LSV

Mark 13 in the MAAL

Mark 13 in the MBV

Mark 13 in the MBV2

Mark 13 in the MHNT

Mark 13 in the MKNFD

Mark 13 in the MNG

Mark 13 in the MNT

Mark 13 in the MNT2

Mark 13 in the MRS1T

Mark 13 in the NAA

Mark 13 in the NASB

Mark 13 in the NBLA

Mark 13 in the NBS

Mark 13 in the NBVTP

Mark 13 in the NET2

Mark 13 in the NIV11

Mark 13 in the NNT

Mark 13 in the NNT2

Mark 13 in the NNT3

Mark 13 in the PDDPT

Mark 13 in the PFNT

Mark 13 in the RMNT

Mark 13 in the SBIAS

Mark 13 in the SBIBS

Mark 13 in the SBIBS2

Mark 13 in the SBICS

Mark 13 in the SBIDS

Mark 13 in the SBIGS

Mark 13 in the SBIHS

Mark 13 in the SBIIS

Mark 13 in the SBIIS2

Mark 13 in the SBIIS3

Mark 13 in the SBIKS

Mark 13 in the SBIKS2

Mark 13 in the SBIMS

Mark 13 in the SBIOS

Mark 13 in the SBIPS

Mark 13 in the SBISS

Mark 13 in the SBITS

Mark 13 in the SBITS2

Mark 13 in the SBITS3

Mark 13 in the SBITS4

Mark 13 in the SBIUS

Mark 13 in the SBIVS

Mark 13 in the SBT

Mark 13 in the SBT1E

Mark 13 in the SCHL

Mark 13 in the SNT

Mark 13 in the SUSU

Mark 13 in the SUSU2

Mark 13 in the SYNO

Mark 13 in the TBIAOTANT

Mark 13 in the TBT1E

Mark 13 in the TBT1E2

Mark 13 in the TFTIP

Mark 13 in the TFTU

Mark 13 in the TGNTATF3T

Mark 13 in the THAI

Mark 13 in the TNFD

Mark 13 in the TNT

Mark 13 in the TNTIK

Mark 13 in the TNTIL

Mark 13 in the TNTIN

Mark 13 in the TNTIP

Mark 13 in the TNTIZ

Mark 13 in the TOMA

Mark 13 in the TTENT

Mark 13 in the UBG

Mark 13 in the UGV

Mark 13 in the UGV2

Mark 13 in the UGV3

Mark 13 in the VBL

Mark 13 in the VDCC

Mark 13 in the YALU

Mark 13 in the YAPE

Mark 13 in the YBVTP

Mark 13 in the ZBP